Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/1 p. 4-6
  • Bible—Ò Sitere n’Aka Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible—Ò Sitere n’Aka Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụghị Nanị Akụkọ Ihe Mere Eme
  • Ibu Ọrụ Dịịrị Anyị
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Gịnị Bụ Baịbụl?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ezi Ozizi nke Na-atọ Chineke Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Akwụkwọ nke Na-ekpughe Ihe Ọmụma Chineke
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/1 p. 4-6

Bible—Ò Sitere n’Aka Chineke?

N’EZIE, ọ bụ nnọọ ihe ruuru Jehova, bụ́ Chineke nke a na-akparaghị ike na ikike o nwere ókè, inwe mkparịta ụka n’etiti ya na ụmụ mmadụ o kere eke n’ụzọ ọ bụla o si chọọ. Ọ bụru na ọ họrọ ịgwa ha okwu site n’okwu e dere ede, ọ ga-adịkwa mkpa ka o chebe ozi ya gabiga ọtụtụ ọgbọ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka o meworo n’ihe banyere Bible?

N’ihe dị ka 1,500 afọ tupu Kraịst, mgbe a malitere odide Bible, e nwere ihe odide okpukpe ndị ọzọ dị adị. Otú ọ dị, a kwụsịrị iji ndị a nile eme ihe, ha wee fusịakwa. Ndị ọkà n’inyocha ihe mgbe ochie e gwutere n’ala egwupụtawo ụfọdụ n’ime ha, ugbu a, ha bụkwa ihe mgbe ochie ndị e debere n’ụlọ ndebe ihe mgbe ochie dị iche iche. N’aka nke ọzọ, ọ dịghị mgbe ọ bụla e chefuru akụkụ Bible ndị ahụ e dere n’ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, e nwekwara ụfọdụ n’ime ha ndị ka dị ruo n’oge anyị a. Nke a bụ ihe kwesịrị ịrịba ama, karịsịa mgbe a tụlere ịkpọasị e weliteworo megide Bible n’akụkọ ihe mere eme dum. Ọ dịbeghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ nwetara ajọ mmegide na ịkpọasị dị otú ahụ. Ịkwụ nhá, ịtụ mkpọrọ, mmekpọ ọnụ, na ọtụtụ mgbekwa, ọnwụ, abụwo ntaramahụhụ dịịrị ịgụ ma ọ bụ ikesa Bible.

Olee otú akwụkwọ nkịtị pụrụ isiworị nọgide na-adị n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Bible n’onwe ya na-agwa anyị, sị: “Okwu Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Pita 1:25) Eziokwu ahụ nke bụ na Bible na-adịgide, na a pụghịkwa ibibi ya ebibi na-enyere anyị aka ịmata ya dị ka Okwu nsọ nke Chineke.

Ọzọkwa, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na ozi Chineke ziteere ihe a kpọrọ mmadụ ga-abụ nke a pụrụ inweta n’ụwa nile. Ọ̀ bụ otú a ka ọ dị n’ihe banyere Bible? N’ezie ọ bụ! Ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke bịaworo Bible nso n’ihe banyere nke a. A na-ekwu na e kesawo Bible ruo n’ọnụ ọgụgụ dị ka 3,000,000,000. Karịsịa, ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ a sụgharịworo gaa n’ọtụtụ asụsụ otú a. Ugbu a, a pụrụ ịgụ Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’ihe karịrị 1,900 asụsụ dị iche iche. Òtù American Bible Society na-akọ na ọ pụrụ iru 98 pasenti nke ndị bi n’ụwa aka ugbu a. Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-akpọ Bible “ma eleghị anya nchịkọta akwụkwọ kasị nwee ikike n’akụkọ ihe mere eme mmadụ.” Ya mere, ọ bụghị ime mpako, bụ́ ịkọwa ya dị ka akwụkwọ kasị ukwuu dị n’elu ụwa.

Nkwekọ dị n’ime Bible site ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ ya bụkwa n’onwe ya ihe àmà siri ike na o sitere n’ike mmụọ Chineke n’ezie. Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na ihe odide ihe dị ka 40 mmadụ dị iche iche dere n’ogologo oge nke 1,600 afọ pụrụ inwezu nkwekọ, nweekwa otu isiokwu bụ isi? Nke a ga-abụ ihe na-agaghị ekwe omume ma a sị na a hapụụrụ ya ihe ndabara ma ọ bụ nduzi nke ụmụ mmadụ efu. Ma, otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere 66 akwụkwọ ndị ahụ mejupụtara Bible. Ọ bụ nanị onye nwere ọgụgụ isi nke karịrị nke mmadụ, onye dịwokwara ogologo ndụ, pụrụ ime ka e mepụta ihe dị otú a nke kwesịrị ịrịba ama.

Ọ Bụghị Nanị Akụkọ Ihe Mere Eme

Ndekọ akụkọ ihe mere eme dị na Bible bụ ihe kwesịrị ịrịba ama. Ma ozi sitere n’aka Chineke nke nanị ihe dị na ya bụ ndekọ akụkọ ihe mere eme ga-abara anyị uru nanị n’ụzọ a kpaara ókè. Nduzi na ezi ihe ọmụma dị anyị mkpa, a pụkwara inweta ihe ndị ahụ n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, Bible na-agba anyị ume ịzụlite “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè”—bụ́ isi ihe ndị e dere ọtụtụ ihe banyere ha n’ime ya. (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 3:12-14) Bible na-akwado ịrụsi ọrụ ike, idebe ihe ọcha, ime ihe n’eziokwu, ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye, nsọpụrụ na ịhụnanya n’ebe mmadụ ndị ọzọ nọ; o nwekwara ndụmọdụ dị ukwuu banyere omume mmadụ n’ime ezinụlọ nakwa n’ime obodo.

Mgbe e tinyere ya n’ọrụ, ndụmọdụ Bible na-eguzopụ iche dị ka ihe bara uru n’ezie. Ọ na-atọhapụ anyị pụọ n’amaghị ihe na nkwenkwe ndị na-enweghị isi. (Jọn 8:32) Ezi amamihe dị na ya enweghị atụ. N’eziokwu, ihe ịrụ ụka adịghị ya na amamihe Chineke dị n’ime ya.

Okwu ahụ nke bụ na “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike” kwekọzuru n’ụzọ Bible na-esi agbanwe ụmụ mmadụ n’ezie. (Ndị Hibru 4:12) Taa, ọtụtụ nde mmadụ emeriwo omume onwe onye dị iche iche ndị na-emerụ ahụ, gbanweekwa ụzọ ndụ mbụ ha ndị na-ebibi ebibi gaa na nke ka mma n’ihi ịbụ ndị ụkpụrụ Bible dị iche iche nwere mmetụta n’ahụ ha.—Ndị Efesọs 4:22.

Gịnị na-eme mgbe e lefuuru ụkpụrụ Bible anya? Ihe ọ na-arụpụta bụ enweghị obi ụtọ na ịta ahụhụ, agha dị iche iche, ịda ogbenye, ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ, na ezinụlọ ndị e kewara ekewa. Ihe ndị dị otú ahụ bụ ihe a ga-atụ anya ha n’ihi na ilefuru Bible Nsọ anya pụtara ịjụ nduzi nke Chineke, bụ́ onye kere mmadụ, marakwa ihe bụ mkpa ya.

Bible na-akọkwa ihe ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ ihe ụmụ mmadụ na-apụghị ime. A mara ọkwa n’ụzọ amụma n’ime Bible banyere mbilite nke ọchịchị ụwa dị iche iche malite na Babilọn gabiga ọtụtụ narị afọ ruo n’oge anyị a. (Daniel, isi 2, 7, 8) Ọzọkwa, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, e denyere n’ime Bible nkọwa ziri ezi nke ọnọdụ ụwa n’ime narị afọ nke 20 nke a. (Matiu isi 24, 25; Mak, isi 13; Luk, isi 21; 2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Mkpughe 6:1-8) Ogologo ahịrị nke amụma Bible ndị mezuworonụ na-emesi anyị obi ike na olileanya ndị e nwere maka ọdịnihu obi ụtọ, dị ka a kọwara ha n’ime ya, ziri nnọọ ezi.

Ibu Ọrụ Dịịrị Anyị

Ihe ndị a nile bụ ihe àmà buru ibu nke na-egosi na Chineke agwawo ụmụ mmadụ okwu n’ezie. N’eziokwu, Chineke sitere n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè zite ozi ya. Ma nke a abụghị ihe mere a ga-eji kwere na Bible ezighị ezi dịkwa ka a na-ekwesịghị ile okwu Chineke jiri ọnụ ya kwuo anya n’ụzọ dị otú ahụ, ma ọ bụ nke e si n’aka ndị mmụọ ozi zite, ma ọ bụ nke e dere n’ụzọ ọrụ ebube n’eluigwe ma jiri aka wedatara ya ụmụ mmadụ ndị bi n’elu ala.

Otú ọ dị, ịnakwere na Bible sitere n’ebe dị nsọ, ma ọ bụ n’aka Chineke, na-ebokwasị anyị otu ibu ọrụ. Jehova na-ele anya n’ụzọ ziri ezi ka anyị na-agụ Okwu ya mgbe nile. (Abụ Ọma 1:1, 2) Ọgụgụ Bible nke na-amịpụta mkpụrụ chọrọ àgwà ziri ezi. Mmadụ aghaghị iburu n’uche na e kwesịghị ịgụ Bible dị nnọọ ka à ga-asị na ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị. Mmadụ aghaghị ịgụ ya ‘ọ bụghị dị ka okwu mmadụ, kama, otú ọ dị n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.’—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.

Ụfọdụ ihe ndị dị n’ime Bible pụrụ isi ike nghọta. Ma site n’ịgụ ya mgbe mgbe, mmadụ na-etolite ná nghọta, na-enwekwa nghọta zuru ezu karị nke uche Chineke na nzube ya nile. (Ndị Hibru 5:14) Ma eleghị anya o dochabeghị gị anya na Bible bụ Okwu nsọ nke Chineke. Ma, n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, olee ụzọ ị pụrụ isi gosipụta ma ì kwenyere ma ọ bụ na i kwenyeghị na Bible ma ọ bụrụ na i lezibeghị anya wee mụọ ya?

N’agbanyeghị ịrụ ụka e nwere n’oge a banyere eziokwu ahụ nke bụ na o sitere n’aka Chineke, iji nlezianya nyochaa Bible Nsọ emewo ka ọtụtụ ndị na-eche echiche kwupụta kpọmkwem otu ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha”!—Ndị Rom 3:4.

[Ihe e sere na peeji nke 4]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ugbu a, Bible pụrụ iru 98 pasenti nke ndị bi n’elu ụwa aka

Ọ dịbeghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke bịaworo nso ọnụ ọgụgụ ahụ a na-ekwu na e kesawo Bible, nke bụ 3,000,000,000. Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-akpọ ya “ma eleghị anya nchịkọta akwụkwọ kasị nwee ikike n’akụkọ ihe mere eme mmadụ”

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Bible anọgidewo, ebe ihe odide okpukpe ndị ọzọ ghọworo nanị ihe ndị e debere n’ebe ndebe ihe mgbe ochie

N’elu: Ihe ndekọ ndị Asiria nke Iju Mmiri ahụ

Aka Nri: Ekpere ndị a na-ekpegara chi ndị Ijipt bụ Ra

[Ebe e si Nweta Foto]

Ha abụọ: A natara ikike site n’aka Ndị Nlekọta nke ebe ndebe ihe mgbe ochie bụ The British Museum

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọ bụ ezie na ihe dị ka 40 mmadụ dị iche iche so dee ya n’ogologo oge nke 1,600 afọ, Bible gbasoro otu isiokwu bụ isi site ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ. Ọ bụ nanị onye nwere ọgụgụ isi karịrị nke mmadụ, onye dịwokwara ogologo ndụ, pụrụ ime ka e mepụta ihe dị otú a kwesịrị ịrịba ama

[Foto dị na peeji nke 5]

A mara ọkwa n’ụzọ amụma n’ime Bible banyere mbilite nke ọchịchị ụwa dị iche iche malite na Babilọn gabiga ọtụtụ narị afọ ruo n’oge anyị a. (Daniel 2, 7, 8)

Aka nri: Siza Ọgustọs

[Ebe e si Nweta Foto]

Museo della Civiltà Romana, Roma

[Foto dị na peeji nke 6]

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Bible buru amụma ziri ezi banyere ọnọdụ e nwere n’ụwa taa. (Matiu 24, 25; Mak 13; Luk 21; 2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Mkpughe 6:1-8) Izi ezi na-ehieghị ụzọ nke amụma Bible na-emesi anyị obi ike na nkwa Chineke banyere elu ala nke bụ paradaịs bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-emezu

[Ebe e si Nweta Foto]

Reuters/Bettmann Newsphotos

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya