Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/1 p. 16-17
  • Ì Ga-amụta Ihe Site n’Oge Dị Iche Iche?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Ga-amụta Ihe Site n’Oge Dị Iche Iche?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • B15 Kalenda Ndị Hibru
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Otu Afọ ‘n’Ezi Ala Ahụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/1 p. 16-17

Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ

Ì Ga-amụta Ihe Site n’Oge Dị Iche Iche?

JEHOVA kwurụ n’otu oge, si: ‘Ruo ụbọchị nile nke ụwa, ọghịgha mkpụrụ na owuwe ihe ụbi, ụdụ mmiri na ọkọchị agaghị ebi.’ (Jenesis 8:22) Otú a, o mere ka oge ọrụ ụbi ndị ahụ pụta ìhè.

Olee ihe ị maara banyere oge na njikọ dị n’etiti ha na ọrụ ụbi? Ọbụna ma a sị na i bi n’obodo ukwu ma ọ bụ na i bụghị onye ọrụ ubi, i kwesịrị ịmụ ihe banyere oge dị iche iche na ihe omume ọrụ ụbi dị iche iche nke ndị Israel. N’ihi gịnị? Rụo ókè i maara banyere ihe ndị a, otú ahụ ka ị ga-aghọta Okwu Chineke nke ọma karị.

Ndị ọrụ ubi na-akọ ihe, kụọ mkpụrụ, mgbe ahụkwa wee ihe ubi ma zọchaa mkpụrụ ha. Ma iji ghọta ihe Bible na-ekwụ n’ụzọ ka mma, anyị kwesịrị ịmata ihe dị ukwuu karị, na-agụnye mgbe ihe omume ndị ahụ na-ewere ọnodụ. Were ịkọri ala dị ka ihe atụ, dị ka anyị na-ahụ ka a na-eme ya n’elu, n’ala dị larịị n’ebe bụ Judia oge ochie.a Olee n’ọnwa i chere na e sere foto nke a? Ịmara oge e ji akọ ihe ná mba gị pụrụ iduhie gị. Oge e ji akọ ihe n’Akụkụ Ụwa Ebe Ugwu dị iche n’oge nke Akụkụ Ụwa Ebe Ndịda; ọ dịkwa iche n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu dị iche iche nakwa dị ka oge ụdu mmiri si dị.

Nke a pụrụ ịmetụta ụzọ i si ele ihe ndị mere eme dị na Bible anya. Ị pụrụ ịgụ banyere nhọpụta Elaịja họpụtara onye ga-anọchi anya ya, si: “Ọ . . . chọta Elaịsha nwa Shefat, ma onye ahụ na-eme ka ehi ya dọgharịa ihe e ji egwu ala ụbi.” (1 Ndị Eze 19:19) Olee n’ọnwa i chere na nke ahụ weere ọnọdụ, oleekwa otú ala ahụ gaara adị ka ya n’ile anya? Ọzọkwa, na Jọn 4:35, Jisọs kwụrụ, sị: “Unu onwe unu àsịghị, ọnwa anọ fọdụrụ, owuwe ihe ubi ewee bịa? . . . Welienụ anya unu elu, kirie ubi, na ha chara acha ugbụ a ka e were ihe dị n’ime ha.” Ọ bụ ezie na ọ kpọrọ otu oge aha kpọmkwem ị̀ ghọtara mgbe ọ bụ?

Chaatị ahụ na-enye ezi nkọwa dị mkpirikpi banyere oge dị iche iche na ihe omụme ọrụ ụbi n’Ala Nkwa ahụ. Ahịrị nke nọ n’elu elu n’ihe osise ahụ na-enye ọnwa ndị e nwere na kalenda dị nsọ nke ndị Jụụ.b N’iji nke a tụnyere ọnwa ndị anyị na-enwe, i na-arịba ama nkarị e nwere n’ọnụ ọgụgụ ụbọchị, dị ka Naịsan (ma ọ bụ, Ebib) ịgafe ngwụsị nke March ma rụo ná mmalite nke April. Akụkụ nke ọzọ dị n’ebe etiti na-egosi mgbe ihe ọkụkụ chara, bụ́ nke na-enyere gi aka ịmata mgbe ihe omume ụfọdụ nke ọrụ ụbi, dị ka iwe ihe ụbi na ịzọcha mkpụrụ ji ewere ọnọdụ. Etiti nke chaatị ahụ na-eme ka i nwee ike iji mgbanwe ndị a na-enwe n’afọ n’ọnọdụ ihu igwe tụnyere ibe ya.

Jiri chaatị ahụ mee ihe ime ka nghọta gị na ekele gị maka ihe ndekọ Bible, dị ka ihe atụ abụọ ndị a e kwụworo okwu ha n’elu, dịwanye omimi.

Elaịsha nọ na-ekere òkè n’otu nnukwute ọrụ ịkọ ihe mgbe a kpọrọ ya dị ka onye amụma. Nke ahụ na-eme ka oge ahụ yikarịa ka ọ bụ Tishri (September-October), bụ́ mgbe oké okpomọkụ nke oge okpomọkụ gafesịrị. Mmiri ozuzo ndị mbụ amalitewo ime ka ájá ditụ nro, na-eme ka o kwe mee ịkọ ihe, bụ nke ikụ mkpụrụ na-esochi.

Oleekwa mgbe Jisọs kwuru okwu ndị ahụ dị na Jọn 4:35? Owuwe ihe ubi ahụ ka dị ọnwa anọ n’ihụ. Rịba ama na oge owụwe ihe ubi nke ọka barley malitere na Naịsan (March-April), ihe dị ka n’oge Ememe Ngabiga. Gụrụ ọnwa anọ laa azụ. Nke ahụ ga-eme ka ị bịarute na Kislev (November-December). Mmiri ozuzo amalitewo ịdiwanye ukwuu, oké mmiri ozuzo na mgbe oyi ka dịkwa n’ihu. Ya mere Jisọs bu owuwe ihe ubi ihe atụ n’uche mgbe o kwuru, sị: “Welienụ anya unu elu, kirie ubi, na ha chara acha ugbụ a ka e were ihe dị n’ime ha.”

Ndị a na-esonụ bụ ajụjụ ndị ọzọ maka ọmụmụ ihe onwe onye gị ma ọ bụ maka iji mee ihe n’oge ọmụmụ ihe gị na ezinụlọ gị nke na-enye obi ụtọ:

▪ Oge owuwe ihe ubi flax na gburugburu Jeriko bụ n’ọnwa Ada; n’ihi nke a, olee otú ihe ndekọ dị na Joshua 2:6 na 3:15 si na-emesi izi ezi nke Bible ike?—Joshua 4:19; 5:11.

▪ Ịzọcha mkpụrụ na-esochi owuwe ihe ubi nke ọka, ya mere, olee otú nkwa ahụ e kwere na Levitikọs 26:5 si egosipụta ịba ụba n’inwe ọganihu?

▪ Olee otú 2 Samuel 21:10 si egosi na ọ ga-abụworị na Rizpa chere ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ́ ndị e kwere ka e gbuo iji wepụ ikpe ọimụma ọbara n’etiti ndị Chineke nche ogologo abalị nile?

▪ N’ihi gịnị ka e ji were égbè eluigwe na mmiri ndị ahụ e kwuru okwu ha na 1 Samuel 12:17 dị ka nzaghachi nke sitere n’ebe Chineke nọ?—Ilu 26:1.

▪ Olee ihe Rut nwere nke mere o ji kwubie na mmeso Boaz mesoro ya abụghị nanị mmeghachi omume nke bịara na mberede?—Rut 1:22; 2:23.

Gịnị mere na ị debeghị chaatị nke a nso mgbe ị na-agụ Bible?

KISLEV NAỊSAN

25 Ememe nke Nraranye 14 Ememe Ngabiga

15-21 Achịcha Ekoghị Eko

16 Onyinye nke mkpụrụ mbụ

IYYAR ADA

14 Ngwụsị nke Ememe Ngabiga 14, 15 Purim

(Ọnụ Ọgụgụ 9:10-13)

SIVAN TISHRI

6 Ememe nke Izu 1 Ịgụ opi

(Pentikọst) 10 Ụbọchi Mkpuchi Mmehie

15-21 Ememe Ụlọ Ntu

22 Nzukọ dị nsọ

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Leekwa 1990 Calendar of Jehovah’s Witnesses

b A na-atukwasị ọnwa ọzọ (Veadar) ugboro asaa n’ime usoro nke 19 afọ ọ bula.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 17]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NISAN (ABIB)

March-April

Ọka Barley

IYYAR (ZIV)

April-May

Ọka Wheat

SIVAN

May-June

Mkpụrụ Osisi Ndị mbụ Fig

TAMMUZ

June-July

Mkpụrụ Osisi Ndị mbụ nke Vine

AB

July-August

Mkpụrụ Osisi nke Oge Okpomọkụ

ELUL

August-September

Mkpụrụ Osisi “Date” Vine Fig

TISHRI (ETHANIM)

September-October

Ịkọ Ihe

HESHVAN (BUL)

October-November

Olive

CHISLEV

November-December

Ìgwè Atụrụ Ebe Ha Na-achọ Nri n’Oge Oyi

TEBETH

December-January

Ntolite nke Ihe Ọkụkụ

SHEBAT

January-February

Okooko Osisi Almond

ADAR

Osisi “Citrus”

VEADAR

March

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 17]

Garo Nalbandian

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya