Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 16-20
  • Gọzie Aha Nsọ Jehova!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gọzie Aha Nsọ Jehova!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-ekwu Okwu Banyere Ọbụbụeze Jehova
  • Nkwado Jehova Anaghị Ada Ada
  • Jehova Na-echebe Ndị Hụrụ Ya n’Anya
  • Nọgide Na-agọzi Aha Nsọ Jehova
  • Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • A Pụghị Ịmatacha Ịdị Ukwuu Jehova Amatacha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Jeere Jehova Ozi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 16-20

Gọzie Aha Nsọ Jehova!

‘Otuto Jehova ka ọnụ m ga-ekwu; ka anụ ahụ nile gọziekwa aha nsọ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’—ABỤ ỌMA 145:21.

1, 2. (a) Olee ụzọ Setan siworo maa ịchịisi Chineke aka? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a na-ewelite banyere Abụ Ọma 145:11-21?

IHE ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Jehova bụ Ọkaaka Eluigwe na Ala. Ma Setan amawo ezi omume na izi ezi nke ọchịchị Chineke aka. (Jenesis 2:16, 17; 3:1-5) Ekwensu etinyewokwa ihe ịrụ ụka banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke nile n’eluigwe na n’ụwa. (Job 1:6-11; 2:1-5; Luk 22:31) Ya mere, Jehova enyewo oge ka ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi hụ ajọ mkpụrụ sitere ná nnupụisi megide ịchịisi ya nakwa iji gosipụta ebe ha guzo n’ihe iseokwu ndị a.

2 Abụ Ọma 145 na-enyere anyị aka iguzosi ike n’ịkwado ịchịisi Chineke. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Gịnị ka Devid kwuru banyere ọbụbụeze nke Jehova? Oleekwa otú Chineke si emeso ndị na-akwado ya ihe? Azịza ndị na-enye aka dị n’Abụ Ọma 145:11-21.

Na-ekwu Okwu Banyere Ọbụbụeze Jehova

3. Ọ bụrụ na ọbụbụeze Jehova dị anyị ezi mkpa, gịnị ka anyị ga-eme?

3 Ịchịisi Jehova bụụrụ Devid ihe oké nchegbu, bụ́ onye sịrị: ‘Nsọpụrụ nke [ọbụbụeze, NW] gị ka ha na-ekwupụta, ọ bu ịdị ike gị ka ha na-ekwu okwu banyere ya; ime ka ụmụ mmadụ mara ịdị ike ya nile, na nsọpụrụ nke ịma mma nke [ọbụbụeze, NW} ya.’ (Abụ Ọma 145:11, 12) Ụmụ mmadụ na-ekwu okwu banyere ihe ndị na-amasị ha. Ya mere, mmadụ na-ekwu okwu banyere ezinụlọ ya, ụlọ ya, ihe ọkụkụ ya. Jisọs sịrị, ‘Ezi mmadụ site n’ezi akụ nke obi ya na-ewepụta ezi ihe.’ (Luk 6:45) Ọ bụrụ na ịchịisi Chineke dị anyị ezi mkpa, anyị ga-ekpe ekpere ka Alaeze ya bịa, anyị ga-akọkwara ndị ọzọ banyere ikpe ziri ezi, udo, na ezi omume nke ga-adị n’okpuru ọchịchị ya. Anyị ga-eto Jehova dị ka ‘Eze nke

mgbe ebighị ebi,’ anyị ga-ekwukwa okwu banyere ngosipụta nke ịbụ ọkaaka ya site n’Alaeze Mesaịa ahụ nke dị n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 15:3, NW; Aịsaịa 9:6, 7) Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ ikwu okwu banyere ebube eluigwe nke ọbụbụeze Jehova, nke a gaje igosipụta n’isi nso n’ịma mma nke paradaịs elu ala nke jupụtara n’ihe okike ndị nwere obi ụtọ n’ụzọ zuru okè!—Luk 23:43.

4. Olee mgbe anyị nwere ohere ikwu okwu banyere ‘ịdị ike’ Jehova, oleekwa ụzọ e si akwado anyị n’ọrụ dị otú ahụ?

4 Obi ekele ga-akpalikwa anyị ikwu okwu banyere ‘ịdị ike’ Jehova. Ọ bụ ezie na ‘ọ dị ukwuu n’ike,’ ọ dịghị mgbe ọ na-eji ike ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Job 37:23) O jiri ike ya mee ihe n’ike ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-ejikwa ya mee ihe n’ibibi ndị na-emebi iwu. Anyị nwere ohere ikwu okwu banyere ịdị ike nke Chineke mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ. Ọ̀ bụ na anyị enweghịkwa obi ekele na Isi Iyi nke a kasị elu nke ike na-eme ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ nke a? (Aịsaịa 40:29-31) Ee, dị ka Ndịàmà Jehova, ike na mmụọ nke Chineke na-akwado anyị n’ije ozi dị nsọ. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú a ka a na-enwe ihe ịga nke ọma n’ikwusa ozi Alaeze ahụ gburugburu ụwa.—Abụ Ọma 28:7, 8; Zekaraịa 4:6.

5. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ìgwè mmadụ amataghị ihe banyere ‘ịdị ike nile’ nke Jehova, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

5 Ọ dị mkpa ka anyị mee ka ụmụ mmadụ mara ihe banyere ‘ịdị ike nile’ nke Jehova, ọbụna dị ka ụmụ Israel kọọrọ ụmụ ha banyere ụzọ Jehova si napụta ha site n’ịbụ ohu n’Ijipt. (Ọpụpụ 13:14-16) Ụmụ mmadụ na-ewu ihe ọkpụkpụ e ji echeta ndị e weere ihe ha mere dị ka ihe kwesịrị ịrịba ama, ma ọ̀ bụ mmadụ ole n’ime ha maara ihe banyere ọrụ dị iche iche dị ike nke Chineke? Dị ka otu onyeọkà mmụta si kwuo ya: ‘Ha na-edekwasị ọrụ nke ndị dike ha n’elu iberibe ígwè brass, ma a na-ede ọrụ dị iche iche dị ebube nke Jehova n’elu ájá nke na ngabiga nke oge na-asachapụ ha ná ncheta nke oge a.’ Ọ bụghị na a na-asachapụ ihe omume ndị ahụ n’ezie, ọ bụ ezie na ọtụtụ ìgwè mmadụ amataghị ihe banyere ha. Ya mere, n’ọrụ ụlọ n’ụlọ anyị, mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible, na n’oge ndị ọzọ, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu banyere ọrụ dị iche iche dị ike nke Chineke.

6. (a) N’oge ihe omume dị aṅaa n’ọtụtụ afọ gara aga ka e gosipụtara nke ọma mmụọ ịnụ ọkụ n’obi anyị na-eji eje ozi anyị? (b) Gịnị bụ isi ihe dị n’ihe e kwuru na 1922 banyere ịkpọsa Alaeze ahụ?

6 Anyị kwesịkwara iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ka a mara ebube nke ọbụbụeze Chineke. Ịnụ ọkụ n’obi maka ozi Alaeze dị otú ahụ pụtara ìhè mgbe, na 1922, J. F. Rutherford, onye bụ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, gwara ndị bịara mgbakọ okwu na Cedar Point, Ohio, wee sị: ‘Kemgbe 1914, Eze nke ebube ahụ ewerewo ike ọchịchị. . . Alaeze eluigwe dị nso; Eze ahụ na-achị achị; alaeze Setan na-adakpọ adakpọ; ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a agaghị anwụ anwụ ma ọlị. I kweere nke ahụ? . . . Ya mere, laghachinụ n’ubi, unu ụmụ nke Chineke ahụ onye kasị elu! Yikwasịnụ ihe agha unu! Nweenụ anya udo, mụrụnụ anya, na-arụsinụ ọrụ ike, nweenụ anya ike. Bụrụnụ ezi ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Onyenwe anyị. Gaanụ n’ihu n’agha ahụ ruo mgbe a kwatusịrị akụkụ nile nke Babilọn. Kpọsaanụ ozi ahụ n’ebe nile. Uwa aghaghị ịmata na Jehova bụ Chineke, na Jisọs Kraịst bụkwa Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ nke kachasị ndị nwenụ nile. Nke a bụ ụbọchị kachasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mgbasa ozi ya. Ya mere, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ, Eze ahụ na alaeze ya.’

7 Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ‘iche echiche n’aha Chineke,’ ịgwa ndị ọzọ banyere ịchịisi ya, na ịkpọsa Alaeze Mesaịa ahụ nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya! (Malakaị 3:16) Dị ka ndị mkpọsa na ndị na-akwado Alaeze ahụ, anyị ji ihe ùgwù anyị nke ịgbasa ozi ọma ahụ na nke ime ka obi mmadụ ndị ọzọ chigharịkwute Chineke, Kraịst, na Alaeze ahụ, kpọrọ ihe. N’ime anyị, e kwesịrị inwe agụụ na-ere ọkụ maka ịgwa ndị ọzọ banyere ịma mma dị ebube nke ọbụbụeze Jehova.—Tụlee Jeremaịa 20:9.

8. (a) Gịnị na-anọchite anya ịchịisi Jehova taa? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ ikwu na Chineke na-achị achị ‘n’ọgbọ nile’?

8 E kwesịrị ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu na-akpọsa Alaeze Chineke, n’ihi na Devid gara n’ihu ikwu, sị: ‘[Ọbụbụeze gi bụ ọbụbụeze, NW] ruo mgbe nile ebighị ebi, ọchịchị gị dịkwa n’ọgbọ nile.’ (Abụ Ọma 145:13) Ka ntụgharị uche nke onye ọbụ abụ ahụ banyere ọbụbụeze Jehova nọgidere na-aga n’ihu, ọ gbanwere okwu mkpọaha o ji eme ihe site na ‘ya’ gaa na ‘gị,’ na-agwa Chineke okwu ekpere ya kpọmkwem. N’eziokwu, ịchịisi Jehova, dị ka e mere ihe nnọchianya ya n’Alaeze Mesaịa ahụ adịghị anọchi ọnọdụ ọbụbụeze ebighị ebi nke Chineke. N’ikwu eziokwu, mgbe e wetaworo ụmụ mmadụ na-erube isi bịa n’izu okè, Kraịst ga-etinyeghachi Alaeze ahụ n’aka Nna ya. (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Ya mere, Chineke na-achị achị ‘n’ọgbọ nile,’ Jehova bụ Eze mgbe e kere Adam, ọ ga-achịkwa achị n’isi ụmụ mmadụ ndị ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.

9. N’Abụ Ọma 145, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere otu amaokwu nke ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru ahụ bụ nun malite?

9 N’abụ ọma nke a nke a haziri n’usoro mkpụrụ akwụkwọ, ihe odide ndị Masorete ahụ mafere otu amaokwu nke ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru ahụ bụ nun wee malite. Ma, dị ka nsụgharị Septuagint nke Grik, Peshitta nke Syriac, na Vulgate nke Latin, si dị, otu ihe odide ochie nke Hibru na-agụ, sị: ‘Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’okwu ya nile, ọ na-ejikwa ịhụnanya na-eme ebere [ma ọ bụ ‘na-eguzosi ike n’ihe’] n’ọrụ ya nile.’ (New World Translation of the Holy Scriptures—With References, nkọwa ala ala peji) Chineke na-emezu nkwa ya nile, ọ na-eguzosikwa ike n’ihe, na-ahụ n’anya, na-emekwa ebere nye ndị nile nwere ekele maka ịdị mma ya.—Joshua 23:14.

Nkwado Jehova Anaghị Ada Ada

10. Olee ụzọ Chineke si ‘enye anyị nkwado’?

10 Eze Mgbe Ebighị Ebi ahụ anaghị elefuru ọnọdụ ndị ohu ya anya mgbe ọ bụla. Otú a, Devid nwere ike ikwu, sị: ‘Jehova na-akwagide ndị nile na-ada ada, ọ na-ekulikwa ndị nile na-ehuda n’ala.’ (Abụ Ọma 145:14) Eri oge Ebel, Jehova akwadowo ndị na-efe Ya ofufe. Ọ bụrụ na a hapụ anyị n’onwe anyị, anyị ga-ada ọtụtụ mgbe n’okpuru ibu arọ anyị. Anyị enweghị ike zuru ezu iji nagide ahụhụ nile nke ndụ na mkpagbu ndị na-abịakwasị anyị dị ka ndị Chineke, ma Jehova na-akwado anyị. Ụdị okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a na-egosi na Chineke nọgidere ‘na-enye anyị nkwado.’ A pụrụ ịrịba ama na Jọn Onye Na-eme Baptism na Ọkpara Chineke n’onwe ya nyere aka iwelite ndị mmehie dara ada n’ụzọ omume. Mgbe ndị dị otú a chegharịrị wee ghọọ ndị ohu Jehova, ha nwetara ngọzi dị ebube nke nkwado Chineke.—Matiu 21:28-32; Mak 2:15-17.

11. Olee ụzọ Jehova na-esi ‘ekulite ndị nile na-ehuda ala’?

11 Ọ bụ ihe nkasi obi ịmata na ‘Jehova na-ekulite ndị nile na-ehuda ala’ n’ihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche. Ọ na-eme ka ndị nọ ná mwute n’etiti anyị nwee ihu ọchị, na-akasi ndị na-eru újú n’etiti anyị obi, na-enyekwara anyị aka iji anya ike na-ekwuwa okwu ya mgbe a na-akpagbu anyị. (Ọrụ 4:29-31) Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ na-ekwe ka ibu arọ anyị nyịgbuo anyị ma ọ bụrụ na anyị anakwere enyemaka ya. (Abụ Ọma 55:22) Ya mere, dị ka ‘nwa [nwanyị] Abraham,’ onye ‘hudara ala,’ ma Jisọs emee ka ahụ dị ya mma, anyị kwesịrị ‘inye Chineke otuto’ mgbe o ji ịhụnanya kulie anyị elu n’ụzọ ime mmụọ. (Luk 13:10-17) Ndị e tere mmanụ, ndị hudara ala n’ịbụ ohu nke Babilọn nwere obi ekele mgbe Chineke kuliri ha elu na 1919, ọ nọwokwa na-ekuli ndị nwere ekele n’etiti ‘atụrụ ọzọ’ ahụ kemgbe 1935.—Jọn 10:16.

12. Olee otú o si bụrụ na ‘anya ihe nile na-ele anya’ Chineke?

12 Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jehova na-ada ada n’inye ndị ya ihe dị ha mkpa, dị ka Devid gara n’ihu ime ka ọ pụta ìhè site n’ikwu, sị: ‘Anya ihe nile na-ele anya gị; gị onwe gị na-enyekwa ha ihe oriri ha na mgbe ya. Ị na-asaghe aka gị, ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bula dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’ (Abụ Ọma 145:15, 16) Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na anya nke ihe nile e kere eke dị ndụ ji olileanya chigharịkwuru Ọkaaka Eluigwe na Ala ahụ. Ndị mmụọ ozi na-elegara Chineke anya maka ịnọgide na-adị ndụ. Dị ka nwata na-elegara nne ma ọ bụ nna ya anya maka ihe ndị dị ya mkpa, otú ahụ ka anyị na-elegara Nna anyị nke eluigwe anya. N’eziokwu, ọ bụ n’aka ya ka ma ụmụ mmadụ ma anụmanụ si enweta ihe ha ji akwado ndụ ha. Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ pụrụ igbo mkpa ha nile. Chineke ‘na-enye ha nri ha na mgbe ya,’ ya bụ, mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.

13. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova na-esi ‘asaghe aka ya wee were ihe na-atọ ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ jụ ya’?

13 Chineke ‘na-asaghe aka ya wee were ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’ (Abụ Ọma 104:10-28) N’eziokwu anụmanụ ụfọdụ na-anwụ n’ihi enweghị ihe oriri. Ọtụtụ ụmụ mmadụ nọ n’agụụ dị ka ndị a na-emekpọ ọnụ site n’ịchọ ọdịmma onwe onye, mmegbu, na iji ihe ndị e nwere eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọzọkwa, Jisọs buru amụma na ‘oké ụnwụ’ ga-abụ otu akụkụ nke ‘ihe ịrịba ama’ nke ọnụnọ ya n’ime mgbe ikpeazụ ndị a. (Matiu 24:3, 7) Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nke na-eme n’ihi na Jehova nwere aka ntagide ma ọ bụ na o nweghị ike inye ihe dị mkpa. Cheedị echiche banyere ọtụtụ puku nde ihe okike ndị ọ na-akwado! Ọzọkwa, abụ ọma nke a na-emesi anyị obi ike na n’okpuru ọchịchị Alaeze, mgbe ‘mmadụ na-agaghị enwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya,’ Chineke ga-emezu mkpa anyị nile nke anụ ahụ na nke ime mmụọ. (Eklisiastis 8:9; Aịsaịa 25:6) Ọbụna taa, ọ dịghị mkpa ka anyị nọrọ n’agụụ nke ihe ime mmụọ, n’ihi na Chineke na-enye ya n’ụba na mgbe ya site n’aka ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.’ (Matiu 24:45-47; 1 Pita 2:2) N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, Ndịàmà Jehova bụ ndị kasị na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ n’ụwa dum. Ị̀ na-egosi obi ekele dị omimi maka ụba ihe oriri dị otú ahụ?

Jehova Na-echebe Ndị Hụrụ Ya n’Anya

14. N’ihi gịnị ka Devid ji nwee ike ịsị na ‘onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ ya nile’?

14 Uche gbagọrọ agbagọ nke anyị pụrụ ‘ikpu ụzọ anyị ihu’ wee wetara anyị ihe isi ike, ma anyị ekwesịghị ịta Chineke ụta mgbe ọ bụla maka ihe isi ike ndị a. (Ilu 19:3) Devid gosiri ihe mere o ji dị otú a mgbe ọ sịrị: ‘Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ ya nile, o [na-eguzosikwa ike, NW] n’ọrụ ya nile.’ (Abụ Ọma 145:17) Chineke na-eme ihe mgbe nile n’ụzọ dị mma, nke ikpe ziri ezi nakwa nke obi ebere. Obi ebere ya pụtara ìhè karịsịa ná ndokwa o mere maka nzọpụta site n’àjà mgbapụta Jisọs. (Ọrụ 2:21; 4:8-12) Jehova ‘na-eguzosikwa ike n’ọrụ ya nile,’ na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile, na-ahụ n’anya, n’eleghịkwa mmadụ anya n’ihu. Ya mere, dị ka ‘ndị na-eṅomi Chineke,’ ka anyị na-eme ihe n’ụzọ dị mma, n’ikpe ziri ezi, n’obi ebere, n’eleghị mmadụ anya n’ihu, nakwa n’iguzosi ike.—Ndị Efesọs 5:1, 2; Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 7:10; 25:8; Aịsaịa 49:7; Ọrụ 10:34, 35.

15. Olee ụzọ anyị siworo ‘kpọkuo Chineke n’eziokwu,’ gịnị siwokwara n’anyị ime otú ahụ pụta?

15 Ebe Chineke bụ onye ezi omume na onye na-eguzosi ike n’ihe, a na-adọrọ anyị bịa n’ebe ọ nọ. Karịsịa, Devid mesiri anyị obi ike, sị: ‘Jehova dị nso ndị nile na-akpọku ya, bụ́ ndị nile na-akpọku ya n’eziokwu.’ (Abụ Ọma 145:18) N’ịbụ ndị e mere baptism dị ka ndị kwere ekwe raara onwe ha nye, anyị kpọkuru aha Jehova. (Ọrụ 8:12; 18:8; Ndị Rom 10:10-15) Ebe anyị si otú a bịaruo Chineke nso, ọ na-abịarukwa anyị nso. (Jemes 4:8) Anyị ‘na-akpọku ya n’eziokwu’ n’ihi na anyị na-eme otú ahụ n’ụzọ ziri ezi, site na Jisọs Kraịst. Jehova ga-anọgidekwa na-adị anyị nso ma ọ bụrụ na anyị na-efe ya ofufe ‘n’ime mmụọ na eziokwu,’ na-egosipụta ‘okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya,’ ‘nọgidesiekwa ike dị ka ànyị na-ahụ Onye ahụ nke a na-apụghị ịhụ ya anya.’ (Jọn 4:23, 24; 1 Timoti 1:5; Ndị Hibru 11:27) Mgbe ahụ, ekpere anyị agaghị abụ n’efu, anyị agaghị echekwa ụwa Setan ihu nanị anyị, kama anyị ga-anọgide na-enweta enyemaka na nduzi nke Chineke. (Abụ Ọma 65:2; 1 Jọn 5:19) Lee nnọọ ụdị nchebe nke ahụ pụtara!

16. N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘eme ihe na-atọ ndị na-atụ egwu ya ụtọ’?

16 Anyị nwekwara ezi ịnọ ná nchebe n’ihi ihe ndị ọzọ Jehova na-emere anyị. Devid sịrị: ‘Ihe dị ndị na-atụ egwu ya uto ka ọ ga-eme; ọ bukwa ntiku ha ka ọ ga-anu, wee zọpụta ha.’ (Abụ Ọma 145:19) Jehova ‘na-eme ihe na-atọ anyị ụtọ’ n’ihi na anyị nwere nsọpụrụ dị omimi maka Chineke nakwa egwu ziri ezi nke imejọ ya. (Ilu 1:7) Obi anyị nke na-erube isi akpaliwo anyị ịrara onwe anyị nye Jehova, àgwà anyị bụkwa, ‘Ka e mee ihe ị na-achọ.’ Ebe ọ bụ ihe ọ na-achọ ka anyị kpọsaa ozi Alaeze ahụ, ọ na-emezu ọchịchọ anyị ịrụ ọrụ ahụ. (Matiu 6:10; Mak 13:10) Chineke ‘na-eme ihe na-atọ anyị ụtọ’ n’ihi na anyị adịghị ekpe ekpere maka ọchịchọ onwe onye, kama anyị na-arịọ ihe ndị kwekọrọ n’uche ya. Ọ na-eme ka anyị nweta ihe kwekọrọ n’uche ya, ihe ga-abụkwa maka ọdịmma anyị.—1 Jọn 3:21, 22; 5:14, 15; tụlee Matiu 26:36-44.

17. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-anụ ‘ntiku’ anyị na-etiku ya?

17 Dị ka Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe, anyị pụkwara ijide n’aka na a ga-anụ ‘ntiku’ anyị mgbe nile. Chineke napụtara Devid site n’ọdachi, zọpụtakwa Jisọs, ọbụna na-akpọlite ya site n’ọnwụ. Mgbe ndị iro wakwasịrị anyị, karịsịa n’oge mbuso agha Gọg, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-anapụta anyị. (Ezikiel 38: 1-39:16) N’eziokwu, n’oge nsogbu ọ bụla, dị ka Devid, anyị pụrụ iji obi ike kpee ekpere, sị: ‘Meere m amara, Jehova, n’ihi na anọ m ná mkpagbu:. . . N’ihi na anụwo m akụkọ ọjọọ nke ọtụtụ mmadụ, ụjọ dị m gburugburu: mgbe ha na-agba izu n’otu imegide m, ha zubere iwepụ ndụ m. Ma mụ onwe m, ọ bụ gị ka m tụkwasịworo obi, Jehova: asịwo m, Chineke m ka ị bụ.’—Abụ Ọma 31:9-14.

18. Olee ụzọ anyị si erite uru n’ịmata na Jehova ‘na-echebe ndị nile na-ahụ ya n’anya,’ na ọ ‘ga-ekpochapụkwa ndị na-emebi iwu’?

18 Jehova Chineke dị njikere inyere anyị aka mgbe nile. Dị ka Devid sịrị: ‘Jehovah na-edebe ndị nile na-ahụ ya n’anya; ma ndị nile na-emebi iwu ka ọ ga-ekpochapu.’ (Abụ Ọma 145:20) Ee, ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, ọ ga-agọzi anyị, debekwa anyị. (Ọnụ Ọgụgụ 6:24-26) Ọ ‘na-akwụghachi onye na-eme omume mpako ụgwọ gabiga ókè’ ma na-echebe ndị ohu ya dị umeala n’obi, ọ naghị ekwe ka ihe ọ bụla mee, bụ́ nke ga-ewetara ha mmerụahụ na-adịgide adịgide. Ebe ọ bụ na Jehova nọnyeere anyị, ka anyị nwee obi ike. (Abụ Ọma 31:20-24; Ọrụ 11: 19-21) ‘Ọ dịghị ihe agha ọ bụla e doro imegide anyị nke ga-aga nke ọma.’ (Aịsaịa 54:17; Abụ Ọma 9:17; 11:4-7) Nke ahụ bụ ahụmahụ nke ndị ahụ na-anwapụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ dị ka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, ndị raara onwe ha nye ya. Dị ka otu òtù, Ndịàmà Jehova ga-agabiga ‘oké mkpagbu’ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ajọ mmadụ. (Mkpughe 7:14) Leekwa nnọọ aha ngọzi idozi nnukwute ihe iseokwu ahụ nke ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova ga-abụrụ ‘ndị nile na-ahụ ya n’anya’!

Nọgide Na-agọzi Aha Nsọ Jehova

19. N’ihi gịnị ka ọnụ anyị na-eji ekwupụta ‘otuto Jehova’?

19 Devid mechiri abụ ọma nke a na-akpali akpali site n’ịsị: ‘Otuto Jehova ka ọnụ m ga-ekwu; ka anụ ahụ nile gọziekwa aha nsọ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 145:21) Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nwere ekele maka ịdị ukwuu nke Chineke, ịdị mma ya, ọbụbụeze obi ebere ya, nkwado ya nke na-adịghị ada ada, na nlekọta ịhụnanya ya nke ike na-adịghị agwụ. Ya mere, dị ka Devid, ọnụ anyị na-ekwupụta otuto nke Chineke. A na-akpali anyị inye ya ofufe nke a na-ekewaghị ekewa, na-enye ya ekele maka ọtụtụ ngọzi ya, na-etokwa ‘aha ya mara mma.’—1 Ihe Emere 29:10-13; Ọpụpụ 20: 4-6.

20. N’iburu mgbe ebighị ebi n’uche, gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị ugbu a?

20 Ebe ọ bụ na Jehova na-agọzi anyị kwa ụbọchị, ka anyị na-agọzikwa, ma ọ bụ na-ekwu okwu ọma banyere ya mgbe nile. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ iji too Chineke, na-agwa ndị ọzọ na n’oge na-adịghị anya, ‘anụ ahụ nile ga-agọzi aha nsọ ya.’ Lee nnọọ ka ọ ga-esi dị mma ibi mgbe ndị nile bi n’elu ala—n’ezie, ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi n’eluigwe na ala—ga na-abụku Nna anyị nke eluigwe abụ otuto! (Abụ Ọma 148:1-13) Ngọzi dịrị Jehova maka ikpughe aha ya na inye anyị ihe ùgwù nke ịbụ Ndịàmà ya. (Abụ Ọma 83:18; Aịsaịa 43:10-12) Ka anyị dozie onwe anyị n’ụzọ kwesịịrị ndị na-eji aha ahụ dị ka ihe dị nsọ, na-ekpekwa ekpere maka ido ya nsọ. (Luk 11:2) Ka anyị guzosie ike n’ijere Chineke ozi, ka ọ ga-abụ n’ime usoro ihe ọhụrụ ya, a ga-anụ olu anyị n’òtù abụ nke ndị ahụ na-agọzi aha nsọ Jehova ruo mgbe ebighị ebi.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ‘ọbụbụeze Jehova dị anyị mkpa n’obi?

◻ Gịnị na-anọchite anya ọbụbụeze Chineke taa?

◻ Olee ụzọ Jehova si ‘ekulite ndị nile na-ehuda ala’?

◻ N’ụzo dịgasị aṅaa ka Chineke si ‘asaghe aka ya wee were ihe na-atọ ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya’?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi gọzie aha nsọ Jehova?

7. Mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ọrụ anyị dị ka ndị mkpọsa Alaeze?

[Foto dị na peeji nke 17]

Na 1922 okwu ahụ bụ ‘kpọsaanụ Eze na Alaeze ahụ’ kpaliri ndị na-akwado ọbụbụeze Jehova ịrụsikwu ọrụ ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya