Sọpụrụ Jehova—n’Ihi Gịnị, Ọ̀ Bụkwa n’Ụzọ Dị Aṅaa?
“Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma a ga-akpọ ha ihe efu, bụ́ ndị na-elelị m.”—1 SAMUEL 2:30.
1. Olee ndị a na-enye onyinye Nobel ndị ahụ a mazuru n’ụwa dum, oleekwa ụzọ ọtụtụ ndị si ele onyinye ndị a anya?
KWA afọ, òtù anọ ndị dị na Scandinavia na-enye ndị ‘wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ abamuru kasị ukwuu n’afọ gaferenụ’ onyinye Nobel. A na-enye onyinye ndị ahụ n’ihi imezu oké ihe n’ihe omume isii dị iche iche. Ọtụtụ ndị na-ele onyinye Nobel anya dị ka nsọpụrụ kasị elu a pụrụ inye mmadụ ọ bụla.
2. Ònye ka ndị na-enye onyinye Nobel na-elefuru anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka O ji kwesị ekwesị inweta nsọpụrụ?
2 Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe dị njọ n’inye ụmụ mmadụ ndị kwesịrị ekwesị nsọpụrụ, ndị na-enye nsọpụrụ ndị a hà na-echekwa echiche ọ bụla banyere inye Onye kasị na-emere ihe a kpọrọ mmadụ ihe ọma nsọpụrụ? Onye ahụ na-eme ihe ọma bụ onye nke wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ abamuru kemgbe okike o kere nwoke na nwanyị mbụ ahụ n’ihe dị ka 6,000 afọ gara aga. Ọdịda a na-ada ọtụtụ mgbe n’inye ya nsọpụrụ pụrụ ichetara anyị okwu Elaịhu, bụ́ enyi nke Job oge ochie, onye kwuru, sị: “Ma ọ dịghị onye sịrị, Olee ebe Chineke nọ, bụ́ onye mere m, onye na-enye abụ ọma n’abalị?” (Job 35:10) Onye ukwu ahụ na-emere anyị ihe ọma nọgidere ‘na-eme ezi ihe, na-enye mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ, jiri ihe oriri na ọṅụ na-emejupụta obi anyị.’ (Ọrụ 14:16, 17; Matiu 5:45) Jehova bụ n’ezie Onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.”—Jemes 1:17.
Ihe Ọ Pụtara Inye Nsọpụrụ
3. Gịnị bụ okwu ndị bụ isi dị n’asụsụ Hibru na Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “nsọpụrụ,” gịnịkwa ka ha pụtara?
3 Okwu Hibru bụ isi nke dịịrị nsọpụrụ, bụ́ ka·vohdhʹ, pụtara n’ụzọ nkịtị “ịdị arọ.” Ya mere a na-ele onye a na-enye nsọpụrụ anya dị ka onye dị arọ, onye dị ukwuu, ma ọ bụ onye nwere ihe ọ bụ. N’ụzọ pụtara ìhè, a na-asụgharịkwa otu okwu Hibru nke a bụ ka·vohdhʹ ọtụtụ ugbo n’Akwụkwọ nsọ dị ka “otuto,” bụ́ nke na-aga n’ihu igosi otú e si na-ele onye ahụ a na-enye nsọpụrụ anya dị ka onye dị ukwuu ma ọ bụ onye dị mkpa. Okwu Hibru ọzọ bụ yeqarʹ, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “nsọpụrụ” n’ime Akwụkwọ nsọ, bụkwa nke a na-asụgharị ịbụ “dị oké ọnụ ahịa” na “ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.” Ya mere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e jikọtara okwu ahụ bụ nsọpụrụ n’ebe otuto na ịdị oké ọnụ ahịa dị. Okwu Grik nke a sụgharịrị ịbụ “nsọpụrụ” n’ime Bible bụ ti·meʹ, ọ na-enyekwa echiche nke ihe e ji kpọrọ ihe, ihe bara uru, ihe dị oké ọnụ ahịa.
4, 5. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ inye mmadụ nsọpụrụ? (b) Ọnọdụ dị aṅaa nke a kọrọ akụkọ ya n’Esta 6:1-9 na-eme ihe atụ ihe inye nsọpụrụ gụnyere?
4 Otú a, mmadụ na-enye onye ọzọ nsọpụrụ site n’igosi onye ahụ nkwanye ùgwù dị omimi na iji onye ahụ kpọrọ ihe. Iji mee ihe atụ, tụlee ọnọdụ ahụ a kọrọ akụkọ ya na Bible banyere onye Juu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Mọdekaị. N’otu mgbe, Mọdekaị kpughere atụmatụ e mere igbu Eze Ahasuerọs nke Peasia oge ochie. Mgbe oge gasịrị, n’ime abalị mgbe eze ahụ na-apụghị ihi ụra, a kọọrọ eze ahụ banyere ihe Mọdekaị mere. Ya mere ọ jụrụ ndị na-ejere ya ozi, sị: “Nsọpụrụ na ịdị ukwuu gịnị ka e meere Mọdekaị n’ihi ihe a?” Ha zara, sị: “Ọ dịghị ihe e meere ya.” Lee nnọọ ka nke a si metụ ya n’ahụ! Mọdekaị azọpụtawo ndụ eze ahụ, ma eze ahụ egosibeghị obi ekele ya.—Esta 6:1-3.
5 N’ihi ya, mgbe oge kwesịrị ekwesị rutere, Ahasuerọs jụrụ onye isi ndị ọchịchị bụ Heman ụzọ kasị mma a ga-esi nye onye eze nweworo mmasị n’ahụ ya nsọpụrụ. Ozugbo ahụ Heman chere n’ime obi ya, sị: “Ònye ka ọ na-atọ eze ụtọ inye nsọpụrụ karị m?” Ya mere Heman kwuru na e kwesịrị iyikwasị onye ahụ “uwe alaeze,” ka ọ nọkwasịkwa n’elu “ịnyịnya nke eze nọkwasịworo.” O mechiri okwu ya, na-asị: “Ka ha meekwa ka ịnyịnya buru ya gaa n’ámá obodo, ka ha kpọọkwa n’ihu ya, sị, Otú a ka a ga-emere nwoke ahụ nke nsọpụrụ ya tọworo eze ụtọ.” (Esta 6:4-9) Ndị nile ga-eji onye e nyere nsọpụrụ n’ụzọ dị otú ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu.
Ihe Mere Jehova Ji Kwesị Inweta Nsọpụrụ
6. (a) Ònye, karịa ndị ọzọ nile kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị? (b) N’ihi gịnị ka okwu ahụ bụ “dị ukwuu” ji kwesị nnọọ ekwesị iji kọwaa Jehova?
6 N’akụkọ ihe mere eme nile, a nọwo na-enye ụmụ mmadụ nsọpụrụ, ọtụtụ mgbe ọ na-abụkwa nke na-erughịrị ha. (Ọrụ 12:21-23) Ma ònye, karịsịa ndị ọzọ nile, kwesịrị ekwesị inweta nsọpụrụ? Ee, ọ bụ Jehova Chineke! O kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị n’ihi na o doro anya na ọ bụ onye dị ukwuu. Ọtụtụ mgbe, a na-eji okwu ahụ bụ “ukwu” (NW) na-eme ihe banyere ya. Ọ bụ Onye Ukwu ahụ, Onye Ukwu ahụ Na-eme Ihe, Onye Okike Ukwu, Eze Ukwu, Onye Ozizi Ukwu, Onye Ukwu Nwe Mmadụ. (Abụ Ọma 48:2; Eklisiastis 12:1; Aịsaịa 30:20; 42:5; 54:5; Hosea 12:14) Onye dị ukwuu bụ onye dị ebube, dị ùgwù, bụrụ onye e buliri elu, onye kwesịrị nsọpụrụ, onye a ma ama n’ihi ihe o meworo, na onye na-akpali egwu. Jehova enweghị ihe ọ bụla e ji atụnyere ya, o nweghị onye ya na ya hà nhata, ọ karịrị ihe nile elu. Ya onwe ya na-agbara eziokwu ahụ àmà, na-asị: “Ònye ka unu ga-asị na m yiri ya, na mụ na ya hara nhata, na mụ dị ka ya, ka anyị wee yie?”—Aịsaịa 46:5.
7. Ya dịkarịa ala, n’ụzọ ole dịgasị iche iche ka a pụrụ ikwu na Jehova Chineke pụrụ iche, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ bụ onye na-enweghị atụ n’ihe banyere ikike o nwere?
7 Jehova Chineke enweghị atụ ma ọ dịkarịa ala n’ụzọ asaa pụtara ìhè bụ́ ndị na-enye anyị ihe ndị e ji n’aka mere a ga-eji sọpụrụ ya. Nke mbụ, Jehova Chineke kwesịrị ịnata nsọpụrụ kasị elu n’ihi na ọ bụ onye na-enweghị atụ n’inwe ikike. Onyenwe anyị Jehova bụ Eze Eluigwe na Ala—ọ bụ onye kasị elu. Ọ bụ Onye Ikpe anyị, Onye na-enye anyị iwu, na Eze anyị. Ndị nile nọ n’eluigwe na n’elu ala ga-aza ajụjụ n’ihu Ya; ma ọ dịghị onye ọ bụla ọ ga-aza ajụjụ n’ihu ya. A kọwara ya nke ọma dị ka onye “ukwu ahụ, bụ́ dike, dịkwa egwu.”—Deuterọnọmi 10:17; Aịsaịa 33:22; Daniel 4:35.
8. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova enweghị ihe e ji atụnyere ya (a) n’ihe banyere ọnọdụ ya? (b) n’ihe banyere ịdị ebighị ebi ya?
8 Nke abụọ, Jehova Chineke kwesịrị ịnata nsọpụrụ kachasị elu n’ihi na ọ bụ onye na-enweghị atụ n’ihe banyere ọnọdụ ya. Ọ bụ “Onye dị elu, Nke e mekwara ka Ọ dị elu,” Onye Kachasị Ihe Nile Elu. Ọ dị elu nke ukwuu n’ụzọ a na-apụghị icheta n’echiche karịa ihe nile o kere eke n’elu ala! (Aịsaịa 40:15; 57:15; Abụ Ọma 83:18) Nke atọ, e kwesịrị inye Jehova Chineke nsọpụrụ karịa ndị ọzọ nile n’ihi na o nweghị ihe a ga-eji tụnyere ya n’ihe banyere ịdị ebighị ebi ya. Ọ bụ nanị ya bụ onye na-enweghị mmalite, onye na-adị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 90:2; 1 Timoti 1:17.
9. N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na Jehova enweghị atụ (a) n’ihe banyere ebube ya? (b) n’ihe banyere àgwà ya ndị bụ isi?
9 Nke anọ, Jehova Chineke kwesịrị inweta nsọpụrụ kachasị elu n’ihi ịdị ukwuu nke ebube onwe onye ya. Ọ bụ “Nna nke ìhè.” Ọdịdị onwe onye ya na-egbukepụ egbukepụ nke na ọ dịghị mmadụ pụrụ ịhụ ya ma dị ndụ. N’ezie ọ bụ onye na-akpali egwu. (Jemes 1:17; Ọpụpụ 33:22; Abụ Ọma 24:10) Nke ise, anyị ji Jehova Chineke ụgwọ nsọpụrụ kasị elu n’ihi àgwà ya ndị dị ebube. Ọ bụ onye ji ike nile, onye a na-akpaghịrị ike ya ókè; ọ bụ onye mazuru ihe nile, onye a na-akpaghịrị amamihe ya ókè; ọ bụ onye zuru nnọọ okè n’ikpe ziri ezi; ọ bụkwa ịhụnanya n’onwe ya.—Job 37:23; Ilu 3:19; Daniel 4:37; 1 Jọn 4:8.
10. Olee ụzọ o si bụrụ na Jehova enweghị onye ya na ya hà (a) n’ihe banyere ọrụ okike na ihe onwunwe? (b) n’ihe banyere aha na otuto ya?
10 Nke isii, Jehova Chineke kwesịrị inweta nsọpụrụ kasị elu a pụrụ inye ya n’ihi oké ọrụ okike ihe ya dị iche iche. Dị ka Onye Kere ihe nile dị n’eluigwe na n’elu ala, n’otu mgbe ahụ, ọ bụ Onye Ukwu Nwe Ihe Nile. Anyị na-agụ n’Abụ Ọma 89:11, sị: “Gị nwe eluigwe, gị nwekwa ụwa.” Nke asaa, Jehova bụ Chineke anyị kwesịrị ịnata nsọpụrụ karịa ndị ọzọ nile n’ihi na ọ bụ onye na-enweghị atụ, onye na-enweghị onye yiri ya n’ihe banyere aha na otuto ya. Ọ bụ nanị ya nwere aha ahụ bụ Jehova, nke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Dị.”—Lee Jenesis 2:4, (NW) nkọwa ala ala peji.
Ụzọ E Si Asọpụrụ Jehova
11. (a) Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi sọpụrụ Jehova? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-asọpụrụ Jehova n’ezie site n’ịtụkwasị ya obi?
11 N’iburu àgwà nile nke Jehova n’uche, olee ụzọ anyị pụrụ isi sọpụrụ ya? Dị ka anyị gaje ịhụ, anyị pụrụ ịsọpụrụ ya site n’igosi ya egwu na nsọpụrụ dị omimi, site n’irubere ya isi, site n’ikwenyere ya n’ụzọ anyị nile, site n’inye onyinye, site n’iṅomi ya, sitekwa n’ịrịọ ya arịrịọ. Anyị pụkwara ịsọpụrụ ya site n’itinye okwukwe n’ebe ọ nọ, site n’ịtụkwasị ya obi n’agbanyeghị ihe merenụ. A na-agba anyị ume, sị, “Tụkwasị Jehova obi gị nile.” Ya mere anyị na-asọpụrụ Jehova Chineke site n’ịtụkwasị obi n’ihe o kwuru. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Atụla egwu, gị ka m nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na mụ onwe m bụ Chineke gị: m ga-agba gị ume; ee, m ga-enyere gị aka.” (Ilu 3:5; Aịsaịa 41:10) Ịghara ịtụkwasị ya obi kpam kpam ga-abụ enyeghị ya nsọpụrụ.
12. Ọrụ dị aṅaa ka nrubeisi na egwu na-arụ n’ịsọpụrụ Jehova?
12 Ụzọ yiri nnọọ nke a anyị na-esi enye Jehova Chineke nsọpụrụ bụ site n’irubere ya isi. Ịtụ egwu Chineke dịkwa oké mkpa ná nrubeisi, ee, ịtụ egwu ime ihe na-amasịghị Chineke. Okwu ndị ahụ Jehova gwara Abraham mgbe Abraham jisịrị nrubeisi nwaa iji Aịsak, bụ́ nwa ya, chụọ àjà, na-egosi njikọ dị n’etiti ịtụ egwu na irube isi. Jehova sịrị, “Ugbu a ka m maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ.” (Jenesis 22:12) Mgbe ọ na-atụle ihe ụmụntakịrị ji ndị mụrụ ha ụgwọ ya, Pọl onyeozi gosikwara na irube isi na inye nsọpụrụ na-agakọ. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ya mere, site n’irube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu, bụ́ ndị na-adịghị arọ, anyị na-asọpụrụ Jehova. Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na inupụrụ Jehova Chineke isi ga-abụ enyeghị ya nsọpụrụ.—1 Jọn 5:3.
13. Ịsọpụrụ Chineke ga-eme ka anyị nwee omume dị aṅaa n’ihe banyere ọrụ na atụmatụ anyị nile?
13 N’ịga n’ihu, anyị pụrụ iwetara Jehova Chineke nsọpụrụ kwesịịrị ya site n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị n’Ilu 3:6: “N’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” Onye na-eso ụzọ bụ Jemes na-enye anyị ezi ndụmọdụ n’ụzọ kwekọrọ na nke a. Kama ịga n’ihu na-atụkwasị onwe anyị obi site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, na-atụkwasị obi n’ikike anyị nwere n’onwe anyị, anyị kwesịrị ikwu, sị: “A sị na Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] chọrọ, anyị ga-adị ndụ, meekwa ihe a ma ọ bụ ihe ahụ.” (Jemes 4:15) N’ọtụtụ afọ gara aga, ọ bụ omenala Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile ịgbakwunye n’okwu ọ bụla metụtara ọdịnihu ndebiri okwu ahụ bụ D.V., nke nọchiri anya Deo volente, nke pụtara “Ọ bụrụ na Chineke kwe.”
14. (a) Àgwà dị aṅaa nke metụtara mgbalị anyị nile ka anyị na-aghaghị inwe ka anyị wee na-asọpụrụ Chineke? (b) Àgwà dị aṅaa ka e gosipụtara n’ihe banyere ibipụta akwụkwọ ndị Watch Tower Society?
14 Anyị na-asọpụrụkwa Jehova Chineke site n’igosipụta àgwà obi umeala, na-enye Chineke otuto maka ihe ịga nke ọma ọ bụla anyị pụrụ inwe. Pọl onyeozi kwuru n’ụzọ ziri ezi banyere ije ozi ya, sị: “Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, onye na-eme ka ọ na-aba ụba, bụ ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) N’eziokwu, Pọl chọsiri ike iwere nsọpụrụ ahụ ruru eru nye Chineke, ọ bụghị nye ya onwe ya ma ọ bụ nye mmadụ ọ bụla ọzọ. Otú a, n’oge a, akwụkwọ ndị Watch Tower Society na-ebipụta adịghị eme ka a mara ndị dere ha, ndị na-eso ede ha adịghị ekwekwa ka ndị ọzọ mara òkè ha kereworo. N’ụzọ dị otú a, a na-atụkwasị uche n’ihe ọmụma ahụ, bụ́ nke e dokwara iji sọpụrụ Jehova, ọ bụghị n’ebe mmadụ ọ bụla nọ.
15. Ahụmahụ dị aṅaa na-eme ihe atụ nke ihe isi ike ụfọdụ ndị na-enwe n’ịghọta ịdị umeala n’obi nke Ndịàmà Jehova?
15 Ụkpụrụ echiche nke a nke ịtụkwasị uche n’ebe Jehova nọ, wee si otú a na-enye ya nsọpụrụ, na-abụrụ ụfọdụ ndị ihe ịtụnanya. N’afọ ole na ole gara aga, mgbe ha na-eguzobe ígwè e ji ekwu okwu maka okwu ihu ọha a gaje ikwu n’ogige Central Park nke dị na New York City, Ndịàmà nọ na-akpọ otu kaseti Kingdom Melodies iji nwalee ígwè okwu ahụ. Otu di na nwunye ndị jikere nnọọ nke ọma jụrụ otu n’ime Ndịàmà ahụ ihe egwu ahụ bụ. N’iche na di na nwunye ahụ bụ Ndịàmà, ọ zaghachiri, sị: “Nke ahụ bụ Kingdom Melodies No. 4.” Ha jụrụ, sị, “Ee, ma ọ̀ bụ onye haziri egwu ahụ?” Onyeàmà ahụ zaghachiri, sị: “Oo, e depụtaghị aha onye haziri ya.” Di na nwunye ahụ zaghachiri, sị: “Ndị na-ahazi egwu dị otú ahụ adịghị eme ya otú a na-agaghị ama aha ha.” Onyeàmà ahụ zara, sị: “Ma Ndịàmà Jehova na-eme otú ahụ.” Ee, ha na-eme nke a ka nsọpụrụ wee gaara Jehova Chineke!
16. Olee ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi jiri olu anyị wetara Jehova Chineke nsọpụrụ?
16 Ụzọ ọzọ a na-esi asọpụrụ Jehova bụ site n’iji egbugbere ọnụ anyị na-agba àmà banyere ya. Ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị n’ezie banyere iwetara ya nsọpụrụ, mgbe ahụ anyị ga na-eme ihe nile anyị pụrụ ime iji gbasaa ozi ọma banyere Alaeze ahụ. Anyị pụrụ ime nke a site n’ịga n’ụlọ ruo n’ụlọ, sitekwa n’ụzọ ọ bụla ọzọ anyị pụrụ isi mee ihe, n’elefurughị ohere ndị na-adapụta maka ịgba àmà mberede anya. (Jọn 4:6-26; Ọrụ 5:42; 20:20) Tụkwasị na nke a, anyị nwere ohere dị iche iche iji olu anyị nye Chineke anyị nsọpụrụ ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ, ma site n’ịza ajụjụ, sitekwa n’isonye n’iji obi anyị nile na-abụ abụ Alaeze anyị dị iche iche. (Ndị Hibru 2:12; 10:24, 25) Ná nkwurịta okwu anyị na-enwe kwa ụbọchị, anyị pụkwara iji egbugbere ọnụ anyị sọpụrụ Jehova Chineke. N’emeghị mgbalị dị ukwuu, anyị pụrụ iduru mkparịta ụka ahụ gaa n’ihe ime mmụọ ndị na-ewuli elu, nke a ga-arụpụtakwa iwetara Jehova Chineke nsọpụrụ.—Abụ Ọma 145:2.
17. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ezi akparamagwa nwere ná nsọpụrụ anyị na-enye Jehova? (b) Mmetụta dị aṅaa ka àgwà ọjọọ nwere?
17 Ọ bụ ezie na ọ dị mma iji egbugbere ọnụ anyị na-asọpụrụ Jehova Chineke, ọ dịkwa mkpa ịsọpụrụ ya site n’akparamagwa anyị. Jisọs katọrọ ndị ahụ ndị, ọ bụ ezie na ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ Chineke, ma ha bụ ndị obi ha dị anya n’ebe Ọ nọ. (Mak 7:6) Àgwà ọjọọ adịghị enye Jehova Chineke nsọpụrụ ma ọlị. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Rom 2:23, 24, anyị na-agụ, sị: “Gị onye na-anya isi n’iwu, ị̀ na-eme Chineke ihe ihere site ná njehie gị n’iwu ahụ? N’ihi na a na-ekwulu aha Chineke n’etiti ndị mba ọzọ n’ihi unu.” N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, a chụpụwo ọtụtụ puku mmadụ site n’ọgbakọ dị iche iche nke ndị Jehova. Ma eleghị anya, ọbụna ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ndị tinyere aka n’àgwà na-adịghị enye nsọpụrụ abụwo ndị a na-achụpụghị n’ọgbakọ n’ihi na ha gosiri omume nke ezi nchegharị. Ndị a nile anọwo jiri egbugbere ọnụ ha na-enye Jehova nsọpụrụ, ma ha emeghị otú ahụ site n’àgwà ha.
18. (a) Ka ha wee gosi Jehova nsọpụrụ ruuru ya, nchegbu dị aṅaa ka ụfọdụ ndị nwere ọnọdụ dị mma nke ukwuu na-aghaghị inwe? (b) Olee ụzọ ọnọdụ nke ụfọdụ ndị nchụàjà n’oge Malakaị si eme ihe atụ mkpa ọ dị inwe nchegbu?
18 Ndị ahụ nọ n’ọrụ ná ngalaba dị iche iche nke ozi oge nile—ma ọ bụ na Betel, n’ọrụ njegharị ma ọ bụ n’ozi ala ọzọ, ma ọ bụ dị ka ndị ọsụ ụzọ—bụ ndị nọ n’ọnọdụ dị mma nke ukwuu n’ihe banyere ohere ndị ha nwere ịtụnye ụtụ ná nsọpụrụ Jehova. Ihe ha nwere bụ ibu ọrụ nke ime ihe kasị mma ha pụrụ ime n’ụdị ọrụ ọ bụla e kenyere ha, na-abụ ‘ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe dị nta dịkwa ka n’ihe dị ukwuu.’ (Luk 16:10) N’ụzọ ụfọdụ, ndị nchụàjà na ndị Livaị n’Israel oge ochie mere ihe atụ ọnọdụ ha nke kwesịrị nsọpụrụ, ọ bụ ezie na o seghị onyinyo ya. Otú ọ dị, n’ihi elezighị anya nke ụfọdụ ndị nchụàjà n’oge Malakaị, Jehova gwara ha, sị: “Ọ bụrụkwa na nna ka m bụ, olee ebe nsọpụrụ m dị? Ọ bụrụkwa na onyenwe mmadụ ka m bụ, olee ebe egwu m dị?” (Malakaị 1:6) Ndị nchụàjà ndị ahụ na-eleda aha Chineke anya site n’ịchụ àjà anụmanụ ndị kpuru ìsì, ndị dara ngwụrọ, na ndị na-arịa ọrịa, na-eche na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ha. Ọ gwụla nanị ma ndị ahụ nwere ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche taa hà gbalịsiri ike ime ihe kachasị mma ha nwere ike ime, ha onwe ha, karịsịa, pụrụ iru eru ịnata nkatọ ahụ Jehova nyere ndị nchụàjà ndị ahụ. N’ime nke ahụ, ha agaghị na-emezu ihe a chọrọ ha n’aka iji nye Chineke nsọpụrụ.
19. (a) Dị ka e hotara n’Ilu 3:9, gịnị bụ ụzọ ọzọ e si asọpụrụ Jehova? (b) Gịnị bụ ụzọ ọzọ dị oké mkpa e si asọpụrụ Jehova?
19 Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi nye Jehova Chineke nsọpụrụ bụ site n’inye onyinye ego iji kwadoo ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ nke o nyeworo ikike ka a rụọ. A na-agba anyị ume, sị, “Sọpụrụ Jehova site n’akụ gị, sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị nile.” (Ilu 3:9) Ihe ùgwù nke inye onyinye ndị dị otú ahụ bụ ohere ịsọpụrụ Chineke nke onye ọ bụla na-ekwesịghị ilefuru anya. Anyị pụkwara inye Jehova nsọpụrụ site n’ekpere anyị, na-enye ya otuto, na-ekelekwa ya. (1 Ihe Emere 29:10-13) N’eziokwu, n’ihi na anyị na-eji obi dị umeala na-abịakwute ya, na-eji nkwanye ùgwù dị omimi, nanị mbịakwute anyị na-abịakwute Chineke n’ekpere bụ inye ya nsọpụrụ.
20. (a) Òle ndị ka ndị ụwa na-enyekarị nsọpụrụ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? (b) Site n’irube isi n’iwu dị aṅaa ka anyị pụrụ inyekwu Jehova nsọpụrụ?
20 Taa, ọtụtụ ndị, karịsịa ndị ntorobịa, na-asọpụrụ ndị ha nwere mmasị na ha site n’iṅomi ha—site n’ikwu okwu otú ha si ekwu, sitekwa n’ime otú ha si eme. Ndị ha na-eṅomi na-abụkarị ndị a ma ama n’egwuregwu ma ọ bụ ndị na-eme nke ọma n’ihe omume ntụrụndụ. Kama nke a, dị ka ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịsọpụrụ Jehova Chineke site n’ịgbalịsi ike iṅomi ya. Pọl onyeozi gbara anyị ume ime otú ahụ, na-ede, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.” (Ndị Efesọs 5:1, 2) Ee, site n’ịgbalị iṅomi Jehova, anyị na-asọpụrụ ya.
21. (a) Gịnị ga-akwadebe anyị inye Jehova otuto na nsọpụrụ? (b) Gịnị bụ ụgwọ ọrụ Jehova na-enye ndị ahụ na-asọpụrụ ya?
21 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ, anyị kwesịkwara, isi nye Chineke otuto na nsọpụrụ. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na site n’iji Okwu ya na-azụ onwe anyị mgbe nile, na-amatakwa ya nke ọma karị, anyị ga-enwe ike karị ịsọpụrụ ya. Gịnị bụ ụgwọ ọrụ dị n’ime otú ahụ? Jehova sịrị, “Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ.” (1 Samuel 2:30) Jehova ga-emesịa sọpụrụ ndị na-efe ya ofufe site n’inye ha ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ, ma ọ bụ n’eluigwe dị ka ndị ha na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-achị achị, ma ọ bụ n’elu ala nke bụ Paradaịs.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Òle ndị ka ụmụ mmadụ na-enyekarị nsọpụrụ, ònyekwa ka ha na-elefurukarị anya ịsọpụrụ?
◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ inye mmadụ nsọpụrụ, oleekwa ụzọ ndị a pụrụ isi mee ya?
◻ Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ kpatara Jehova Chineke ji kwesị inweta nsọpụrụ?
◻ Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi sọpụrụ Jehova?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova na-esi enyeghachi ndị na-asọpụrụ ya ụgwọ ọrụ?