Ị Pụrụ Ịchọta Akụ Dị Oké Ọnụ Ahia Karịa Ọlaedo!
A PỤRỤ iji eziokwu ndị dị na Bible tụnyere ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ akụ ndị ọzọ i zoro ezo. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọ dịbeghị mgbe i jere ịchọ ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo nkịtị, ma eleghị anya ị maara na ime nke ahụ chọrọ ịrụsi ọrụ ike na ịnọgidesi ike. Ọtụtụ mgbe, onye na-achọ ha adịghị enwetakwa ihe ọ tụrụ anya ya.
Otú ọ dị, ahụghị ihe a tụrụ anya ya dị otú ahụ adịghị abịa mgbe ị na-achọ akụ zoro ezo ndị dị na Bible. Rịba ama nkwa nke a na-agba ume: ‘Ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.’ (Ilu 2:4, 5) Ma, ị ghaghị ịchọ ya achọ.
‘Nyochaa, Leekwa’
‘Nyochaa n’akwụkwọ nsọ, leekwa na ọ dịghị onye amụma si na Galili bilie.’ Nke a bụ aro ụfọdụ ndị Farisii bụ ndị Juu tụụrụ Nikọdimọs, bụ́kwa onye Farisii. ‘Nyochaa, leekwa.’ Nke a bụ ezi ndụmọdụ n’ezie. O kwere omume inyocha ma chọta eziokwu—ihe dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu karịa ọlaedo.
Otú ọ dị, n’ọnọdụ nke ahụ, ndị nyere ndụmọdụ ahụ ka e ‘nyochaa ma leekwa’ emeghị ihe kwekọrọ na nke ahụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
Ndị isi nchụaja na ndị Farisii edupụwo ndị agha ije jide Jisọs Kraịst. N’ịbụ ndị ụzọ izi ihe ya tọrọ ụtọ nke ukwuu, ndị agha ahụ lọghachiri n’akpọghị ya. N’ihi nke a, ndị Farisii ahụ jụrụ ha, sị: ‘È duhiewokwa unu onwe unu?’ Nikọdimọs kwuru okwu, wee sị: ‘Iwu anyị [ọ̀] na-ekpe mmadụ ikpe, ọ bụrụ na o bughị ụzọ nụ n’ọnụ ya, wee mara ihe ọ na-eme?’ Ọ bụ okwu ndị a kpatara aro ahụ a tụụrụ ya ka o ‘nyochaa, leekwa.’—Jọn 7:32, 45-52.
Olee ụzọ ndị nchụaja na ndị Farisii ahụ siworo daa? Ha amataghị ma ọ bụ nakwere na ọ bụ ezie na a zụlitere Jisọs na Galili, na a mụrụ ya na Betlehem. Maịka onye amụma buru amụma, sị: ‘Ma gị onwe gị, [Betlehem] n’ime gị ka otu onye ga-esi pụtara m ịbụ onye na-achị achị n’Israel.’ (Maịka 5:2) Ya mere, ndị ndú ahụ emeghị nnyocha iji hụta ihe banyere Jisọs dị ka onye amụma, onye gaje ịghọ onye na-achị achị n’Israel. Nke a rụpụtara ajọ ihe, o mekwara ihe atụ nke otú o si dịrị oké mkpa ime nnyocha iji mata eziokwu dum banyere okwu ọ bụla. Ma olee otú a na-esikarị ele eziokwu anya?
A Gwagbuwo Eziokwu
Otu onye edemede nke biri na narị afọ nke 19 kwuru, sị, ‘A chọpụtawo na ọ dịghị mma ikesa ihe bụ eziokwu nke na-enweghị ntụpọ, dị ka ọlaedo nke na-enweghị ntụpọ, n’ihi na ụmụ mmadụ achọpụtawo na ọ dịịrị ha nnọọ mma karị ịgwagbu eziokwu ahụ karịa ime onwe ha ka ha dị ọcha.’ Lee nnọọ ka okwu ndị a ka si bụrụ eziokwu n’ihe banyere okpukpe nke ụwa! Onye nọ n’azụ wee na-akwado ngwagbu nke a nke eziokwu bụ ‘nna nke ụgha,’ Setan bụ Ekwensu. (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) Ọ na-eji okpukpe ụgha eme ihe iji gwagbuo ezi ozizi nile n’ajụjụ ndị dị oké mkpa dị ka ndị a: Ònye bụ Chineke? Gịnị bụ njikọ Jisọs nwere n’ebe ọ nọ? Gịnị bụ ọdịnihu nke ụwa na nke ihe a kpọrọ mmadụ?
Ndị nchụaja na ndị Farisii ahụ nwere ike ịchọworị eziokwu ma chọta ya. Ha gaara achọtaworị akụ nke dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu karịa ọlaedo. Ee, ha gaara amataworị eziokwu banyere Jisọs site ‘n’ịnụrụ okwu n’ọnụ ya wee mata ihe ọ na-eme,’ dị ka Nikọdimọs tụrụ aro. A sị na ha jiri obi eziokwu mee nke a, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs gaara akọwara ha ihe nile, dị ka ọ kọwaara ndị na-eso ụzọ ya. (Mak 4:34) Ma, olee ebe anyị pụrụ inweta eziokwu nke na-enweghị ntụpọ taa? N’ezie, è nwere ihe ọ bụla na-ekwe nkwa na anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịchọ ma nweta eziokwu dum?
[Foto dị na peeji nke 4]
Ndị ndú okpukpe gaara enwetaworị eziokwu dum banyere Jisọs site ‘n’ịnụrụ okwu n’ọnụ ya’