Olee Otú Akwụkwọ Ahụ Si Lanarị?
Ihe odide oge ochie nwere ndị iro na-esiteghị n’aka mmadụ—ọkụ, mmiri, na evu. Bible enwereghị onwe ya pụọ n’ọdachi ndị dị otú ahụ. Ihe ndekọ nke ụzọ o siworo lanarị ihe ndị meworo ya eri ogologo oge wee ghọọ akwụkwọ a kasị enweta dị ịrịba ama n’etiti ihe odide oge ochie. Akụkọ ahụ kwesịrị ihe karịrị mmasị na-abaghị ime.
NDỊ dere Bible akanyeghị okwu ha n’elu nkume; ha edekwasịghịkwa ha na nkume ụrọ na-adịte anya. Ihe àmà na-egosi na ha dekọrọ okwu ha n’ihe ndị na-emebi emebi—papyrus (e si n’ihe ọkụkụ Ijipt nwere otu aha ahụ mee) na parchment (e ji akpụkpọ anụ mee).
Gịnị mere ihe mbụ ndị e dere? Ọ ghaghị ịbụ na ha rekasịrị eri ogologo oge, ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime ha n’Israel oge ochie. Ọkà mmụta bụ́ Oscar Paret na-akọwa, sị: “Ihe abụọ ndị a e ji ede ihe [papyrus na akpụkpọ anụ] nọ n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ dị ike nọ n’ihe ize ndụ nke mmiri, evu, na ụdị ikpuru dị iche iche. Anyị maara site n’ihe na-eme kwa ụbọchị ụzọ o si dị mfe na akwụkwọ, na ọbụna akpụkpọ anụ siri ike, na-erekasị n’èzí ma ọ bụ n’ọnụ ụlọ dị udè.”1
Ọ bụrụ na ndị mbụ adịkwaghị, mgbe ahụ olee otú okwu ndị dere Bible si dịgide ruo ụbọchị anyị?
Nke Ndị Odeakwụkwọ Na-elezi Anya Chekwara
Ngwa ngwa e desịrị ndị mbụ, a malitere imepụta ndị e ji aka depụtaghachi. Idepụtaghachi Akwụkwọ Nsọ ghọrọ ọrụ aka n’ezie n’Israel oge ochie. (Ezra 7:6; Abụ Ọma 45:1) Ma, e dekwara ndị ahụ e depụtaghachiri n’ihe ndị na-emebi emebi. E mesịa ndị ọzọ e ji aka depụtaghachi aghaghị ịnọchi ndị a. Mgbe ndị mbụ pụrụ n’anya, ndị a e depụtaghachiri ghọrọ ihe ndabere maka ihe odide ndị nke ọdịnihu. Idepụtaghachi ihe odide ndị ahụ ghọrọ usoro gara n’ihu ruo ọtụtụ narị afọ. Ndehie ihe nke ndị odeakwụkwọ n’ọtụtụ narị afọ ndị ahụ hà gbanwere ihe e dere na Bible nke ukwuu? Ihe àmà na-aza mba.
Ndị ọrụ odeakwụkwọ ahụ jiri nnọọ ọrụ ha kpọrọ ihe. Ha nwere nsọpụrụ miri emi maka okwu ndị ha depụtaghachiri. Ha na-elezikwa anya. Okwu Hibru a kpọrọ “odeakwụkwọ” bụ so·pherʹ, nke na-ezo aka n’ịgụkọ na idekọ ihe. Iji maa atụ izi ezi nke ndị odeakwụkwọ ahụ, tụlee ndị Masorete.a Banyere ha, ọkà mmụta bụ́ Thomas Hartwell Horne na-akọwa, sị: “Ha . . . gbakọrọ nke bụ mkpụrụ akwụkwọ nke etiti nke Pentateuch [akwụkwọ ise mbụ nke Bible], nke bụ nkebi ahịrịokwu nke etiti nke akwụkwọ ọ bụla, na ugbo ole mkpụrụ okwu [Hibru] nke ọ bụla pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum.”3
Otú a, ndị odeakwụkwọ nwere nkà ji ụzọ dị iche iche nke ngwá ọrụ ngụzigharị mee ihe. Iji zere ịhapụ ọbụna otu mkpụrụ site n’ihe odide Bible, ha ruru n’ókè nke ịgụ ọ bụghị nanị okwu ha depụtaghachiri kamakwa mkpụrụ okwu ndị ahụ ọnụ. Chee banyere oké nlezianya nke a gụnyere: A kọrọ na ha gụkọrọ mkpụrụ okwu 815,140 n’otu n’otu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru!4 Mgbalị ịdị uchu dị otú ahụ mere ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke izi ezi.
Ka o sina dị, ndị odeakwụkwọ ahụ abụghị ndị na-apụghị imehie ihe. È nwere ihe akaebe ọ bụla na, n’agbanyeghị ọtụtụ narị afọ nke ndepụtaghachi, ihe e dere na Bible alanarịwo n’ụdị a pụrụ ịdabere na ya?
Ihe Ndabere Siri Ike Maka Obi Ike
E nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na e wedatawo Bible n’izi ezi ruo n’ụbọchị anyị. Ihe akaebe ahụ gụnyere ihe odide ndị e ji aka dee—nke atụmatụ ya bụ 6,000 nke Akwụkwọ Nsọ Hibru dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ na ihe dị ka 5,000 nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ime ndị a e nwere ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru a chọtara na 1947 nke na-enye ihe atụ kpọmkwem ụzọ ndepụtaghachi nke Akwụkwọ Nsọ si zie ezi. A kpọworị ya “nchọpụta ihe odide kachasịnụ n’oge ndị a.”5
Mgbe ọ na-elekọta ìgwè atụrụ ya ná mmalite afọ ahụ, onye Bedouin na-azụ atụrụ chọtara otu ọgba dị nsọ Osimiri Nwụrụ Anwụ. N’ime ya ọ hụrụ ọtụtụ ite ájá, ndị ihe na-adịghị n’ime ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime ha. Otú ọ dị, n’ime otu ite ndị ahụ, nke e kwuchisiri ike, ọ hụrụ akwụkwọ mpịakọta e ji akpụkpọ anụ mee bụ́ nke e ji nlezianya fụchie n’ákwà ọcha ma nwee ozuzu nke akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa. Akwụkwọ mpịakọta a kara nká nke e chekwara nke ọma gosiri ihe àmà nke ịbụ nke nwere mgbe e doziburu ya. Nwa okoro ahụ na-azụ atụrụ amaghị ma ọlị na akwụkwọ mpịakọta ochie ahụ o ji n’aka ga-emesịa dọrọ mmasị ụwa dum.
Gịnị dị nnọọ ịrịba ama banyere ihe odide a kpọmkwem? Na 1947 ihe odide kasị ochie zuru ezu nke Hibru dị malite n’ihe dị ka na narị afọ nke iri O.A. Ma akwụkwọ mpịakọta nke a dị eri narị afọ nke abụọ T.O.A.b—ihe karịrị otu puku afọ bu ụzọ.c Ndị ọkà mmụta nwere oké mmasị ịchọpụta ụzọ akwụkwọ mpịakọta a si na-atụnyere ihe odide ndị e depụtara n’oge dị n’ihu karị.
N’otu ihe ọmụmụ, ndị ọkà mmụta ji isi nke 53 nke Aịsaịa n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ tụnyere ihe odide Masorete nke e mepụtara otu puku afọ n’ihu. Akwụkwọ bụ́ A General Introduction to the Bible na-akọwa ihe sitere n’ihe ọmụmụ ahụ: “N’ime okwu 166 dị n’Aịsaịa 53, e nwere nanị mkpụrụ edemede iri na asaa na-edoghị anya. Iri n’ime ndị a bụ nanị okwu metụtara nsụpe, nke na-emetụtaghị nghọta okwu. Mkpụrụ edemede anọ ọzọ bụ obere mgbanwe n’aka akwụkwọ, dị ka njikọ. Mkpụrụ edemede atọ fọrọ mejupụtara okwu bụ́ ‘ìhè,’ nke a gbakwụnyere Aịz 53 n’amaokwu nke 11, ọ dịghịkwa emetụta nghọta okwu nke ukwuu. . . . Ya mere, n’ime isiakwụkwọ nwere okwu 166, e nwere nanị otu okwu (mkpụrụ akwụkwọ atọ) na-edoghị anya mgbe otu puku afọ nke ndepụtagharị gafeworo—okwu a adịghịkwa agbanwe ihe ebe ahụ na-ekwu nke ukwuu.”7
Prọfesọ Millar Burrows, onye ji akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ rụọ ọrụ ọtụtụ afọ, n’ịtụle ihe ndị dị n’ime ha, bịara ná nkwubi okwu yiri nke ahụ: “A pụrụ ịkọwa ọtụtụ n’ime ọdịiche dị n’etiti . . . akwụkwọ mpịakọta Aịsaịa na ihe odide Masorete dị ka ndehie ihe ná ndepụtaghachi. E wezụga ndị a, e nwere nkwekọ dị ịrịba ama, n’ozuzu ya, ha na ihe odide ndị nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya. Nkwekọ dị otú ahụ n’ihe odide mere ochie nke ukwuu karị na-agba akaebe na-emesi obi ike maka izi ezi nke ihe odide mbụ n’ozuzu ya.”8
A pụkwara ịgba “akaebe na-emesi obi ike” banyere ndepụtaghachi nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, nchọpụta narị afọ nke 19 nke Codex Sinaiticus, ihe odide vellum nke dịwara na narị afọ nke anọ O.A., nyere aka iguzobe izi ezi nke ihe odide ndị nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst e mepụtara ọtụtụ narị afọ n’ihu. Otu iberibe papyrus nke Oziọma Jọn, nke a chọtara n’ógbè Faiyūm, Ijipt, bụ nke dịwara ná nkera mbụ nke narị afọ nke abụọ O.A., ihe na-erughị afọ 50 mgbe e desịrị nke mbụ. E chekwawo ya ruo ọtụtụ narị afọ n’ájá ọkpọọ. Ihe odide ahụ kwekọrọ na nke a hụrụ n’ihe odide ndị pụtara ogologo oge n’ihu.9
Otú a ihe àmà na-akwado na ndị odeakwụkwọ, n’ezie, deziri nnọọ ihe edezi. Ka o sina dị, ha dehiere ihe. Ọ dịghị otu ihe odide nke zuru okè—gụnyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa. Otú o sina dị, ndị ọkà mmụta enwewo ike ịchọpụta ma dezie ihe ndị dị otú ahụ na-ekwekọghị na nke mbụ.
Idezi Ihe Ndị Odeakwụkwọ Dejọrọ
Ka e were ya na a gwara mmadụ 100 ka ha jiri aka depụtaghachi ihe odide dị ogologo. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ahụ ga-edehie ihe. Otú ọ dị, ha nile agaghị edehie otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na ị ga-ewere 100 ihe ahụ e depụtaghachiri ma jiri nlezianya tụlee ha, ị ga-enwe ike iwepụ ndehie ihe nile ma kpebie kpọmkwem ihe e dere n’ihe odide mbụ, ọ bụrụgodị na ị hụtụbeghị ya.
N’otu aka ahụ, ndị odeakwụkwọ Bible nile edehieghị otu ihe ndị ahụ. Ebe e nwere ugbu a ọtụtụ puku ihe odide Bible maka ntụle ntụnyere, ndị ọkà mmụta ihe odide enwewo ike ịmata ndehie ihe, kpebie ihe odide mbụ, ma detuo ihe ndị ọ dị mkpa ka e dezie. N’ihi ọmụmụ ihe dị otú ahụ e ji nlezianya mee, ndị ọkà mmụta ihe odide emepụtawo ihe odide bụ ọkpọka n’asụsụ ndị mbụ. Mbipụta ndị a a nụchara anụcha nke ihe odide Hibru na nke Grik na-edenye okwu ndị e kwekọrọ na ha n’ozuzu dị ka nke bụ ndị mbụ, ọtụtụ mgbe na-edepụta ná nkọwa ala ala peji nghọta ndị dị iche ma ọ bụ ndị ọzọ a pụrụ iji mee ihe bụ́ ndị a pụrụ inwe n’ihe odide ụfọdụ. Mbipụta ndị ndị ọkà mmụta ihe odide nụchara bụ nke ndị nsụgharị Bible ji asụgharị Bible gaa n’asụsụ ndị e nwere n’oge a.
Ya mere mgbe i welitere nsụgharị oge a nke Bible, e nwere nnọọ ihe mere a ga-eji nwee obi ike na ihe odide Hibru na nke Grik ahụ ọ dabeere na ya na-anọchite anya okwu ndị nke ndị mbụ dere Bible n’izi ezi dị ịrịba ama.d Ndekọ nke ụzọ Bible si lanarị ọtụtụ puku afọ nke iji aka na-edepụtaghachi dị ịtụnanya n’ezie. Sir Frederic Kenyon, onye nlekọta Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie na Britain ruo ogologo oge, pụrụ ikwu n’ihi ya, sị: “A pụghị ikwusi ike gabiga ókè na n’ọkpụrụkpụ ihe odide nke Bible bụ ihe e ji n’aka . . . A pụghị ikwu nke a banyere akwụkwọ ochie ọ bụla ọzọ n’ụwa.”10
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị Masorete (nke pụtara “Ndị Ọkà n’Ọdịnala”) bụ ndị odeakwụkwọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ́ ndị biri ndụ n’agbata narị afọ nke isii na nke iri O.A. A na-ezo aka n’ihe odide ndị ha wepụtara dị ka ihe odide ndị Masorete.2
b T.O.A. pụtara “Tupu Oge Anyị.” O.A. na-egosi “Oge Anyị,” nke a na-akpọkarị A.D., maka Anno Domini, nke pụtara “n’ime afọ nke Onyenwe anyị.”
c Textual Criticism of the Hebrew Bible, nke Emanuel Tov dere, na-ekwu, sị: “Site n’enyemaka nke nnyocha carbon 14, a na-ekwu ugbu a na 1QIsaa [Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ] dị malite n’agbata 202 na 107 TOA (ọgụgụ oge mgbe ochie: 125-100 TOA) . . . Usoro ọgụgụ oge mgbe ochie a kpọtụrụ aha, nke e meworo ka ọ ka mma n’afọ ndị na-adịbeghị anya, nke na-enyekwa ohere maka ngụkọ oge ziri ezi ná ndabere nke iji ọdịdị na nguzo nke mkpụrụ edemede atụnyere ihe ndị ọzọ dị iche dị ka mkpụrụ ego na ihe a tụrụ atụ ndị a maara oge ha, anwapụtawo onwe ya ịbụ usoro a pụrụ ịdaberetụ na ya.”6
d Otú ọ dị, ndị nsụgharị n’otu n’otu pụrụ ịdị aka ike ma ọ bụ ghara ịdị aka ike ná nrapara ha n’ihe odide mbụ nke Hibru na nke Grik ndị ahụ.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ndị odeakwụkwọ nwere nkà chekwara Bible
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa (e gosiri foto ya) yiri nnọọ ihe odide Masorete nke e mepụtara otu puku afọ n’ihu