Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 16-21
  • Na-egosinụ Ndị Ọzọ Nsọpụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-egosinụ Ndị Ọzọ Nsọpụrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-akwanyere Ụmụ Mmadụ Ùgwù
  • Jisọs Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù
  • Pọl Gosiri Nkwanye Ùgwù
  • Igosi Nsọpụrụ n’Oge Anyị
  • Ịsọpụrụ Jehova
  • Sọpụrụ Ụdị Mmadụ Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Sọpụrụ Jehova—n’Ihi Gịnị, Ọ̀ Bụkwa n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Na-asọpụrụ Ndị E Kwesịrị Ịsọpụrụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Ịsọpụrụ Ụmụnna Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 16-21

Na-egosinụ Ndị Ọzọ Nsọpụrụ

“N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.”—NDỊ ROM 12:10.

1, 2. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị ịdị na-eme iji gosipụta obi dị umeala anyị? (b) Olee otú Bible si ejikarị okwu ahụ bụ́ “nsọpụrụ” eme ihe, oleekwa ndị igosi nsọpụrụ na-aka adịrị mfe?

ISIOKWU anyị bu ụzọ mesiri ike ndụmọdụ nke Okwu Chineke bụ́: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (1 Pita 5:5) Otu ụzọ anyị ga-esi were obi dị umeala kee onwe anyị dị ka ákwà bụ site n’ịdị na-egosi ndị ọzọ nsọpụrụ.

2 A na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “nsọpụrụ” eme ihe n’ime Bible iji gosi nkwanye ùgwù na nchebara echiche anyị kwesịrị igosi ndị ọzọ. Anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ site n’inwe obiọma n’ebe ha nọ, ịsọpụrụ ùgwù ha, ige ntị n’echiche ha, ịdị njikere imezu arịrịọ ha ndị ezi uche dị na ha. Nke a agaghị esikarịrị ndị nwere obi dị umeala ike. Otú ọ dị, ọ pụrụ isiri ndị nwere obi nganga ike igosi ezi nsọpụrụ, kama nke ahụ, ha pụrụ ịgbalị inweta ihu ọma na uru dị iche iche site n’otuto efu na-esighị n’ezi obi.

Jehova Na-akwanyere Ụmụ Mmadụ Ùgwù

3, 4. Olee otú Jehova si gosi Abraham nkwanye ùgwù, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

3 Jehova n’onwe ya na-esetịpụ ihe nlereanya n’igosi nkwanye ùgwù. O kenyere n’ime ụmụ mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ, ọ dịghịkwa emeso ha ihe dị ka robot nkịtị. (1 Pita 2:16) Dị ka ihe atụ, mgbe ọ gwara Abraham na a gaje ibibi Sọdọm n’ihi oké ajọ omume ya, Abraham jụrụ, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Ị ga-ekpochapụ ndị ezi omume tinyere ndị na-emebi iwu? Eleghị anya [ndị ezi omume iri ise] dị n’obodo ahụ: ọ̀ ga-abụ ezie na ị ga-ekpochapụ ebe ahụ ghara ịgbaghara ya n’ihi [ndị ezi omume iri ise ahụ]?” Jehova zaghachiri na ya agaghị ebibi obodo ahụ n’ihi ndị ezi omume 50. Mgbe ahụ Abraham gara n’ihu iji umeala n’obi rịọ arịrịọ. Gịnị ma ọ bụrụ na e nwere nanị mmadụ 45? 40? 30? 20? 10? Jehova mesiri Abraham obi ike na ya agaghị ebibi Sọdọm ma ọ bụrụ na a hụ nanị ndị ezi omume iri.—Jenesis 18:20-33.

4 Jehova maara na e nweghị ndị ezi omume iri na Sọdọm, ma ọ kwanyeere Abraham ùgwù site n’ige ntị n’echiche ya na iji nchebara echiche mesoo ya ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na Abraham “kwere na Jehova; O wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.” A kpọrọ Abraham “enyi nke Chineke.” (Jenesis 15:6; Jemes 2:23) Ọzọkwa, Jehova hụrụ na Abraham kwanyeere ndị ọzọ ùgwù. Mgbe esemokwu ókèala bilitere n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ ya na ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke nwa nwanne ya bụ́ Lọt, Abraham kwanyeere Lọt ùgwù site n’ịgwa ya ka o buru ụzọ họrọ ebe ọ chọrọ. Lọt họọrọ ihe o lere anya dị ka ala kasị mma, Abraham gafekwara ebe ọzọ.—Jenesis 13:5-11.

5. Olee otú Jehova si kwanyere Lọt ùgwù?

5 N’otu aka ahụ, Jehova kwanyeere onye ezi omume bụ́ Lọt ùgwù. Tupu e bibie Sọdọm, ọ gwara Lọt ka ọ gbalaga n’ugwu. Otú ọ dị, Lọt kwuru na ya achọghị ịga ebe ahụ; ọ họọrọ Zoa dị nso, ọ bụ ezie na obodo ahụ nọ n’ógbè a gaje ibibi. Jehova gwara Lọt, sị: “Lee, m hụwokwa gị ihu ọma n’okwu a, na m gaghị akwatu obodo a nke i kwuworo okwu banyere ya.” Jehova gosiri Lọt na-ekwesị ntụkwasị obi nkwanye ùgwù site n’ime ihe ọ rịọrọ.—Jenesis 19:15-22; 2 Pita 2:6-9.

6. Olee otú Jehova si kwanyere Mosis ùgwù?

6 Mgbe Jehova zighachiri Mosis n’Ijipt iji duru ndị Ya pụọ n’ohu na iji gwa Fero okwu banyere ịhapụ ndị Ya ka ha laa, Mosis zaghachiri, sị: “Biko, Onyenwe anyị, Ọ bụghị onye ọkà okwu ka m bụ.” Jehova mesiri Mosis obi ike, sị: “Mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị, zi gị ihe ị ga-ekwu.” Ma Mosis ka nọ na-ala azụ. Mgbe ahụ, Jehova mesighachiri Mosis obi ike ma mee ndokwa iziga ya na nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn, dị ka ọnụ na-ekwuru ya.—Ọpụpụ 4:10-16.

7. N’ihi gịnị ka Jehova ji dị njikere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù?

7 N’ọnọdụ nile dị otú ahụ, Jehova gosipụtara njikere ọ dị ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù, nke ka nke, ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ ezie na ihe ha rịọrọ pụrụ ịdịwo iche ná nzube mbụ Jehova, o lebaara arịrịọ ha anya ma nabata ha ma ọ bụrụhaala na ha emebighị nzube ya.

Jisọs Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù

8. Olee otú Jisọs si kwanyere otu nwanyị nke na-arịasi ọrịa ike ùgwù?

8 Jisọs ṅomiri Jehova n’ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. N’otu oge n’etiti ìgwè mmadụ, e nwere otu nwanyị nke nwere oruru ọbara ruo afọ 12. Ndị dibịa agwọtalighị ya. N’okpuru Iwu Mosis, e lere ya anya dị ka onye na-adịghị ọcha n’ụzọ ịgbaso iwu omenala, o kwesịghịkwa ịnọworị n’ebe ahụ. Ọ bịaruru n’azụ Jisọs, metụ uwe ya aka, a gwọkwara ya. Jisọs esighị ọnwụ na a ga-agbasorịrị ụmụ irighiri ihe Iwu ahụ gụnyere, na-abara ya mba maka ihe o mere. Kama nke ahụ, n’ịmara ọnọdụ ọ nọ na ya, ọ kwanyeere ya ùgwù, na-asị: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ dị ike.”—Mak 5:25-34; Levitikọs 15:25-27.

9. Olee otú Jisọs si kwanyere onye Jentaịl ùgwù?

9 N’oge ọzọ, otu nwanyị Kenean gwara Jisọs, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid; mmụọ ọjọọ na-ejisi nwa m nwanyị ike.” N’ịmara na ọ bụ ná mba Israel ka e zigara ya, ọ bụghị nye ndị Jentaịl, Jisọs sịrị: “Ọ dịghị mma ịnara nri ụmụ [Israel] tụpụrụ ụmụ nkịta [ndị Jentaịl].” Nwanyị ahụ zaghachiri, sị: “Ọbụna ụmụ nkịta na-eri ụfọdụ n’ime irighiri nke na-adapụta na tebụl nke ndị nwe ha.” Mgbe ahụ Jisọs sịrị: “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu: ka e meere gị dị ka ị na-achọ.” A gwọrọ nwa ya nwanyị. Jisọs kwanyeere onye Jentaịl a ùgwù n’ihi okwukwe ya. Ọbụna ojiji o ji okwu bụ́ “ụmụ nkịta” mee ihe, kama iji nkịta ọhịa, mere ka okwu ahụ dị nro ma gosi ọmịiko o nwere.—Matiu 15:21-28.

10. Olee ihe mmụta siri ike Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa?

10 Jisọs nọgidere na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi na ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù, ebe ọ bụ na ha ka nwere nsogbu nke mụ onwe m tupu ndị ọzọ. N’otu mgbe ha rụrịtasịrị ụka, Jisọs jụrụ, sị: “Gịnị ka unu na-ekwurịta?” Ha gbachiri nkịtị, n’ihi na “ha na-arụrịta ụka [banyere] onye ka ibe ya n’etiti ha.” (Mak 9:33, 34) Ọbụna n’abalị bu ụzọ tupu Jisọs anwụọ, “esemokwu wee daakwa n’etiti ha, onye n’ime ha ka a na-agụ na ọ ka ibe ya ukwuu.” (Luk 22:24) Ya mere n’oge nri Ememe Ngabiga, Jisọs “[tinyere] mmiri n’ihe a na-eji asa ahụ, wee malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ Ya.” Lee ihe mmụta dị ike nke a bụ! Jisọs bụ Ọkpara Chineke, onye na-esote Jehova n’eluigwe na ụwa dum. Ma, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe mmụta banyere nkwanye ùgwù site n’ịsa ụkwụ ha. Ọ sịrị: “Enyewo m unu ihe nṅomi, ka unu onwe unu wee na-emekwa dị ka Mụ onwe m mere unu.”—Jọn 13:5-15.

Pọl Gosiri Nkwanye Ùgwù

11, 12. Gịnị ka Pọl mụtara mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst, oleekwa otú o si tinye ihe mmụta a n’ọrụ n’ebe Faịlimọn nọ?

11 Dị ka onye na-eṅomi Kraịst, Pọl onyeozi gosiri ndị ọzọ nkwanye ùgwù. (1 Ndị Kọrint 11:1) Ọ sịrị: “Ma ọ bụ n’ịchọ otuto site na mmadụ . . . Kama anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:6, 7) Nwanyị na-azụ nwa na-elekọta ụmụaka ya anya. Mgbe Pọl ghọsịrị onye Kraịst, ọ mụtara ịdị umeala n’obi ma gosi ndị Kraịst ibe ya nsọpụrụ site n’imeso ha ihe n’ụzọ dị nro. N’ime otú ahụ, ọ kwanyekwaara nnwere onwe ha ime nhọrọ ùgwù, dị ka ihe mere mgbe ọ bụ onye mkpọrọ na Rom gosiri.

12 Otu ohu gbara ọsọ nke aha ya bụ́ Ọnisimọs gere ntị n’ozizi Pọl. Ọ ghọrọ onye Kraịst nakwa enyi Pọl. Onye nwe ohu ahụ bụ Faịlimọn, onye bụ́kwa onye Kraịst, nke bi n’Asia Minor. N’akwụkwọ ozi o degaara Faịlimọn, Pọl dere otú Ọnisimọs si baara ya uru, na-asị: “Onye mụ onwe m na-ezuberị ijide ka mụ na ya nọdụ.” Ma, Pọl kpọghachiri Ọnisimọs nye Faịlimọn, n’ihi na o dere, sị: “Achọghị m ime ihe ọ bụla mgbe ị ka-ekwenyeghị; ka ịdị mma gị wee ghara ịdị ka a ga-asị na ọ dị n’ụzọ mkpa, kama ka o wee dị n’ụzọ ọchịchọ obi gị.” Pọl ejighị n’ihi na ọ bụ onyeozi chọọ uru nke aka ya, kama ọ kwanyeere Faịlimọn ùgwù site n’ịghara ịrịọ ka ya na Ọnisimọs nọrọ na Rom. Ọzọkwa, Pọl gbara Faịlimọn ume ịkwanyere Ọnisimọs ùgwù, na-emeso ya dị ka onye “karịrị ohu, [dị] ka nwanna a hụrụ n’anya.”—Faịlimọn 13-16.

Igosi Nsọpụrụ n’Oge Anyị

13. Gịnị ka Ndị Rom 12:10 na-agwa anyị ka anyị mee?

13 Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Nke a pụtara na anyị ekwesịghị ichere ka ndị ọzọ buru ụzọ gosi anyị nsọpụrụ, kama anyị kwesịrị ibute ụzọ. “Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.” (1 Ndị Kọrint 10:24; 1 Pita 3:8, 9) N’ụzọ dị otú a, ndị ohu Jehova na-achọ ohere iji gosi ndị òtù ezinụlọ ha, ndị Kraịst ibe ha n’ọgbakọ, na ọbụna ndị na-anọghị n’ọgbakọ, nsọpụrụ.

14. Olee otú e si egosi nsọpụrụ n’etiti di na nwunye?

14 Bible na-ekwu, sị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Jehova nyere nwoke iwu imeso nwunye ya ihe dị ka Kraịst si mesoo ọgbakọ ya. Na 1 Pita 3:7, a gwara di ka o kenye nwunye ya “nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.” Ọ pụrụ ime nke a site n’igosipụta ezi njikere ige ntị nakwa site n’ichebara aro nwunye ya echiche. (Jenesis 21:12) Ọ pụrụ ikwenye ná nhọrọ ya mgbe ọ na-adịghị ụkpụrụ ọ ga-emebi, ọ ga na-enyekwara ya aka, na-ejikwa obiọma emeso ya ihe. N’aka nke ya, “ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Ọ ga na-ege ya ntị, ọ gaghị na-agbalịsi ike mgbe nile ka ihe nile laara ya, ọ gaghị na-ewetu ya ala ma ọ bụ na-eseso ya okwu. Ọ ga na-egosi obi dị umeala site n’ịghara ịnwa ịchịkwa di ya, ọbụna mgbe o nwere ikike ka elu n’akụkụ ụfọdụ.

15. Nsọpụrụ dị aṅaa ka a na-enye ndị agadi, oleekwa otú ha kwesịrị isi meghachi omume?

15 N’ime ọgbakọ ndị Kraịst, e nwere kpọmkwem ndị kwesịrị nsọpụrụ, dị ka ndị agadi. “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.” (Levitikọs 19:32) Ọ dị otú a karịsịa n’ebe ndị ahụ jewooro Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ nọ n’ihi na “okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Ndị nlekọta kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya site n’ịkwanyere ndị Kraịst ibe ha bụ́ ndị tọrọ ha ùgwù kwesịrị ha. N’ezie, ọ dịkwa ndị agadi mkpa igosipụta àgwà nkwanye ùgwù n’ebe ndị ha tọrọ nọ, nke ka nke, ndị nwere ibu ọrụ nke ịzụ ìgwè atụrụ ahụ.—1 Pita 5:2, 3.

16. Olee otú ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha si asọpụrụ ibe ha?

16 Ụmụaka kwesịrị ịsọpụrụ ndị mụrụ ha: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” N’aka nke ya, ndị mụrụ ụmụ ga-akwanyere ụmụ ha ùgwù, n’ihi na a gwara ha ka ha ‘ghara ịkpasu ụmụ ha iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.’—Ndị Efesọs 6:1-4; Ọpụpụ 20:12.

17. Olee ndị kwesịrị ka e nye ha “nsọpụrụ okpukpu abụọ”?

17 Ndị ọzọ a ga-egosikwa nsọpụrụ bụ ndị na-arụsi ọrụ ike n’ijere ọgbakọ ozi: “Ka a gụọ ndị okenye ná ndị kwesịrị nsọpụrụ okpukpu abụọ, bụ́ ndị na-achị isi nke ọma, ma nke kachasịnụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime okwu Chineke na ozizi.” (1 Timoti 5:17) Otu ụzọ anyị pụrụ isi gosi ha nsọpụrụ a bụ́ site n’ime ihe Ndị Hibru 13:17 na-ekwu: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha.”

18. Gịnị ka anyị ga-eme n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ nọ?

18 Ò kwesịrị ka anyị gosi ndị na-anọghị n’ọgbakọ nsọpụrụ? Ee. Dị ka ihe atụ, e nyere anyị ntụziaka, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) Ndị a bụ ndị ọchịchị ụwa bụ́ ndị Jehova kwere ka ha na-achị ruo mgbe Alaeze ya ga-anọchi ha. (Daniel 2:44) Ya mere anyị ‘na-akwụghachi mmadụ nile ihe nile anyị ji ha n’ụgwọ: na-atụ ụtụ nye onye anyị ji ụgwọ ụtụ; na-atụ ụtụ ahịa nye onye anyị ji ụgwọ ụtụ ahịa; na-atụ egwu onye anyị ji ụgwọ egwu; na-asọpụrụ onye anyị ji ụgwọ nsọpụrụ.’ (Ndị Rom 13:7) Anyị ga ‘na-asọpụrụ mmadụ nile.’—1 Pita 2:17.

19. Olee otú anyị pụrụ isi “na-arụ ezi ihe” n’ebe ndị ọzọ nọ ma na-egosi ha nsọpụrụ?

19 Ọ bụ ezie na anyị ga na-asọpụrụ ọbụna ndị na-anọghị n’ọgbakọ, rịba ama ihe Okwu Chineke na-emesi ike: “Otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) N’ezie, ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi “na-arụ ezi ihe” n’ebe ndị ọzọ nọ bụ ịzụlite na igbo mkpa ime mmụọ ha. (Matiu 5:3) Anyị pụrụ ime nke a site n’ige ntị n’ihe ncheta Pọl onyeozi nyere: “Na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” Mgbe anyị ji akọ jiri ohere nile na-agba ama, ‘na-ejezu ozi anyị,’ ọ bụghị nanị na anyị na-emere mmadụ nile ihe ọma kamakwa anyị na-egosi ha nsọpụrụ.—2 Timoti 2:15; 4:5.

Ịsọpụrụ Jehova

20. Gịnị mere Fero na usuu ndị agha ya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

20 Jehova na-akwanyere ihe o kere eke ùgwù. Mgbe ahụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na anyị kwesịkwara ịsọpụrụ ya. (Ilu 3:9; Mkpughe 4:11) Okwu Jehova na-ekwukwa, sị: “Ndị na-asọpụrụ m ka M [ga-akwanyere ùgwù], ma a ga-akpọ ha ihe efu, bụ́ ndị na-elelị m.” (1 Samuel 2:30) Mgbe a gwara Fero nke Ijipt ka ọ hapụ ndị Chineke ka ha laa, o ji mpako zaghachi: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya?” (Ọpụpụ 5:2) Mgbe Fero zipụrụ usuu ndị agha ya igwepịa ụmụ Israel, Jehova kewaara Israel Osimiri Uhie. Ma mgbe ndị Ijipt sochiri, Jehova mere ka mmiri ahụ laghachi. “Ụgbọala Fero nile na usuu ndị agha ya ka [Jehova] tụfuworo n’oké osimiri.” (Ọpụpụ 14:26-28; 15:4) Ya mere ọjụjụ Fero ji mpako jụ ịsọpụrụ Jehova dugara ná mbibi ya.—Abụ Ọma 136:15.

21. Gịnị mere Jehova ji megide Belshaza, gịnịkwa si na ya pụta?

21 Eze Belshaza nke Babilọn jụrụ ịsọpụrụ Jehova. N’oge oriri ọ nọ na ya ṅụbiga mmanya ókè, o mere Jehova akaje site n’iji arịa nsọ ọlaedo na ọlaọcha bụ́ ndị e wetara n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, ṅụọ mmanya. Mgbe ọ na-emekwa nke a, ọ jara chi arụsị ya dị iche iche mma. Ma ohu Jehova bụ́ Daniel gwara ya, sị: “I meghị ka obi gị dị ala . . . ma ọ bụ imegide Onyenwe eluigwe ka i buliworo onwe gị.” E gburu Belshaza kpọmkwem n’abalị ahụ, a napụkwara ya alaeze ya.—Daniel 5:22-31.

22. (a) N’ihi gịnị ka iwe Jehova ji bịakwasị ndị ndú Israel na ndị ha na-edu? (b) Olee ndị nwetara ihu ọma Jehova, gịnịkwa si na ya pụta?

22 Na narị afọ mbụ O.A., Eze Herọd nọ na-ekwu okwu n’ihu ọha, ha wee tie mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghịkwa olu nke mmadụ.” Eze mpako ahụ ajụghị ịnara otuto ahụ kama ọ nakweere ya. Mgbe ahụ, “mmụọ ozi nke Onyenwe anyị wee tie ya ihe, n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ.” (Ọrụ 12:21-23) Herod sọpụụrụ onwe ya, ọ bụghị Jehova, e gbukwara ya. Ndị ndú okpukpe nke oge ahụ akparịwo Chineke site n’ịgba izu igbu Ọkpara ya, bụ́ Jisọs. Ụfọdụ ndị ọchịchị maara na Jisọs kụziri eziokwu ahụ ma ha achọghị iso ụzọ ya, “n’ihi na ha hụrụ otuto mmadụ n’anya karịa otuto Chineke.” (Jọn 11:47-53; 12:42, 43) Mba ahụ n’ozuzu ya asọpụrụghị Jehova ma ọ bụ Onye Nnọchiteanya ya ọ họpụtara, bụ́ Jisọs. N’ihi ya, Jehova agaghị n’ihu n’ịkwanyere ha ùgwù, na-agbahapụ ha na ụlọ nsọ ha nye mbibi. Ma o chebere ndị sọpụụrụ ya na Ọkpara ya.—Matiu 23:38; Luk 21:20-22.

23. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji biri n’ime ụwa ọhụrụ Chineke? (Abụ Ọma 37:9-11; Matiu 5:5)

23 Ndị nile chọrọ ibi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke mgbe e bibisịrị usoro ihe dị ugbu a aghaghị ịsọpụrụ Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs, ma rubere ha isi. (Jọn 5:22, 23; Ndị Filipaị 2:9-11) Ndị na-egosighị nsọpụrụ dị otú ahụ “ka a ga-ebipụ n’ụwa.” N’aka nke ọzọ, ndị ziri ezi bụ́ ndị na-asọpụrụ ma na-erubere Chineke na Kraịst isi “ga-ebi n’ụwa.”—Ilu 2:21, 22.

Ná Ntụleghachi

◻ Gịnị ka ịsọpụrụ ndị ọzọ pụtara, oleekwa otú Jehova si mee nke a?

◻ Olee otú Jisọs na Pọl si kwanyere ndị ọzọ ùgwù?

◻ Olee ndị kwesịrị nsọpụrụ n’oge anyị?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji sọpụrụ Jehova na Jisọs?

[Foto dị na peeji nke 17]

Jehova kwanyeere Abraham ùgwù site n’ige ntị n’arịrịọ ya

[Foto dị na peeji nke 18]

N’alụmdi na nwunye ndị na-aga nke ọma, di na nwunye na-asọpụrụ ibe ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya