Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/1 p. 20-25
  • Asụsụ Dị Ọcha Nye Mba Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Asụsụ Dị Ọcha Nye Mba Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onyinye nke Ikwu Okwu
  • Mkpa E Nwere maka Asụsụ Dị Ọcha
  • Ndị ahụ E Nyeworo Asụsụ ahụ Dị Ọcha
  • Ihe Ịmụ Asụsụ ahụ Chọrọ Anyị n’Aka
  • Bụrụnụ Ndị Dị n’Otu Site n’Asụsụ ahụ Dị Ọcha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • ‘Asụsụ ahụ Dị Ọcha’ Ọ̀ Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Na-asụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha Ka I Wee Dịrị Ndụ Ebighị Ebi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ndị Jehova E Weghachiri Eweghachi Na-eto Ya n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/1 p. 20-25

Asụsụ Dị Ọcha Nye Mba Nile

“Mgbe ahụ ka m ga-agbanwere ndị nile dị iche iche egbugbere ọnụ [“asụsụ,” NW] dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ubu.”—ZEFANAỊA 3:9.

1, 2. (a) N’imezu Zefanaịa 3:9, gịnị ka Jehova na-eme n’oge anyị a? (b) Iji wee ghọta otú amụma Zefanaịa si metụta anyị, olee ajụjụ ndị ọ dị mkpa ka a zaa?

JEHOVA CHINEKE na-arụzu ọrụ dị ịtụnanya n’ezie n’oge anyị a. Ọ na-ejikọ ndị si ná mba nile. Dị ka o bururịị n’amụma n’oge dị anya gara aga n’ime Okwu Nsọ ya, ọ na-eme ya site n’ịkụziri ha asụsụ ọhụrụ.—Zefanaịa 3:9.

2 Gịnị bụ asụsụ ahụ? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa? Gịnị ka ịmụta ya chọrọ anyị n’aka n’otu n’otu?

Onyinye nke Ikwu Okwu

3. (a) Onyinye dị aṅaa dị ebube ka e kenyere Adam? (b) Gịnị bụ asụsụ Adam sụrụ?

3 Ikike nke mmadụ nwere ikwupụta echiche ya site n’okwu ọnụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke nke mere ka ihe a kpọrọ mmadụ dị iche n’anụmanụ dum e kere eke. Mgbe e kere mmadụ mbụ bụ Adam, o nwere uche nke nwere ike iji ọgụgụ isi chee echiche. E nyere ya akwara ndị na-eme ka ụda olu pụta, iré, na egbugbere ọnụ ndị a pụrụ iji kwuo okwu, nyekwa ya ìgwè mkpụrụ okwu na ikike nke imepụta okwu ọhụrụ dị iche iche. Adam pụrụ ịghọta ya mgbe Jehova gwara ya okwu, Adam pụkwara ikwupụta echiche ya n’okwu. (Jenesis 1:28-30; 2:16, 17, 19-23) O doro anya na asụsụ nke e nyere Adam bụ nke ahụ e mesịrị mata dị ka Hibru. N’ihi na ma ọ dịghị ihe ọzọ, ruo 1,757 afọ ndị mbụ ihe a kpọrọ mmadụ dịrị adị, ihe àmà gosiri na ihe nile a kpọrọ mmadụ nọgidere na-asụ otu asụsụ ahụ.—Jenesis 11:1.

4. Olee ụzọ ihe ndị mere n’oge Nimrọd si metụta asụsụ ụmụ mmadụ?

4 E mesịa, n’oge Nimrọd, iji wee meghasịa mgbalị nke ndị ajọ mmadụ, Jehova gwagburu asụsụ nke ndị nile kweworo ka a rụgide ha gaa n’ikere òkè n’iwu ụlọ elu Bebel ahụ. (Jenesis 11:3-9) O yiri ka Jehova ò bu ụzọ hichapụsịa kpam kpam ncheta nile nke asụsụ mbụ ahụ ha nwekọrọ ọnụ, wee webata asụsụ ọhụrụ dị iche iche n’ime uche ha. Nke a gụnyere ọ bụghị nanị mkpụrụ okwu ndị ọhụrụ, kamakwa ụtọ asụsụ ndị ọhụrụ na usoro iche echiche ndị ọhụrụ. Nwayọọ nwayọọ, asụsụ ndị ọzọ sitere n’asụsụ ndị ahụ Jehova malitere na Bebel wee bilite ruo taa, mgbe, dị ka ụlọ akwụkwọ dị iche iche na-amụ ihe banyere asụsụ si kwuo, a na-asụ ihe dị ka puku asụsụ atọ gburugburu ụwa.

5. Olee ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta ihe ‘mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha’ metụtara?

5 Nye ndị na-asụ asụsụ ndị a, ‘mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha’ ọ̀ ga-achọ ka ha gbahapụ asụsụ nke ala ha wee mụọ asụsụ mbụ ahụ Chineke nyere Adam? Ọnọdụ ndị metụtara onyinye e nyere amụma ahụ na-enye aka ịza ajụjụ ahụ.

Mkpa E Nwere maka Asụsụ Dị Ọcha

6-8. (a) Ọnọdụ okpukpe dị aṅaa bilitere na Juda tupu e buo amụma ahụ dị na Zefanaịa 3:9? (b) Ná mba ndị gbara Juda gburugburu, omume dị aṅaa jupụtara ebe nile?

6 Oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, Juda anọwo n’okpuru ọchịchị Manase, e mesịa, ọ nọọ n’okpuru ọchịchị Emọn, bụ́ ndị wuru ebe ịchụaja dị iche iche nye Beal, gbasoo omume nke ịjụ ndị mmụọ ase, malitekwa ihe omume mgbaasị dị iche iche. (2 Ndị Eze 21:1-6; 2 Ihe Emere 33:21-23) N’ihi nke a, n’oge ọchịchị nke nwa Emọn onye nọchiri anya ya, bụ́ Josaịa, Jehova nyere onye amụma ya bụ Zefanaịa ọrụ nke ịdọ aka ná ntị na a gaje iweta ikpe ọmụma Chineke n’ala ahụ.—Zefanaịa 1:1, 2.

7 Ọ bụ ezie na ndị bi na Judia maara site n’akụkọ ihe mere eme nke mba nke ha, sitekwa n’Akwụkwọ nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ na Jehova bụ ezi Chineke ahụ, ha nọ na-etinye aka n’ememe ndị rụrụ arụ nke ofufe Beal. Ha na-akpọ isiala nye anyanwụ na ọnwa na ìgwè kpakpando dị iche iche nke eluigwe, bụ́ nke megidere iwu Chineke kpọmkwem. (Deuterọnọmi 4:19; 2 Ndị Eze 23:5) Tụkwasị n’ihe ndị a nile, ha na-ekere òkè n’otu ụdị nke ngwakọta okpukpe, na-eme dị ka à ga-asị na okpukpe nile bụ otu ihe, site n’ịṅụ iyi nye Jehova nakwa n’aha nke chi ụgha bụ Malkam. Omume ha na-eme bụ na “Jehova agaghị eme ezi ihe, ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ.” (Zefanaịa 1:4-6, 12) N’ihe banyere mba ndị gbara Juda gburugburu, ha nile bụ ndị a ma ama dị ka ndị na-emegide Jehova na ndị ya, ya mere, ha onwe ha gaje inwetakwa mmezu nke ikpe ziri ezi Chineke n’isi ha.—Zefanaịa 2:4-15.

8 Ọ bụ ná ndabere nke ihe omume ndị dị otú a ka Jehova ji buo amụma na ya gaje ‘ịgbanwere ndị nile dị iche iche asụsụ dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ubu.’ (Zefanaịa 3:9) Ya mere, gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha?

9. (a) N’ihi gịnị ka asụsụ ahụ dị ọcha na-abụghị Hibru ma ọ bụkwanụ nanị Okwu Chineke e dere ede? (b) Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha, oleekwa ụzọ o si emetụta ndụ nke ndị na-asụ ya?

9 Ọ̀ bụ asụsụ Hibru? Ee e; ndị bi na Juda enweworị asụsụ ahụ, ma o doro anya na ihe ndị ha na-ekwu na ihe ndị ha na-eme adịghị ọcha ma ọ bụ zie ezi n’anya Jehova. Asụsụ ahụ dị ọcha abụghịkwa nanị Okwu Chineke e dere ede. Ha nwekwara nke ahụ. Ma ihe dị ha mkpa bụ nghọta ziri ezi nke eziokwu banyere Chineke na nzube ya nile, ọ bụkwa nanị Jehova pụrụ inye nke ahụ site ná mmụọ ya. Mgbe ha mụtara ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha, iche echiche ha, okwu ọnụ ha, omume ha, ga-adabere n’ịmata eziokwu ahụ nke bụ na Jehova bụ nanị ezi Chineke dịnụ. (Zefanaịa 2:3) Ha ga-atụkwasị ya obi, nyekwa ịbụ ọkaaka ya nkwado zuru ezu. Nke a bụ ihe na-akpali mmasị anyị taa n’ụzọ pụrụ iche. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Ndị ahụ E Nyeworo Asụsụ ahụ Dị Ọcha

10. Na-agbata oge dị aṅaa ka oge ruru maka mmezu nke amụma ahụ dị na Zefanaịa 3:9?

10 N’izo aka ná mmezu nke amụma ahụ n’otu oge kpọmkwem, Zefanaịa 3:9 na-asị: “N’ihi na mgbe ahụ ka m ga-agbanwere ndị nile dị iche iche egbugbere ọnụ [“asụsụ,” NW] dị ọcha.” Olee mgbe nke ahụ bụ? Amaokwu 8 na-aza na ọ bụ n’oge mgbe Jehova ‘na-achịkọta mba nile’ tupu ọ ‘wụsa ha oké iwe ya,’ ka ọ ga-enye ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha.

11. (a) Mmezu abụọ dị aṅaa ka Zefanaịa 3:9 nwere tupu oge anyị a? (b) Olee ụzọ mmezu ya nke oge a si dị iche?

11 N’oge nke Eze Josaịa, tupu Jehova ekwere ka ndị agha Babilọn mezuo ihe e kpere n’ikpe, ọtụtụ ndị gbakụtara ofufe ụgha azụ ma fee Jehova. (2 Ihe Emere 34:3-33) Ọzọ, n’ime narị afọ mbụ O.A., tupu ndị Rom ebibie Jerusalem, ọtụtụ puku mmadụ mụtara eziokwu ahụ banyere Chineke na nzube ya, wee bụrụ ndị e jikọrọ n’otu n’ijere ya ozi. N’oge ahụ, e mere ka asụsụ nke eziokwu ahụ dị ụtọ nke ukwuu site n’ihe ndị Jisọs Kraịst mere n’imezu nzube Jehova. Ma ọ bụ n’oge nke anyị a ka amụma Zefanaịa na-emezu n’ụzọ zuru ụwa ọnụ. A na-achịkọta mba nile ugbu a gaa n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) Nchịkọta ahụ anọwo na-aga n’ihu kemgbe ọmụmụ nke Alaeze ahụ na 1914. Ọ bụkwa n’otu oge nke a ka Jehova nọworo na-enye ndị dị iche iche bi n’ụwa dum mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha n’imezu amụma nke a. Ịmụta asụsụ ahụ dị oké mkpa n’ihi na ndị ga-alanarị mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ ga-abụ mmadụ ndị meworo ka asụsụ ahụ dị ọcha bụrụ asụsụ nke ha n’ezie.—Joel 2:32.

12. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ọhụụ ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 6 nwere n’amụma ahụ nke metụtara asụsụ dị ọcha? (b) N’ihi gịnị ka ndị e tere mmanụ ji chọọ enyemaka ka ha wee nọgide bụrụ ndị a na-anara nke ọma maka ijere Jehova ozi?

12 N’ikwekọ na nke a, ọ bụ ná mmalite nke oge ahụ na-esochi Agha Ụwa Mbụ ka Jehova malitere imeghe anya nghọta nke ndị ohu ya e tere mmanụ nye ọhụụ ahụ dị ebube nke e dekọrọ n’Aịsaịa isi 6. (Amaokwu 1-4) Ọhụụ nke a na-emesi mkpa ọ dị ike bụ́ anyị inwe egbugbere ọnụ dị ọcha ka anyị wee jeere Jehova ozi n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. Ọ na-egosi na n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu, Jehova bụ onye dị nsọ. Ndị ohu ya aghaghịkwa igosipụta àgwà ahụ. (1 Pita 1:15, 16) Ma ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ chọrọ enyemaka n’ihe banyere nke a. N’oge Agha Ụwa Mbụ na-aga n’ihu, ha ekwewo ka itinye aka n’ihe omume nke ụwa metọọ ha ruo n’ókè ụfọdụ. “Egwu Jehova dị ọcha,” ma ha ekwerewo ka egwu nke mmadụ na nke òtù ụmụ mmadụ dị iche iche metụta egbugbere ọnụ ha, na-emechi mkpọsa ha na-akpọsa Okwu Chineke ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. (Abụ Ọma 19:9) Site ná mmekọrịta ha na Krisendọm nwere, ihe ahụ fọdụrụ ka nwere ntụpọ site n’omenala na ihe omume ya ụfọdụ.

13, 14. (a) Olee ụzọ ihe ahụ fọdụrụ si gosipụta omume dị mma, gịnịkwa ka Jehova meere ha? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si nye ihe ahụ fọdụrụ asụsụ dị ọcha?

13 N’ịmata ọnọdụ ha, ihe ahụ fọdụrụ kwuru, dị ka Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Ahụhụ na-adịrị m, n’ihi na alawo m n’iyi; n’ihi na onye egbugbere ọnụ ya abụọ rụrụ arụ ka m bụ, ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m na-ebi: n’ihi na ọ bụ Eze anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ka anya m abụọ hụworo.” (Aịsaịa 6:5) Ha matara na ọnọdụ ha bụ nke a na-adịghị anara nke ọma. Ha anọgideghị n’ihi adịghị ike na-agbaso ụzọ ọjọọ ma ọ bụ jiri ịgba isi akwara jụ ịnara ịdọ aka ná ntị nke Jehova. Ha esonyereghị ndị ndú okpukpe ebe ọ bụ na ndị a ji nanị egbugbere ọnụ ha na-akwado Alaeze Chineke ma na-akwadokwa òtù League of Nations ahụ dị ka à ga-asị na ọ bụ ya bụ Alaeze ahụ.

14 N’ihi omume nchegharị nke ihe ahụ fọdụrụ dị umeala n’obi, Jehova jiri obi ebere ya nke na-erughịrị mmadụ gaa n’ihu ime ka egbugbere ọnụ ha dị ọcha. Aịsaịa 6:6, 7 na-agwa anyị, sị: “Otu n’ime ndị seraph wee fekwute m, jide otu nkume dị ọkụ n’aka ya, nke o ji m̀kpà wepụta n’elu ebe ịchụaja: o wee were ya metụ ọnụ m, sị, Lee, nke a emetụwo egbugbere ọnụ gị abụọ; e wee wezụga ajọ omume gị, kpuchiekwa mmehie gị.” Ọ bụ ozi na-eme ka a dị ọcha nke sitere n’Okwu Chineke bibiri omenala na ozizi nke ụmụ mmadụ dị ka à ga-asị na e ji ọkụ. O wepụchasịrị n’obi ha ịtụ egwu nke mmadụ, werekwa iji oké ịnụ ọkụ n’obi maka iji ọnụ ha na-ewetara Jehova otuto wee dochie anya ya. Jehova si otú a wee na-emezu nkwa ya nke ‘ịgbanwere ndị nile dị iche iche asụsụ dị ọcha [n’ikwu ya n’ụzọ nkịtị, egbugbere ọnụ dị ọcha], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova.’—Zefanaịa 3:9.

15. Olee ụzọ mmeghachi omume nke ihe ahụ fọdụrụ si kwekọọ n’ihe mere Jehova ji nye ha asụsụ ahụ dị ọcha?

15 Ya mere, mgbe òtù Aịsaịa nke oge a malitere ịnụ olu Jehova ka ọ na-ajụ, dị ka e dekọrọ ya n’Aịsaịa 6:8, sị: “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” Ha ji obi ụtọ zaghachi, sị: “Lee m; ziga m.” Ọ dịghịrị ha nile mfe ịmalite ozi ihu ọha ahụ, ma ha chọrọ ka Chineke jiri ha mee ihe dị ka ndị a kpọkwasịrị aha ya. Mmụọ ya gbara ha ume. Ọnụ ọgụgụ ha mụbakwara.

16. (a) Ihe dị aṅaa nke a na-atụghị anya ya ka nkwusa nke ihe ahụ fọdụrụ rụpụtara? (b) Olee ụzọ oké ìgwè mmadụ ahụ si enye ihe àmà na ha onwe ha na-asụkwa asụsụ ahụ dị ọcha?

16 Mgbe oge na-aga, o doro anya na ọrụ nkwusa ha na-arụpụta ihe a na-atụghị anya ya. Site n’aka ha, Jehova nọ na-enyere otu òtù ọzọ aka ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha. (Aịsaịa 55:5) Ndị a esoghị nwee olileanya nke ịdị ndụ n’eluigwe, ma ha weere ya dị ka ihe ùgwù ịbụ ndị ha na ihe ahụ fọdụrụ nke ndị nketa Alaeze na-akpakọrịta, nakwa iso ha na-eje ozi n’otu ubu dị ka ndị mkpọsa nke Alaeze Chineke. N’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, ndị a esiwo “ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile” pụta ruo ugbu a mgbe ha ghọworo “oké ìgwè mmadụ” nke ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ nde. Okwu nke na-esi n’ọnụ ha apụta abụghị ụdị nke ga-egosipụta ha dị ka ndị sitere na nke ọ bụla n’ime ihe dị iche iche dị n’ụwa nke a nke na-akpata nkewa. Olileanya ha adabereghị n’ebe mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọ bụla dị. Kama nke ahụ, ‘ha nọgidere na-ewere oké olu na-eti mkpu, sị, Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.’—Mkpughe 7:9, 10.

Ihe Ịmụ Asụsụ ahụ Chọrọ Anyị n’Aka

17. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mụta asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma, meziwanyekwa ikike anyị nwere iji ya eme ihe?

17 N’agbanyeghị ogologo oge anyị soworo nzukọ Jehova na-emekọ ihe, e nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ ime iji mụbawanye ihe ọmụma anyị nwere n’asụsụ ahụ dị ọcha nakwa ikike anyị nwere iji ya mee ihe nke ọma. Ọ dị mkpa itinye mgbalị ime nke ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na nke a bụ ihe na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere maka eziokwu ahụ.

18, 19. (a) Site ná mmalite, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịzụlite ịhụnanya siri ike maka eziokwu ahụ? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnọgide na-azụlite ịhụnanya ahụ?

18 Ná mmalite, ịhụnanya dị otú ahụ na-emeghe uche na obi mmadụ ka o wee nwee ike ịghọta ihe dị n’akwụkwọ nsọ, bụ́ ndị e gosiri ya; ọ na-akpali ya ịbịa Jehova nso na inwe nghọta banyere nzukọ Ya. Otú a, ịhụ eziokwu ahụ n’anya bụ isi ihe dị mkpa ná mmadụ ịdọbipụ onwe ya n’agbụ nile nke okpukpe ụgha. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha nwere mmasị n’ozi nke Bible ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ha na-ahapụ ihe nile e ji mara okpukpe ụgha na ụzọ ibi ndụ ya nke onye ọ bụla ime otú ọ masịrị ya. N’ihi gịnị ka ha na-adịghị eme nke ahụ? Dị ka a kọwara ya ná 2 Ndị Tesalọnaịka 2:10, ha “anaraghị ịhụnanya nke eziokwu nke ọma, ka e wee zọpụta ha.” Lee nnọọ ka o si dị mkpa ka anyị nwee ịhụnanya ahụ!

19 Ozugbo anyị natara eziokwu ahụ, ịdị na-azụlite ịhụnanya ahụ bụ ihe dị mkpa ná ntolite ime mmụọ anyị. Buru n’uche na Jehova na-ezo aka n’ebe eziokwu ahụ dị dị ka ‘asụsụ.’ Mgbe mmadụ mụtara asụsụ ọhụrụ, ọ ghaghị itinye ezi mgbalị iji wee mụta ọtụtụ okwu ndị dị na ya, ịkpọpụta okwu nke ọma, ịmụta akụkụ dị iche iche nke ụtọ asụsụ ya, na ihe ndị ọzọ. Ịhụnanya ọ hụrụ asụsụ ọhụrụ ahụ na ndị na-asụ ya ga-enyere ya aka ịnọgide na-enwe ọganihu. Ọ pụrụ ịsụ asụsụ ahụ ruo ókè ụfọdụ n’ime ọnwa ole na ole, ma ọ na-ewe ọtụtụ afọ nke ime ezi mgbalị tupu o nwee ike ịsụ ya dị ka nwa amaala. Otu ụdị mgbalị ahụ dị mkpa ka e wee mụta asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma.

20. (a) Gịnị mere ka asụsụ ahụ dị ọcha bụrụ nke dị ọcha n’ezie? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa onye ọ bụla n’ime anyị ilezi anya nke ọma?

20 Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ịrịba ama na asụsụ ahụ nke Chineke nyere ndị na-ejere ya ozi bụ nke e kwuru na ọ dị ọcha. Nke a bụ eziokwu, ọ bụghị n’ihi otú e si hazie ụtọ asụsụ ya, kama n’ihi na ọ na-enye ihe àmà nke ịdị ọcha nke omume na nke ime mmụọ. Asụsụ nke a adịghị enye ohere maka ịgha ụgha, ịghọgbu mmadụ, ma ọ bụ inwe ire aghụghọ. Ndị na-asụ asụsụ nke a aghaghị ịdị na-ekwu eziokwu mgbe nile. (Zefanaịa 3:13; Ndị Efesọs 4:25) Okwu ha aghaghịkwa ịdị na-egosipụta ụkpụrụ omume ọma dị elu nke Jehova n’ihe banyere mmekọahụ. (Ndị Efesọs 5:3, 4) Akwụkwọ nsọ na-emekwa ka anyị mara na ihe nile ọ bụla metụtara Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ ihe na-adịghị ọcha. (Mkpughe 18:2-4) A kpọrọ onyinyo nile nke chi ya dị iche iche “arụsị.” (Jeremaịa 50:2) Ya mere, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ndị mụtara asụsụ ahụ dị ọcha aghaghị ịtụfusị ihe nile a na-ahụ anya ndị metụtara ofufe ụgha, jụ ozizi ya nile, dọbipụ onwe ha n’ememe ya nile, wepụchasịakwa okwu nile ndị na-egosi echiche ọjọọ ya n’okwu ọnụ ha. E wezụga nke a, ná Mkpughe 16:13-16, a na-eme ka anyị mata na ịgba égbè ọnụ nke na-ekpokọba mba nile imegide Alaeze Chineke bụkwa ihe na-adịghị ọcha, ebe ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-akpali ya. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya wee ghara ikwe ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị a na-adịghị ọcha merụọ okwu ọnụ anyị.

21. Gịnị ọzọ ka e nwere n’asụsụ ahụ dị ọcha tụkwasị n’okwu ndị a na-ekwu?

21 A na-akpọ ihe ahụ nke anyị na-amụ asụsụ, o zikwara ezi ịkpọ ya otú ahụ. Ma nke ahụ apụtaghị na nanị ihe ndị na-asụ ya ga-eme bụ ịmụta okwu ụfọdụ e ji mara ndị Jehova. Ụda olu, otú e si debe ihu, na mmegharị ahụ dị iche iche dịkwa mkpa. Ihe ndị a pụrụ izipụ ozi ndị a na-apụghị iji nanị okwu ọnụ wee zipụ. Ha na-egosipụtakarị ihe anyị bụ n’ime n’ezie. Ha pụrụ igosipụta ma ànyị ewepụsịwo ịkpọasị, esemokwu, na ọnụma, nke ha nile bụcha ọrụ nke anụ ahụ na-emehie emehie. Mgbe mmụọ Chineke na-arụ ọrụ ná ndụ anyị n’enweghị ihe na-egbochi ya, mkpụrụ ya na-apụta ìhè n’ụzọ anyị na ndị ọzọ na-esi emekọrịta ihe.—Ndị Galetia 5:19-23; Ndị Efesọs 4:31, 32.

22. Mgbe anyị mụtara asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma, olee ụzọ ọ na-esi emetụta ime mkpebi anyị?

22 Onye ọ bụla nke mụtaworo asụsụ ọhụrụ na-ama na ya emezuwo oké ihe mgbe ọ hụrụ onwe ya ka ọ na-eche echiche n’asụsụ ọhụrụ ahụ, kama ịnọ na-asụgharị ya site n’asụsụ nke ala ya. N’otu aka ahụkwa, mgbe anyị na-amụ eziokwu ahụ, na-eme ezi mgbalị itinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị, sorokwa ndị ọzọ na-ekerịta ya mgbe nile, nwayọọ nwayọọ, anyị ga-ahụ na anyị na-eche echiche n’ụzọ nke eziokwu ahụ. Anyị adịghị anọgide jiri ihe ochie anyị maara na-atụnyere nke ọhụrụ ahụ, na-agbalị ịhọrọ otu n’ime ha. Ọbụna n’ihe ndị dị nta, ụkpụrụ Bible na-agbata anyị n’uche inye anyị nduzi nke dị anyị mkpa.—Ilu 4:1-12.

23. N’agbanyeghị ihe bụ asụsụ nke ala ha, gịnị na-egosi na Ndịàmà Jehova nile gburugburu ụwa na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha?

23 Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ puku asụsụ ihe a kpọrọ mmadụ na-asụ taa, ma a pụrụ ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha n’ime ndị ahụ nile. N’ịdị n’otu gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova na-eji asụsụ ahụ dị ọcha na-eme ihe nke ọma ka ha nọ na-eje ozi n’otu ubu, na-agba àmà ihu ọha nke na-ewetara Jehova, bụ́ Chineke anyị nke na-ahụ n’anya otuto.

Ajụjụ maka Ntụleghachi

◻ Gịnị so n’onyinye ahụ nke ikwu okwu?

◻ Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha?

◻ N’ebe òle ndị nọ ka Zefanaịa 3:9 mezuworo?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi nye ihe àmà nke na-egosi na anyị hụrụ asụsụ ahụ dị ọcha n’anya n’ezie?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị maara asụsụ ahụ dị ọcha na-eso ndị ọzọ ekerịta ya

[Foto dị na peeji nke 25]

N’agbanyeghị ihe bụ asụsụ nke ala ha, Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya