Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Onye Nọn Ruo 25 Afọ Emesịa Mụta Eziokwu Ahụ
BIBLE buru amụma na “oké ìgwè mmadụ” ndị sitere ná mba nile ga-abịa ife ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. (Mkpughe 7:9) Nke a na-eme taa, anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ ịhụ na ọtụtụ ndị, site n’enyemaka nke eziokwu nke Chineke, si otú a na-adọbisị ihe nkedo nile nke okpukpe ụgha. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-eme ihe atụ nke a.
◻ Otu nwanyị bi na Rom, Itali, kọrọ, sị: “Site na mgbe m dị na nwata, ọchịchọ kasị ukwuu m nwere bụ ịghọ onye nọn, ebe ọ bụ na achọsiri m ike iji obi m nile jeere Chineke ozi. Enwere m ike imezu ọchịchọ m nanị mgbe m gbara 32 afọ, na December 8, 1960, mgbe m ṅụrụ iyi ndị mbụ m nke nrubeisi, ịnọ n’ogbenye, na ịdị ọcha. Ọrụ e kenyere m bụ ilekọta ihe dị ka 30 ụmụntakịrị ndị ogbenye na ndị ndị mụrụ ha gbahapụworo ehihie na abalị, ndị bụ ụmụ mgbei ma ọ bụ ụmụ ndị ndị mụrụ ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ọrụ ahụ e kenyere m nyere m afọ ojuju.
“E nunyara okwukwe m mgbe afọ iri nke ije ozi gasịrị mgbe esemokwu bilitere n’etiti òtù ahụ. Ọ tụrụ m n’anya ihe mere Chineke ga-eji kwere ka esemokwu na ọgba aghara dị otú ahụ dịrị n’ụlọ nke ya ma ọ bụrụ na ọ bụ ya na-eduzi anyị.”
Onye nọn ahụ nwere otu nwanne nwanyị bi na France nke bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ gbaara onye nọn ahụ àmà site n’akwụkwọ ozi, zijekwara ya otu New World Translation of the Holy Scriptures. Onye nọn ahụ kọrọ, sị: “Mgbe 23 afọ gasịrị, nke a bụ ọhụhụ mbụ m hụrụ Okwu Chineke.” Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ nakweere ka ya na Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ọ sịrị: “Ka m na-aga n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ, amụtara m ihe banyere Jehova Chineke na ihe ndị ọ chọrọ mmadụ n’aka, tinyekwara àgwà ya nile ndị dị ebube. O wutere m nke ukwuu mgbe m mụtara na ọ dịghị amasị ya, bụ́ iji ihe oyiyi dị iche iche eme ihe, ebe ọ bụ na ebe ahụ m na-arụ ọrụ jupụtara n’ihe oyiyi dị iche iche. Aghọtara m na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ, na m pụghị ịnọgide n’ebe ahụ. Mgbe 25 afọ nke m raara onwe m nye n’ije ozi dị ka onye nọn gasịrị, emesịwo m chọta eziokwu ahụ. Ya mere n’October 1, 1985, etinyere m akwụkwọ igosi na m chọrọ ịpụ, bụ́ nke wutere ndị ka m n’ọkwá nke ukwuu.
“Ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị ndị na-ahụ n’anya nyeere m aka ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ ihe onwunwe. Enwere m ekele nye Jehova na nzukọ ya na emere m baptism n’August 30, 1986, wee malite ịga ije n’ụzọ ahụ nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi.”
Jehova Agọzie Ọchịchọ Otu Nwa Agbọghọ Ijere Chineke Ozi
◻ Otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ nọ na Brazil nke bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova hụtara mgbe ọ na-akanye akara n’akwụkwọ ule ụmụ akwụkwọ na otu nwata akwụkwọ gbara afọ 14 dere ihe banyere ọchịchọ ya ịmụtakwu ihe banyere Chineke. Ọ malitere iduziri nwata akwụkwọ ahụ ọmụmụ Bible, ma ka nwa agbọghọ ahụ na-enwe ọganihu, ezinụlọ ya nke bụ ndị Katọlik kwuru ka a kwụsị ọmụmụ ihe ahụ, bibisịakwa akwụkwọ ndị o ji amụ ihe. Nwata akwụkwọ ahụ malitere ịmụ Bible n’oge a na-enwe nkwụsịtụ n’ụlọ akwụkwọ, ma a chọpụtakwara nke a. Ya mere a gara n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ site n’iderịta akwụkwọ. Ma n’oge na-adịghị anya, ezinụlọ ahụ chọtara akwụkwọ ozi ya wee suo ha ọkụ. Nna ya malitere ịmanye ya ije Mas. Ọ na-eje, ma ọ na-ewere otu Ụlọ Nche ọ ga na-agụ mgbe okwuchukwu ahụ na-aga n’ihu, na-ezo ya n’etiti akwụkwọ chọọchị ahụ. Nke a gara n’ihu ruo ọnwa isii, otu ụbọchị, o zopụrụ site n’ụlọ ha ije n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe nzukọ ahụ na-aga n’ihu, nna ya bịara n’ọnụ ụzọ wee gwa ụmụnna ka ha gwa nwa ya nwanyị na ya ga-eti ya ihe mgbe ọ lọtara. Mgbalị nile ụmụnna mere iso ya tụgharịa uche abaghị uru ọ bụla.
N’echi ya, n’inwe obi ụtọ na ihu ọchị, nwa agbọghọ ahụ jere ịhụ ụmụnna ahụ. O gosiri ha ebe nile nna ya tihịasịrị ya ahụ. Ma gịnị mere o ji nwee obi ụtọ? Mgbe ọ hapụsịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, nna ya jere jụọ ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ, gụnyere onye isi obodo ahụ, banyere abamuru na ọghọm dị na nwa ya nwanyị ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Onye isi obodo ahụ kwuru na Ndịàmà ahụ bụ ezi ndị mmadụ, bụ́ ndị a pụrụ inwe obi ike n’ebe ha nọ. O kwukwara na ha nwere àgwà ọma na-enweghị atụ, na ọ ga-abụkwa ihe magburu onwe ya mmadụ inwe nwa na-agbaso ụkpụrụ ndị a, bụ́ ndị dị elu nke ukwuu karịa nke ndị ntorobịa n’ozuzu ha.
N’agbanyeghị nke a, e tiri nwa agbọghọ ahụ ihe ahụ e kwuru na a ga-eti ya. Ma nna ya gwara na ya na-eti ya ihe n’ihi ịhapụ ụlọ n’enweghị onye ọ gwara. O kwukwara na ya ga-eti ya ihe ọzọ ma ọ bụrụ na ọ kwụsị ịmụ Bible ma ọ bụ ije nzukọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova! Nwa agbọghọ ahụ bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi ugbu a, ụfọdụ ndị n’ime ezinụlọ ya na-egosikwa mmasị n’eziokwu ahụ.
N’ezie, Jehova na-agọzi ndị na-eto eto, bụ́ ndị nwere ezi ọchịchọ ijere ya ozi, dị ka ahụmahụ nke a na-egosi.—Abụ Ọma 148:12, 13.