Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 20-25
  • Ṅomie Obi Ebere Chineke Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ṅomie Obi Ebere Chineke Taa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbaghara, Ihe Ndị Kraịst Na-aghaghị Ime
  • Ịlọghachikwute Jehova
  • Enyemaka Obi Ebere Ndị Ọzọ
  • Gosipụta Iguzosi Ike n’Ihe Ndị Kraịst Mgbe Ọ Dị Onye Ikwu A Chụpụrụ Achụpụ
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Otú Anyị Ga-esi Na-akpaso Onye A Chụpụrụ n’Ọgbakọ Àgwà
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mgbe Onye Anyị Hụrụ n’Anya Hapụrụ Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 20-25

Ṅomie Obi Ebere Chineke Taa

“Biko, ka anyị daba n’aka Jehova; n’ihi na obi ebere ya bara ụba.”—2 SAMUEL 24:14.

1. Mmetụta dị aṅaa ka Devid nwere banyere obi ebere Chineke, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

SITE n’ahụmahụ nke onwe ya, Eze Devid maara na Jehova nwere obi ebere karịa ụmụ mmadụ. N’inwe obi ike na ụzọ nile, ma ọ bụ okporo ụzọ nile nke Chineke kasị mma, Devid chọsiri ike ịmụta ụzọ Ya nile nakwa ije ije n’eziokwu Ya. (1 Ihe Emere 21:13; Abụ Ọma 25:4, 5) Ị̀ na-enwe mmetụta yiri nke ahụ Devid nwere?

2. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere na Matiu 18:15-17 banyere ilebara mmehie ndị dị oké njọ anya?

2 Bible na-enye anyị nghọta banyere ụzọ Chineke si eche echiche, ọbụna n’ihe ndị dị ka ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide anyị. Jisọs gwara ndị ozi ya, ndị ga-emesị bụrụ ndị nlekọta ndị Kraịst, sị: “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritere nwanna gị n’uru.” Mmejọ e kwuru okwu ya n’ebe a abụghị obere mmejọ onwe onye efu kama ọ bụ mmehie dị oké njọ, dị ka igwu wayo ma ọ bụ ikwutọ mmadụ. Jisọs kwuru na ọ bụrụ na nzọụkwụ nke a edozighị okwu ahụ, ọ bụrụkwa na e nwere ndị akaebe dịnụ, onye ahụ e mehiere kwesịrị ịkpọrọ ha jee ịnwapụta na e mejọrọ ya. Nke a ọ̀ bụ ihe ikpeazụ a ga-eme? Ee e. “Ma ọ bụrụ na [onye mmehie ahụ] aṅaghị ha ntị, gwa nzukọ m: ma ọ bụrụ na ọ ṅaghịkwa nzukọ m ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.”—Matiu 18:15-17.

3. Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru na onye mmehie na-enweghị nchegharị ga-adị “ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ”?

3 Ebe ha bụ ndị Juu, ndị ozi ahụ ga-aghọta ihe ọ pụtara bụ imeso onye mmehie ‘dị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.’ Ndị Juu na-ezere iso ndị mba ọzọ enwe mkpakọrịta, ha kpọkwara ndị Juu asị, bụ́ ndị na-arụ ọrụ dị ka ndị na-anakọtara ọchịchị Rom ụtụ isi.a (Jọn 4:9; Ọrụ 10:28) N’ihi ya, Jisọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụrụ na ọgbakọ ajụ onye mmehie, na ha ga-akwụsị iso ya na-enwe mkpakọrịta. Ma, olee ụzọ nke ahụ si kwekọọ n’eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs so ndị ọna ụtụ nọkọọ mgbe ụfọdụ?

4. N’iburu okwu ya dị na Matiu 18:17 n’uche, n’ihi gịnị ka Jisọs pụrụ iji soro ụfọdụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-emekọ ihe?

4 Luk 15:1 na-asị: “Ndị ọna ụtụ na ndị mmehie nile na-abịaru ya nso ịnụ okwu ya.” Ọ bụghị onye ọna ụtụ ma ọ bụ onye mmehie ọ bụla nọ n’ebe ahụ, ma, ọ bụ ha “nile” n’echiche nke bụ na ha dị ọtụtụ. (Tụlee Luk 4:40.) Olee ndị nke ọ bụ? Ọ bụ ndị ahụ nwere mmasị ka a gbaghara ha mmehie ha. Tupu mgbe ahụ, ụfọdụ n’ime ndị ahụ abụwo ndị a dọọrọ bịa n’ebe ozi nchegharị nke Jọn Onye Na-eme Baptism dị. (Luk 3:12; 7:29) Ya mere, mgbe ndị ọzọ bịakwutere Jisọs, ya ikwusara ha ozi ọma emebighị ndụmọdụ ya nke dị na Matiu 18:17. Rịba ama na ‘ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie [nụrụ olu Jisọs] malitekwa iso ya.’ (Mak 2:15) Ndị a abụghị ndị chọrọ ịnọgide n’ụzọ ndụ ha nke dị njọ, na-ajụ ịnara enyemaka ọ bụla. Kama nke ahụ, ha nụrụ ozi Jisọs, o metụkwara ha n’obi. Ọbụna ma a sị na ha ka nọ na-eme mmehie, ọ bụ ezie na o yikarịrị ka hà nọ na-agbalị ime mgbanwe, “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ, site n’ikwusara ha ozi ọma, na-eṅomi Nna ya nke nwere obi ebere.—Jọn 10:14.

Mgbaghara, Ihe Ndị Kraịst Na-aghaghị Ime

5. Gịnị bụ ọnọdụ bụ isi nke Chineke weere n’ihe banyere ịgbaghara mmehie?

5 E ji okwu ọma ndị a mesie anyị obi ike banyere ịdị njikere nke Nna anyị ịgbaghara mmehie: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, ka o wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.” “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ onye ezi omume.” (1 Jọn 1:9; 2:1) À pụrụ ịgbaghara onye a chụpụrụ n’ọgbakọ mmehie ya?

6. Olee ụzọ a pụrụ isi gbaghara onye a chụpụworo n’ọgbakọ ma nabataghachi ya?

6 Ee. N’oge a na-achụpụ mmadụ n’ọgbakọ maka ime mmehie n’enweghị nchegharị, ndị okenye ndị na-anọchite anya ọgbakọ ahụ na-akọwara ya na ọ pụrụ inwe nchegharị wee nweta mgbaghara nke Chineke. Ọ pụrụ ịbịa nzukọ ndị a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe ọ pụrụ ịnọ nụrụ ndụmọdụ Bible ndị pụrụ inyere ya aka inwe nchegharị. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 14:23-25.) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ pụrụ ịrịọ ka a kpọbataghachi ya n’ime ọgbakọ ahụ dị ọcha. Mgbe ahụ, mgbe ya na ndị okenye zukọtasịrị, ha ga-agbalị ịchọpụta ma ò chegharịwo ma hapụ ụzọ mmehie ya. (Matiu 18:18) Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, a pụrụ ịkpọbataghachi ya, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ahụ dị ná 2 Ndị Kọrint 2:5-8. Ọ bụrụ na ọ bụwo onye a chụpụrụ n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, ọ ga-adị mkpa ka o mee ezi mgbalị iji nwee ọganihu. Ọ pụkwara ịdị mkpa inyere ya aka n’ebe ọ dị ukwuu mgbe nke ahụ gasịrị iwulite ihe ọmụma na nghọta Bible ya ka o wee ghọọ onye Kraịst nke siri ike n’ime mmụọ.

Ịlọghachikwute Jehova

7, 8. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Chineke setịpụrụ n’ihe banyere ndị ya a dọọrọ n’agha laa ná mba ọzọ?

7 Ma, ndị okenye hà pụrụ ịmalite ime ihe ọ bụla n’onwe ha iji jekwuru onye a chụpụrụ n’ọgbakọ? Ee. Bible na-egosi na a na-egosipụta ebere ọ bụghị nanị site n’ime ihe na-ekwesịghị ekwesị nke bụ ịhapụ inye ahụhụ, kama ọtụtụ mgbe, site n’ime ihe ndị kwesịrị ekwesị. Anyị nwere ihe nlereanya nke Jehova. Tupu o mee ka a dọrọ ndị ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’agha laa ná mba ọzọ, n’ụzọ amụma o debere olileanya nke nlọghachi n’ihu ha, sị: “Cheta ihe ndị a, Jekọb; gị Israel kwa, n’ihi na ohu m ka ị bụ: . . . ehichapụwo m njehie gị nile, dị ka oké igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị nile, dị ka igwe ojii: laghachikwute m; n’ihi na agbapụtawo m gị.”—Aịsaịa 44:21, 22.

8 Mgbe ahụ, mgbe ha nọ ná ndọta n’agha n’ala ọzọ, Jehova mere ihe ndị ọzọ, na-eme ihe n’ụzọ baara ha uru. O zipụrụ ndị amụma, bụ́ ndị nnọchianya ya, ka ha kpọọ Israel òkù ‘ịchọ ya na ịchọta ya.’ (Jeremaịa 29:1, 10-14) N’Ezikiel 34:16, o ji onwe ya mee ihe atụ nke onye ọzụzụ atụrụ, jirikwa ndị nke mba Israel mee ihe atụ atụrụ furu efu: “Nke furu efu ka m ga-achọ, ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka m ga-ewelata.” Na Jeremaịa 31:10, Jehova jikwara ihe atụ nke ya ịbụ onye na-azụ ụmụ Israel dị ka atụrụ mee ihe. Ee e, o seghị onyinyo onwe ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ ahụ na-eche ka atụrụ nke furu efu lọghachite; kama nke ahụ, o gosiri onwe ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke na-achọgharị ndị furu efu. Rịba ama na ọbụna mgbe ndị mmadụ n’ozuzu ha na-enweghị nchegharị, bụrụkwa ndị nọ ná ndọta n’agha, Chineke malitere ime mgbalị ịchọ nlọghachite ha. N’ụzọ kwekọkwara na Malakaị 3:6, Chineke agaghị agbanwe ụzọ o si eme ihe ná ndokwa ndị Kraịst.

9. Olee ụzọ e si gbasoo ihe nlereanya Chineke n’ime ọgbakọ ndị Kraịst?

9 Nke a ọ́ dịghị atụ aro na a pụrụ inwe ihe mere a ga-eji malite ime ihe ụfọdụ n’ebe onye a chụpụrụ n’ọgbakọ nọ, onye ọ pụrụ ịbụ na o nwewo nchegharị ugbu a? Cheta na Pọl onyeozi nyere nduzi ka a chụpụ ajọ onye ahụ n’ọgbakọ dị na Kọrint. Mgbe e mesịrị, ọ gbara ọgbakọ ahụ ume ka ha gosi n’ezie na ha hụrụ nwoke ahụ n’anya n’ihi nchegharị ya, bụ́ nke dujere ná nnabata e mesịrị nabataghachi ya n’ime ọgbakọ ahụ.—1 Ndị Kọrint 5:9-13; 2 Ndị Kọrint 2:5-11.

10. (a) Nzube dị aṅaa kwesịrị ịkpali mgbalị ọ bụla e mere ijekwuru ụfọdụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị ịbụ ndị ikwu bụ ndị Kraịst kwesịrị ịmalite ime ihe iji jekwuru onye ahụ?

10 Akwụkwọ ihe ọmụma ahụ e hotara okwu site na ya ná mmalite kwuru, sị: ‘Ihe ndabere bụ isi e ji achụpụ mmadụ bụ iji chebe ụkpụrụ nile nke ìgwè ahụ: “Ihe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum” (1 Kọr. 5:6). Ebumnuche nke a pụtara ìhè n’ihe ka ọtụtụ n’ihe odide Bible dị iche iche na nke akwụkwọ ndị na-esoghị na Bible, ma nchegbu e nwere maka ndị mmadụ n’otu n’otu ọbụna mgbe a chụpụsịrị ha bụ ihe ndabere nke arịrịọ ahụ Pọl rịọrọ na 2 Kọr. 2:7-10.’ (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ndị ọzụzụ atụrụ nke ìgwè atụrụ ahụ kwesịrị igosi nchegbu dị otú a taa. (Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:2) Ndị bụbu ndị enyi na ndị ikwu pụrụ inwe olileanya na onye a chụpụrụ n’ọgbakọ ga-alọghachi; ma n’ihi nsọpụrụ ha nwere maka iwu ahụ e nyere ná 1 Ndị Kọrint 5:11, ha adịghị eso onye dị otú ahụ a chụpụrụ achụpụ na-enwe mkpakọrịta.b Ha na-ahapụrụ ya ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ahọpụta ime ihe kwesịrị ekwesị iji hụ ma onye ahụ ò nwere mmasị n’ịlọghachite.

11, 12. Ụdị ndị a chụpụrụ achụpụ dị aṅaa ka ọbụna ndị okenye na-ekwesịghị ijekwuru, ma olee ụdị ndị ha pụrụ ije leta?

11 Ọ gaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị ọbụna ka ndị okenye jekwuru ụfọdụ ndị a chụpụrụ achụpụ, dị ka ndị dapụworo n’ezi ofufe, ndị ‘na-ekwu ihe dị iche iche gbagọrọ agbagọ iji wee dọrọ ndị na-eso ụzọ iso ha n’azụ.’ Ndị a bụ ‘ndị ozizi ụgha ndị na-agbalị iwebata ịrọ òtù dị iche iche nke ịla n’iyi, na-agbalịkwa iji okwu nrafu dị iche iche rigbuo ọgbakọ.’ (Ọrụ 20:30; 2 Pita 2:1, 3) Bible enyeghịkwa ihe ndabere ọ bụla maka ije ịchọgharị ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ, bụ́ ndị nwere omume iseokwu ma ọ bụ ndị na-agba ndị mmadụ ume ime ihe na-ezighị ezi.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3; 1 Timoti 4:1; 2 Jọn 9-11; Jud 4, 11.

12 Otú ọ dị, ọtụtụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ adịghị otú ahụ. Ọ pụrụ ịbụ na mmadụ akwụsịwo ajọ omume ahụ nke e ji n’ihi ya chụpụ ya. Ọ pụrụ ịbụ na onye ọzọ na-ejibu ụtaba na-eme ihe, ma ọ̀ bụkwanụ na ọ na-aṅụbigabu mmanya ókè, ma ugbu a, ọ dịghị agbalị iduba ndị ọzọ n’ajọ omume. Cheta na ọbụna tupu ndị Israel ahụ a dọọrọ n’agha echigharịkwute Chineke, e dupụrụ ndị nnọchianya ya ịgba ha ume ka ha lọghachite. Bible agwaghị anyị ma Pọl ma ọ bụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Kọrint hà mere ihe ọ bụla n’onwe ha iji kpọtụrụ nwoke ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ. Mgbe nwoke ahụ chegharịworo, kwụsịkwa ndụ adịghị ọcha ya, Pọl duziri ọgbakọ ahụ ka ha nabataghachi ya.

13, 14. (a) Gịnị na-egosi na ụfọdụ ndị a chụpụrụ achụpụ pụrụ ịnara mgbalị ndị e ji obi ebere malite ime n’ebe ha nọ? (b) Olee ụzọ òtù ndị okenye pụrụ isi mee ndokwa ime nleta ahụ?

13 N’oge ndị na-adịbeghị anya gara aga, e nwewo oge dị iche iche mgbe onye okenye jekwuuru onye a chụpụrụ n’ọgbakọ.c Mgbe o kwesịrị ekwesị, onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-akọwa ná mkpirikpi ihe ndị ọ dị mkpa ka e mee iji bụrụ onye a nabataghachiri. Ụfọdụ ndị dị otú ahụ chegharịrị wee bụrụ ndị a nabataghachiri. Ihe ọṅụ ndị dị otú ahụ nke a rụpụtara na-egosi na a pụrụ inwe ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị hapụworo ọgbakọ n’onwe ha, ndị ga-anara ọkpụkpọ òkù ndị ọzụzụ atụrụ ji obi ebere kpọọ ha. Ma olee otú ndị okenye pụrụ isi lebara okwu nke a anya? A sị nnọọ na ọ karịala, otu ugbo n’afọ, òtù ndị okenye kwesịrị ịtụle ma è nwere ndị dị otú ahụ bi n’ókèala ha.d Ndị okenye ga-elekwasị anya ná ndị ahụ a chụpụworo ruo ihe karịrị otu afọ. Dị ka ọnọdụ e nwere si dị, ọ bụrụkwa na o kwesịrị ekwesị, ha ga-ezipụ ndị okenye abụọ (ọ kasị mma ka ọ bụrụ ndị maara ọnọdụ ahụ nke ọma) ije leta onye dị otú ahụ. E kwesịghị ije na nke onye ọ bụla na-enye ihe àmà nke ịbụ onye nkatọ na nke inwe àgwà dị ize ndụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke meworo ka a mara na ya achọghị enyemaka.—Ndị Rom 16:17, 18; 1 Timoti 1:20; 2 Timoti 2:16-18.

14 Ndị ọzụzụ atụrụ abụọ ahụ pụrụ iji telifon kpọọ ya ịjụ ya ma hà nwere ike ịbịa nleta dị mkpirikpi, ma ọ bụ ha nwere ike ije n’ụlọ ya n’oge kwesịrị ekwesị. N’oge nleta ahụ, ọ dịghị mkpa ka ha na-aba mba ma ọ bụ ọbụna jụbiga oyi ókè, kama ha kwesịrị igosipụta ezi nchegbu obi ebere ha nwere n’ebe ọ nọ. Kama ịtụleghachi ihe ahụ mere n’oge gara aga, ha pụrụ ịtụle akụkụ Bible ndị dị ka Aịsaịa 1:18 na 55:6, 7 na Jemes 5:20. Ọ bụrụ na onye ahụ nwere mmasị n’ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke, ha pụrụ iji obi ebere kọwaara ya ihe o kwesịrị ime, dị ka ịdị na-agụ Bible na akwụkwọ dị iche iche Watch Tower Society na-ebipụta, na-abịakwa nzukọ dị iche iche a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

15. Gịnị ka ndị okenye ndị na-eje ileta onye a chụpụrụ n’ọgbakọ kwesịrị iburu n’uche?

15 Ọ ga-adị mkpa ka ndị okenye ndị a nwee amamihe na nghọta iji kpebie ma è nwere ihe na-egosi nchegharị ma ọ bụkwanụ na ọ ga-adị mma ije nleta nke ugbo abụọ. Otú ọ dị, ha kwesịrị iburu n’uche na ụfọdụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ adịghị mgbe ọ bụla ‘a pụrụ ime ka ha nwee nchegharị.’ (Ndị Hibru 6:4-6; 2 Pita 2:20-22) Mgbe ha jesịrị nleta ahụ, mmadụ abụọ ga-eji ọnụ kọọrọ Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ná mkpirikpi banyere ije ha. Kọmitii ahụ ga-emekwa ka òtù ndị okenye dum mara ihe e jetara na n’oge ọzọ ha ga-enwe nnọkọ. Ihe ahụ ndị okenye ji obi ebere malite ime ga-egosipụtaworị echiche nke Chineke, bụ́: “Laghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.”—Malakaị 3:7.

Enyemaka Obi Ebere Ndị Ọzọ

16, 17. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee ndị Kraịst bụ ndị ikwu nke onye a chụpụrụ n’ọgbakọ anya?

16 Gịnị banyere ndị ahụ n’etiti anyị ndị na-abụghị ndị nlekọta, ndị na-agajeghịkwa ịmalite ime ihe ndị dị otú ahụ n’ebe ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ nọ? Gịnị ka anyị pụrụ ime, bụ́ nke kwekọrọ ná ndokwa nke a, nakwa n’iṅomi Jehova?

17 Ọ bụrụhaala na mmadụ bụ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ onye kewapụworo onwe ya n’ọgbakọ, ọ dị mkpa ka anyị gbasoo ndụmọdụ ahụ bụ: “Ka unu na onye ọ bụla nke a na-akpọ ya aha na ọ bụ nwanna ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye anyaukwu, ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye nkwutọ, ma ọ bụ onye na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe; ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.” (1 Ndị Kọrint 5:11) Ma okwu ntụzi Bible nke a ekwesịghị imetụta otú anyị si ele ndị Kraịst nọ n’ezinụlọ anya, bụ́ ndị ha na onye a chụpụrụ n’ọgbakọ na-ebikọ. Ndị Juu oge ochie kpọrọ ndị ọna ụtụ asị nke ukwuu nke na ịkpọasị ha gbasara ọbụna ruo n’ebe ezinụlọ ndị ọna ụtụ ahụ dị. Jisọs akwadoghị nke ahụ. O kwuru na e kwesịrị imeso onye mmehie nke jụrụ ịnara enyemaka dị ka “onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ”; o kwughị na e kwesịrị imeso ndị ezinụlọ ya bụ ndị Kraịst n’otu aka ahụ.—Matiu 18:17.

18, 19. Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosipụta ịbụ ndị Kraịst anyị n’ebe ndị ikwu kwesịrị ntụkwasị obi nke onye a chụpụrụ achụpụ nọ?

18 Anyị kwesịrị inye ndị ezinụlọ ahụ bụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nkwado pụrụ iche. Ọ pụrụ ịbụ na ha anọworị na-eche ihe mgbu na ihe mgbochi dị iche iche ihu n’ihi ibikọ n’otu ụlọ, ha na onye a chụpụrụ achụpụ nke pụrụ ịnọ na-akụda ha aka ná nchụso ime mmụọ ha. Ọ pụrụ ikwu ka ndị Kraịst ghara ịbịa n’ụlọ ha; ma ọ bụ, ọ bụrụ na ha abịa ileta ndị ezinụlọ ahụ na-eguzosi ike n’ihe, ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị enwe omume ọma nke ịghara ịbịa ndị ọbịa ahụ nso. Ọ pụkwara ịdị na-egbochi mgbalị ezinụlọ ahụ na-eme ịgazu nzukọ na mgbakọ dị iche nke ndị Kraịst. (Tụlee Matiu 23:13.) Ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ ọjọọ dị otú a kwesịrị inweta obi ebere anyị n’ezie.—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

19 Otu ụzọ anyị pụrụ isi gosi ezi obi ebere bụ site ‘n’ikwu okwu nkasi obi’ na iso ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị otú ahụ nọ n’ezinụlọ ahụ na-enwe mkparịta ụka ndị na-agba ume. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) E nwekwara ohere ọma inye nkwado tupu a malite nzukọ dị iche iche nakwa mgbe a gbasasịrị, mgbe a nọ n’ozi ubi, ma ọ bụ mgbe anyị nọkọrọ n’otu n’oge ndị ọzọ. Ọ dịghị mkpa ka anyị kpọtụ nchụpụ n’ọgbakọ aha, kama anyị pụrụ ịkparịta ụka banyere ihe ndị na-ewuli elu. (Ilu 25:11; Ndị Kọlọsi 1:2-4) Ọ bụ ezie na ndị okenye ga-anọgide na-azụ ndị Kraịst nọ n’ezinụlọ ahụ dị ka atụrụ, anyị pụrụ ịhụ na anyị onwe anyị pụkwara ije leta ha n’enweghị mmekọrịta ọ bụla nke anyị na onye ahụ a chụpụrụ achụpụ. Ọ bụrụ na ọ bụ onye ahụ a chụpụrụ achụpụ bịara mepee ụzọ ma ọ bụ zaa mgbe anyị kpọrọ na telifon, anyị pụrụ ịgwa ya ka ọ kpọọrọ anyị onye ikwu ya bụ onye Kraịst nke anyị na-achọ. Mgbe ụfọdụ, ndị Kraịst nọ n’ezinụlọ ahụ pụrụ inwe ike ịza òkù anyị kpọrọ ha ịbịa n’ụlọ anyị maka mkpakọrịta. Isi ihe dị na ya bụ: Ha—ma ụmụntakịrị ma ndị okenye—bụ ndị ohu ibe anyị, ndị a hụrụ n’anya nọ n’ọgbakọ Chineke, ndị a na-agaghị ahapụ nanị ha.—Abụ Ọma 10:14.

20, 21. Mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a nabataghachi mmadụ n’ọgbakọ?

20 Akụkụ ọzọ nke igosi obi ebere na-emeghe mgbe a nabataghachiri onye a chụpụrụ achụpụ n’ọgbakọ. Ihe atụ ndị ahụ Jisọs mere na-eme ka ọ pụta ìhè ọṅụ a na-enwe n’eluigwe mgbe ‘otu onye mmehie chegharịrị.’ (Luk 15:7, 10) Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ banyere nwoke ahụ nke a chụpụwororịị, sị: “Ana m achọ ka unu were amara gbaghara ya kasiekwa ya obi, ka a ghara iji ihe mwute nke na-ewutebiga ya ókè lodaa mmadụ dị otú a n’ụzọ ọ bụla. N’ihi nke a arịọ m unu ka unu mee ka ịhụnanya unu hụrụ ya bụrụ ihe dị ịtụkwasị obi.” (2 Ndị Kọrint 2:7, 8) Ka anyị jiri anya udo tinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ n’ụzọ ịhụnanya n’ụbọchị na izu ndị na-eso mgbe a nabataghachiri mmadụ n’ọgbakọ.

21 Ihe atụ Jisọs banyere nwa mmefu ahụ na-ewelite otu ihe ize ndụ nke ọ dị mkpa ka anyị zere. Nwanne ya nwoke nke tọrọ ya enweghị ọṅụ ná nlọghachi nke nwa mmefu ahụ, kama o nwere mwute. Ka anyị ghara ịdịkwa otú ahụ, na-ebukọ ihe ọjọọ n’obi n’ihi mmejọ e mejọrọ anyị n’oge gara aga ma ọ bụ na-enwe iwe n’obi maka nnabata a nabataghachiri onye ahụ n’ọgbakọ. Kama nke ahụ, ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịdị ka nna ahụ, onye mere ihe atụ mmeghachi omume nke Jehova. Nna ahụ nwere obi ụtọ na nwa ya nwoke, onye fuwororịị efu, yiekwa onye nwụrụ anwụ, bụ onye a chọtaghachiri, ma ọ bụ onye bịaghachiri ná ndụ. (Luk 15:25-32) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, anyị ga-enwere onwe anyị ikwunyere nwanna ahụ a nabataghachiri n’ọgbakọ okwu, sitekwa n’ụzọ ndị ọzọ gbaa ya ume. Ee, anyị kwesịrị ime ka ọ pụta ìhè na anyị na-egosi obi ebere, dị ka Nna anyị nke eluigwe nke na-agbaghara mmehie, na-emekwa ebere, na-eme.—Matiu 5:7.

22. Gịnị ka anyị iṅomi Jehova Chineke gụnyere?

22 E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla dị ya na ọ bụrụ na anyị chọrọ iṅomi Chineke anyị, anyị aghaghị igosi obi ebere n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị o nyere n’iwu na ikpe ziri ezi ya. Onye ọbụ abụ ahụ kọwara ya n’ụzọ dị otú a: “Onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ; ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ dịkwa ukwuu n’ebere. Jehova dị mma n’ebe ihe nile o kere eke dị; obi ebere ya nile dịkwasịkwa n’ọrụ ya nile.” (Abụ Ọma 145:8, 9) Lee nnọọ ihe nlereanya ịhụnanya nke a bụụrụ ndị Kraịst iṅomi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “Ndị Juu bi na Palestine nwere ọtụtụ ihe ha ji kpọọ ndị ọna ụtụ asị nke ukwuu: (1) ha na-anakọtara ọchịchị mba ọzọ ego, bụ́ ndị bichiri n’Israel, wee si otú a na-akwado mmegbu nke a n’ụzọ na-apụtaghị ìhè; (2) a ma ha ama n’ihi ajọ omume ha, site n’irigbu ndị ala ha na-aba ọgaranya; (3) ọrụ ha mekwara ka ha na ndị Jentaịl na-akpakọrịta, na-eme ka ha ghara ịdị ọcha n’ụzọ usoro ihe omume ha. A na-ahụta asị a kpọrọ ndị ọna ụtụ ma n’A[gba] Ọ[hụrụ] ma n’ihe odide ndị rabaị . . . Nke ikpeazụ ahụ kwuru na a ga-akpọkwu ọbụna ezinụlọ onye ọna ụtụ asị.”—The International Standard Bible Encyclopedia.

b Ọ bụrụ na, n’ime ezinụlọ onye Kraịst, e nwere onye ikwu nke a chụpụrụ achụpụ, onye ahụ ka ga-abụkwa akụkụ nke ihe omume na mmekọrịta a na-enwe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị n’ime ezinụlọ ahụ. Nke a pụrụ ịgụnye ịnọ ya mgbe a na-atụle ihe ime mmụọ dị ka ezinụlọ.—Lee Ụlọ Nche nke November 15, 1988, peji 19-20.

c Lee 1991 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji 53-54.

d Ọ bụrụ na Onyeàmà ọ bụla, mgbe ọ nọ ná nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ site n’ụzọ ọzọ, amata banyere onye a chụpụrụ n’ọgbakọ nke bi n’ókèala ahụ, o kwesịrị ime ka ndị okenye ọgbakọ mara nke a.

Ị̀ Rịbara Isi Ihe Ndị A Ama?

◻ Olee ụzọ ndị Juu si mesoo ndị ọna ụtụ na ndị mmehie, ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji soro ụfọdụ n’ime ndị dị otú ahụ nwee mkpakọrịta?

◻ Ihe ndabere Akwụkwọ nsọ dị aṅaa ka e nwere maka iji obi ebere malite ime ihe iji jekwuru ọtụtụ ndị fuworonụ?

◻ Olee ụzọ òtù ndị okenye dị iche iche pụrụ isi malite ime ihe n’ụzọ dị otú ahụ, ọ̀ bụkwa n’ebe òle ndị nọ?

◻ Olee ụzọ anyị kwesịrị isi gosi ndị a nabataghachiri n’ọgbakọ obi ebere, gosikwa ezinụlọ dị iche iche nke ndị a chụpụrụ achụpụ?

[Igbe dị na peeji nke 23]

Ọ dịghị mkpa ka onye ọ bụla nke bụbu akụkụ nke ọgbakọ obi ụtọ Chineke nke dị ọcha, ma bụrụ onye a chụpụrụ achụpụ ugbu a ma ọ bụ onye kewapụworo onwe ya, nọgide n’ọnọdụ ahụ. Kama nke ahụ, onye ahụ pụrụ ichegharị wee malite ime ihe iji jekwuru ndị okenye ọgbakọ. Ụzọ nlọghachi ghere oghe.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 24]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya