‘Na-anwanụ Onwe Unu, Ma Ùnu Dị n’Okwukwe Anyị’
Isi Ihe Ndị Sitere ná Ndị Kọrint nke Abụọ
PỌL onyeozi nwere nchegbu banyere ndị Kraịst ahụ nọ na Kọrint. Olee otú ha ga-esi lee ndụmọdụ o nyere n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ha anya? Ọ nọ na Masedọnia mgbe Taịtọs ji ozi ọma ahụ bịarute, nke bụ na akwụkwọ ozi ahụ mere ka ndị Kọrint nwee mwute gaa n’ichegharị. Lee nnọọ ka nke ahụ si mee ka Pọl ṅụrịa!—2 Ndị Kọrịnt 7:8-13.
Pọl nọ na Masedọnia mgbe o dere Ndị Kọrint nke Abụọ, ma eleghị anya mgbe etiti afọ 55 O.A. gasịrị. N’akwụkwọ ozi nke a, ọ tụlere ihe ndị a ga-eme iji debe ọgbakọ ọcha, wulite ọchịchọ maka ịtụnye ụtụ iji nyere ndị kwere ekwe bi na Judia aka, kwadookwa ọbụbụ ọ bụ onyeozi. Akụkụ dị ukwuu n’ihe Pọl kwuru pụrụ inyere anyị aka ‘ịnọgide na-anwa onwe anyi, ma ànyị nọkwa n’okwukwe ahụ.’ (13:5) Ya mere, gịnị ka anyị pụrụ ịkpachata site n’akwụkwọ ozi nke a?
Na-ejere Chineke nke Nkasi Obi Ozi
Onyeozi ahụ gosiri na dị ka Chineke na-akasi anyị obi ná mkpagbụ anyi nile, anyị kwesịrị ịkasi ndị ọzọ obi, na-ekpekwa ekpere maka ha. (1:1-2:11) Ọ bụ ezie na Pọl na ndị ya na ha so nọ n’ihe nrụgide siri oké ike, Chineke napụtara ha. Ma, ndị Kọrint ndị ahụ pụrụ inye aka site n’ikpe ekpere n’ihi ha, ọbụna dị ka anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ihi ndị ọzọ nakweere ezi okwukwe ahụ. Ma gịnị banyere nwoke ahụ nke na-eme omume rụrụ arụ nke e hotara ná 1 Ndị Kọrint isi 5? Ihe àmà gosiri na a chụpụburu ya n’ọgbakọ, ma o chegharịwo. Lee nnọọ ka ọ ga-esiworị nweta nkasi obi mgbe ndị Kọrint ahụ gosiri ya mgbaghara wee jiri ịhụnanya nabataghachi ya n’etiti onwe ha.
Okwu Pọl kwuru pụrụ ịmụba nghọta anyị ghọtara ịdị mkpa nke ije ozi ndị Kraịst, na-ewusi nguzo anyị guzo n’ezi okwukwe ahụ ike. (2:12-6:10) Ee, ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere ihe ùgwù nke ịnọ ‘n’ọṅụ agha’ nke Chineke na-eduzi! Pọl na ndị ọrụ ibe ya nwere ije ozi ahụ nke dị oké ọnụ ahịa n’ihi ebere nke e gosiri ha. Dị ka ha, ndị e tere mmanụ nke oge a nwere ije ozi nke ime ka a dị n’otu. Ma, Ndịàmà Jehova nile na-eme ka ndị ọzọ baa ọgaranya site n’ije ozi ha.
Na-emezu Ịdị Nsọ, Na-emesapụkwa Aka
Pọl gosiri na ndị ozi bụ ndị Kraịst aghaghị imezu ịdị nsọ n’egwu nke Jehova. (6:11-7:16) Ka anyị wee guzosie ike n’okwukwe, anyị aghaghị izere ịbụ ndị e kekọtara ha na ndị na-ekweghị ekwe, ọ dịkwa mkpa ka e mee ka anyị dị ọcha pụọ ná mmetọ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ. Ndị Kọrint mere ihe iji mee ka a dị ọcha site n’ịchụpụ onye ahụ mere ajọ ihe rụrụ arụ, Pọl ṅụrịkwara ọṅụ n’ihi na akwụkwọ ozi mbụ ya wutere ha gaa ná nchegharị nke na-eduje ná nzọpụta.
Anyị na-amụtakwa na a na-akwụghachi ndị ozi na-atụ egwu Chineke ụgwọ maka mmesapụ aka ha. (8:1-9:15) N’ihe banyere ịtụ ụtụ maka ‘ndị nsọ’ nọ ná mkpa, Pọl kpọtụrụ uche n’ezi ihe nlereanya nke ndị Masedọnia. Ha emesapụwo aka karịa otú ike ha hà, o nwekwara olileanya ihụ otu ụdị mmesapụ aka ahụ n’aka ndị Kọrint. Onyinye ihe ha—na nke anyị—kwesịrị isite n’obi, n’ihi na ‘Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya,’ na-enyezukwa ndị ya ihe iji na-emesapụ aka n’ụdị ọ bụla.
Pọl—Onyeozi nke Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
Mgbe anyị mezuru ihe ọ bụla n’ije ozi Jehova dị ka ndị ozi, ka anyị nyaa isi n’ime ya, ọ bụghị n’ime onwe anyị. (10:1-12:13) E kwuwerị, ọ bụ nanị site n’iji ihe agha ime mmụọ ‘ndị Chineke mere ka ha sie ike,’ ka anyị pụrụ ịkwatu echiche ụgha dị iche iche. ‘Ndị ahụ kachasị elu n’etiti ndị ozi,’ bụ́ ndị na-eme mpako n’etiti ndị Kọrint enweghị mgbe ha ga-enwe ihe a pụrụ iji tụnyere ihe ndekọ nke ntachi obi Pọl dị ka onyeozi Kraịst. Ma, ka a ghara ibulibiga ya elu ókè, Chineke ewepụghị ‘ogwu n’anụ ahụ (ya)’—nke pụrụ ịbụworị nsogbu anya ma ọ bụ ndị ozi ụgha ndị ahụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ ga-akara Pọl mma ịnya isi n’adịghị ike ya nile ka ‘ike nke Kraịst’ wee nọgide na-adịkwasị ya dị ka ihe mkpuchi. Dị ka nwoke nke guzosiri ike n’okwukwe, ọ bụghị onye dị ala karịa ndị ahụ kachasị elu n’etiti ndị ozi. Ndị Kọrint ahụwo ihe nnwapụta nke ọbụbụ Pọl bụ onyeozi, bụ́ ndị o meworo ka ha pụta ìhè n’etiti ha ‘site n’ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube na ọrụ dị ike dị iche iche.’
Dị ka onye na-eje ozi nke bụkwa onyeozi, Pọl bu ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe ya n’obi, ọbụna dị ka anyị kwesịrị ime. (12:14-13:14) Ọ ‘ga-ewere obi ụtọ nile mefuo ihe o nwere, kwekwa ka e mefusịa ya onwe ya n’ihi mkpụrụ obi ha.’ Ma Pọl tụrụ egwu na mgbe ya ga-erute Kọrint, na ya ga-ahụ ụfọdụ ndị na-echegharịbeghị site n’ọrụ nile nke anụ ahụ. N’ihi ya, ọ tụụrụ mmadụ nile aro ka ha nọgide na-anwa onwe ha ma hà dịkwa n’okwukwe ahụ, kpeekwa ekpere ka ha ‘ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla.’ Ná mmechi, ọ gbara ha ume ka ha na-aṅụrị ọṅụ, bụrụ ndị a hazigharịrị echiche ha, bụrụ ndị a kasiri obi, ka ha na-eche otu ihe, na-ebikwa n’udo. Lee nnọọ ezi ndụmọdụ nke a bụkwaara anyị!
Nọgidenụ Na-anwa Onwe Unu!
Otú a, akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint na-atụ aro ụzọ dị iche iche anyị ga-esi na-anwa onwe anyị ma ànyị dịkwa n’okwukwe. N’ezie, okwu ya kwesịrị ịkpali anyị ịkasi ndị ọzọ obi, ọbụna dị ka Chineke na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị. Ihe onyeozi ahụ kwuru banyere ije ozi ndị Kraịst kwesịrị ịkpali anyị ka anyị na-ejezu ya n’ikwesị ntụkwasị obi ka anyị nọ na-emezu ịdị nsọ n’egwu Jehova.
Itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ pụrụ ime ka anyị na-emesapụ aka karị, na-enyekwara ndị ọzọ aka. Ma, okwu ya kwesịrị ikpali anyị ịnya isi n’ime Jehova, ọ bụghị n’ime onwe anyị. O kwesịrị ime ka mmetụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ dịwanye elu. N’ezie, ndị a na isi ihe ndị ọzọ dị ná Ndị Kọrint nke Abụọ pụrụ inyere anyị aka ịnọgide ‘na-anwa onwe anyị ma ànyị dịkwa n’okwukwe ahụ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]
GOSIPỤTA EBUBE JEHOVA: Mgbe Moses ji mbadamba nkume abụọ nke Ihe Àmà ahụ si n’Ugwu Saịnaị rịdata, ihu ya na-egbukepụ egbukepụ n’ihi na Chineke akpanyeworo ya ụka. (Ọpụpụ 34:29, 30) Pọl kpọtụrụ uche na nke a wee sị: ‘Anyị onwe anyị nile ebe anyị weere ihu nke e kpupụworo ihe mkpudo na-egosi ebube nke [Jehova, NW] dị ka enyo, a na-enwogha anyị ruo n’otu onyinyo ahụ site n’ebube ruo ebube, ọbụna dị ka a na-enye ya site [na Jehova, bụ́ Mmụọ ahụ, NW].’ (2 Ndị Kọrint 3:7-18) A na-eji ihe ígwè ndị dị ka ọla bronze ma ọ bụ copper eme enyo ndị a na-eji n’aka n’oge ochie, a na-ehichasịkwa ha nke ọma nke na ihu ha ga na-egosipụta onyinyo ihe nke ọma. Dị ka enyo, ndị e tere mmanụ na-egosipụta ebube Chineke nke na-acharutere ha site na Jisọs Kraịst, na-aga n’ihu n’ihu ‘n’inwogha ha ruo n’onyinyo’ ahụ nke Ọkpara Jehova nke na-egosipụta ebube. (2 Ndị Kọrint 4:6; Ndị Efesọs 5:1) Site ná mmụọ nsọ na Akwụkwọ nsọ, Chineke na-eke n’ime ha ‘mmadụ ọhụrụ ahụ’ nke bụ ngosipụta nke àgwà ya nile. (Ndị Efesọs 4:24; Ndị Kọlọsi 3:10) Ma olileanya anyị ọ̀ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, ka anyị gosipụta ọdịdị mmadụ ahụ, jirikwa ihe ùgwù nke igosipụta ebube Chineke n’ije ozi anyị n’ihe dị oké ọnụ ahịa.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]
‘IHE AGHA NKE EZI OMUME’: Otu ụzọ Pọl na ndị ozi ibe ya si mee ka a mara ha dị ka ndị ozi Chineke bụ ‘site n’ihe agha nke ezi omume n’aka nri na aka ekpe.’ (2 Ndị Kọrint 6:3-7) Aka nri ka a na-eji ejide mma agha, na-ejikwa aka ekpe ejide ihe mgbochi obi. Ọ bụ ezie na a na-esi n’akụkụ nile ebuso ha agha, Pọl na ndị ọrụ ibe ya bụ ndị e jikere ibu agha ime mmụọ. A na-ebu ya megide ndị ozizi ụgha na ‘ndị kachasị elu n’etiti ndị ozi,’ ka a ghara iduru ọgbakọ ahụ dị na Kọrint pụọ site n’ịrara onwe ha nye Kraịst. Pọl echigharịkwurughị ihe agha nke anụ ahụ na-emehie emehie, aghụghọ, nduhie, ma ọ bụ nghọgbu. (2 Ndị Kọrint 10:8-10; 11:3, 12-14; 12: 11, 16) Kama nke ahụ, ‘ihe agha’ ndị o jiri mee ihe bụ nke ezi omume, ma ọ bụ nke ikpe ziri ezi, bụ́ ụzọ isi mee ka ezi ofufe na-aga n’ihu n’agbanyeghị mmegide nile. Ndịàmà Jehova na-eji ‘ihe agha nke ezi omume’ ndị dị otú ahụ eme ihe n’oge a maka otu nzube ahụ.