N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Jeere Jehova Ozi?
“ỤBỌCHỊ Jehova dị nso! ‘Mkpagbu ukwu’ ahụ dị nso, ị gaghị alanarịkwa ya ma ọ bụrụ na i jeghịrị Chineke ozi.” Ọ bụrụ na mmadụ gwara gị nke ahụ, olee otú ị ga-esi meghachi omume?—Zefanaịa 2:2, 3; Matiu 24:21.
N’eziokwu, anyị kwesịrị iburu ụbọchị Jehova n’uche, nlanarị gabiga mkpagbu ukwu ahụ nke dị nso na-adaberekwa n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi. Ma eziokwu ndị a hà kwesịrị ịbụ isi ihe ndị mere anyị ji ejere Jehova Chineke ozi dị nsọ? N’ihi gịnị ka i ji ejere Jehova ozi?
Mkpa Ọ Dị Inwe Ebumnuche Ziri Ezi
Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ejere Chineke ozi site n’ebumnuche ziri ezi, ọ pụrụ ịkwụsị ma ọ bụrụ na ihe ndị ọ tụrụ anya ha emezughị n’ime oge ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị tụrụ anya ka Jisọs Kraịst lọghachi na 1843 ma ọ bụ 1844, bụ́ ụbọchị ndị gafere n’ewetaghị mmezu nke olileanya ha. Ihe na-akpali mmasị n’akụkụ nke a bụ ihe George Storrs dere, bụ́ onye bipụtara akwụkwọ bụ́ Bible Examiner na onye mesịrị mata Charles Taze Russell, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society. N’akwụkwọ bụ́ Bible Examiner nke September 1846, Storrs dere, sị:
“Ibu ọrụ nke ijere Chineke ozi dabeere n’ihe karịrị nanị eziokwu ahụ nke bụ na ụbọchị ahụ agwụwo agwụ. . . . Mmeghachi omume nke ga-ewere ọnọdụ ma ọ bụrụ na afọ 1846 na 1847 agabiga dị ka ha pụrụ, n’ewetaghị ọbịbịa nke abụọ, ga-abụ ndakpọ olileanya na-enweghị atụ. Ahụmahụ egosiwo na nke a bụ eziokwu—ihe m na-ekwu bụ ahụmahụ nke 1843 na 1844. Olee ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ahụ nọ ugbu a bụ́ ndị, dị ka ha kwuru, a ‘kpaliri ijere Chineke ozi’ dị ka ha kwesịrị site ná mkpu a na-eti maka oge ọbịbịa nke Onyenwe anyị? M na-ajụghachikwa—OLEE EBE!!! Ihe na-eruchaghị otu onye n’ime iri n’etiti ha ka nọgidere na-ejegharị iji wee sọpụrụ ọbụbụ ha bụ ndị Kraịst. Gịnị mere ọ dịghị otú ahụ? A kpaliri ha site n’ebumnuche na-ezighị ezi. Ọchịchọ ọdịmma ha bụ isi ihe nke a kpaliri ma kwalie. Ha dị nnọọ ka onye mmehie ahụ nke chere na oge ọnwụ ya eruwo n’elu àkwà ọrịa ma ọ bụ n’ebili mmiri nke osimiri. Ọ bụrụ na ọ ghaghị ịnwụ, ọ gaje ịghọ onye Kraịst. Ọ bụrụ na ọ maara na o siwo n’ihe ize ndụ pụta, ọ gaghị enwekwa mmasị ọzọ ma ọlị.”
Ije Ozi Site n’Inwe Ebumnuche Ziri Ezi
Ọchịchọ ọdịmma onwe onye na egwu nke mbibi pụrụ ịkpali ụfọdụ ime uche Jehova nanị iji mezuo iwu. Ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị a kpaliri site n’olileanya nke ndụ n’ime Paradaịs nke na ha ga-ejere Chineke ozi nanị n’ihi ihe ahụ. Ma, ọ bụrụ na ndị a kpaliri n’ụzọ bụ isi site n’ebumnuche ndị dị otú ahụ echee na ụbọchị Jehova na mkpagbu ukwu ahụ adịghị oké nso, ha pụrụ ịbụ ndị na-enweghị ọchịchọ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi.
Otú ọ dị, ọ bụghị ịchọ ọdịmma onwe onye inwe ọṅụ ná nkwa nile nke Chineke na ngọzi ndị e buru n’amụma. Ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ banyere olileanya nile e setịpụrụ n’ihu anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. “N’akụkụ olileanya unu, na-aṅụrịnụ ọṅụ,” ka Pọl onyeozi sịrị, na-ekwukwa, sị: “N’akụkụ mkpagbu unu, na-enwenụ ntachi obi; n’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike.” (Ndị Rom 12:12) Tinyere ekpere, “ọṅụ Jehova” na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa dị iche iche ma jiri ndidi na-echere mmezu nke nkwa nile Chineke kwere. (Nehemaịa 8:10) Ka ọ dị ugbu a, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jeere Jehova ozi. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a?
Ọrụ na Ihe Ùgwù
Dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala, Jehova ruru eru inweta ma na-achọ ofufe a na-akpaghịrị ókè. (Ọpụpụ 20:4, 5) Ya mere onye Kraịst ọ bụla nwere otu ụdị ọ̀tụ̀tụ̀ nke ibu ọrụ n’ebe Chineke nọ ma mkpagbu ukwu ahụ ọ̀ na-amalite echi, afọ na-abịanụ, ma ọ bụ ma e mesịa. O nwere ibu ọrụ nke ijere Jehova ozi n’achọghị ọdịmma onwe ya n’ihi ịhụ Chineke n’anya site n’obi, mkpụrụ obi, uche na ike ya dum. (Mak 12:30) Ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ chere na ụbọchị Jehova dị nso, ma ihe ha tụrụ anya ya emezughị, ha nwụkwara n’ahụghị ihe omume ahụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-5; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-5) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ndị ahụ na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ mesịrị nata nkwụghachi ụgwọ nke mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe.—Mkpughe 2:10.
Ndịàmà nke Jehova e mere baptism kwesịrị ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihi na ha ejiwo ọchịchọ obi ha nakwere ibu ọrụ nke ime uche ya. Cheedị nnọọ echiche! Dị ka ndị mmụọ ozi dị nsọ, anyị pụrụ ime uche nke Ọkaaka Eluigwe na Ala. (Abụ Ọma 103:20, 21) Jisọs ji ihe ùgwù dị otú ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu nke na o kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ, ka m rụzuokwa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Ọ bụrụ na anyị nwere otu mmụọ ahụ, anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa otuto nile nke Jehova ma na-agwa ndị ọzọ banyere nzube ya nile, dị ka e kpughere n’Akwụkwọ Nsọ. N’ụzọ dị otú a, anyị nwekwara ihe ùgwù nke inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. N’eziekwa, ime uche Chineke site n’ịhụnanya anyị nwere maka ya bụ ihe ùgwù dị ebube, n’agbanyeghị mgbe ụbọchị Jehova ga-amalite.
Obi Ekele Na-enye Mkpali
Obi ekele maka ịhụnanya Chineke n’inye àjà mgbapụta nke Ọkpara ya kwesịkwara ịkpali anyị ijere Jehova ozi. N’otu oge anyị bụ ndị e kewapụrụ n’ebe Jehova Chineke nọ n’ihi mmehie. Otú ọ dị, Jisọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Jehova butere ụzọ n’akụkụ nke a, dị ka Pọl dere: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Obi ekele maka ngosipụta nke a nke ịhụnanya Chineke kwesịrị ịkpali anyị ijere ya ozi site n’obi anyị nile.
Ekele maka ndokwa ime mmụọ na nke anụ ahụ Jehova mere na-enyekwu anyị ihe mere anyị ga-eji jeere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Okwu Chineke bụ ihe nduzi n’ezie—ìhè nye okporo ụzọ anyị. Akwụkwọ ndị a na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enyere anyị aka ime ka ndụ anyị kwekọọ n’uche Chineke. (Matiu 24:45-47; Abụ Ọma 119:105) N’ihi na anyị na-ebukwa ụzọ achọ Alaeze ahụ, Jehova na-enyekwa anyị ihe n’ụzọ anụ ahụ. (Matiu 6:25-34) Ị̀ na-egosi obi ekele i nwere maka ihe ndị a?
Obi ekele maka nnwere onwe Chineke nyeworo pụọ n’okpukpe ụgha na-ewepụta ihe ọzọ mere a ga-eji jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Nwanyị akwụna okpukpe ahụ bụ́ Babilọn Ukwu ahụ “na-anọkwasị n’ọtụtụ mmiri,” nke pụtara “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche.” (Mkpughe 17:1, 15) Ma, ọ dịghị anọkwasị n’elu ndị ohu Jehova, na-emetụta ma na-achịkwa ha n’ụzọ okpukpe. Dị ka ihe atụ, ha na-ajụ ozizi okpukpe ụgha ahụ nke bụ na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. Ha maara na e kere mmadụ dị ka “mkpụrụ obi dị ndụ,” na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” na a ga-enwekwa mbilite n’ọnwụ. (Jenesis 2:7; Eklisiastis 9:5, 10; Ọrụ 24:15) Ya mere ha adịghị atụ egwu ma ọ bụ na-efe ndị nwụrụ anwụ ofufe. Obi ekele maka nnwere onwe ime mmụọ dị otú ahụ ọ̀ na-eme ka i guzogide isi n’ezi ofufe dapụ ma rapara n’ofufe dị ọcha nke Jehova?—Jọn 8:32.
Ekele maka nkwado Jehova na-enye kwa ụbọchị kwesịrị ịmụba mkpebi anyị ịnọgidesi ike na-ejere ya ozi. Onye ọbụ abụ bụ́ Devid kwupụtara, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka ọ na-eburu anyị ibu.” (Abụ Ọma 68:19) N’ebe ọzọ onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Ee, onye ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi pụrụ ịtụkwasị ibu arọ ihe atụ ya, dị ka nchegbu na ọnwụnwa, n’ebe Chineke nọ. Ị̀ na-egosi ekele maka nkwado Jehova na-adịghị ada ada site n’ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi?—Abụ Ọma 145:14.
Bulie Jehova na Ọbụbụeze Ya Elu
Ọchịchọ nke inye Jehova otuto kwesịrị ịkpalikwa anyị ijere ya ozi. A na-egosipụta ihe ndị e kere eke dị n’eluigwe dị ka ihe ndị na-enye Chineke otuto site n’okwu ahụ bụ: “Gị Onyenwe anyị na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:11) Eze Devid buliri Chineke elu site n’ịsị: “Jehova, gị nwe ịdị ukwu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube . . . Jehova, gị nwe alaeze . . . Ma akụ̀ ma nsọpụrụ na-esite n’ebe ị nọ bịa, gị onwe gị na-achịkwa ihe nile . . . Chineke anyị, anyị onwe anyị na-ekele gị, na-etokwa aha gị mara mma.” (1 Ihe Emere 29:10-13) Dị ka ndị ohu Jehova, ànyị ga-eme ihe dị ala karị n’inye ya otuto n’okwu ọnụ na n’omume ka anyị na-echere mmezu nke nkwa ya nile?—1 Ndị Kọrint 10:31.
Mkpali siri ike ikwu banyere Alaeze Chineke na-enye nkwali ọzọ iji jeere Jehova ozi. E kwupụtara ezi ebumnuche ahụ nke ọma n’okwu onye ọbụ abụ bụ́: “Ọrụ gị nile na-ekele gị, Jehova; ndị ebere gị na-agọzikwa gị. Nsọpụrụ nke alaeze gị ka ha na-ekwupụta, ọ bụ ịdị ike gị ka ha na-ekwu okwu banyere ya; ime ka ụmụ mmadụ mara ịdị ike ya nile, na nsọpụrụ nke ịma mma nke alaeze ya. Alaeze gị bụ alaeze ruo mgbe nile ebighị ebi, ọchịchị gị dịkwa n’ọgbọ nile.” (Abụ Ọma 145:10-13) Ịkpọsa ozi Alaeze bụ ọrụ dịịrị onye Kraịst, bụrụkwa ọrụ kasị dị mkpa a na-arụ n’oge anyị a. (Matiu 24:14; 28:19, 10) Ì nwere ọchịchọ na-anụ ọkụ inye Jehova otuto na ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze ya?
Ido aha Jehova nsọ na iwepụ ọkaaka ya n’ụta kwesịrị ịbụ ihe dị oké mkpa nye anyị nke na anyị ga-achọ ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Anyị pụrụ ikpe ekpere maka ido aha Jehova nso na maka iwepụ ọkaaka ya n’ụta. (Matiu 6:9) Anyị pụrụ ime ihe kwekọrọ n’ekpere anyị site n’ikere òkè n’ozi ndị Kraịst n’ụzọ chiri anya na site n’ịgbasa eziokwu banyere ihe ndị dị otú ahụ dị oké mkpa.—Ezikiel 36:23; 39:7.
Ọṅụ na Afọ Ojuju
Site n’ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, anyị na-enwe afọ ojuju nke ime ka obi ya ṅụrịa na ịnwapụta Ekwensu dị ka onye ụgha. Ọ bụ ezie na Setan na-azọrọ na ndị mmadụ na-ejere Chineke ozi n’ihi ọchịchọ ọdịmma onwe onye, ozi anyị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-ejere Jehova site n’ịhụnanya, na-anwapụta nzọrọ nke onye ụta ahụ dị ka okwu ụgha. (Job 1:8-12) Nke a na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji nọgide na-eme ihe e kwuru n’Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Ọzọkwa, mgbe anyị na-anọgidesi ike n’ijere Jehova ozi n’agbanyeghị ihe nile Setan na-eme iji gbochie anyị, omume iguzosi ike n’ezi ihe anyị pụkwara ịgba ndị kwere ekwe ibe anyị ume.—Ndị Filipaị 1:12-14.
Ọṅụ na afọ ojuju nke ikere òkè n’owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ kwesịkwara ịkpali anyị ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Jisọs nwetara obi ụtọ n’inyere ndị mmadụ aka, karịsịa n’ụzọ ime mmụọ. Matiu 9:35-38 na-asị: “Jisọs wee na-ejegharị n’obodo nta na obodo nta ha nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịarịa nile dị iche iche. Ma mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Mgbe ahụ ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka o zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi ya.” Ọ bụrụ na owuwe ihe ubi ahụ ewee oge karịa otú anyị tụrụ anya, nke a ga-enyekwu anyị ohere inweta ọṅụ na afọ ojuju n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. Nke a bụkwa ụzọ isi gosipụta ịhụnanya agbata obi nke a tụrụ anya ya n’aka anyị.—Matiu 22:39.
N’ihi Gịnị Ka I Ji Ejere Chineke Ozi?
Anyị atụlewo nanị ole na ole n’ime ọtụtụ ihe ndị na-akpali akpali mere a ga-eji jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ dị mma iji ekpere chee echiche n’ihe mere anyị onwe anyị ji ejere Chineke ozi, n’ihi na onye ọ bụla n’ime anyị gaje ịza ajụjụ n’ihu ya. (Ndị Rom 14:12; Ndị Hibru 4:13) Ndị nọgidekwara na-enwe nanị ebumnuche ọchịchọ ọdịmma onwe onye agaghị enweta amara Chineke.
Gịnị ka a pụrụ ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na nchegbu anyị bụ isi bụ ido aha Jehova nso ma na-ejere Chineke ozi dị nsọ site n’ebumnuche ndị na-enweghị ọchịchọ ọdịmma onwe onye? Lee, Jehova ga-agọzi anyị na ozi anyị! (Ilu 10:22) Anyị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi n’ihi na anyị ejeworo Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ọtụtụ puku na-ejere Jehova ozi na Japan
[Foto dị na peeji nke 10]
Ijere Jehova ozi na Côte d’Ivoire
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]
SIX SERMONS, nke George Storrs (1855)