Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/1 p. 10-14
  • Ịtụkwasị Jehova Obi Na-eweta Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịtụkwasị Jehova Obi Na-eweta Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọta Nzube ná Ndụ n’India
  • Ịlọghachite n’England
  • Ozi E Mere Ka Ọ Gbasawanye na Canada
  • Afọ Ndị A Nọ Ná Mmachibido Iwu
  • Ndụ Dị Ka Onye Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị
  • Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Ọzọ
  • Jehova Na-eme Ihe n’Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Jehova Gọziri Mkpebi M Mere nke Ukwuu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/1 p. 10-14

Ịtụkwasị Jehova Obi Na-eweta Obi Ụtọ

DỊ KA JACK HALLIDAY NATHAN SI KỌỌ

Ma eleghị anya ị nụwo okwu ahụ bụ, “Onye kpụ ngaji ọlaọcha n’ọnụ mgbe a mụrụ ya.” Mgbe a mụrụ m na 1897, Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị n’ụzọ nkịtị n’ọnọdụ m.

Ọ BỤ n’afọ nke 60 nke ọchịchị Eze Nwanyị Victoria, nke bụ afọ maka ememe mgbaafọ a na-akpọ diamond jubilee. E nyere ụmụ a mụrụ n’England n’afọ ahụ ngaji ọlaọcha. Alaeze Britain nọ n’ebube ya, na-enweta uru nile nke Oké Mgbanwe n’Usoro Mmepụta Ihe n’obodo ha na azụmahịa na-aga n’ihu site ná mba ofesi ndị ha na-achị.

Nna nna m bụ onye Juu, nna m ghọkwara onye na-amụ ihe banyere ndị Hibru, marakwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. Ma nne nna m bụ ada onye bishọp Anglican, n’ihi mmetụta o nwekwara, nna m nabatara Jisọs Kraịst dị ka Mesaịa ahụ. Ihe odide nile nke Charles Taze Russell nwere mmetụta n’ebe ma nne ma nna m nọ, ya mere ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị ji kwenye na nkwenkwe Atọ n’Ime Otu ma ọ bụ ọkụ ala mmụọ.

N’oge m dị na nwata, ịnyịnya ka bụ ihe bụ isi e ji aga njem n’England, e nweghịkwa ọtụtụ ụgbọ ndị ọ na-abụghị inyinya na-adọkpụ, ma ọ bụ moto. Na 1913, n’ihi ịhụnanya m nwere maka ịnyịnya, esonyeere m òtù ndị ji ịnyịnya ebu ndị njem, nke bụ akụkụ nke òtù ndị agha na-echebe obodo, (ndị nkịtị e nyere ọzụzụ dị ka ndị agha). Ná ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ, e wefere m n’òtù nke ndị agha a zụrụ azụ ma jiri ụgbọ mmiri buga m n’ihu agha Gris, ebe m nọ bute ọrịa ịba. E mesịa, e zigara m n’ihu agha nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ na France dị ka onye na-agba égbè nke na-awụpụ mgbọ n’ike n’ike ma mesịa bụrụ onye ndị Germany jidere ma tụọ mkpọrọ na 1917.

Ịchọta Nzube ná Ndụ n’India

Mgbe agha ahụ kwụsịrị na 1918, ọ dịghị ọrụ ọ bụla dị n’England, ya mere, abanyeghachiri m n’òtù ndị agha ma gaa India dị ka akụkụ nke òtù ndị agha na-eche nche n’oge udo. Na May 1920, ọrịa ịba ahụ malitekwara ọzọ. E zigakwara m n’ebe ugwu ije gbakee n’ọrịa ahụ. N’ebe ahụ, agụrụ m akwụkwọ nile ndị m pụru inweta, tinyere Bible. Ịgụ Akwụkwọ nsọ wusiri mmasị m ná nlọghachi nke Onyenwe anyị ike.

Ọnwa ole na ole n’ihu, na Kanpur, amalitere m otu òtù ọmụmụ Bible, na-enwe olileanya ịmụtakwu ihe banyere nlọghachi nke Onyenwe anyị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m zutere Fredrick James, onye bụbu onye agha ndị Britain, nke bụzi Onye Mmụta Bible na-anụsi ọkụ n’obi ike ugbu a. Ọ kọwaara m na Jisọs anọwo eri 1914, n’ụzọ anya mmadụ na-apụghị ịhụ. Nke a bụ akụkọ kasị akpali akpali m nụtụrụla. Mkpali mbụ m nwere bụ ịhapụ òtù ndị agha. Mwụfu ọbara na ọnwụ nile nke agha Europe asọwo m oyi. Achọrọ m ịbụ onye udo nke na-eje ozi ala ọzọ ma kwusaa ozi ọma nke a banyere ọnụnọ Kraịst.

Otú ọ dị, ndị agha ekweghị ka m laa. Kama nke ahụ, ha zigara m n’ọdịda anyanwụ India, nke bụ Pakistan ugbu a. Mgbe m nọ n’ebe ahụ, agụrụ m akwụkwọ bụ Studies in the Scriptures, nke Charles Taze Russell dere, o wee doo m anya karịa otú ọ dị na mbụ na m kwesịrị ịzaghachi nye òkù ahụ nke ikwusa ozi ọma. Amalitere m ịrọ nrọ ọjọọ ndị mere ka m daa mbà n’obi. N’amaghị ihe m ga-eme, edegaara m Nwanna James akwụkwọ, bụ́ onye kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ya na Kanpur. Ubọchị m bịarutere bụ ụbọchị Ememe Ncheta ọnwụ Onyenwe anyị. Ubọchị ahụ nwere mmetụta dị ukwuu ná ndụ m—ekpebiri m ịnọgide n’alụghị nwunye na ime ka ozi oge nile bụrụ ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ.

Ịlọghachite n’England

N’akụkụ ikpeazụ nke 1921, e zighachiri m n’England, n’oge opupu ihe ubi nke 1922, e zilagara m site n’òtù ndị agha. N’oge ọkọchị afọ ahụ, J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke abụọ nke Watch Tower Society bịara England, esokwaara m ndị mụrụ m gaa ịnụrụ okwu ya n’ụlọ nzukọ Royal Albert Hall, London. Mgbe nke ahụ gasịrị, enwere m mkpali ije ozi na Betel, bụ́ aha a na-akpọ alaka ụlọ ọrụ nile nke Watch Tower Society, ma e ji obi ọma gbaa m ume ka m burugodi ụzọ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ (ikwusa ozi ọma oge nile). Ya mere akwụsịrị m ọrụ m ma nabata ije ozi n’ebe ndịda England. N’enweghị ahụmahụ ọ bụla, na-enwe nanị otu crown (50 cent, U.S.) n’akpa m, na ịtụkwasị Jehova obi, amalitere m ọrụ m dị ka onye na-eje ozi oge nile. N’ihe dị ka March 1924, a kpọrọ m na Betel.

Otú ọ dị, n’afọ na-eso ya, a gwara m ka m hapụ Betel, o wutekwara m nke ukwuu, ebe m na-eche na a na-enye m ahụhụ n’ihi ihe m na-emeghị. N’oge nta ahụ, Betel aghọwo ndụ m. Ma site n’itinye nsogbu ahụ n’ekpere gwa Jehova ma na-enwe nchekwube na uche ya ga-eme, e nwere m ike iji ọṅụ nọgide na-aga n’ihu n’ozi ọsụ ụzọ nke e nyere m. Na May 1926, a kpọghachiri m na Betel, ebe m nọgidere ruo afọ 11 dị n’ihu.

Nwanna Rutherford bịara England ọzọ na 1936 ma kpọọ m ka m gaa Canada ikere òkè n’ọrụ Alaeze ahụ n’ebe ahụ. Otú ọ dị, n’ihi nghọtahie, emere m ka Nwanna Rutherford nwee mwute n’ebe m nọ site n’ikpughe ụfọdụ ihe ọmụma a na-achọghị ka ndị ọzọ mara. M ka pụrụ icheta kpọmkwem ụfọdụ n’okwu ndị o kwuru, sị: “Jack, apụghị m ịtụkwasị gị obi. Dọkaa akwụkwọ tiketi gị!” Lee ahụmahụ na-egbu mgbu n’obi nke a bụ! Ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị nke dị nnọọ mkpa, mgbe e mesịkwara, e zipụrụ mụ na otu Nwanna ọzọ ije ozi ọsụ ụzọ ruo ọnwa asatọ ndị na-eso. Ihe ùgwù ije ozi nke a mere ka m nwere onwe m pụọ n’ọnọdụ enweghị olileanya nke m nọ na ya, amụtakwara m ihe site n’ịdọ aka ná ntị ahụ.

Ozi E Mere Ka Ọ Gbasawanye na Canada

Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, n’oge ọbịbịa ya ọzọ n’England, Nwanna Rutherford welitakwara okwu banyere ije Canada ọzọ. Achọsiri m ike ịnabata ohere ahụ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu nabata ije ozi n’ebe ahụ. Mgbe m jesịrị ozi ọnwa ole na ole na Betel dị na Canada, e nyere m ozi nke ijegharị dị ka onye nnọchianya Society n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Ontario. Ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndị e nwere n’ebe ahụ dị nta ma chọọkwa agbamume dị ukwuu. Ma lee ihe na-enye ọṅụ afọ ndị mbụ ahụ bụ, n’agbanyeghị nsogbu elu ahụ ndị ọnọdụ ọjọọ nke ihu igwe na usoro ịga njem a na-ejighị n’aka kpatara!

Apụghị m ichefu ezi okpomọkụ na nghọta ime mmụọ nke otu ọgbakọ ndị India nke dị na nso Brantford gosiri. Ọ bụ oge oyi, snow jupụtakwara n’ebe nile, na-eme ka o siere ụgbọ ala Model T Ford m ike ịgafe. Ọ dịghị onye ọ bụla na-ele anya na m ga-abịa, mgbe m rutekwara, achọpụtara m na ụmụnna ahụ agawo n’ọhịa ịkpata nkụ. Ya mere, ejewere m ịchọ ha, snow tojupụtakwara, na-erute m n’úkwù. Mgbe m mesịrị chọta ha, ọ tụrụ ha n’anya, ma ha nwere obi ụtọ ịhụ m. Ha hapụrụ ihe nile, lọta n’ụlọ, ma mee ndokwa inwe nzukọ kpọmkwem n’uhuruchi ahụ.

Na Beamsville nke dị nso n’ebe ahụ, mụ na ụmụnna ndị kwesịrị ntụkwasị obi gbasiri mgba ike megide ndị okenye a họpụtara site n’ịtụli aka elu na ndị si n’ezi ofufe dapụ. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịhụ otú mmụọ Jehova si mee ihe ikpochapụ ọnọdụ ahụ! Ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ na ịnọgidesi ike ná nzukọ ya mere ka e nwee ọtụtụ ngọzi n’ọgbakọ ahụ n’afọ ndị mbụ ahụ. Ọtụtụ ụmụntakịrị sitere n’ọgbakọ ndị ahụ tolitere ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ, ịga Betel, ije ozi ala ọzọ, ma ghọọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Echefubeghị m ọṅụ nile nke ịnọnyere ezinụlọ ndị Kraịst na-anọgidesi ike n’ihe, bụ́ ndị mụtara ezi ndị na-eto eto dị otú ahụ. Ezinụlọ ndị a ghọrọ ezinụlọ m, ụmụ ha ghọkwara ụmụ m.

Afọ Ndị A Nọ Ná Mmachibido Iwu

N’oge ọgba aghara nke agha na 1940, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu. Lee ihe na-awụ akpata oyi ọ bụ! Ịma ọkwa redio nke ndị ọchịchị kwadoro nyere iwu ka anyị nyefee ndị uwe ojii akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible, ihe ndekọ ọgbakọ anyị, na mkpịsị ugodi nke Ulọ Nzukọ Alaeze anyị. N’ịmata ịdị ngwa nke ọnọdụ ahụ, agbagharịrị m gaa n’ọgbakọ ndị ahụ ma gbaa ha ume ka ha zoo akwụkwọ na ihe ndekọ ha nile. A gbara ụmụnna ahụ ume izukọta n’ebe obibi ndị mmadụ, na-ezukọ n’ebe dị iche kwa izu. Ka oge na-aga, ọgbakọ ndị ahụ maliteghachiri ozi ụlọ n’ụlọ, jiri Bible na-eme ihe. Nke a ghọrọ ngọzi, n’ihi na anyị nile mụtara iji Bible na-eme ihe n’ụzọ dị mma karị.

Mgbe e mesịrị n’afọ ahụ, anyị natara ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke akwụkwọ nta ahụ bụ End of Nazism site na United States. Ibubata akwụkwọ nke a a machibidoro iwu na Canada chọrọ ọgụgụ isi dị ukwuu. Ụmụnna ụfọdụ butere ndị agha nọ n’okporo ụzọ na-eche ụgbọ ala ga-eburu ha, bụ́ ndị nọdụrụ ọdụ n’elu katọn ndị ahụ, si otú a na-ezobe akwụkwọ nta ndị ahụ a machibidoro iwu n’amaghị na ha na-eme otú ahụ. Mgbe ahụ, n’otu ụtụtụ na November, n’agbata elekere atọ na nke isii, mba ahụ jupụtara ná Ndịàmà, bụ́ ndị debere otu akwụkwọ nta nke a n’ọnụ ụzọ nke ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ndị Canada.

N’afọ ndị ahụ a nọ ná mmachibido iwu, anọgidere m n’ozi ọsụ ụzọ n’ókèala ebe ọdịda

anyanwụ Canada nke British Columbia. Tupu mmachibido iwu ahụ, ụmụnna ndị ahụ ji ụgbọ epeepe mee ihe mgbe ha na-agakwuru ndị bi n’ime obodo ndị dị n’ime ime malite na Vancouver ruo Alaska. Mgbe mmachibido ahụ malitere ịdị ìrè, e bu ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke akwụkwọ na-abịa, ya mere Ndịàmà ahụ nyefere ha n’aka ndị nwere ụdịdị enyi bụ́ ndị bi n’ụzọ ebe ha si na-aga n’ọdụ ụgbọ mmiri ebe a ga-ejide ụgbọ ahụ. Mgbe e mesịrị, eweere m ụgbọ e ji akụ ọkụ azụ gaa ịchọta ebe akwụkwọ ahụ dị, mgbe ahụkwa, n’oge e ji akụ azụ salmon, emere m ndokwa ka ụmụnna ahụ gaa bute ya site n’aka ndị a nwere mmasị. Ka oge na-aga e zoro akwụkwọ ndị ahụ n’ime ebe a na-ebu ibu n’ụgbọ ahụ e ji akụ azụ ma bubata ha na Vancouver iji kesaa ha n’ụzọ dị ukwuu karị.

N’akụkụ ngwụsị nke 1943, anyị natara akụkọ na e wepụwo mmachibido iwu ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Otú ọ dị, e wepụghị ya n’ebe Watch Tower Society nọ. Ya mere anyị gara n’ihu dị ka anyị na-eme na mbụ, na-eji nanị Bible eme ihe n’ozi ụlọ n’ụlọ anyị. Ma ugbu a, anyị pụrụ igosipụta onwe anyị n’ihu ọha dị ka Ndịàmà Jehova. Mgbe mmachibido iwu ahụ malitere, anyị nwere ihe dị ka 6,700 Ndịàmà; mgbe e wepụrụ ya, anyị dị 11,000 n’ọnụ ọgụgụ!

Ndụ Dị Ka Onye Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị

Dị ka onye nnọchianya na-ejegharị ejegharị nke Society, ejezuru m ọtụtụ maịlụ a na-apụghị ịgụta ọnụ n’afọ ole na ole ndị sochirinụ, soro ọgbakọ dị iche iche na-arụ ọrụ ma na-agba ha ume. N’oge oyi, esonyeere m ụmụnna ahụ n’otu ụgbọ ala pụrụ nnọọ iche a kpọrọ caboose. Nke a bụ ụgbọ ala dị ogologo a rụchiri elu ya arụchi nke ịnyịnya na-adọkpụ, bụ́ nke nwezuru ebe a na-akwanye ọkụ nke ikuku na-adịghị abanye, nke e ji nkụ afụnwu nakwa ebe anwụrụ ọkụ si ekupu. N’ịmalite n’isi ụtụtụ, na-enwe ihe dị ka mmadụ isii n’ime ụgbọ ahụ, ọtụtụ mgbe, anyị na-aga njem n’elu snow miri emi ruo 20 maịlụ [35 kilomita] ma ọ bụ karị, na-aga n’ubi ndị dị n’akụkụ ụzọ. Onye na-akwọ ụgbọ ahụ aghaghị ịkpachara anya n’ihi na ebe snow kpụkọtara ọnụ pụrụ ime ka ụgbọ ala caboose ahụ dalaa otu akụkụ, na-eme ka ndị nọ n’ime ya nakwa icheku ọkụ ndị sitere n’ihe ahụ e ji akwanye ọkụ dapụtasịa.

Na 1947, a họpụtara m ka m lekọta distrikti mbụ e nwere ná mba ahụ, bụ́ nke jikọtara mba ahụ dum. Ọ fọdụrụ nke nta ka ọ bụrụ na m na-enwe mgbakọ sekit m na-elekọta kwa izu. E mere mgbakọ dị iche iche n’ama egwuregwu ndị e nwere maka ịgba ọsọ n’elu ice, ama egwuregwu bọọlụ, ama egwuregwu ndị e mebere maka ịgba ọsọ, ụlọ nzukọ nke òtù dị iche iche, na ụlọ nzukọ obodo. Ndokwa maka nzukọ ndị a chọrọ nlebara anya dị ukwuu tupu usoro ihe omume ahụ enwee ike ịmalite. Na 1950, a họpụtara Frank Franske dị ka onye nlekọta distrikti nke abụọ na Canada, mgbe ahụ, e mesịkwara tụkwasị mmadụ ise ndị ọzọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị.

N’afọ ndị ahụ, ejiriwo m ụgbọ elu ndị obere, ụgbọ e ji akụ ọkụ azụ, ụgbọ ndị e ji aga n’elu snow ndị nwere ụkwụ ígwè na ski (bụ́ ihe na-amị amị ndị e ji aga n’elu snow) ndị a na-akpọ bombardier, snowplane (ụgbọ ala ndị nwere ihe na-efegharị efegharị n’azụ ma nwee ski maka iji na-anyagharị ya) gaa njem, ejikwa m ụzọ ndị e jikarị eme ihe—ụgbọ okporo ígwè, bọs, na ụgbọ ala mee ihe. Mgbe ụfọdụ anyị nọ n’ụgbọ elu, anyị ga-elepụ anya hụ elu elu nke ugwu Rocky Mountain ndị ahụ dị ebube, mgbe ahụ anyị na-echedata ihu n’ime ndagwurugwu ndị dị omimi iji rute òtù ụmụnna ndị bi n’ebe dịpụrụ adịpụ,

Agagharịwo m akụkụ nile nke Canada ọtụtụ ugbo. Anọwo m n’ụlọ nta ndị e ji osisi wuo, ebe oyi dị nke ukwuu nke na anyị pụrụ ịhụ ikuku si n’imi anyị na-apụta n’ụtụtụ, nọọkwa n’ụlọ ubi ndị na-enweghị ihe ọgbara ọhụrụ ndị na-eme ka a tụsara ahụ. Ma n’ihe ndị a nile, enwere m afọ ojuju dị ukwuu, na-amata na m na-arụ ọrụ Jehova, na-agba ndị Jehova ume.

Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Ọzọ

Eri 33 afọ gara aga, enwewo m ihe ùgwù nke ịbụ onye òtù nke ezinụlọ Betel dị na Canada, tinyekwara ije ozi dị ka onyeọkà okwu ná mgbakọ dị iche iche n’England, Europe, Africa, Australia, New Zealand, na Ime Ime Ebe Owụwa Anyanwụ. N’Australia, ezutere m ada Nwanna James, bụ́ onye gbaworo m ume nke ukwuu n’India. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Nwanna James bụtụrụ onye ozi ala ọzọ, ma o bufeere ezinụlọ ya ihe nketa ime mmụọ mara nnọọ mma.

Taa, ọtụtụ narị nke ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ gbara m gburugburu na Betel dị na Canada. Uzọ ha si na-etinye ikike okoro na agbọghọ ha n’ozi Jehova na-agba ume ma na-akpali akpali. Anya m adịghị ahụchasị ụzọ nke ọma, ma ndị a ka na-eto eto na-agụrụ m ihe ọgụgụ. Ukwụ m esighịkwa ike, ma ha na-akpọrọ m jee ozi ubi. Ufọdụ na-ajụ otú m si anagide nsogbu ahụ ike ndị a na-enwe mgbe mmadụ na-aka nkà. Otú ọ dị otu ihe bụ na m na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. Nke a na-eme ka uche na obi m dịgide n’ihe ime mmụọ.

N’eziokwu, ọ bụrụwo ihe ùgwù dị ukwuu isoro Nna m nke eluigwe, bụ́ Jehova na-agakọ ije ma na-ekwukọ okwu eri 69 afọ nke ndụ a raara nye ya, bụ́ nke e tinyeworo 67 afọ n’ime ya n’ozi oge nile. Achọpụtawo m Jehova mgbe nile ịbụ Chineke na-ahụ n’anya nke dị ebere, na-agbaghara adịghị ike mmadụ ma na-enye ndị na-atụkwasị ya obi ike na ume. Olileanya m bụ ijigide nnọgidesi ike m n’ezi ihe na nguzosi ike m nye Jehova na ọgbakọ ya ruo ngwụsị, na-adabere ná nkwa ahụ bụ na mgbe oge ruru, a ga-ejikọ mụ na ezi Onyenwe m bụ́ Jisọs Kraịst, na ọtụtụ n’ime ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi n’ebube nke eluigwe.—Abụ Ọma 84:12.

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Snowplane gazuru mba ahu gburugburu n’ọ̀tọ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke ruru 50 maịlụ [80 kilomitá] kwa hour

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

N’oge oyi, a na-eji ugbo caboose ịnyịnya na-adọkpụ eme ihe n’ịgba àmà n’ókèala ndị ahụ jupụtara n’ahịhịa nke Canada

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya