Oge Ọ̀ Gabigawo Karịa Otú I Chere?
ỤBỌCHỊ atọ tupu ọ nwụọ, Jisọs nọ na-arụsi ọrụ ike nke ukwuu na Jerusalem, bụ́ ụbọchị nke mesịrị ghọọ nke dị oké mkpa nye ndị Kraịst na-adị ndụ taa. O ziri ihe n’ụlọ nsọ ahụ, na-azaghachi ọtụtụ ajụjụ aghụghọ ndị ndú okpukpe ndị Juu ji nwaa ime ka ọ ma n’ọnyà. N’ikpeazụ, ọ katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’ụzọ dị oké ike nke mere ka a mara ha dị ka ndị ihu abụọ na ajụala ndị a ga-atụba na Gehena.—Matiu, isi 22, 23.
Mgbe ọ na-ahapụ ogige ụlọ nsọ ahụ, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya, sị: “Onye ozizi, lee aha nkume na aha owuwu ụlọ ndị a bụ!” N’ịbụ onye nke a na-akpalighị mmasị ya ma ọlị, Jisọs gwara ya, sị: “Ị̀ hụrụ oké owuwu ụlọ ndị a? A gaghị ahapụ otu nkume ma ọlị n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.” (Mak 13:1, 2) Mgbe ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ nsọ ahụ nke ikpeazụ ya, gbadaa na Ndagwurugwu Kidrọn, gabiga ya, wee rịgoo n’Ugwu Olive.
Ka ọ na-anọdụ ebe ahụ n’okpuru anyanwụ uhuruchi n’elu ugwu ebe ahụ, na-ekiri ụlọ nsọ ahụ nke dị n’Ugwu Moraịa n’akụkụ nke ọzọ nke ndagwurugwu ahụ, Pita, Jemes, Jọn, na Andru bịakwutere ya iche. Okwu ndị ahụ o kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ ịbụ nke a kwaturu na-anyị ha arọ n’uche. Ha jụrụ, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] gị, na nke ọgwụgwụ oge a [“usoro ihe nke a,” NW].” (Matiu 24:3; Mak 13:3, 4) Azịza o nyere ajụjụ ha n’ehihie ahụ n’elu Ugwu Olive dị oké mkpa nye anyị. Ọ pụrụ igbochi anyị ichere ruo ogologo oge tupu anyị amalite iche echiche banyere ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.’
Ajụjụ ahụ ha jụrụ nwere akụkụ abụọ. Otu akụkụ bụ banyere ọgwụgwụ nke ụlọ nsọ ahụ na usoro ihe ndị Juu; akụkụ nke ọzọ metụtara ọnụnọ Jisọs n’ọdịnihu dị ka Eze nakwa ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a. Azịza Jisọs metụtachara ajụjụ abụọ ndị a, dị ka ọ dị na Matiu 24 na 25, Mak 13, na Luk 21. (Leekwa Mkpughe 6:1-8.) N’ihe banyere ọgwụgwụ nke ụwa ma ọ bụ usoro ihe dị ugbu a, Jisọs kọwara ihe dị iche iche nke ọ ga-abụ, e lee ha anya n’ozuzu ha, ha ga-abụ ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara nke na-aka mgbe ikpeazụ ahụ akara. Ihe iriba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara ọ̀ na-emezu ugbu a? Ọ̀ na-eme ka ọ bụrụ na anyị nọ n’ime mgbe ikpeazụ ahụ e kwuru okwu ya na Bible? Mmezu ya ọ̀ na-adọ anyị aka ná ntị na ọ pụrụ ịbụ na oge agabigawo karịa otú anyị chere?
Otu akụkụ nke ihe ịrịba ama Jisọs ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara bụ: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) Na 1914, Agha Ụwa Mbụ malitere. Ndịàmà Jehova nọ n’oge ahụ malitere ịmụrụ anya ozugbo. Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? Na December 1879, ihe dị ka 35 afọ tupu mgbe ahụ, magazin Ụlọ Nche (Bekee) ekwuwo, na-adabere ná ngụkọ oge Bible, na 1914 ga-abụ afọ oké ihe omume n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Agha nke a, bụ́ agha mbụ zuru ụwa ọnụ n’ezie, nke 28 mba dị iche iche mesịrị kere òkè na ya, nke e gbukwara nde mmadụ 14 n’ime ya, ọ̀ pụrụ ịbụ mmalite nke ihe omume ndị na-emezu ihe ịrịba ama Jisọs ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara banyere oge ọgwụgwụ? Akụkụ ndị ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ hà ga-esochi?
Ná “mkpughe nke Jisọs Kraịst,” e bukwara amụma banyere otu mwụfu ọbara nke a. N’ebe a, otu ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ na onye na-anọkwasị n’elu ya ‘napụrụ udo n’ụwa.’ (Mkpughe 1:1; 6:4) O doro anya na nke ahụ mere malite na 1914 ruo 1918. Agha Ụwa Mbụ bụkwa nanị mmalite. Na 1939, Agha Ụwa nke Abụọ sochiri. A kwabanyere 51 mba dị iche iche ná mburịta agha ahụ, e gbukwara ihe dị ka 50 nde mmadụ. N’ime 45 afọ ndị sochiri Agha Ụwa nke Abụọ, a lụwo ihe karịrị 125 agha dị iche iche, na-egbu ihe karịrị 20 nde mmadụ.
Akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ bụ: ‘Oké ụnwụ ga-adịkwa.’ (Matiu 24:7) E nwere ụnwụ nri gbasazuru ebe nile n’oge Agha Ụwa Mbụ ahụ nakwa mgbe ọ gasịrị. Otu akụkọ depụtara ihe karịrị 60 ụnwụ nri ndị pụtara ìhè kemgbe 1914, na-egbu ọtụtụ nde mmadụ. Karịsia, ọbụna ugbu a, 40,000 ụmụntakịrị na-anwụ kwa ụbọchị site n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ na ọrịa ndị a pụrụ igbochi egbochi.
“Oké ala ọma jijiji ga-adịkwa.” (Luk 21:11) Ha mere ka ụwa maa jijiji mgbe Agha Ụwa Mbụ malitesịrị. Na 1915, otu ala ọma jijiji gburu 32,610 mmadụ n’Itali; na 1920 otu nke ọzọ gburu 200,000 mmadụ na China; na 1923, 99,300 nwụrụ na Japan; na 1935, 25,000 mmadụ tụfuru ndụ ha n’ebe ahụ a maara ugbu a dị ka Pakistan; na 1939, 32,700 mmadụ lara n’iyi na Turkey; na 1970, e gburu 66,800 mmadụ na Peru; na 1976, 240,000 mmadụ (ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ 800,000) nwụrụ na China; Na 1988, 25,000 tụfuru ndụ ha n’Armenia. N’ezie, e nwewo oké ala ọma jijiji dị iche iche kemgbe 1914!
“Ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) N’ime 1918 na 1919, ihe dị ka 1,000,000,000 mmadụ dara ọrịa oké ahụ ọkụ si Spain, ihe karịrị 20,000,000 n’ime ha nwụkwara. Ma nke ahụ bụ nanị mmalite. N’akụkụ ụwa ndị ka na-emepe emepe, ọrịa ịba, ịba ogbu na nwayọọ, ọrịa anya ìsì mmiri, oké afọ ọsịsa, na ọrịa ndị ọzọ nọgidere na-eweta mmerụahụ nye, na-egbukwa ọtụtụ narị nde mmadụ. Tụkwasị na nke a, ọrịa obi na ọrịa cancer na-egbukwa ọtụtụ nde ndị ọzọ. Ọrịa ndị a na-ebufe site ná mmekọahụ na-emekpọ ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ. Ajọ ihe otiti nke ọrịa AIDS na-etinye oké egwu n’obi ọtụtu mmadụ taa, bụ́ nke a na-eche na ọ na-enweta otu onye ọhụrụ n’otu minit ọ bụla, ngwọta ya adịghịkwa nso.
‘Ịba ụba nke mmebi iwu.’ (Matiu 24:12) Mmebi iwu anọwo na-arịgo elu nke ukwuu kemgbe 1914, taa, ọ nọkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kachasị elu. Igbu ọchụ, idina mmadụ n’ike, izu ohi, mburita agha nke òtù ndị na-eme ihe ike—ha jupụtara n’isiakụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche, bụrụkwa ihe a na-akọ akụkọ ha na redio na telivishọn. Ime ihe ike nke ezi echiche na-adịghị ya na-agbasakwa n’enweghị nchịkwata. N’ime United States, otu onye ji égbè gbapụrụ otu narị mgbọ site n’otu égbè e ji eje agha nke na-awụpụ mgbọ awụpụ n’ebe ìgwè ụmụntakịrị nọ—mmadụ 5 nwụrụ anwụ, 29 merụkwara ahụ. N’England, otu onye isi gbakara ji égbè AK-47 e ji eje agha gbuo mmadụ 16. Na Canada, otu nwoke nke kpọrọ ụmụ nwanyị asị jere na mahadum Montreal University ma gbuo 14 ndị inyom. Ndị dị otú ahụ yiri anụ ọhịa wolf, ọdụm, anụ ọhịa dị iche iche, anụmanụ ndị na-enweghị echiche, ndị a mụrụ ka e wee jide ha, bibiekwa ha.—Tụlee Ezikiel 22:27; Zefanaịa 3:3; 2 Pita 2:12.
“Mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Luk 21:26) Nwa mgbe nta mgbe a tụsịrị bọmbụ atọm mbụ ahụ, ọkà mmụta sayensị n’ihe banyere ike atọm, bụ́ Harold C. Urey kwuru banyere ọdịnihu, sị: “Anyị ga-eri nri n’egwu, hie ụra n’egwu, dịrị ndụ n’egwu, nwụọkwa n’egwu.” Tụkwasị n’egwu nke agha nuklia, e nwewo egwu nke imempụ, ụnwụ nri, ọnọdụ akụ na ụba a na-ejighị n’aka, ndakpọ nke omume ọma, nretọ nke ezinụlọ, na mmetọ nke elu ala. N’eziokwu, akụkọ ọjọọ ndị a na-ewepụta n’ihu anyị site n’akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta kwa ụbọchị nakwa n’akụkọ telivishọn na-agbasa egwu n’ebe nile.
Pọl onyeozi dekwara ihe banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’oge ikpeazụ nke usoro ihe nke a. Ịgụ okwu ya yiri ịgụ akụkọ nke ụbọchị. O dere, sị, “Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.
Ihe Nile Hà Nọgidere Na-aga n’Ihu “Dị Ka Ha Dịworo Site ná Mmalite nke Okike”?
Pita onyeozi buru amụma banyere ihe ọzọ nke ga na-eme n’ime mgbe ikpeazụ ndị a: “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị, na-asịkwa, Olee ebe nkwa nke ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] ya dị? N’ihi na site n’ụbọchị nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.”—2 Pita 3:3, 4.
Taa, mgbe e welitere okwu banyere mgbe ikpeazụ ahụ, ọtụtụ ndị na-emezu okwu amụma Pita ndị ahụ site n’ịkwa emo na ikwu, sị: ‘Oo, ihe ndị ahụ nile emewo mbụ. Ọ bụ nanị akụkọ ihe mere eme na-emeghachi.’ Ya mere, ha na-elefuru ịdọ aka ná ntị ahụ anya, ma nọgide “na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị.” Ọ bụ ‘n’ihi ọchịchọ ha’ ka ha ji na-elefuru mmezu nke amụma ndị ahụ anya, bụ́ ndị na-aka mgbe ikpeazụ ahụ akara n’ụzọ pụtara ìhè.—2 Pita 3:5.
Otú o sina dị, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ e mezuru akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke Jisọs buru amụma ya, n’otu mgbe na nwa mkpirikpi oge n’ụzọ pụtara ìhè otú a, n’ụzọ metụtakwara ọtụtụ ihe. (Dị ka ihe atụ, tụleghachi Matiu 24:3-12; Mak 13:3-8; Luk 21:10, 11, 25, 26.) Ọ gamasịkwa anyị ịdọrọ uche gị karịsịa gaa n’otu akụkụ ọzọ e buru n’amụma banyere mgbe ikpeazụ ahụ, bụ́ nke a kọwara ná Mkpughe.
Ka anyị saghee gaa ná Mkpughe 11:18. O kwuru na mgbe Alaeze Kraịst malitere ịchị achị, mgbe mba nile na-ewekwa iwe, oge ikpe ikpe wee ruo, na mgbe ahụ Jehova ‘ga-ebibi ndị ahụ na-ebibi ụwa.’ Ọ̀ bụ na mmetọ ikuku na mmiri adịghị ebibi gburugburu ebe obibi anyị taa? N’eziokwu, ụmụ mmadụ anọwo mgbe nile na-eji ihe ndị ha nwetara n’ala na-eme ihe ime onwe ha ọgaranya. Ma mgbe ha na-eme otú ahụ, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ha nọ n’ọnọdụ ibibi ya dị ka mbara ala ebe dị mma maka mmadụ ibi. Ugbu a, n’ihi nkà na ụzụ nkà mmụta sayensị ndị a rụpụtaworo kemgbe 1914, ụmụ mmadụ nwere ike dị otú ahụ, sitekwa n’iji anyaukwu na-achụso ihe onwunwe, ha na-ebibi ụwa n’ezie, na-emetọ gburugburu ebe obibi, na-etinyekwa ikike elu ala nwere ịkwado ndụ n’ihe ize ndụ.
Òtù ụmụ mmadụ ndị na-enwe oké ọchịchọ, ndị na-achụsokwa ihe onwunwe na-eme nke ahụ ugbu a n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-eyi egwu. Ndị a bụ ụfọdụ n’ajọ ihe ndị ha rụpụtaworo: mmiri ozuzo acid, ịrị elu okpomọkụ ụwa, mgbapusị nke ihe nchebe ozone, mkpokọba nke ihe ruru unyi, ebe nkwakọba dị iche iche nke unyi ndị nwere ike na-egbu egbu n’ime ha, ọgwụ ndị dị ize ndụ e ji egbu ahịhịa na ahụhụ, ihe mkpofu ndị nwere nsí nuklia n’ime ha, mwụfu nke mmanụ e gwutere n’ala, ịwụfu nsị n’ọnọdụ na-ekwesịghị ekwesị, itinye ụdị ihe dị iche iche dị ndụ n’ihe ize ndụ mkpochapụ, ọdọ mmiri ndị na-enweghị ihe ọ bụla dị ndụ dị n’ime ha, mmiri ime ala ndị e metọworo, oké ọhịa ndị e bibiworo, ájá nke e metọworo, ájá ihe ọkụkụ na-eto n’elu ya nke a sachapụworo, na oké anwụrụ ọkụ ndị na-akpata mbibi nye osisi na ihe ọkụkụ dị iche iche, nyekwa ahụ ike mmadụ.
Professor Barry Commoner kwuru, sị: “Ekwenyere m na ịnọgide na-emetọ elu ala, ọ bụrụ na a kparaghị ya ókè, ga-emesịa bibie ọnọdụ nke mbara ala nke a dị ka ebe mmadụ pụrụ ịdị ndụ. . . . Ihe isi ike ahụ dị, ọ bụghị n’amaghị ihe n’ụzọ nkà mmụta sayensị, kama ọ bụ n’ilezi anya nwee anyaukwu.” Akwụkwọ ahụ bụ State of the World 1987 kwuru na peji 5, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe omume mmadụ amalitewo itinye elu ala n’onwe ya n’ihe ize ndụ dị ka ebe mmadụ pụrụ ibi n’ime ya.” Otu nnukwu usoro ihe nkiri e mere maka telivishọn ọha, bụ́ nke e gosiri na United States na 1990 nwere isiokwu bụ “Ọsọ A Na-agba Iji Zọpụta Mbara Ala Anyị.”
Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ ga-akwụsị mmetọ ahụ; Chineke ga-eme nke ahụ mgbe o mebiri ndị ahụ na-emebi ụwa. Chineke na Ọchịagha Ukwu nke eluigwe, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-eme nke a site n’imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi mba ndị na-achụso ihe onwunwe n’agha ikpeazụ ahụ nke Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16; 19:11-21.
N’ikpeazụ, rịba ama akụkụ sonụ nke kwesịrị ịrịba ama nke amụma Jisọs banyere mgbe ikpeazụ ahụ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) Ozi ọma nke a na-agwa anyị na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a n’eluigwe, na ọ ga-emekwa ihe n’oge na-adịghị anya ibibi ajọ usoro ihe nke a nakwa iwetaghachi Paradaịs n’elu ala. E kwusawo oziọma ahụ mbụ, ma ọ dịbeghị mgbe ọ gbasazuru elu ụwa dum mmadụ bi. Otú ọ dị, kemgbe 1914, Ndịàmà Jehova emewo nke ahụ, n’agbanyeghị mkpagbu ahụ nke Jisọs buru amụma ya—mmachibido iwu nke ndị ọchịchị, mwakwasị nke òtù ndị na-eme ihe ike, ịtụ mkpọrọ, ịta ahụhụ, na ọtụtụ ndị e gburu egbu.
Na 1919, e nwere 4,000 Ndịàmà Jehova ndị na-ekwusa ozi ọma nke a. Ọnụ ọgụgụ ha anọgidewo na-arị elu, nke mere na n’afọ gara aga, ihe karịrị 4,000,000 mmadụ nọ na-ekwusa ozi ọma na 212 ala dị iche iche, n’ihe dị ka 200 asụsụ dị iche iche, na-ekesa ọtụtụ narị nde Bible, akwụkwọ ukwu, na magazin dị iche iche, na-eduzi ọtụtụ nde ọmụmụ Bible n’ebe obibi ụmụ mmadụ, na-enwe mgbakọ ná nnukwute ámá egwuregwu dị iche iche n’akụkụ nile nke ụwa. A pụghị ịrụworị oké ọrụ nkwusa oziọma nke a tupu 1914. Iji wee rụzuo ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ a rụzuworo ya ugbu a, ọ dịrị mkpa inwe ígwè obibi akwụkwọ ọgbara ọhụrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ oké ngwa ngwa, ihe ndị e ji aga njem, ígwè kọmputa, ígwè nzipụ ozi bụ fax, nakwa ihe ndị e ji ebu ibu na ndị e ji ezirịta ozi ndị e nwere nanị n’oge anyị a.
A dọrọ Jerusalem nke oge Jeremaịa aka ná ntị banyere mbibi ya nke na-abịanụ; nanị ihe ndị bi n’ime ya mere bụ ịkwa emo, ma oge gabigara karịa otú ha chere. Taa, a nọ na-akpọsa ịdọ aka ná ntị nke dị ukwuu karị banyere mbibi a ga-enwe n’Amagedọn, nweekwa ihe àmà dị ukwuu nke na-akwado ya. (Mkpughe 14:6, 7, 17-20) Ọtụtụ nde mmadụ na-emechi ntị ha n’ebe nke a dị. Ma oge na-agwụnarị ha; oge agabigawo karịa otú ha chere. Oge ọ̀ gabigawo karịa otú i chere?
[Foto dị na peeji nke 7]
N’oge Jeremaịa, oge gabigara karịa otú ha chere