Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/1 p. 5-7
  • Olee Chi nke I Kwesịrị Ife?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Chi nke I Kwesịrị Ife?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Dị n’Azụ Chi Ụgha Nile
  • Mkpụrụ Ndị Ofufe Na-ezighị Ezi Na-amịpụta
  • N’ihi Gịnị Ka I Kwesịrị Iji Fee Jehova Chineke Ofufe?
  • Enyi Anyị Kasị Mma Nọ n’Ógbè Ndị Mmụọ
    Teta!—1996
  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Olee Chi Nke A ga-efe Ofufe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/1 p. 5-7

Olee Chi nke I Kwesịrị Ife?

NKE mbụ, ònye bụ otu Chineke ahụ nke kwesịrị ka e fee nanị ya ofufe? Bible na-aza n’ụzọ kwụ nnọọ ọtọ. Akwụkwọ Mkpughe na-ekwu, sị: “Gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” Nw] na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:11) Ee, Jehova, bụ́ Onye Okike ahụ, bụ nanị Chineke nke kwesịrị ịnata ofufe anyị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Anyị ga-abịaghachi n’ajụjụ ahụ n’oge na-adịghị anya. Ma ka anyị burugodị ụzọ kwuo okwu banyere chi ndị ọzọ ụmụ mmadụ na-efe ofufe.

Ihe Dị n’Azụ Chi Ụgha Nile

Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ na-efe ọtụtụ chi dị iche iche ofufe, eziokwu bụ na ofufe nile ha na-enye chi nile ná mba nile—e wezụgakwa ofufe nke a na-enye Jehova, bụ́ Onye Okike ahụ—na-emezu nzube nke nanị otu chi. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Gụọ okwu ndị ahụ Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint. N’obodo ahụ, a na-efe ọtụtụ chi dị iche iche ofufe, site n’Aphrodite ahụ nke na-akwado omume rụrụ arụ ruo n’Aesculapius, bụ́ chi ha nke ọgwụgwọ ọrịa. Otú ọ dị, Pọl gosiri na e nwere n’ezie nanị otu ajọ ikike n’azụ chi ndị ahụ nile. O dere, sị: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa Chineke ka ha na-achụrụ.” (1 Ndị Kọrint 10:20) Ee, ndị Kọrint ahụ na-ekpere arụsị na-efe ndị mmụọ ọjọọ ofufe.

Ndị mmụọ ọjọọ nwere mmalite ha ná nnupụisi. Nke mbụ, nke kasịkwa ukwuu n’ime ha bụ mmụọ ozi ahụ e kere eke nke rafuru Iv gaa n’imebi iwu Chineke laa azụ n’ogige Iden. (Jenesis 3:1-6; Jọn 8:44) N’ime nke a, onye nke a e kere eke nupụrụ isi megide ịbụ ọkaaka nke Onye Okike ahụ. Mgbe e mesịrị, a malitere ịkpọ ya Setan, nke pụtara “Onye Nguzogide.” Mgbe e mesịrị, mmụọ ndị ọzọ e kere eke sonyeere ya ná nnupụisi. Ha onwe ha ghọkwara ndị mmụọ ọjọọ, a kọwakwara Setan dị ka “onye isi ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 12:24, 26) N’akwụkwọ Mkpughe, a kpọrọ mmụọ ọjọọ ndị a “ndị mmụọ ozi” nke Setan. (Mkpughe 12:7) Ya mere, ife ndị mmụọ ọjọọ ofufe bụ otu ihe ahụ ya na ife Setan ofufe.

Setan nwere ike dị ukwuu. Jọn onyeozi sịrị na “ụwa dum” na-atọgbọ n’aka ya, Pọl kpọkwara ya “chi nke oge a.” (1 Jọn 5:19; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ya mere, ife chi ọ bụla ọzọ na-abụghị Jehova ofufe bụ n’ezie ife Setan ofufe. A sị nnọọ na ọ dịghị ihe o mere, ọ na-emezu nzube nile nke Setan n’ihi na ihe mgbaru ọsọ ya bụ ịrafu ụmụ Adam na Iv gaa n’inupụ isi megide Jehova. Ebe ọ bụ na Setan “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” o doro anya na o nwewo ihe ịga nke ọma n’ebe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nọ. (Mkpughe 12:9) Ma ọ bụghị n’ebe mmadụ nile nọ. A ka nwere ọtụtụ nde ndị na-agbalịsi ike ife Jehova ofufe. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Mkpụrụ Ndị Ofufe Na-ezighị Ezi Na-amịpụta

Otu ihe bụ na ha maara na ife chi ndị na-abụghị Jehova ofufe na-ewe ihe karịrị ihe ha dị njikere imefu. Ngwupụta e mere iji chọpụta ihe mgbe ochie n’obodo Carthage oge ochie nke dị n’Ebe Ugwu Africa gosiri mbara ala ebe a na-eli ụmụntakịrị. A chọtara n’ime ya nchịkọta ọkpụkpụ nke ụmụntakịrị ndị e ji chụọrọ chi ndị Finisia ahụ bụ Beal àjà. Àjà e ji ụmụntakịrị na-achụ bụ ụgwọ dị egwu ndị Carthage ahụ kwụrụ n’ihi ofufe ha fere Beal. Okpukpe Katọlik nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya fukwara ndị mmadụ ihe dị ukwuu mgbe ọ kpatara ntaramahụhụ dị egwu n’Agha Ntụte ndị ahụ a wụfuru ọbara dị ukwuu na ha nakwa ná Njụta Okwukwe ndị ahụ e ji oké obi ọjọọ mee. Ofufe e fere chi dị iche iche nke ndị Inca n’America tupu oge Columbus gụnyekwara igbu ọtụtụ puku mmadụ n’ihe omume ofufe ha.

N’oge ndị na-etechabeghị anya n’oge anyị a, ụdị ofufe dị iche iche akpatawokwa mgbukpọ nke ọtụtụ mmadụ n’India, ha etinyewokwa aka n’ịkpata ajọ nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị e nwere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ugwu Ireland. E kwesịkwara ịgụnye amaghị ihe, nkwenkwe ụgha, na egwu dị ka akụkụ nke ụgwọ mmadụ na-akwụ n’ihi ofufe ọ na-efe ọtụtụ chi dị iche iche.

N’ihi Gịnị Ka I Kwesịrị Iji Fee Jehova Chineke Ofufe?

N’aka nke ọzọ, ife Jehova na-eweta nanị abamuru. Otu ihe bụ na ọ bụ “Onye ahụ nke na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, bụ́ onye kere eluigwe na ihe nile dị ya n’ime, na ụwa na ihe nile dị ya n’ime, na oké osimiri na ihe nile dị ya n’ime.” (Mkpughe 10:6) Otú a, anyị kwesịrị ife ya ofufe n’ihi na ọ bụ Onye Kere anyị.

Ọzọkwa, anyị kwesịrị ife Jehova Chineke n’ihi na àgwà ya nile na-akpọ anyị òkù ife ya ofufe. Jọn onyeozi kwuru na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ Job kwuru na “[Chineke] nwere obi nke maara ihe, ọ dịkwa ukwuu n’ike.” (Job 9:4, NW) Mosis bụrụ abụ banyere ya, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ: n’ihi na ụzọ ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ònye ga-ala azụ n’ijere Chineke nke dị otú ahụ ozi?

Tụkwasị na nke ahụ, Bible na-asị: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Lee nnọọ ka nke a si bụrụ eziokwu! Jehova chọrọ ka ihe a kpọrọ mmadụ nweta ihe dị mma. O dokwara elu ala dị ka ebe obibi mara mma maka ihe o kere eke, o nyekwara ihe n’ụba ka ndụ wee bụrụ ihe obi ụtọ. N’agbanyeghị nnupụisi nke mmadụ, Chineke anọgidewo na-akwado ndụ n’elu ala nke a, na-eme ka e nweta ihe nile dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa ka “ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.”—Matiu 5:45.

Ma ‘nkwa nke ndụ ugbu a’ karịrị nke ahụ. Ijere Chineke ozi bụ ihe na-enye afọ ojuju. Ọ bụ ihe e bu n’uche wee mee anyị. Chineke na-enyekwara ndị ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ. Site na Bible, ọ na-enye nduzi dịịrị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ndị lụworo di na nwunye, ụmụntakịrị—ndị nọ n’ọnọdụ nile nke ndụ. Ọ na-enye amamihe a pụrụ ịdabere na ya, nke a pụkwara iji mee ihe, iji nye aka n’ọnọdụ nile ka anyị wee nwee ike igbo mkpa nile a na-enweta ná ndụ dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ime ụwa nke nọ n’okpuru ike Setan. Ọ bụrụ na anyị efee Chineke n’ụzọ na-amasị ya, anyị pụrụ inweta “udo nke Chineke, nke kachasi uche nile.”—Ndị Filipaị 4:7

O kwesịkwara ịrịba ama, bụ́ “nkwa nke ndụ . . . nke gaje ịbịa.” Jịsọs gwara onye Farisii ahụ bụ Nikọdimọs, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ndụ ebighị ebi! Olee chi ọzọ ma ọ bụghị Jehova, nke pụrụ ikwe nkwa ihe dị otú ahụ ma mezuo nkwa ya? A kọwara ọnọdụ ikpeazụ nke ndị na-anata oké onyinye ahụ ná Mkpughe, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:4, 5) N’eziokwu, olileanya nke ndụ nke gaje ịbịa kwesịrị ịkpali anyị ịchọ ijere Jehova ozi!

Ya mere, olee Chi nke i kwesịrị ife? Ọ bụ nanị Jehova, bụ́ Onye Okike ahụ. N’etiti ndị nile bụ chi, ọ bụ nanị ya ka okwu ndị ahụ metụtara, bụ́: “Ọrụ gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, gị eze nke mba nile [“Eze mgbe ebighị ebi,” NW]. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], tookwa aha gị? N’ihi na nanị gị dị ọcha n’obi; n’ihi na mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu gị; n’ihi na e mere ka ezi omume gị nile pụta ìhè.” (Mkpughe 15:3, 4) Lee nnọọ ka o si bụrụ amamihe nye ndị nile na-azaghachi n’agbamume onye ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Batanụ, ka anyị kpọọ isiala huruokwa ala; ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova Onye meworo anyị”!—Abụ Ọma 95:6.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ụfọdụ n’ime chi ndị Setan kpaliworo ihe a kpọrọ mmadụ ife

[Foto dị na peeji nke 7]

Olileanya nile nke ndụ nke gaje ịbịa kwesịrị ime ka anyị chọọ ijere Jehova ozi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya