Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndịàmà Jehova Na-arụzu Ezi Ihe n’Ime Nkwusa Mberede
◻ E MERE ka ọtụtụ ndị mmadụ mata eziokwu Bible na nke mbụ ya mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova kwusaara ha ozi ọma na mberede. Na nke a Ndịàmà ahụ na-agbaso ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst, bụ́ onye mere nkwusa na mberede nye otu nwanyị onye Sameria n’otu ọdọ mmiri mgbe ọ bịara isere mmiri. (Jọn, isi nke 4) N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, otu n’ime Ndịàmà Jehova mere nkwusa na mberede nye otu nọn ndị Katọlik. Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society na-akọ ihe sitere na ya pụta:
◻ N’isi ụtụtụ otu ụbọchị ka ọ nọ n’ụzọ ịba n’ime obodo, Onyeàmà ahụ zutere otu onye nọn ndị Katọlik. O ji ohere ahụ mee ihe ịjụ onye nọn ahụ, sị: “Ebee ka ị na-aga n’oge nke a nke ụbọchị?” Azịza ya bụ: “M na-aga ikpeku Chineke m ekpere.” Mgbe ahụ ọ jụrụ onye nọn ahụ, sị: “Ị̀ maara aha Chineke gị?” “Ọ̀ bụ na aha ya abụghị Chineke?” ka onye nọn ahụ zaghachiri. Onyeàmà ahụ kwuru na ya ga-abịa n’ụlọ ya n’ehihie ahụ ikwu okwu banyere aha Chineke. Mgbe nkwurịta okwu ahụ gasịrị onye nọn ahụ gara na chọọchị ya ma jụọ otu n’ime ndị ụkọchukwu ya ma ọ̀ maara ihe “Jehova” pụtara. Azịza ya, “Ọ bụ aha Chineke.” O juru onye nọn ahụ anya nke ukwuu ịnụ na onye ụkọchukwu ahụ maara nke a ma ọ dịbeghị mgbe ọ kụziiri ya nke ahụ.
Onyeàmà ahụ letara nwanyị ahụ ụbọchị itoolu n’esepụghị aka ma zie ya eziokwu banyere Atọ n’Ime Otu, mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, na olileanya maka ndị nwụrụ anwụ. Nwanyị ahụ nakweere ihe nile ma rịọ Onyeàmà ahụ ka o nye ya oge ụfọdụ iji tụgharịa uche n’ozizi ọhụrụ ndị a nile. Mgbe izu abụọ gasịrị o jekwuuru Onyeàmà ahụ ọzọ ma rịọ ka e nwekwuo mkparịta ụka. Ka ọ dị n’oge a onye nọn ahụ emeworị mkpebi ya ịhapụ chọọchị ahụ, o bibisịwokwarị ihe oyiyi ya nile, chapleti ya nile na obe ya. Onye ụkọchukwu ahụ gbalịrị ime ka ọ lọghachite azụ, ma o kpebisiwo ike ịgbaso eziokwu. E mesịrị mee ya baptism, o jewokwa ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka n’oge nile ruo ọtụtụ ọnwa n’agbanyeghị ahụ esighị ike ya na ime agadi.
Ebe ọ bụ na ụlọ ya buru ibu, o nyefere ya ọgbakọ ahụ ka o jiri ya na-eme ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụnna ahụ gbanwere elu ya meworo ochie, kwatuo mgbidi ájá ndị dị n’ime, wee mee akụkụ buru ibu nke ụlọ ahụ ka ọ ghọọ ebe nzukọ na-adọrọ mmasị. Onye a bụbu onye nọn ndị Katọlik bi n’otu ọnụ ụlọ dị n’azụ ụlọ nzukọ ahụ. O nwere obi ụtọ nke ukwuu n’ihi inwe ike inye onyinye nke a maka ofufe Jehova.
◻ Ahụmahụ ọzọ nke na-egosi amamihe dị n’ịgba àmà mberede sitere na Kampala, Uganda. Ka ọ nọ n’ụzọ ịgaru otu ọfịs ndị gọọmenti, onye ozi ala ọzọ bụ Onyeàmà gwara ndị ya na ha nọ n’ígwè na-eburu ndị mmadụ gbagoo elu ma ọ bụ gbadaa ala okwu na mberede. Otu nwoke, bụ Maazị L——, gosipụtara ọchịchọ siri ike ịnakwere akwụkwọ e nyefere ma ọ pụghị iwere ya n’oge ahụ. Ya mere o nyere onye ozi ala ọzọ ahụ aha ya na adres ọfịs ya. E mesịa onye ozi ala ọzọ ahụ gara n’ebe ahụ ma jụọ maka Maazị L——. A kpọrọ ya ma n’ijuanya nye onye ozi ala ọzọ ahụ, nwoke dị iche pụtara. E nwere ndị ikom abụọ nwere otu aha ahụ na-arụ ọrụ n’ọfịs ahụ. A gbaara Maazị L—— nke abụọ ahụ àmà dị mkpirikpi, o gosikwara mmasị pụrụ iche. Ebe Maazị L—— nke mbụ na-enwekwaghị mmasị, a malitere iduziri Maazị L—— nke abụọ ọmụmụ Bible. Ugbu a ọ bụ Onyeàmà e mere baptism, nwunye ya na nwa ya nwoke na-enwekwa ọganihu dị mma iru baptism.
Jisọs Kraịst bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, ọ makwaara ndị yiri atụrụ bụ́ ndị obi ha na-achọ ime ihe ziri ezi. Ahụmahụ ndị a na-egosipụta na ọ na-eduru ndị na-eso ụzọ ya gaa n’ebe ndị dị otú ahụ nọ. Ime nkwusa mberede pụrụ ịrụpụta nnọọ ihe!—Jọn 10:14.