Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Òle nke n’ime ndị so dee Bible bụ “ọchịagha,” dị ka e hotara ya n’akwụkwọ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s?a
Akwụkwọ ahụ nke na-enye aka banyere Okwu Chineke kwuru na peji 10, sị: “Bible bụkwa ihe pụrụ iche n’ihi ihe ọtụtụ n’ime ndị so dee ya kwuru. Ihe dị ka 40 mmadụ dị iche iche, gụnyere ndị eze, ndị na-azụ atụrụ, ndị na-akụ ọkụ azụ, ndị ọrụ obodo, ndị nchụaja, ọ dịkarịa ala otu onye ọchịagha, na otu onye dibia, keere òkè n’ide akụkụ dị iche iche nke Bible. Ma ọtụtụ mgbe, ndị odeakwụkwọ ndị ahụ na-ekwu otu ihe: na ihe ha na-ede abụghị uche nke aka ha, kama na ọ bụ uche Chineke.”
Ụfọdụ ndị ajụwo ajụjụ banyere ndị so dee Bible bụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche ndị a. N’ihe banyere nke a, biko tụlee ihe na-esonụ:
Ndị Eze: Ụfọdụ n’ime ndị so dee Bible bụ ndị eze. A pụrụ icheta Devid na Solomọn ngwa ngwa karịsịa. (Abụ Ọma 3, ihe e dere n’elu ya; Ilu 1:1; Eklisiastis 1:1) Otú ọ dị, ọ bụ Hezekaịa dere abụ ahụ dị n’Aịsaịa 38:10-20. (Amaokwu 9) Ọtụtụ ndị mmụta kwenyekwara na ọ bụ ya dere Abụ Ọma 119, ma eleghị anya tupu ọ ghọọ eze. Hezekaịa tinyekwara aka n’ịchịkọta ihe dị n’Ilu isi 25-29. (Ilu 25:1) Ọ bụ “Lemuel, bụ́ eze” kwadebere isiakwụkwọ ikpeazụ nke Ilu. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ Eze Hezekaịa, ọ bụ ezie na ndị ọzọ na-eche na Lemuel bụ Eze Solomọn.—Ilu 31:1.
Ndị Na-azụ Atụrụ: Devid na onye amụma bụ Emọs rụrụ ọrụ dị ka ndị na-azụ atụrụ. (1 Samuel 16:11-13; 17:15, 28, 34; Emọs 1:1) Ọ bụ Emọs dere akwụkwọ Bible ahụ a kpọkwasịrị aha ya, Devid dekwara ọtụtụ n’ime abụ ọma ndị ahụ. Abụ Ọma 23 ahụ a ma ama gosipụtara n’ezie eziokwu ahụ nke bụ na ọrụ onye na-azụ atụrụ doro Devid anya nke ọma.
Ndị Na-akụ Ọkụ Azụ: N’ime ndị ozi Jisọs, bụ́ ndị na-akụ ọkụ azụ, Jọn na Pita mesịrị bụrụ ndị jiri ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ dị iche iche nke Bible. (Matiu 4:18-22) Jọn dere otu ihe ndekọ Oziọma, tinyekwara akwụkwọ ozi atọ n’okpuru ike mmụọ Chineke nakwa akwụkwọ Mkpughe. Pita dere akwụkwọ ozi abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ.
Ndị Ọrụ Obodo: Ma Daniel ma Nehemaịa bụcha ndị na-arụrụ ọchịchị ndị mba ọzọ ọrụ obodo, bụ́ ndị chịrị ndị Chineke. (Nehemaịa 1:1, 11; 2:1, 2; Daniel 1:19; 2:49; 6:1-3) A kpọkwasịrị akwụkwọ abụọ dị na Bible aha ndị ikom abụọ ndị a.
Ndị Nchụaja: Abụọ n’ime ndị amụma Chineke e jiri mee ihe ide akwụkwọ Bible dị iche iche bụ ndị nchụaja. Ha bụ Jeremaịa na Ezikiel. (Jeremaịa 1:1; Ezikiel 1:1-3) Ọzọkwa, Ezra bụ onye nchụaja sitere n’usoro ọmụmụ Erọn, onye “bụ odeakwụkwọ nke bụ onye ọkà n’iwu Mosis.” O “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ ya na ikpe ya n’Israel.”—Ezra 7:1-6, 10, 11.
Ọchịagha: Ọrụ Joshua rụrụ n’iduzi usuu ndị agha ahụ mgbe ndị Israel na-abanye n’Ala Nkwa ahụ ma buo agha megide ọtụtụ ndị iro mere ka o ruo eru ịbụ ọchịagha. (Joshua 1:1-3; 11:5, 6) O nwere ihe ùgwù nke ide akwụkwọ Joshua. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị na-agụ Bible pụrụ ile Devid anya dị ka onye rụrụ ọrụ dị ka ọchịagha tupu ọ ghọọ eze.—1 Samuel 19:8; 23:1-5.
Onye Dibia: Ná mmechi, Ndị Kọlọsi 4:14 hotara “Luk, bụ́ dibia nke a hụrụ n’anya.” Luk dere Oziọma ahụ nke a kpọkwasịrị aha ya, ihe àmà gosikwara na ọ bụ ya dere Ọrụ Ndị Ozi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1989.