Ugbu A Bụ Ụbọchị Nzọpụta!
“Lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”—2 NDỊ KỌRINT 6:2.
1. Gịnị ka a chọrọ iji nwee ezi nguzo n’ebe Chineke na Kraịst nọ?
JEHOVA esetịpụwo otu ụbọchị maka ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe. (Ọrụ 17:31) Ọ bụrụ na ọ ga-abụrụ anyị ụbọchị nzọpụta, ọ dị anyị mkpa inwe nguzo dị mma n’ebe ya na Onyeikpe ọ họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ. (Jọn 5:22) Nguzo dị otú ahụ na-achọ àgwà nke kwekọrọ n’Okwu Chineke na okwukwe nke na-akpali anyị inyere ndị ọzọ aka ịbụ ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs.
2. N’ihi gịnị ka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ ji bụrụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ?
2 N’ihi mmehie e ketara eketa, ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ ndị ala ọzọ n’ebe Chineke nọ. (Ndị Rom 5:12; Ndị Efesọs 4:17, 18) Ya mere, ndị anyị na-ekwusara ozi ọma pụrụ inweta nzọpụta nanị ma ọ bụrụ na ha na ya adịrị n’otu. Pọl onyeozi mere ka nke a doo anya mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ. Ka anyị nyochaa 2 Ndị Kọrint 5:10–6:10 iji hụ ihe Pọl kwuru banyere ikpe, isoro Chineke dị n’otu, na nzọpụta.
“Anyị Na-eme Ka Mmadụ Kwenye”
3. Olee otú Pọl si “na-eme ka mmadụ kwenye,” gịnịkwa mere anyị ji kwesị ime nke a taa?
3 Pọl jikọtara ikpe na ime nkwusa mgbe o dere, sị: “A ghaghị ime ka anyị nile pụta ìhè n’ihu oche ikpe Kraịst; ka anyị nile n’otu n’otu wee naraghachi ihe e sitere n’ahụ mee, dị ka ihe onye ọ bụla mere si dị, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe na-adịghị mma. Ya mere ebe anyị matara egwu Onyenwe anyị, anyị na-eme ka mmadụ kwenye.” (2 Ndị Kọrint 5:10, 11) Onyeozi ahụ ‘mere ka ndị mmadụ kwenye’ site n’ikwusa ozi ọma. Gịnị banyere anyị? Ebe ọ bụ na anyị na-eche ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a ihu, anyị kwesịrị ime ihe nile anyị pụrụ ime iji mee ka ndị ọzọ kwenye ime ihe ndị dị mkpa a chọrọ iji nweta ikpe ọma nke Jisọs na nnwapụta nke Isi Iyi nke nzọpụta, bụ́ Jehova Chineke.
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji nyaa isi banyere ihe ndị anyị rụzuru n’ozi Jehova? (b) Olee otú o si bụrụ na Pọl nyara isi “n’ebe Chineke nọ”?
4 Otú ọ dị, ọ bụrụ na Chineke agọziwo ozi anyị, anyị ekwesịghị ịnya isi. Na Kọrint, ụfọdụ ji mpako fụlie onwe ha ma ọ bụ ndị ọzọ elu, si otú a na-akpata nkewa n’ime ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 1:10-13; 3:3, 4) N’izo aka n’ọnọdụ a, Pọl dere, sị: “Anyị adịghị eme ọzọ ka unu mara anyị, kama anyị na-ekwu dị ka ndị na-enye unu ohere ịnya isi n’ihi anyị, ka unu wee nwee ihe ịza ndị na-anya isi n’ihe a na-ahụ anya, ọ bụghịkwa n’obi. N’ihi na a sị na anyị bụrụ ndị anya na-adịghị mma, ọ bụ n’ebe Chineke nọ; a sịkwa na anyị nwere uche zuru okè, ọ bụ n’ebe unu nọ.” (2 Ndị Kọrint 5:12, 13) Ndị mpako enweghị mmasị n’ịdị n’otu na ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ. Ha chọrọ ịnya isi n’ihe a na-ahụ anya kama inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka ịzụlite obi dị mma n’ihu Chineke. N’ihi ya, Pọl tụrụ ọgbakọ ahụ mmehie ha n’anya ma mesịa kwuo, sị: “Onye na-anya isi, ya nyaa n’Onyenwe anyị.”—2 Ndị Kọrint 10:17.
5 Pọl ọ́ nyaghị isi? Ụfọdụ pụrụ icheworị otú ahụ n’ihi ihe o kwuru banyere ịbụ onyeozi. Ma ọ ghaghị ịnya isi “n’ebe Chineke nọ.” Ọ nyara isi banyere iru eru ya dị ka onyeozi, ka ndị Kọrint wee ghara ịhapụ Jehova. Pọl mere nke a iji weghachite ha n’ebe Chineke nọ n’ihi na ndị ozi ụgha na-echigharị ha ihu gaa n’ụzọ na-ezighị ezi. (2 Ndị Kọrint 11:16-21; 12:11, 12, 19-21; 13:10) Ma, Pọl adịghị anwa iji ihe ndị ọ rụzuru na-adọrọ mmasị mmadụ nile mgbe nile.—Ilu 21:4.
Ịhụnanya Kraịst Ọ̀ Na-arụgide Gị?
6. Olee otú ịhụnanya Kraịst kwesịrị isi metụta anyị?
6 Dị ka ezi onyeozi, Pọl kụziiri ndị ọzọ banyere àjà mgbapụta Jisọs. O nwere mmetụta ná ndụ Pọl, n’ihi na o dere, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị; ebe anyị na-atụle nke a, na otu Onye nwụrụ n’ọnọdụ mmadụ nile, ya mere mmadụ nile nwụrụ; Ọ nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Lee nnọọ ịhụnanya Jisọs gosiri n’inye ndụ ya n’ihi anyị! N’ezie nke ahụ kwesịrị ịbụ ike na-arụgide anyị ná ndụ anyị. Inwe obi ekele nye Jisọs maka inye ndụ ya n’ihi anyị kwesịrị ịkwali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma nke nzọpụta ahụ Jehova nyere site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. (Jọn 3:16; tụlee Abụ Ọma 96:2.) “Ịhụnanya Kraịst” ọ̀ na-arụgide gị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ?—Matiu 28:19, 20.
7. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘amataghị onye ọ bụla dị ka anụ ahụ na-amata’?
7 Site n’iji ndụ ha na-eme ihe n’ụzọ na-egosi obi ekele maka ihe Kraịst mere n’ihi ha, ndị e tere mmanụ ‘adịghịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ha dịịrị Ya ndụ.’ “Ya mere,” ka Pọl kwuru, “anyị onwe anyị amataghị onye ọ bụla site n’ugbu a dị ka anụ ahụ na-amata: ọbụna a sị na anyị amawo Kraịst dị ka anụ ahụ maara, ma ugbu a anyị amaghị Ya ọzọ otú a.” (2 Ndị Kọrint 5:16) Ndị Kraịst agaghị ele ndị mmadụ anya n’ụzọ anụ ahụ, ikekwe na-ele ndị Juu anya ọma karịa ndị Jentaịl ma ọ bụ ndị ọgaranya karịa ndị ogbenye. Ndị e tere mmanụ ‘amataghị onye ọ bụla dị ka anụ ahụ na-amata,’ n’ihi na ọ bụ mmekọrịta ime mmụọ nke ha na ndị kwere ekwe ibe ha bụ ihe dị mkpa. Ndị ahụ ‘maara Kraịst dị ka anụ ahụ maara’ abụghị nanị ụmụ mmadụ ndị hụrụ Jisọs mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọbụna a sị na ụfọdụ ndị na-ele anya Mesaịa leburu Kraịst anya ná ndabere nke anụ ahụ ya, ha agakwaghị eme otú ahụ ọzọ. O nyere ahụ ya dị ka ihe mgbapụta, e mekwara ka o si n’ọnwụ bilie dị ka mmụọ na-enye ndụ. Ndị ọzọ a kpọliri gaa ná ndụ eluigwe ga-agbahapụ anụ ahụ ha, n’adịghịkwa mgbe ọ bụla ha ga-ahụ Jisọs Kraịst n’anụ ahụ.—1 Ndị Kọrint 15:45, 50; 2 Ndị Kọrint 5:1-5.
8. Olee otú ndị mmadụ n’otu n’otu siworo ghọọ ndị “dị n’ime Kraịst”?
8 Ka ọ ka na-agwa ndị e tere mmanụ okwu, Pọl na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla dị n’ime Kraịst, ọ bụ onye e kere ọhụrụ: ihe ochie agasịwo; lee, ha aghọwo ihe ọhụrụ.” (2 Ndị Kọrint 5:17) Ịdị “n’ime Kraịst” pụtara iso ya dị n’otu. (Jọn 17:21) Onye ahụ malitere inwe mmekọrịta nke a mgbe Jehova mere ka ọ bịaruo Ọkpara ya nso ma were mmụọ nsọ mụọ onye ahụ. Dị ka nwa Chineke e ji mmụọ nsọ mụọ, ọ bụ “onye e kere ọhụrụ” nke nwere olileanya iso Kraịst kere òkè n’Alaeze eluigwe. (Jọn 3:3-8; 6:44; Ndị Galetia 4:6, 7) E nyewo ndị Kraịst e tere mmanụ dị otú ahụ ihe ùgwù ije ozi nke dị ebube.
“Meenụ Ka Unu na Chineke Dị n’Otu”
9. Gịnị ka Chineke meworo iji mee ka o kwe omume isoro ya dị n’otu?
9 Lee otú Jehova siworo nwee ihu ọma n’ebe “onye [ahụ] e kere ọhụrụ” nọ! Pọl na-ekwu, sị: “Ihe nile sitere na Chineke, Onye sitere n’aka Kraịst mee ka anyị na Ya onwe ya dị n’otu, O wee nye anyị ije ozi nke ime ka a dị n’otu ahụ; nke bụ na Chineke nọrịị n’ime Kraịst na-eme ka Ya onwe ya na ụwa dị n’otu, n’agụghị ndahie nile ha megide ha, O debekwara n’ime anyị okwu nke ime ka a dị n’otu ahụ.” (2 Ndị Kọrint 5:18, 19) Ihe a kpọrọ mmadụ abụrụwo ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ kemgbe Adam mehiere. Ma Jehova ji ịhụnanya bute ụzọ n’imeghe ụzọ nke ime ka a dịghachi n’otu site n’àjà Jisọs.—Ndị Rom 5:6-12.
10. Ole ndị ka Jehova nyefere ozi nke ime ka a dị n’otu, gịnịkwa ka ha meworo iji jezuo ya?
10 Jehova enyefewo ndị e tere mmanụ ozi nke ime ka a dịghachi n’otu, ya mere Pọl pụrụ ikwu, sị: “Ya mere anyị bụ ndị [nnọchianya] n’ọnọdụ Kraịst, dị ka a ga-asị na Chineke na-arịọ arịrịọ site n’aka anyị: anyị nọ n’ọnọdụ Kraịst na-arịọ unu, meenụ ka unu na Chineke dị n’otu.” (2 Ndị Kọrint 5:20) N’oge ochie, a na-ezipụ ndị nnọchianya karịsịa n’oge ọgba aghara iji hụ ma a pụrụ igbochi agha. (Luk 14:31, 32) Ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie bụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, o zipụwo ndị nnọchianya ya e tere mmanụ ime ka ndị mmadụ mara banyere ndokwa ya maka ime ka a dịghachi n’otu. Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, ndị e tere mmanụ na-arịọ, sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị n’otu.” Arịrịọ a bụ agbamume obi ebere maka ịchọ udo n’ebe Chineke nọ ma nabata nzọpụta ọ na-eme ka o kwe omume site n’aka Kraịst.
11. Site n’inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, ole ndị ga-emesị nweta nguzo ezi omume n’ihu Chineke?
11 Ndị nile nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ pụrụ ịghọ ndị ha na Chineke dị n’otu. (Jọn 3:36) Pọl na-ekwu, sị: “Onye ahụ [Jisọs] Nke na-amaghị mmehie ka O [Jehova] mere ka Ọ bụrụ mmehie n’ọnọdụ anyị; ka anyị onwe anyị wee ghọọ ezi omume Chineke [site n’aka, NW] Ya.” (2 Ndị Kọrint 5:21) Nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs bụ àjà mmehie maka ụmụ Adam nile bụ́ ndị a gbapụtara site ná mmehie e ketara eketa. Ha ghọrọ “ezi omume Chineke” site n’aka Jisọs. Ezi omume, ma ọ bụ nguzo ezi omume a n’ihu Chineke, bu ụzọ abịara 144,000 ndị nketa ibe Kraịst. N’oge Ọchịchị Puku Afọ ya, ụmụ elu ala nke Nna Nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-enweta nguzo ezi omume dị ka ụmụ mmadụ zuru okè. Ọ ga-ebuli ha gaa ná nguzo ezi omume n’izu okè ka ha wee nwee ike ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke ma nata onyinye nke ndụ ebighị ebi.—Aịsaịa 9:6; Mkpughe 14:1; 20:4-6, 11-15.
“Oge A Na-anara Mmadụ nke Ọma”
12. Ozi dị mkpa dị aṅaa ka ndị nnọchianya na ndị ozi Jehova na-eje?
12 Iji nweta nzọpụta, anyị aghaghị ime ihe kwekọrọ n’okwu Pọl: “Ma, dị ka ndị anyị na Ya [Jehova] na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa unu ka unu ghara ịnara amara Chineke n’efu, (n’ihi na Ọ na-asị, N’oge a na-anara mmadụ nke ọma ka M nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka M nyeere gị aka: lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta).” (2 Ndị Kọrint 6:1, 2) Ndị nnọchianya e tere mmanụ nke Jehova na ndị ozi ya, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, adịghị anara amara Nna ha nke eluigwe n’efu. (Jọn 10:16) Site n’àgwà ziri ezi na ozi ịnụ ọkụ n’obi ha ‘n’oge a a na-anara mmadụ nke ọma,’ ha na-achọ ihu ọma Chineke, na-emekwa ka ndị bi n’ụwa mara na ugbu a bụ “ụbọchị nzọpụta.”
13. Gịnị bụ isi ihe dị n’Aịsaịa 49:8, oleekwa otú o si mezuo ná nke mbụ ya?
13 Pọl na-ehota Aịsaịa 49:8, bụ́ nke na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Na mgbe ihe mmadụ na-atọ m ụtọ ka M zaworo gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka M nyewooro gị aka: M ga-echebekwa gị, nye gị ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị m, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe nketa nile tọgbọrọ n’efu.” Amụma a bu ụzọ mezuo mgbe a tọhapụrụ ndị Israel ná ndọrọ n’agha na Babilọn, ha mesịakwa laghachi n’ala ha tọgbọrọ n’efu.—Aịsaịa 49:3, 9.
14. Olee otú Aịsaịa 49:8 si mezuo n’ebe Jisọs nọ?
14 Ná mmezu ọzọ nke amụma Aịsaịa, Jehova nyere “ohu” ya bụ́ Jisọs dị ka “ìhè nke mba nile, ịbụ nzọpụta [Chineke] ruo nsọtụ ụwa.” (Aịsaịa 49:6, 8; tụlee Aịsaịa 42:1-4, 6, 7; Matiu 12:18-21.) O doro anya na “mgbe ihe mmadụ na-atọ [Chineke] ụtọ,” ma ọ bụ “oge a na-anara mmadụ nke ọma,” na-ezo aka n’ebe Jisọs nọ mgbe ọ nọ n’ụwa. O kpere ekpere, Chineke ‘zakwara’ ya. Nke ahụ ghọrọ “ụbọchị nzọpụta” nye Jisọs n’ihi na ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè, sikwa otú a “ghọọrọ ndị nile na-aṅa Ya ntị Onye na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.”—Ndị Hibru 5:7, 9; Jọn 12:27, 28.
15. Site ole mgbe ka ụmụ Israel ime mmụọ ghọrọ ndị na-aghaghị igosi na ha ruru eru maka amara Chineke, ọ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa?
15 Pọl ji Aịsaịa 49:8 eme ihe n’ebe ndị Kraịst e tere mmanụ nọ, na-arịọ ha ka ha ghara “ịnara amara Chineke n’efu” site n’ịghara ịchọ ihu ọma ya ‘n’oge a na-anara mmadụ nke ọma’ na “ụbọchị nzọpụta” nke ọ na-enye. Pọl na-agbakwụnye, sị: “Lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” (2 Ndị Kọrint 6:2) Kemgbe Pentikọst 33 O.A., ụmụ Israel ime mmụọ agbalịwo igosi na ha ruru eru inweta amara Chineke ka “oge a na-anara mmadụ nke ọma” wee bụrụ “ụbọchị nzọpụta” nye ha.
‘Ime Ka Mmadụ Mara Anyị Dị Ka Ndị Na-ejere Chineke Ozi’
16. N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa siri ike ka Pọl mere ka ndị mmadụ mara ya dị ka onye na-ejere Chineke ozi?
16 Ụfọdụ ndị so ọgbakọ Kọrint na-akpakọ adịghị egosi na ha ruru eru inweta amara Chineke. Ha kwutọrọ Pọl ná mgbalị iji mebie ikike ịbụ onyeozi ya, ọ bụ ezie na o zeere ‘ime ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla.’ N’ezie, o mere ka ndị mmadụ mara ya dị ka onye na-ejere Chineke ozi “n’ime oké ntachi obi, n’ime mkpagbu, n’ime mkpa, n’ime oké mkpa, n’ime ihe otiti, n’ime ụlọ mkpọrọ, n’ime aghara, n’ime ịdọgbu onwe [ya] n’ọrụ, n’ime ịmụrụ anya, n’ime obubu ọnụ.” (2 Ndị Kọrint 6:3-5) Mgbe e mesịrị, Pọl tụgharịrị uche na ọ bụrụ na ndị na-emegide ya bụ ndị na-eje ozi, ya onwe ya “na-eje karị” n’ihi ịta ahụhụ ụlọ mkpọrọ, ihe otiti, ihe ize ndụ, na owu ọmụma karị.—2 Ndị Kọrint 11:23-27.
17. (a) Site n’igosipụta àgwà ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ime ka mmadụ mara anyị dị ka ndị na-ejere Chineke ozi? (b) Olee ihe ndị bụ ‘ihe agha nke ezi omume’?
17 Dị ka Pọl na ndị ibe ya, anyị pụrụ ime ka mmadụ mara anyị dị ka ndị na-ejere Chineke ozi. N’ụzọ dị aṅaa? ‘Site n’ịdị ọcha,’ ma ọ bụ n’enweghị ntụpọ, nakwa site n’ime ihe kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma Bible. Anyị pụrụ ime ka mmadụ mara anyị ‘site n’ogologo ntachi obi,’ jiri ndidi na-atachi obi n’ihe ọjọọ ma ọ bụ n’ihe mkpasu iwe, ‘sitekwa n’obiọma’ ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka. Ọzọkwa, anyị pụrụ ime ka mmadụ mara anyị dị ka ndị na-ejere Chineke ozi site n’ịnabata nduzi sitere ná mmụọ ya, na-egosi “ịhụnanya nke ihu abụọ na-adịghị ya,” na-ekwu eziokwu, na-adaberekwa n’ebe ọ nọ maka ike iji jee ozi ahụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, Pọl gosipụtakwara ọnọdụ ije ozi ya “site n’ihe agha nke ezi omume n’aka nri na aka ekpe.” N’agha oge ochie, a na-ejikarị aka nri ejide mma agha ebe a na-eji aka ekpe ejide ọta. N’ịlụ agha ime mmụọ megide ndị nkụzi ụgha, Pọl ejighị ihe agha nke anụ ahụ na-emehie emehie mee ihe—ngahie, ịtụ ntụ, aghụghọ. (2 Ndị Kọrint 6:6, 7; 11:12-14; Ilu 3:32) O ji ‘ihe agha,’ ma ọ bụ ụzọ ezi omume mee ihe, iji mee ka ezi ofufe na-aga n’ihu. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ime.
18. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi, olee otú anyị ga-esi na-akpa àgwà?
18 Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi, anyị ga-akpa àgwà dị ka Pọl na ndị ọrụ ibe ya kpara. Anyị ga-eme dị ka ndị Kraịst ma à na-asọpụrụ anyị ma ọ bụ na-akparị anyị. Akụkọ ọjọọ ndị a na-akọ banyere anyị agaghị akwụsị ọrụ nkwusa anyị, anyị agaghịkwa ebuli onwe anyị elu ma a kọọ akụkọ ọma banyere anyị. Anyị ga-ekwu eziokwu, anyị pụkwara ịbụ ndị e ji ọrụ nsọpụrụ Chineke mara. Mgbe anyị nọ n’ihe ize ndụ na-eweta ọnwụ site n’aka ndị iro, anyị ga-atụkwasị Jehova obi. Anyị ga-ejikwa obi ekele nabata ịdọ aka ná ntị.—2 Ndị Kọrint 6:8, 9.
19. Olee otú o si ekwe omume ‘ime ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ọgaranya’ n’ụzọ ime mmụọ?
19 N’ikwubi okwu ya banyere ozi nke ime ka a dị n’otu, Pọl kwuru okwu banyere onwe ya na ndị ibe ya “dị ka ndị ihe na-ewute, ma [ha] na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile; dị ka ndị ogbenye, ma [ha] na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ọgaranya; dị ka ndị na-enweghị ihe, ma [ha] na-enwezu ihe nile.” (2 Ndị Kọrint 6:10) Ọ bụ ezie na ndị ozi ahụ nwere ihe mere ha ga-eji ruo újú ná mkpagbu ha, ha nwere ọṅụ n’ime onwe ha. Ha bụ ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, ma ha ‘mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ọgaranya’ n’ụzọ ime mmụọ. N’ezie, ha ‘nwezuru ihe nile’ n’ihi na okwukwe ha wetaara ha akụ̀ ime mmụọ—ọbụna olileanya nke ịghọ ụmụ ndị ikom eluigwe nke Chineke. Ha bikwara ndụ juru afọ na nke obi ụtọ dị ka ndị ozi bụ́ ndị Kraịst. (Ọrụ 20:35) Dị ka ha, anyị pụrụ ‘ime ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ọgaranya’ site n’ikere òkè n’ozi nke ime ka a dị n’otu ugbu a—n’ụbọchị nzọpụta a!
Tụkwasị Obi ná Nzọpụta nke Jehova
20. (a) Gịnị na-agụsi Pọl ike, n’ihi gịnịkwa ka oge na-ejighị fọdụ? (b) Gịnị na-aka ụbọchị nzọpụta nke anyị na-ebi n’ime ya ugbu a akara?
20 Mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi nke abụọ ya nye ndị Kọrint n’ihe dị ka afọ 55 O.A., nanị ihe dị ka afọ 15 fọdụụrụ usoro ihe ndị Juu. Onyeozi ahụ ji obi ya chọọ ka ndị Juu na ndị Jentaịl ghọọ ndị ha na Chineke dị n’otu site na Kraịst. Mgbe ahụ bụ ụbọchị nzọpụta, oge afọdụghịkwa. Anyị anọwo n’ebi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe, nke yiri nke oge ahụ kemgbe 1914. Ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ nke na-aga n’ihu ugbu a na-aka ugbu a akara dị ka ụbọchị nzọpụta.
21. (a) Olee isiokwu dịịrị afọ a họpụtaworo maka 1999? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme n’ụbọchị nzọpụta a?
21 Ọ dị ndị nke mba nile mkpa ịnụ banyere ndokwa Chineke mere maka nzọpụta site n’aka Jisọs Kraịst. Oge afọdụghịzi. Pọl dere, sị: “Lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” Okwu ndị ahụ nke 2 Ndị Kọrint 6:2 ga-abụ isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova maka 1999. Lee nnọọ ka o si kwesị ekwesị, n’ihi na anyị na-eche ihe dị njọ nke ukwuu karịa mbibi Jerusalem na ụlọ nsọ ya, ihu! Mbibi nke usoro ihe a nile, nke na-emetụta onye ọ bụla nọ n’ụwa, dị nnọọ n’ihu. Ugbu a—ọ bụghị echi—bụ oge ime ihe. Ọ bụrụ na anyị kwetara na Jehova nwe nzọpụta, ọ bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụrụkwa na anyị ji ndụ ebighị ebi kpọrọ ihe, anyị agaghị anara amara Chineke n’efu. Site n’ọchịchọ si n’obi ịsọpụrụ Jehova, anyị ga-egosi site n’okwu ọnụ na omume na ihe anyị na-ekwu si anyị n’obi n’ezie mgbe anyị na-eti mkpu, sị: “Lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka isoro Chineke dị n’otu ji dị oké mkpa?
◻ Olee ndị bụ ndị nnọchianya na ndị ozi bụ́ ndị na-eje ozi ime ka a dị n’otu?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị mmadụ mara anyị dị ka ndị na-ejere Chineke ozi?
◻ Gịnị ka isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova maka 1999 pụtaara gị?
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Dị ka Pọl, ì ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa, na-enyekwara ndị ọzọ aka ịghọ ndị ha na Chineke dị n’otu?
United States
France
Côte d’Ivoire
[Foto dị na peeji nke 18]
N’ụbọchị nzọpụta a, ì so n’etiti ìgwè mmadụ ndị na-aghọ ndị ha na Jehova Chineke dị n’otu?