Gaa n’Ihu Irute Ihe Mgbaru Ọsọ ahụ!
Isi Ihe Ndị Sitere ná Ndị Filipaị
ONYEOZI ahụ bụ Pọl chọrọ ka ndị Kraịst nọ na Filipaị nọgide na-aga n’ihu irute ihe mgbaru ọsọ ahụ maka ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi. N’ihi nke a, o degaara ha akwụkwọ n’ihe dị ka afọ 60 ma ọ bụ 61 O.A., n’oge ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ nke mbụ ya na Rom. E zigara akwụkwọ ozi ya n’ọgbakọ nke o guzobeworo ihe dị ka afọ iri tupu mgbe ahụ na Filipaị, bụ́ obodo nke onye chọpụtara ya bụ Philip onye Macedon (nna Alexander Onye Ukwu). Ka ọ na-erula narị afọ mbụ O. A., ọ ghọwo “obodo bụ isi nke ókèala Masedọnia,” nke bụ akụkụ nke ebe ugwu Gris na ebe ndịda Yugoslavia ugbu a.—Ọrụ 16:11, NW.
Ndị kwere ekwe nọ na Filipaị bụ ndị ogbenye ma ha na-emesapụ aka. Ihe karịrị otu ugbo, ha ezigawo ihe iji gboo mkpa ndị Pọl nwere. (Ndị Filipaị 4:14-17) Ma akwụkwọ ozi ya abụghị nanị iji kelee ha. O nyekwara agbamume, gosipụta ịhụnanya ma nye ndụmọdụ.
Àgwà Ndị Kraịst Pụtara ìhè
Pọl ji ihe àmà nke ịhụnanya o nwere maka ndị kwere ekwe nọ na Filipaị malite. (1:1-30) O kelere Jehova n’ihi onyinye ha na-enye iji hụ na ozi ọma ahụ na-aga n’ihu ma kpee ekpere ka ịhụnanya ha hiwanye nne. Obi tọrọ Pọl ụtọ na mkpọrọ a tụrụ ya kpaliri ha igosi ‘inwebiga anya ike ókè n’ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.’ O nwere ọchịchọ nke isoro Kraịst nọrọ ma chee na ya ka nwekwara ozi ya pụrụ ijere ha. Pọl chọkwara ka ha nọgide “na-ewerekwa otu mkpụrụ obi lụkọọrọ okwukwe nke ozi ọma ahụ ọgụ sie ike.”
E mesịrị nye ndụmọdụ banyere àgwà na omume. (2:1-30) A gbara ndị Filipaị ahụ ume ka ha gosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ ma gosipụta obi umeala yiri nke Kraịst. Ha bụ “ndị na-enye ìhè n’ụwa,” a gbakwara ha ume ka ha nọgidesie ike “na-ejidesi okwu nke ndụ ike.” (NW) Pọl na-ele anya izigara ha Timoti ma nwee obi ike na ya onwe ya ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Iji mesie ha obi ike banyere Epafrọdaịtọs bụ́ onye rịasiworo ọrịa ike, Pọl na-ezitere ha onye ozi nke a na-anọgidesi ike n’ihe.
Nọgide Na-aga n’Ihu Irute Ihe Mgbaru Ọsọ ahụ
Onyeozi ahụ gara n’ihu igosi ndị Filipaị ebe ha ga-etinye obi ike ha ka ha na-aga n’ihu irute ihe mgbaru ọsọ ahụ. (3:1-21) A ga-etinye ya n’ebe Jisọs Kraịst nọ, ọ bụghị n’ebe anụ ahụ ma ọ bụ ibi úgwù dị, dị ka ụfọdụ ndị na-eme. Pọl lere ihe ndị o nwere n’anụ ahụ anya ịbụ ndị na-abaghị uru n’ihi “ọkịka nke ọmụma Kraịst.” Onyeozi ahụ ‘na-agbakwuru oké ịgba ọsọ ka o wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs,’ ma gbaa ndị Filipaị ume ka ha nwee otu ụdị echiche ahụ.
Itinye ndụmọdụ Pọl ji mechie okwu ya n’ọrụ ga-enyere ndị Filipaị aka ilegide ihe mgbaru ọsọ na ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ anya. (4:1-23) Ọ gbara ndị Filipaị ahụ ume ka ha site n’ekpere bufeere Chineke ihe nile bụ nchegbu ha ma were echiche ndị na-ewuli elu mejupụta uche ha. Ọzọkwa, Pọl jara ha mma n’ihi imesapụ aka ha ma jiri ekele na arịrịọ ka amara na-erughịrị mmadụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ nke ha na-egosi, mechie.
Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Filipaị na-akwalite mmesapụ aka, ịhụnanya, na ịdị umeala n’obi. Ọ na-agba ume inwe obi ike n’ebe Kraịst nọ, na ekpere sitere n’ala ala obi nye Chineke. N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, okwu ndị ahụ nke Pọl na-enyere Ndịàmà nke Jehova aka ịnọgịde na-aga n’ihu irute ihe mgbaru ọsọ ahụ maka ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi.
Igbe/Foto dị na peeji nke 25]
Irute Ihe Mgbaru Ọsọ ahụ: Pọl dere, sị: “M na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru oké ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 3:13, 14) Onyeozi ahụ na-agbalịsi ike dị ka onye na-agba ọsọ. Ọ tụfughị oge na mgbalị ya site n’ile anya n’azụ kama ọ gara n’ihu irute ihe mgbaru ọsọ ya—dị ka onye na-agba ọsọ na-agbalịsi ike ịgafe ebe njedebe nke ịgba ọsọ ya. Nye Pọl na ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ, ihe mgbata n’ọsọ ahụ bụ ndụ eluigwe site n’ibilite n’ọnwụ mgbe ha jisịrị ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ rụzuo ọrụ ha n’ụwa. Ma olileanya anyị ọ̀ bụ nke eluigwe ma ọ̀ bụ nke elu ala, ka anyị nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ebe Jehova nọ ma gaa n’ihu irute ihe mgbaru ọsọ ahụ dị ka Ndịàmà ya.—2 Timoti 4:7.