Akwụkwọ “Na-asụ” Asụsụ Ndị Dị Ndụ
Ọ bụrụ na asụsụ e ji dee otu akwụkwọ anwụọ, n’ihe banyere nzube nile dị irè akwụkwọ ahụ na-anwụkwa. Ole na ole taa pụrụ ịgụ asụsụ ndị ochie e dere Bible na ha. Ma ọ dị ndụ. Ọ dịgidewo n’ihi na ọ “mụtawo ịsụ” asụsụ ndị dị ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị nsụgharị “kụziiri” ya ịsụ asụsụ ndị ọzọ chere ihe mgbochi ndị yiri ka a pụghị imeri ha emeri ihu mgbe ụfọdụ.
ỊSỤGHARỊ Bible—ya na ihe karịrị isiakwụkwọ ya dị 1,100 na amaokwu 31,000—bụ ọrụ buru oké ibu. Otú ọ dị, eri ọtụtụ narị afọ, ndị nsụgharị ji ọrụ ha kpọrọ ihe ji ọṅụ nakwere ihe ịma aka ahụ. Ọtụtụ n’ime ha dị njikere ịnagide ihe isi ike na ọbụna ịnwụrụ ọrụ ha. Akụkọ nke otú Bible si bụrụ nke a sụgharịrị gaa n’asụsụ ndị nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ akụkọ dị ịrịba ama nke nnọgidesi ike na nkà. Tụlee nanị akụkụ dị nta nke ihe ndekọ ahụ na-akpali akpali.
Ihe Ịma Aka Ndị Chere Ndị Nsụgharị ahụ Ihu
Olee otú i si asụgharị akwụkwọ gaa n’asụsụ na-enweghị usoro edemede? Ọtụtụ ndị nsụgharị Bible chere ihe ịma aka dị nnọọ otú ahụ ihu. Dị ka ihe atụ, Ulfilas, nke narị afọ nke anọ O.A., malitere ịsụgharị Bible gaa n’ihe bụ mgbe ahụ asụsụ ọgbara ọhụrụ ma ọ bụghị nke a na-ede ede—Gothic. Ulfilas meriri ihe ịma aka ahụ site n’ichepụta mkpụrụ okwu Gothic nwere mkpụrụ akwụkwọ 27, bụ́ ndị o mere ka ha dabere n’ụzọ bụ isi ná mkpụrụ okwu ndị nke Grik na Latin. Nsụgharị ya fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Bible dum gaa na Gothic bụ nke a rụzuru tupu 381 O.A.
Na narị afọ nke itoolu, ụmụnne nwoke abụọ na-asụ Grik, Cyril (onye a na-akpọbu Constantine) na Methodius, ha abụọ bụcha ndị ọkà mmụta na ọkà asụsụ pụtara ìhè, chọrọ ịsụgharị Bible maka ndị na-asụ Slavic. Ma Slavonic—asụsụ mụtara Slavic ndị a na-asụ taa—enweghị usoro edemede. Ya mere ụmụnne abụọ ahụ chepụtara mkpụrụ edemede iji wepụta nsụgharị nke Bible. Otú a Bible pụrụ ugbu a “ịgwa” ọtụtụ mmadụ karị okwu, ndị bi n’ógbè ndị Slav.
Na narị afọ nke 16, William Tyndale malitere ịsụgharị Bible site n’asụsụ ndị mbụ gaa na Bekee, ma o zutere ajọ mmegide site n’aka Chọọchị na Ọchịchị. Tyndale, onye gụrụ akwụkwọ n’Oxford, chọrọ iwepụta nsụgharị nke ọbụna “nwa okoro na-ebu ọ́gụ̀” pụrụ ịghọta.1 Ma iji mezuo nke a, ọ ghaghị ịgbaga Germany, ebe e biri “Agba Ọhụrụ” Bekee ya na 1526. Mgbe e gbebatara ụfọdụ n’ime ya n’England, iwe juru ndị ọchịchị obi nke na ha malitere isu ha ọkụ n’ihu ọha. E mesịrị rara Tyndale nye. Kpọmkwem tupu a nyagbuo ya, kpọọkwa ozu ya ọkụ, o kwuru okwu ndị a n’olu dara ụda: “Onyenwe anyị, meghee anya Eze England!”2
Nsụgharị Bible gara n’ihu; a gajeghị ịkwụsị ndị nsụgharị ya. Ka ọ na-erule 1800, ọ dịkarịa ala akụkụ dị iche iche nke Bible “amụtawo ịsụ” asụsụ 68. E mesịa, site ná nhiwe nke Òtù Bible—karịsịa Òtù Bible nke Britain na Ofesi, nke e hiwere na 1804—Bible “mụtara” ọbụna ọtụtụ asụsụ ọhụrụ ọzọ ngwa ngwa. Ọtụtụ narị ụmụ okoro wepụtara onwe ha ịga n’ala ofesi dị iche iche dị ka ndị ozi ala ọzọ, ọtụtụ ná nzube bụ isi nke ịsụgharị Bible.
Ịmụta Asụsụ Ndị Africa
Na 1800, e nwere nanị ihe dị ka asụsụ iri na abụọ a na-ede ede n’Africa. Ọtụtụ narị asụsụ ndị ọzọ a na-asụ asụ aghaghị ichere ruo mgbe ọ dị onye chepụtara usoro edemede. Ndị ozi ala ọzọ bịara ma mụta asụsụ ndị ahụ, n’enweghị akwụkwọ nkụzi ma ọ bụ ọkọwa okwu ọ bụla. E mesịa ha dọgburu onwe ha n’ọrụ iwepụta ụdị a na-ede ede, mgbe nke ahụ gasịkwara ha kụziiri ndị mmadụ ụzọ isi gụọ ihe e dere ede. Nke a ka ha mere ka o wee bụrụ na n’otu ụbọchị ndị mmadụ ga-enwe ike ịgụ Bible n’asụsụ nke ha.3
Otu onye ozi ala ọzọ dị otú ahụ bụ nwoke Scotland aha ya bụ Robert Moffat. Na 1821, n’afọ ndụ nke 25, Moffat hiwere òtù chọọchị n’etiti ndị ndịda Africa na-asụ Tswana. Iji mụta asụsụ ha a na-adịghị ede ede, o so ndị ahụ na-emekọ ihe, mgbe ụfọdụ mee njem gaa n’ime ime obodo iji binyere ha. “Ndị ahụ dị obiọma,” ka o mesịrị dee, “mkpọhie okwu m n’asụsụ ahụ kpalitekwara ntiwapụ ọchị ọtụtụ mgbe. Ọ dịghị mgbe, ọbụna otu, mmadụ ga-ekwuzi okwu ma ọ bụ ahịrịokwu, ruo mgbe o jijetara nnọọ ihe mbụ m kwuru, ka o wee kpaa ndị ọzọ oké ọchị.”4 Moffat tachiri obi ma mesịa mụta asụsụ ahụ, na-emepụtara ya ụdị a na-ede ede.
Na 1829, mgbe ọ rụworo ọrụ n’etiti ndị Tswana ruo afọ asatọ, Moffat sụgharịsịrị Oziọma Luk. Iji hụ na e biri ya, o ji ụgbọ ehi na-adọkpụ gaa njem ihe dị ka kilomita 966 gaa n’ụsọ oké osimiri wee banye ụgbọ mmiri gaa Cape Town. N’ebe ahụ onye gọvanọ nyere ya ikike iji ígwè obibi akwụkwọ gọọmenti mee ihe, ma Moffat aghaghị ịhazi mkpụrụ okwu ya ma bie ya n’onwe ya, mesịa bipụta Oziọma ahụ na 1830. Na nke mbụ ya, ndị Tswana pụrụ ịgụ akụkụ ụfọdụ nke Bible n’asụsụ nke ha. Na 1857, Moffat sụgharịsịrị Bible dum na Tswana.
Moffat mesịrị kọwaa mmeghachi omume ndị Tswana mgbe e wepụtaara ha Oziọma Luk na nke mbụ ya. O kwuru, sị: “E nwere ndị m maara si ọtụtụ narị mile bịa iji nweta Oziọma St. Luk. . . . Ahụwo m ka ha nwetara akụkụ ụfọdụ nke St. Luk, bekwasị ha ákwá, bịakwasịsie ha ike n’obi ha, gbaakwa anya mmiri nke obi ekele, ruo mgbe m gwaworo ihe karịrị otu onye sị, ‘Ị ga-eji anya mmiri mebie akwụkwọ gị.’”5
Ndị nsụgharị tinyere uche ha n’ọrụ si otú a nye ọtụtụ ndị Africa—ndị ụfọdụ n’ime ha na-ahụghị mkpa maka asụsụ a na-ede ede na mbụ—ohere mbụ iji ihe odide zirịta ozi. Ma, ndị nsụgharị ahụ kwenyere na ha na-enye ndị Africa onyinye bara uru ọbụna karị—Bible n’asụsụ nke ha. Taa Bible, n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ, “na-asụ” ihe karịrị asụsụ 600 nke ndị Africa.
Ịmụta Asụsụ Ndị Esia
Ka ndị nsụgharị n’Africa na-agbalị imepụta ụdị a na-ede ede maka asụsụ ndị a na-asụ asụ, n’akụkụ nke ọzọ nke ụwa, ndị nsụgharị ndị ọzọ zutere ihe mgbochi dịwagara iche—ịsụgharị gaa n’asụsụ ndị nwewororị usoro edemede dị mgbagwoju anya. Nke ahụ bụ ụdị ihe ịma aka chere ndị sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ ndị Esia ihu.
Ná mmalite nke narị afọ nke 19, William Carey na Joshua Marshman gara India ma mụta nke ọma ọtụtụ n’ime asụsụ ya ndị a na-ede ede. Site n’enyemaka William Ward, onye na-ebi akwụkwọ, ha mepụtara nsụgharị nke ma ọ dịghị ihe ọzọ akụkụ ụfọdụ nke Bible n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ asụsụ 40.6 Banyere William Carey, J. Herbert Kane na-ede akwụkwọ na-akọwa: “O chepụtara ụdị nke okwu ọnụ mara mma, nke na-aga were were [nke asụsụ Bengali] nke nọchiri ụdị nke ọkpọka oge ochie ya, si otú ahụ na-eme ka o kwe nghọta karị ma na-adọrọ adọrọ nye ndị na-agụ ya n’oge a.”7
Adoniram Judson, onye a mụrụ ma zụlite na United States, gara Burma, na 1817 kwa ọ malitere ịsụgharị Bible gaa na Burmese. N’ịkọwa ihe isi ike nke ịmụta asụsụ Ọwụwa Anyanwụ ruo n’ókè dị mkpa iji sụgharịa Bible, o dere, sị: ‘Mgbe anyị na-amụ asụsụ ndị bi n’akụkụ nke ọzọ nke ụwa, ndị echiche ha dịwagara iche na nke anyị, na ndị ụkpụrụ okwu ha dị ọhụrụ n’ihi ya, na ndị mkpụrụ okwu na okwu ha nile na-eyitụghị asụsụ ndị anyị zutetụworo mbụ; mgbe anyị na-enweghị akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụ ndị ntụgharị ọ bụla, anyị aghaghịkwa ịmụtatụ asụsụ ahụ tupu anyị enwee ike inwetara onwe anyị enyemaka nke nwa amaala ga-akụzi ya—nke ahụ bụ nnọọ ọrụ!’8
N’ọnọdụ nke Judson, ọ pụtara ihe dị ka afọ 18 nke ọrụ chọrọ mgbalị na nlezianya. E biri akụkụ ikpeazụ nke Bible Burmese na 1835. Otú ọ dị, ọnụnọ ya na Burma furu ya oké ihe. Mgbe ọ na-eme nsụgharị ahụ, e boro ya ebubo ime nledo, n’ihi ya kwa ọ nọrọ afọ abụọ n’ụlọ nga jupụtara n’anwụnta. Oge na-adịghị anya ka a tọhapụrụ ya, ahụ ọkụ gburu nwunye ya na obere ada ya.
Mgbe Robert Morrison dị afọ 25 rutere China na 1807, ọ bagidere ọrụ siri oké ike nke ịsụgharị Bible gaa na Chinese, otu n’ime asụsụ ndị a na-ede ede kasị mgbagwoju anya. O nwere nanị ihe ọmụma dị nta banyere Chinese, nke ọ maliteworo ịmụ nanị afọ abụọ tupu mgbe ahụ. Morrison aghaghịkwa ịnagide iwu ndị China, nke chọrọ ịkwalite ịnọpụrụ onwe onye iche nke China. A machibidoro ndị China iwu, n’ọmụma ikpe nke ọnwụ, ịkụziri ndị ala ọzọ asụsụ ha. Onye ofesi ịsụgharị Bible gaa na Chinese bụ njọ ogbugbu.
N’alaghị azụ, jirikwa akọ, Morrison nọgidere na-amụ asụsụ ahụ, na-amụta ya ngwa ngwa. N’ime afọ abụọ o nwetara ọrụ dị ka onye nsụgharị maka East India Company. N’ehihie, ọ na-arụrụ ụlọ ọrụ ahụ ọrụ, ma ná nzuzo na n’okpuru iyi egwu na-adị mgbe nile nke ịbụ onye a nwụdere, o mere nsụgharị nke Bible. Na 1814, afọ asaa ka o rutesịrị China, ọ kwadebewo Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst maka obibi.9 Afọ ise n’ihu, site n’enyemaka William Milne, ọ sụgharịsịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru.
Ọ bụ oké ihe a rụzuru—Bible pụrụ ugbu a “ikwu okwu” n’asụsụ ọtụtụ ndị ji eme ihe n’ụwa karịa asụsụ ọ bụla ọzọ. N’ihi ndị nsụgharị ruru eru, nsụgharị n’asụsụ Esia ndị ọzọ sochiri. Taa, e nwere akụkụ dị iche iche nke Bible n’ihe karịrị 500 n’ime asụsụ ndị dị n’Esia.
N’ihi gịnị ka ndị ikom dị ka Tyndale, Moffat, Judson, na Morrison ji dọgbuo onwe ha n’ọrụ ọtụtụ afọ—ụfọdụ ọbụna na-anọ n’ọnụ ọnwụ—iji sụgharịara ndị ha na-amaghị na, n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị na-enweghị asụsụ a na-ede ede otu akwụkwọ? N’ezie ọ bụghị maka otuto ma ọ bụ uru ego. Ha kwenyere na Bible bụ Okwu Chineke nakwa na o kwesịrị “ịgwa” ndị mmadụ okwu—mmadụ nile—n’asụsụ nke aka ha.
Ma ị̀ na-eche na Bible bụ Okwu Chineke ma ọ bụ na ị naghị eche otú ahụ, ikekwe ị ga-ekwenye na ụdị mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị nsụgharị tinyere uche ha n’ọrụ gosipụtara dị nnọọ ụkọ n’ụwa nke taa. Ọ̀ bụ na akwụkwọ na-akpali achọghị ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ erughị eru ka e nyochaa ya?
[Foto dị na peeji nke 12]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ọnụ ọgụgụ asụsụ e biworo akụkụ dị iche iche nke Bible eri afọ 1800
68 107 171 269 367 522 729 971 1,199 1,762 2,123
1800 1900 1995
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: United Bible Societies
[Foto dị na peeji nke 10]
Tyndale ka ọ na-asụgharị Bible
[Foto dị na peeji nke 11]
Robert Moffat
[Foto dị na peeji nke 12]
Adoniram Judson
[Foto dị na peeji nke 13]
Robert Morrison