Bụrụnụ Ndị Dị n’Otu Site n’Asụsụ ahụ Dị Ọcha
“Mgbe ahụ ka m ga-agbanwere ndị nile dị iche iche egbugbere ọnụ [“asụsụ,” New World Translation] dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ubu.”—ZEFANAỊA 3:9.
1. Ọ̀ dịtụwo mgbe ọ bụla ụmụ mmadụ nụrụ ka Jehova Chineke kwuru okwu?
ASỤSỤ Jehova Chineke dị ọcha. Ma, ọ̀ dịwo mgbe ndị mmadụ nụrụ ka o kwuru okwu? Eenụ! Nke ahụ mere mgbe Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ n’elu ala na narị afọ 19 gara aga. Dị ka ihe atụ, mgbe e mere Jisọs baptism, a nụrụ ka Chineke kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:13-17) Nke ahụ bụ okwu bụ nnọọ eziokwu, nke Jisọs na Jọn Onye Na-eme Baptism nụrụ n’asụsụ mmadụ.
2. Gịnị ka e gosiri site n’ozuzo aka Pọl zoro ‘n’asụsụ dị iche iche . . . nke ndị mmụọ ozi’?
2 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, onye Kraịst bụ Pọl onyeozi kwuru banyere “asụsụ dị iche iche nke mmadụ na nke ndị mmụọ ozi.” (1 Ndị Kọrint 13:1) Gịnị ka nke a na-egosi? Ee, ọ na-egosi na ọ bụghị nanị ụmụ mmadụ, kamakwa ndị bụ mmụọ nwere asụsụ na ụdị okwu ha na-ekwu! N’eziokwu, Chineke na ndị mmụọ ozi adịghị enwe mkparịta ụka n’etiti onwe ha site n’iji ụda olu na asụsụ nke anyị ga-anụ ma ghọta. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dị mkpa inwe ọnọdụ mbara dị ka nke gbara ụwa gburugburu iji mụbaa ọ̀tụ̀tụ̀ ụda olu nke ụmụ mmadụ pụrụ ịnụ ma ghọta.
3. Olee ụzọ asụsụ mmadụ si malite?
3 Olee otú asụsụ mmadụ si malite? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị nne na nna anyị ochie gbalịrị iso ibe ha kparịta ụka site n’ime ụzụ anụmanụ na ịsụ ude. Akwụkwọ bụ Evolution (Life Nature Library) na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya mmadụ nke na-aghọchabeghị mmadụ n’ihe dị ka otu nde afọ gara aga . . . mụtara ụda okwu ole na ole.” Ma, onye ọkà a ma ama n’ide akwụkwọ ọkọwa okwu, bụ́ Ludwig Koehler kwuru, sị: “Ike ikwu okwu mmadụ bụ ihe nzuzo; ọ bụ onyinye Chineke, ọrụ ebube.” Ee, ike ikwu okwu mmadụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, n’ihi na ọ bụ Chineke nyere mmadụ mbụ, bụ́ Adam, asụsụ. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ nke ahụ e mesịrị kpọọ Hibru. Ndị Israel, bụ́ ndị sitere n’usoro ọmụmụ “Abram, bụ́ onye Hibru,” bụ́ nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi nke nna ya ochie bụ Shem bụ nwa nke onye ahụ na-ewu ụgbọ bụ Noa, sụrụ asụsụ ahụ. (Jenesis 11:10-26; 14:13; 17:3-6) N’ihi ngọzi ahụ Chineke gọziri Shem n’ụzọ amụma, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ọ dịghị ihe mere asụsụ ya site n’ihe ahụ Jehova Chineke mere n’ụzọ ọrụ ebube na 43 narị afọ gara aga.—Jenesis 9:26.
4. Ònye bụ Nimrọd, oleekwa ụzọ Setan bụ Ekwensu si jiri ya mee ihe?
4 N’oge ahụ, ‘ụwa nile nwere otu asụsụ na otu ụzọ okwu.’ (Jenesis 11:1) Nimrọd, bụ́ ‘dike n’ịchụ nta megide Jehova,’ dị ndụ n’oge ahụ. (Jenesis 10:8, 9) Onyeiro kasị ukwuu a na-adịghị ahụ anya nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Setan, jiri Nimrọd mee ihe n’ụzọ pụrụ iche iji guzobe akụkụ elu ala nke nzukọ Ekwensu. Nimrọd chọrọ imere onwe ya aha, omume mpako ahụ gafekwaara ndị na-eso ya, bụ́ ndị malitere atụmatụ ihe owuwu pụrụ iche n’ala Shaịna. Dị ka Jenesis isi 11, amaokwu 4 si kwuo, ha sịrị: “Ngwa, ka anyị wuoro onwe anyị obodo, na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwara onwe anyị aha; ka anyị wee ghara ịgbasa n’elu ụwa nile.” Atụmatụ ahụ, nke a malitere n’imegide ihe ahụ Chineke nyere n’iwu, bụ́ ka e ‘mejupụta ụwa’ bịara ná njedebe mgbe Chineke ghagburu asụsụ ndị nnupụisi ahụ. Ihe ndekọ Bible na-asị, “Jehova wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa nile: ha wee hapụ iwu obodo ahụ.” (Jenesis 9:1; 11:2-9) A kpọrọ obodo ahụ Bebel, ma ọ bụ Babilọn (nke pụtara, “Ọgba Aghara”), “n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova ghagburu asụsụ ụwa nile.”—Byington.
5. (a) Gịnị ka e gbochiri mgbe Chineke ghagburu asụsụ ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere asụsụ nke Noa na Shem?
5 Ọrụ ebube ahụ—nghagbu nke otu asụsụ ụmụ mmadụ—dujere n’imejupụta ụwa n’ụzọ ahụ Chineke nyere Noa iwu ka e si mee ya, o gbochikwara atụmatụ ọ bụla Setan pụrụ inweworị iji guzobe ofufe na-adịghị ọcha nke ụmụ mmadụ ga na-efe ya, bụ́ ndị nupụworo isi megide Eze Onyenwe eluigwe na ala. N’eziokwu, site n’ikpe okpukpe ụgha n’ụdị ya ọ bụla, ndị ahụ bụ ndi Ekwensu nwetaworo, ha na-ejekwara ndị mmụọ ọjọọ ozi mgbe ha na-eme chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche, na-enyekwa ha aha n’asụsụ ha dị iche iche, na-efekwa ha ofufe. (1 Ndị Kọrint 10:20) Ma ihe ahụ nanị otu ezi Chineke ahụ mere na Bebel gbochiri inwe otu okpukpe ụgha e jikọrọ ọnụ nke ga na-enye Ekwensu ofufe ahụ nke ihe àmà gosiri na ọ chọsiri ike. Otú ọ dị, onye ezi omume ahụ bụ Noa na nwa ya bụ Shem adịghị mgbe ọ bụla ha tinyere aka ná mgbalị ahụ na-agaghị nke ọma e mere n’ala Shaịna. N’ihi ya, a pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na asụsụ ha nọgidere na-abụ nke ahụ Abram (ma ọ bụ Abraham) onye kwesịrị ntụkwasị obi sụrụ—bụ́ asụsụ nke Chineke ji gwa nwoke ahụ bụ Adam okwu n’ogige Iden.
6. N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., olee ụzọ Jehova si gosi na ya pụrụ inye ike ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche?
6 Jehova, bụ́ onye ghagburu asụsụ mbụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, pụkwara inye ikike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ee, o mere ihe ahụ kpọmkwem n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 nke Oge Anyị! Dị ka Ọrụ Ndị Ozi 2:1-11 si kwuo, ihe dị ka 120 ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst zukọtara n’oge ahụ n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem. (Ọrụ 1:13, 15) Na mberede, e nwere ụzụ sitere n’eluigwe “dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike.” A hụrụ “ire, dị ka nke ọkụ,” e kesakwara ya n’isi ha nile. Mgbe nke ahụ mere, ndị ahụ na-eso ụzọ “wee jupụta ná mmụọ nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dị ka mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu.” N’asụsụ ndị ahụ Chineke nyere ha, ha kwuru okwu “banyere oké ọrụ nile nke Chineke.” Leekwa nnọọ ihe ọrụ ebube ọ bụ, mgbe ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, bụ́ ndị sitere n’ebe ndị dị anya dị ka Mesopotamịa, Ijipt, Libia, na Rom, ghọtara ozi ahụ nke na-enye ndụ!
Asụsụ nke Chineke Nyere Taa!
7. Olileanya dịgasị aṅaa ka a ga-enwe ma ọ bụrụ na a na-asụ, na-aghọtakwa nanị otu asụsụ gburugburu ụwa?
7 Ebe ọ bụ na Chineke pụrụ inye asụsụ dị iche iche site n’ọrụ ebube, ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ ihe dị ebube ma ọ bụrụ na o mee ka a na-asụ, na-aghọtakwa nanị otu asụsụ gburugburu ụwa? Nke ahụ ga-akwalite inwerịta nghọta n’ime ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka akwụkwọ The World Book Encyclopedia si kwuo ya: “Ọ bụrụ na mmadụ nile na-asụ otu asụsụ, njikọ omenala na akụ na ụba ga-esiwanye ike, mba nile ga-ebukwara mba ndị ọzọ ezi ihe n’obi karị.” Ee, e nwewo, ma ọ dịkarịa ala, 600 asụsụ dị iche iche e mere atụmatụ ka ọ bụrụ asụsụ ụwa dum n’ọtụtụ afọ ndị gaworo aga. N’ime ndị a, Esperanto enwewo mmetụta kasị ukwuu n’ihi na ihe dị ka 10,000,000 ndị mmadụ amụtawo ya kemgbe e wepụtara ya n’afọ 1887. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, mgbalị nile mmadụ mere iji asụsụ ụwa dum jikọọ ihe a kpọrọ mmadụ n’otu adịbeghị nke ọ bụla nwere ihe ịga nke ọma. N’eziokwu, ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ nọ na-akpata nkewasị n’ime ụwa nke a ka ‘ndị ajọ mmadụ na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.’—2 Timoti 3:13.
8. Ọbụna ma a sị na a nabata otu asụsụ zuru ụwa ọnụ n’ụwa nke oge a, gịnị ka ga-adịgide, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
8 N’ikwu ya n’ụzọ okpukpe, e nwere oké ọgba aghara. Ma, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya nke a, ebe akwụkwọ Bible bụ Mkpughe kpọrọ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha “Babilọn Ukwu ahụ”? (Mkpughe 18:2) Ee, n’ihi na “Babilọn” pụtara “Ọgba Aghara.” Ọbụna ma a sị na e guzobe asụsụ ọ bụla mmadụ mebere ma ọ bụ nke e ji mụọ ndị mmadụ dị ka Bekee, French, German, ma ọ bụ Russian, dị ka asụsụ ụwa dum, a ka ga-enwe adịghị n’otu n’ụzọ okpukpe na n’ụzọ ndị ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya bụ onye kasị na-achọ ọdịmma onwe ya, o jikwa anyaukwu na-achọ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ fee ya ofufe, dị nnọọ ka o mere n’oge Nimrọd na Ụlọ Elu nke Bebel. Ee, asụsụ ụwa dum nke ụmụ mmadụ na-emehie emehie na-asụ pụrụ ọbụna inye Setan ohere iguzobe ofufe Ekwensu nke dị n’otu! Ma Jehova apụghị ikwe ka nke ahụ mee; n’eziokwu, n’oge na-adịghị anya, ọ gaje iweta okpukpe ụgha nile Ekwensu kpaliri ná njedebe.
9. Olee ụzọ e si na-eme ka ndị si ná mba na agbụrụ nile na-adị n’otu ugbu a?
9 Ma n’agbanyeghị nke ahụ, otu eziokwu dị ịtụnanya bụ na a na-eme ka ndị ezi mmadụ sitere ná mba na agbụrụ nile dị n’otu ugbu a kpọmkwem. Nke a na-eme n’ụzọ Chineke si chọọ ya na n’ihi ofufe ya. Taa, Chineke na-eme ka o kwe omume ụmụ mmadụ ịmụta na ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha e nwere nanị ya n’elu ụwa. Ọ bụkwa n’ezie asụsụ zuru ụwa ọnụ. N’ikwu eziokwu, Jehova Chineke na-akụziri ọtụtụ ndị sitere ná mba nile nke ụwa asụsụ a dị ọcha taa. Nke a bụ ná mmezu nke nkwa amụma ahụ Chineke kwere site n’ọnụ onye amụma na onye àmà ya, bụ́ Zefanaịa, sị: “Mgbe ahụ m ga-enye ndị mmadụ mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha [n’ụzọ nkịtị, “egbugbere ọnụ dị ọcha”], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ka ha wee jeere ya ozi n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9, NW) Gịnị bụ asụsụ nke a dị ọcha?
Nkọwa nke Asụsụ ahụ Dị Ọcha
10. Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha?
10 Asụsụ ahụ dị ọcha bụ eziokwu Chineke nke a na-achọta n’ime Okwu nke ya, bụ́ Akwụkwọ Nsọ. Karịsịa, ọ bụ eziokwu metụtara Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-eweta udo na ngọzi ndị ọzọ nye ihe a kpọrọ mmadụ. Asụsụ ahụ dị ọcha na-ewepụ ndahie okpukpe na ofufe ụgha. Ọ na-ejikọ ndị nile na-asụ ya n’ofufe ahụ dị ọcha, dị mma, na-ewuli elu, nke ezi Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Jehova. Taa, ihe dị ka 3,000 asụsụ dị iche iche na-egbochi nghọta, ọtụtụ narị okpukpe ụgha dị iche iche na-emekwa ka ihe a kpọrọ mmadụ nọrọ ná mgbagwoju anya. Ya mere, lee nnọọ ka anyị si nwee obi ụtọ na Chineke na-enye ụmụ mmadụ mgbanwe gaa n’asụsụ nke a dị ọcha, dịkwa ebube!
11. Gịnị ka asụsụ ahụ dị ọcha mewooro mmadụ ndị si ná mba na agbụrụ nile?
11 Ee, ndị si ná mba na agbụrụ nile nọ na-amụta asụsụ ahụ dị ọcha. Dị ka nanị asụsụ dị ọcha n’ime mmụọ nke e nwere n’elu ala, ọ na-eje ozi dị ka ihe nkekọ dị ike. Ọ na-eme ka ndị nile na-asụ ya nwee ike ‘ịkpọku aha Jehova, ka ha wee jeere ya ozi n’otu ubu,’ ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị, “na-eji otu ubu.” Otú a, ha na-ejere Chineke ozi “n’otu nkwekọrịta,” “n’otu nkwekọrịta nke ha nile nwekọrọ ọnụ nakwa n’otu ubu nke dị n’otu.” (The New English Bible; The Amplified Bible) Nsụgharị nke Steven T. Byington na-agụ, sị: “Mgbe ahụ, mụ onwe m [Jehova Chineke] ga-eme ka egbugbere ọnụ nke mmadụ nile dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova ma na-emekọ ihe ọnụ n’ijere ya ozi.” E nwere ụdị imekọ ihe ọnụ ahụ nke e ji asụsụ dị iche iche na-eme n’ijere Chineke ozi nanị n’etiti Ndịàmà Jehova. Na 212 ala dị iche iche taa, ihe karịrị nde ndị nkwusa Alaeze anọ ndị a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ọtụtụ asụsụ dị iche iche ụmụ mmadụ na-asụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndịàmà ahụ “na-ekwu otu ihe,” ha ‘zukwara okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.’ (1 Ndị Kọrint 1:10) Nke a dị otú ahụ n’ihi na n’agbanyeghị ebe ha nọ n’elu ụwa, Ndịàmà Jehova nile na-asụ otu asụsụ ahụ dị ọcha, bụ́ nke na-ewetara Nna ha nke eluigwe otuto na nsọpụrụ.
Mụta Asụsụ ahụ Dị Ọcha Ugbu A!
12, 13. (a) N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji chegbuo onwe gị banyere ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha? (b) N’ihi gịnị ka okwu ndị ahụ dị na Zefanaịa 3:8, 9 ji dị oké mkpa taa?
12 N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji chegbuo onwe gị banyere ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha? Otu ihe bụ n’ihi na ndụ gị dabeere n’ịmụta na ịsụ ya. Kpọmkwem tupu Chineke ekwe nkwa ‘inye mmadụ nile mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha,’ ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe m ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka m wee chịkọta alaeze nile, ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m; n’ihi na a ga-eji ọkụ nke ekworo m ripịa ụwa nke a nile.”—Zefanaịa 3:8.
13 Mgbe mbụ Eze Onyenwe anyị bụ Jehova kwuru okwu ndị ahụ bụ na 26 narị afọ gara aga na Juda, nke Jerusalem bụ isi obodo ya. Ma okwu ndị ahụ bụ maka ụbọchị anyị karị n’ihi na Jerusalem sere onyinyo Krisendọm. Oge anyị a, kemgbe e guzobere Alaeze eluigwe nke Chineke na 1914, bụkwa ụbọchị Jehova maka ime ka mba nile zukọta nakwa ịchịkọta alaeze nile. O wekọtawo ha ọnụ iji leruo ha anya site n’otu oké ọrụ ịgba àmà a na-arụ. Nke a akpaliwokwa ha imegide nzube ya. Otú ọ dị, Jehova Chineke ji obi ebere na-eme ka mmadụ ndị sitere ná mba nile ndị a na-adị n’otu n’ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha. Site na ya, ndị nile chọrọ ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ o kwere ná nkwa pụrụ ijere ya ozi n’ịdị n’otu tupu e repịa mba nile ná ngosipụta yiri ọkụ nke ọnụma Chineke ‘n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,’ bụ́ nke a na-akpọkarị Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16; 2 Pita 3:13) Ọ bụ ihe obi ụtọ na ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha ma na-akpọku aha Jehova n’okwukwe dị ka ezi ndị na-efe ofufe n’ịdị n’otu ga-enweta nchebe Chineke n’oge oké ọdachi ụwa ahụ ga-akpọtụ. Chineke ga-echebe ha banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ebe nanị asụsụ ahụ dị ọcha ga-abụ asụsụ nke dị n’egbugbere ọnụ nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.
14. Site n’ọnụ Zefanaịa, olee ụzọ Chineke si gosi na ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a chọrọ ime ihe ozugbo?
14 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ Zefanaịa, Jehova mere ka o doo anya na ndị na-ele anya ịlanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a aghaghị ime ihe ozugbo. Dị ka Zefanaịa 2:1-3 si kwuo, Chineke na-asị: “Chịkọtanụ onwe unu, ee, chịkọta dị ka ahịhịa ọka, unu mba nke na-enweghị ihere; tupu ụkpụrụ amụpụta nwa, (ụbọchị agabigawo dị ka igbugbo ọka), mgbe ọnụma nke iwe Jehova akabịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị Jehova akabịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe o kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”
15. (a) Gịnị bụ mmezu mbụ nke Zefanaịa 2:1-3? (b) Olee ndị lanarịrị mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi Juda, gịnị ga-eyikwa nlanarị nke a n’oge anyị a?
15 Okwu ndị ahụ nwere mmezu ha mbụ n’isi Juda na Jerusalem oge ochie. Ndị Juda ahụ na-emehie emehie azaghachighị nke ọma n’ọkpụkpọ òkù Chineke, dị ka e gosiri site na ya imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ha n’aka ndị Babilọn n’afọ 607 T.O.A. Dị nnọọ ka Juda bụ “mba nke na-enweghị ihere” n’anya Chineke, otú a ka Krisendọm nọworo n’ihu Jehova dị ka “mba” nke na-enweghị ihere ọ bụla. Otú ọ dị, n’ihi ịṅa ntị n’okwu Chineke, ụfọdụ ndị Juda na ndị ọzọ lanarịrị, ha gụnyekwara onye amụma Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ Jeremaịa. Ndị ọzọ lanarịrịnụ bụ otu onye Etiopia aha ya bụ Ebed-melek na ụmụ Jehonadab. (Jeremaịa 35:18, 19; 39:11, 12, 16-18) N’otu aka ahụ taa, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” Jisọs, bụ́ ndị a chịkọtara site ná mba nile, ga-alanarị Amagedọn banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:14-16) Ọ bụ nanị ndị mụtara, na-asụkwa asụsụ ahụ dị ọcha ga-abụ ndị nwere ọṅụ n’ịlanarị.
16. Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji bụrụ onye e zobere “n’ụbọchị iwe Jehova”?
16 Dị nnọọ ka ọ bụ ụkpụrụ Jehova na e kwesịrị ikpochapụ Juda na Jerusalem, otú ahụ ka Krisendọm na-aghaghị ịla n’iyi. N’eziokwu, mbibi nke okpukpe ụgha nile dị nso, ndị chọrọ ịlanarị aghaghịkwa ime ihe ozugbo. Ha aghaghị ime otú ahụ ‘tupu ụbọchị agabiga dị ka igbugbo ọka,’ bụ́ nke ikuku na-ekuchapụ ngwa ngwa, dị ka mgbe a chịliri mkpụrụ ọka n’ikuku n’ebe a na-azọcha ọka. Ka e wee zọpụta anyị site n’ọnụma Chineke, anyị aghaghị ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha, meekwa ihe kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị Chineke tupu ụbọchị iwe Jehova nke na-ere ọkụ abịakwasị anyị. N’oge Zefanịa, nakwa n’oge anyị a, ndị dị umeala n’obi na-achọ Jehova Chineke, ya na ezi omume na ịdị umeala n’obi. Anyị ịchọ Jehova pụtara ịhụ ya n’anya site n’obi, mkpụrụ obi, uche, na ume anyị dum. (Mak 12:29, 30) “Eleghị anya a ga-ezobe [ndị na-eme otú ahụ] n’ụbọchị iwe Jehova.” Ma n’ihi gịnị ka amụma ahụ ji sị “eleghị anya”? N’ihi na nzọpụta dabeere n’ikwesị ntụkwasị obi na ntachi obi. (Matiu 24:13) A ga-ezobe ndị na-ekwekọ n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke, ndị nọgidekwara na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha, n’ụbọchị iwe Jehova.
17. Ajụjụ dịgasị aṅaa fọdụrụ ka anyị tụlee ha?
17 Ebe ụbọchị iwe Jehova dị nso, nzọpụta adaberekwa n’ịmụta na iji asụsụ ahụ dị ọcha na-eme ihe, ugbu a bụ oge imikpu onwe anyị n’ịmụta na ịsụ ya. Ma olee otú mmadụ pụrụ isi mụta asụsụ ahụ dị ọcha? Oleekwa ụzọ ị pụrụ isi rite uru site n’ịsụ ya?
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olee ụzọ ike ikwu okwu mmadụ si malite?
◻ Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha?
◻ N’ihi gịnị ka okwu ahụ dị na Zefanaịa 3:8, 9 ji dị oké mkpa taa?
◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ ndị e zobere “n’ụbọchị iwe Jehova”?
[Foto dị na peeji nke 11]
Na Bebel, Chineke chụsara ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịghagbu asụsụ ha