Ebe Mgbaba Ha—Okwu Ụgha!
“Anyị emewo ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaga anyị, ọ bụkwa n’okwu ụgha ka anyị zobeworo onwe anyị.”—AỊSAỊA 28:15.
1, 2. (a) Olee nzukọ dị taa nke kwesịrị ịrịba ama ihe mere alaeze Juda oge ochie? (b) Obi ike dị aṅaa nke na-ezighị ezi ka Juda nwere?
OKWU ndị ahụ hà metụtara Krisendọm nke oge a dị ka ha metụtara alaeze ebo abụọ nke Juda oge ochie? N’ezie, ha metụtara ya! Myirịta ahụ na-agbakwa àmà ihe ọjọọ nye Krisendọm nke oge a. Ọ pụtara na n’oge na-adịghị anya, ọdachi gaje ịbịakwasị nzukọ okpukpe ahụ nke dapụworo n’ezi ofufe.
2 N’ebe ugwu nke Juda ka e nwere alaeze ebo iri nke Israel. Mgbe Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi, Jehova kwere ka ndị Asiria merie ya na 740 T.O.A. Alaeze bụ nwanne ya, bụ́ Juda, hụrụ mgbe oké ọdachi nke a na-eme, ma o doro anya na o chere na ihe dị otú ahụ agajeghị ime ya ma ọlị. Ndị ndú ya turu ọnụ, sị, ‘Olee otú nke ahụ ga-esi mee, ọ̀ bụ na ụlọ nsọ Jehova adịkwaghị na Jerusalem? Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị nwere ihu ọma Chineke? Ọ̀ bụ na ndị nchụaja anyị na ndị amụma anyị adịghị ekwu okwu n’aha Jehova?’ (Tụlee Jeremaịa 7:4, 8-11.) Ndị ndú okpukpe ndị Juu ahụ nwere obi ike na ọ dịghị ihe gaje ime ha. Ma ihe ha chere abụghị otú ọ dị! Ha ekwesịghị ntụkwasị obi dị nnọọ ka ndị ikwu ha nọ n’ebe ugwu. Ya mere, ihe mere Sameria ga-emekwa Jerusalem.
3. N’ihi gịnị ka Krisendọm ji na-enwe obi ike banyere ọdịnihu, ma è nwere ezi ihe mere ọ ga-eji nwee obi ike?
3 N’ụzọ yiri nke ahụ, Krisendọm na-azọrọ na ya na Chineke nwere mmekọrịta pụrụ iche. Ọ na-etu ọnụ, sị, ‘Leenụ, anyị nwere ọtụtụ iri puku chọọchị dị iche iche na ndị ụkọchukwu maara ọrụ ha nke ọma, tinyekwara ọtụtụ narị nde ndị òtù. Anyị nwekwara Bible, anyị na-ejikwa aha Jisọs eme ihe n’ofufe anyị. N’ezie, anyị nwere ihu ọma Chineke!’ Ma ihe mere Jerusalem oge ochie nọ dị ka ihe ịdọ aka ná ntị siri ike. N’agbanyeghị ihe ndị pụrụ iche na-eme na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’oge ndị na-adịbeghị anya, anyị maara na n’oge na-adịghị anya, Jehova gaje ime ihe pụtara ìhè megide Krisendọm na okpukpe ụgha ndị ọzọ nile.
‘Iso Ọnwụ Gbaa Ndụ’
4. Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Juda chere na ya agbawo?
4 N’oge ochie, Jerusalem ahụ nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi natara ọtụtụ ịdọ aka ná ntị site n’ọnụ ezi ndị amụma Chineke, ma o geghị ha ntị. Kama nke ahụ, o turu ọnụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọnwụ ga-eweda ya n’ime Sheol, bụ́ ili, dị ka o wedaworo alaeze ebe ugwu nke Israel. A kpaliri Aịsaịa onye amụma ịgwa Juda, sị: ‘N’ihi nke a, nụrụnụ okwu Jehova unu ndị na-akwa emo, ndị na-achị ndị nke a bi na Jerusalem: n’ihi na unu asịwo, Anyị na Ọnwụ agbawo ndụ, anyị na Sheol ekwerịtawokwa nkwa; mgbe ụtarị nke na-erubiga ókè dị ka mmiri na-agabiga, ọ gaghị abịakwute anyị; n’ihi na anyị emewo ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị, ọ bụkwa n’okwu ụgha ka anyị zobeworo onwe anyị.’—Aịsaịa 28:14, 15.
5. (a) Gịnị bụ ọgbụgba ndụ ahụ Juda chere na ya na ọnwụ gbara? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa e nyere Eze Esa ka Juda chefuworo?
5 Ee, ndị ndú Jerusalem chere na ha emewo nkwekọrịta, dị ka a pụrụ ikwu ya, n’etiti ha na ọnwụ na Sheol, ka e wee chebe obodo ha. Ma ọgbụgba ndụ ahụ Jerusalem chere na ya na ọnwụ gbara ọ̀ pụtara na o chegharịwo ná mmehie ya nile, na-atụkwasịkwa Jehova obi ugbu a maka nzọpụta? (Jeremaịa 8:6, 7) Ọ dịghị ma ọlị! Kama nke ahụ, o chigharịkwuuru ndị ọchịchị bụ mmadụ maka enyemaka. Ma ndabere ọ dabeere n’ebe ndị enyi ya bụ ndị ụwa nọ bụ ihe nrafu, okwu ụgha. Ndị ụwa ọ tụkwasịrị obi apụghị ịzọpụta ya. Ebe ọ bụkwa na ọ hapụwo Jehova, Jehova hapụrụ Jerusalem. O mere kpọmkwem dị ka Azaraịa onye amụma dọrọ Eze Esa aka ná ntị na ọ ga-eme: “Jehova nọnyeere unu, mgbe unu nọnyeere ya; ọ bụrụkwa na unu achọọ ya, ọ ga-eme ka unu chọta ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.”—2 Ihe Emere 15:2.
6, 7. Gịnị ka Juda mere iji chebe onwe ya, ma gịnị bụ ihe ikpeazụ si na nke ahụ pụta?
6 N’ịbụ ndị obi siri ike ná nkwekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha nile, ndị ndú Jerusalem ji n’aka na ọ dịghị “ụtarị nke na-erubiga ókè dị ka mmiri” nke ndị agha mwakpọ ga-abịarute ha nso imebi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ha. Mgbe njikọ nke Israel na Siria yiri ya egwu, Juda chigharịkwuuru Asiria maka enyemaka. (2 Ndị Eze 16:5-9) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, mgbe usuu ndị agha Babilọn yiri ha egwu, ọ rịọrọ Ijipt maka nkwado, Fero zaghachikwara, na-ezite usuu ndị agha inyere ya aka.—Jeremaịa 37:5-8; Ezekiel 17:11-15.
7 Ma ndị agha Babilọn siri ike nke ukwuu, usuu ndị agha nke Ijipt wee laghachi azụ. Ọ pụtara ìhè na obi ike Jerusalem tinyere n’ebe Ijipt nọ bụ mmehie ihe, n’afọ 607 T.O.A., Jehova hapụkwara ya ka ọ daba ná mbibi ahụ o buworo amụma ya. Ya mere, ihe ndị ọchịchị na ndị nchụaja Jerusalem chere abụghị eziokwu! Ntụkwasị obi ha nwere ná njikọ dị iche iche nke ụwa maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi bụ “okwu ụgha” nke mmiri na-erubiga ókè nke usuu ndị agha Babilọn kpochapụrụ.
Ịjụ ‘Nkume ahụ nke A Nwaworo’
8. Olee ụzọ Krisendọm siworo were ọnọdụ yiri nnọọ nke Juda oge ochie?
8 È nwere ọnọdụ yiri nke ahụ n’oge a? Ee, e nwere. Ndị ndú okpukpe Krisendọm na-echekwa na ọdachi ọ bụla agaghị abịakwasị ha. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha na-ekwu, dị ka Aịsaịa buru amụma ya, sị: ‘Anyị na Ọnwụ agbawo ndụ, anyị na Sheol ekwerịtawokwa nkwa; mgbe ụtarị nke na-erubiga ókè dị ka mmiri ga-agabiga, ọ gaghị abịakwute anyị; n’ihi na anyị emewo ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị, ọ bụkwa n’okwu ụgha ka anyị zobeworo onwe anyị.’ (Aịsaịa 28:15) Dị ka Jerusalem oge ochie, Krisendọm na-elegara njikọ aka dị iche iche nke ụwa anya maka nchebe, ndị ndú okpukpe ya na-ajụkwa ịgbaba n’ime Jehova. Ee, ọbụna na ha adịghị eji aha ya eme ihe, ha na-akwakwa ndị na-asọpụrụ aha ahụ emo, na-akpagbu ha. Ndị ndú okpukpe Krisendọm emewo kpọmkwem ihe ndị isi nchụaja ndị Juu mere n’ime narị afọ mbụ mgbe ha jụrụ Kraịst. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha asịwo, “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza.”—Jọn 19:15.
9. (a) Olee ndị na-adọ Krisendọm aka ná ntị taa n’otu ụzọ ahụ Aịsaịa si dọọ Juda aka ná ntị? (b) Ònye ka Krisendọm kwesịrị ichigharịkwuru?
9 Taa, Ndịàmà Jehova na-adọ aka ná ntị na usuu ndị agha na-eru dị ka mmiri ga-ekpochapụ Krisendọm n’oge na-adịghị anya. Ọzọkwa, ha na-ezo aka n’ebe mgbaba bụ ezie pụọ n’iju mmiri ahụ. Ha na-ehota okwu sitere n’Aịsaịa 28:16, nke na-asị: “Otú a ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, sịrị, Lee, abụ m onye tọworo ntọala na Zaịọn, bụ́ otu nkume, nkume nke ọnwụnwa [“nke a nwaworo,” NW], nkume nkuku dị oké ọnụ ahịa nke bụ ntọala siri ike: onye na-ekwere agaghị ewere ọsọ ọsọ gbalaga.” Ònye bụ ‘nkume nkuku nke a dị oké ọnụ ahịa’? Pita onyeozi hotara okwu ndị a ma kọwaa ha n’ihe banyere Jisọs Kraịst. (1 Pita 2:6) A sị na Krisendọm mere udo n’etiti ya na Eze nke Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst, ọ gaara ezereworị ụtarị ahụ na-erubiga ókè dị ka mmiri nke na-abịanụ.—Tụlee Luk 19:42-44.
10. Na gịnị ka Krisendọm tinyeworo onwe ya?
10 Ma o mebeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, n’ọchịchọ ọ na-achọ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, o jiwo aghụghọ na-ewebata onwe ya n’ọnọdụ inweta ihu ọma nke ndị ndú ọchịchị na nke mba dị iche iche—nke a bụkwa n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị Bible nke bụ na ịbụ enyi nke ụwa na-eweta ịbụ onye iro nke Chineke. (Jemes 4:4) Karịa nke ahụ, na 1919, o nyere òtù League of Nations nkwado siri ike dị ka olileanya kasị mma mmadụ nwere maka inweta udo. Kemgbe 1945, o tinyewo olileanya ya n’ebe òtù United Nations dị. (Tụlee Mkpughe 17:3, 11.) Ruo ókè ha aṅaa ka o tinyeworo onwe ya n’iso òtù nke a na-emekọ ihe?
11. N’ụzọ dị aṅaa ka e si nọchite anya okpukpe n’ime òtù UN?
11 Otu akwụkwọ e dere n’oge na-adịbeghị anya na-enye ihe àmà nke ókè o ruworo mgbe ọ sịrị: “Ya dịkarịa ala, e nwere ndị nnọchianya nke òtù iri abụọ na anọ nke okpukpe Katọlik n’ime òtù UN. Ọtụtụ n’ime ndị ndú okpukpe ụwa ejewo leta òtù ụwa ahụ. Nke kasị kwesị ịrịba ama bụ nleta nke His Holiness Pope Paul nke Isii letara ya n’oge e nwere Nzukọ Ezumeezu na 1965 nakwa nke Pope John Paul nke Abụọ na 1979. Ọtụtụ okpukpe nwere arịrịọ, ekpere, abụ na ofufe nrù ndị pụrụ iche a na-edoro òtù United Nations. Ihe atụ ndị kasị mkpa bụ ndị nke okpukpe Katọlik, nke okpukpe Unitarian-Universalist, nke okpukpe Baptist na nke okpukpe Bahai.”
Olileanya Ndị Na-ezighị Ezi maka Udo
12, 13. N’agbanyeghị olileanya ahụ zuru ebe nile nke bụ na udo adịwala nso, n’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji nwee obi ike na ịdọ aka ná ntị ha bụ eziokwu?
12 Otu n’ime ndị isi ọchịchị kasị ike n’ụwa kwuru ihe na-egosi olileanya nke ọtụtụ ndị mgbe o kwuru, sị: “Ọgbọ nke a nke ụmụ mmadụ bi n’ụwa pụrụ ịhụ mmalite nke oge udo a na-apụghị ịgbanwe agbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke mmepeanya mmadụ.” Ihe o kwuru ò ziri ezi? Ihe ndị na-eme n’oge ndị na-adịbeghị anya gara aga hà na-apụta na ịdọ aka ná ntị Ndịàmà Jehova na-akpọsa banyere mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe n’isi mba nile agaghị emekwa? Ọ̀ bụ na ihe Ndịàmà Jehova kwuru ezighị ezi?
13 Ee e, ihe ha na-ekwu ziri ezi. Ha maara na ha na-ekwu eziokwu n’ihi na ha tụkwasịrị obi n’ebe Jehova nọ na n’ebe Bible dị, nke bụ Okwu Chineke nke eziokwu. Taịtọs 1:2 na-asị: ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ Ya mere, ha nwere obi ike na mgbe amụma Bible kwuru na otu ihe gaje ime, ọ ghaghị ime. Jehova n’onwe ya na-ekwu, sị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe m zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.
14, 15. (a) Gịnị ka ndị ndú nke Juda nọ na-akpọsa nwa mgbe nta tupu mbibi Jerusalem na 607 T.O.A.? (b) Gịnị ka Pọl buru amụma na a ga-akpọsa tupu mbibi mberede abịakwasị ụwa nke a? (ch) Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya mgbe mkpọsa ahụ nke e buru amụma ya ná 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3 ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu?
14 N’afọ ndị bu ụzọ tupu mbibi Jerusalem na 607 T.O.A., Jeremaịa kọrọ na ndị ndú mba ahụ na-eti mkpu, sị, “Udo, Udo!” (Jeremaịa 8:11) Otú ọ dị, nke ahụ bụ okwu ụgha. E bibiri Jerusalem ná mmezu nke ihe odide nile sitere n’ike mmụọ nsọ nke ezi ndị amụma Jehova. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na ihe yiri nke ahụ gaje ime n’oge anyị a. O kwuru na ndị mmadụ ga na-eti mkpu, sị, “Udo na ntụkwasị obi dị.” Ma o kwuru na mgbe ahụ ‘mbibi mberede ga-abịakwasị ha.’—1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.
15 Ka anyị banyere n’afọ ndị 1990, akwụkwọ akụkọ na magazin dị iche iche n’ebe nile nọ na-ekwu na Agha Nzuzo ahụ agwụsịwo, na udo ụwa adịwakwala nso. Ma mgbe ahụ, agha mgbarịta égbè tiwapụrụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọnọdụ ụwa ga-aga n’ihu ruo mgbe iti mkpu “Udo na ntụkwasị obi” ahụ e buru n’amụma na 1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3 ga-amụba ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. Ebe olileanya anyị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’Okwu Chineke, anyị maara na, ka a na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ kasị elu, a ga-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe ngwa ngwa, n’ehieghịkwa ụzọ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime mkpọsa udo na ntụkwasị obi ndị na-eguzosighị ike nke kwesịrị ime ka anyị chee na mbibi ahụ nke Chineke buru amụma ya agaghị abịakwa. E dekọrọ ihe Jehova kpere n’ikpe n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe n’ime Okwu ya bụ Bible. A gaje ibibi Krisendọm, tinyere okpukpe ụgha nile ndị ọzọ. Mgbe ahụkwa, a gaje imezu ikpe mbibi nke Jehova n’isi ihe fọdụrụ n’ụwa Setan. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8; 2:8; Mkpughe 18:21; 19:19-21) Ebe Ndịàmà Jehova nwere obi ike na Jehova ga-emezu okwu ya, ha nọgidere na-elepụ anya n’okpuru nduzi nke òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche, jirikwa nlezianya na-ekiri ihe ndị na-eme n’ụwa. (Matiu 24:45-47) N’ezie, ọ dịghị mgbalị ime udo ọ bụla nke mmadụ nke kwesịrị ime ka anyị chee na Jehova agbakụtawo nzube ya azụ nke iweta ihe otiti mbibi na-eru ka mmiri n’ahụ Krisendọm nke ibu mmehie na-anyịgbu.
‘Chineke Bụ Ebe Mgbaba Anyị’
16, 17. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova na-esi emeghachi omume ma ọ bụrụ na nkwuwa okwu ha na-eji ezi ozi ha akpasuo ụfọdụ ndị iwe?
16 Nkwuwa okwu nke Ndịàmà Jehova ji na-eme ihe n’ịkpọsa nke a pụrụ ịkpasu ụfọdụ ndị iwe. Otú ọ dị, mgbe ha na-ekwu na ndị ọchịchị okpukpe nke Krisendọm ewerewo ndokwa ụgha mere ebe mgbaba, ọ bụ nanị ihe Bible kwuwororịị ka ha na-akọghachi. Mgbe ha na-ekwu na Krisendọm kwesịrị ịnata ahụhụ n’ihi na ọ ghọwo akụkụ nke ụwa, ọ bụ nanị ihe Chineke n’onwe ya kwuworo n’ime Bible ka ha na-akọ. (Ndị Filipaị 3:18, 19) Ọzọkwa, n’ihi na Krisendọm atụkwasịwo obi n’atụmatụ dị iche iche ụwa nke a guzobeworo, ọ bụ n’ezie chi nke ụwa nke a, Setan bụ Ekwensu, ka ọ na-akwado, onye Jisọs kwuru na ọ bụ nna nke ụgha.—Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 4:4.
17 Ya mere, Ndịàmà Jehova na-ekwupụta, sị: Nye anyị, anyị adịghị agba ume inwe olileanya ụgha nke udo ụwa n’ihi ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agbanwe agbanwe. Kama nke ahụ, anyị na-ekwupụtaghachi okwu onye ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba. Nanị otu nku ume ka ndị dị ala bụ, ọ bụkwa okwu ụgha ka ndị dị elu bụ: n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ha ga-arịgo elu dị ka ihe mfe; ndị ahụ nile n’otu dị mfe karịa otu nku ume.” (Abụ Ọma 62:8, 9) Atụmatụ ụmụ mmadụ iji kwalite ma chebe Krisendọm na akụkụ ndị ọzọ nile nke usoro ihe nke a bụ ihe ụgha, okwu ụgha! Ọ bụrụ na e jikọta ha nile n’otu, ha enweghị nnọọ ike ịkwụsị nzube nile nke Jehova dị ka ikuku ọkụ nke e kupụrụ n’ọnụ na-agaghị enwe ike ịkwụsị ya!
18. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke onye ọbụ abụ ahụ kwesịrị ekwesị taa?
18 Ndịàmà Jehova na-ehotakwa Abụ Ọma 33, amaokwu 17 ruo 19, nke na-asị: “Nanị ihe nrafu ka ịnyịnya [nke Ijipt, nke na-ese onyinyo ibu agha] bụ iji zọpụta mmadụ: ọ dịghị ejikwa ike ya hiri nne mee ka mmadụ wepụga onwe ya. Lee, anya Jehova dị n’ahụ ndị na-atụ egwu ya, bụ́ n’ahụ ndị na-echere ebere ya; ịnapụta mkpụrụ obi ha n’ọnwụ, na idebe ha ndụ n’oké ụnwụ.” Taa, ezi ndị Kraịst na-atụkwasị obi na Jehova nakwa n’Alaeze eluigwe ya, bụ́ nanị ndokwa nke ga-eweta udo na-adịgide adịgide.
Krisendọm “Ebe Nzọda”
19. N’ihi gịnị ka ịdabere n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche iji weta udo ji bụrụ ihe nrafu?
19 Ịtụkwasị obi n’ihe ọ bụla mmadụ mere iji dochie anya Alaeze Chineke na-eme ka ihe nnọchianya ahụ ghọọ ihe oyiyi, ihe a na-efe efe. (Mkpughe 13:14, 15) Otú a, ịgba ume ka a dabere n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, dị ka n’òtù United Nations, maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi bụ ihe nrafu, okwu ụgha. Banyere ihe dị otú ahụ ndị na-enye olileanya ụgha, Jeremaịa kwuru, sị: “Okwu ụgha ka arụsị ya a wụrụ awụ bụ, nku ume adịghịkwa n’ime ha. Ihe efu ka ha bụ, ọrụ ịkwa emo: na mgbe nleta ha ha ga-ala n’iyi.” (Jeremaịa 10:14, 15) N’ihi ya, ịnyịnya agha nile nke ihe ahụ Ijipt sere onyinyo ya, ya bụ, ike agha na nke ọchịchị nke mba nile taa, agaghị echebe òtù okpukpe nile nke Krisendọm n’ụbọchị ihe isi ike ya. O doro anya na njikọ aka nke okpukpe dị iche iche nke Krisendọm na ụwa nke a agaghị echebe ha.
20, 21. (a) Gịnị mere òtù League of Nations, n’ihi gịnịkwa ka ihe na-agaghị eji gaara òtù United Nations nke ọma karị? (b) Olee ụzọ Aịsaịa si gosi na njikọ nile nke Krisendọm na ụwa nke a agaghị echebe ya?
20 Krisendọm tinyere olileanya ya n’òtù League of Nations, ma a kwaturu ya ọbụna mgbe Amagedọn na-abịabeghị. Ugbu a, o bufewo nkwado ya gaara òtù United Nations. Ma n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eche “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” ihu, ọ gaghị alanarịkwa. (Mkpughe 16:14) Ọbụna òtù UN nke e mere ka ọ dịghachi ndụ adịghị mgbe ọ bụla ọ ga-enwe ike iweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Okwu amụma Chineke na-egosi na òtù United Nations, ya na mba ndị nọ na ya, “ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ [Kraịst n’ike Alaeze], Nwa Atụrụ ahụ ga-emerikwa ha, n’ihi na ọ bụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile.”—Mkpughe 17:14.
21 Ndịàmà Jehova ji obi ike na-ekwu na ọ dịghị nzọpụta dịịrị Krisendọm ná njikọ ya nile nke o sooro ụwa Setan mee. Mgbe ha na-ekwukwa nke a, ọ bụ nanị ihe Bible n’onwe ya kwuworo ka ha na-eme ka ọ pụta ìhè. Aịsaịa 28:17, 18 hotara okwu Jehova kwuru, na-asị: ‘M ga-emekwa ka ikpe ziri ezi bụrụ eriri, meekwa ka ezi omume bụrụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀: akụ mmiri igwe aghaghịkwa ikpochapụ ebe mgbaba nke okwu ụgha, mmiri ga-eruchapụkwa ebe nzuzo. A ga-ehichapụkwa ọgbụgba ndụ ahụ unu na Ọnwụ gbara, nkwa unu na Sheol kwerịtara agaghị eguzosikwa ike: mgbe ụtarị nke na-erubiga ókè dị ka mmiri ga-agabiga, unu ga-aghọkwara ya ebe nzọda.’
22. Mgbe e ji ikpe ziri ezi zuru okè mesoo Krisendọm ihe, gịnị ka ọ ga-arụputara ya?
22 Mgbe Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe, nke a ga-ekwekọ n’ikpe ziri ezi nke zuru okè. A ga-ekpochapụ kpam kpam ebe ndabere nke olileanya Krisendọm, bụ́ ‘ọgbụgba ndụ nke ya na Ọnwụ,’ dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’ụtarị nke na-eru dị ka mmiri. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Kwa ụtụtụ ka ọ ga-agabiga, n’ehihie na abalị: o wee bụrụ nanị ọma jijiji ịghọta ihe a nụrụ.” (Aịsaịa 28:19) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe oké egwu nye ndị na-ahụ ihe na-emenụ ịhụ ike zuru ezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe! Lee ka ọ ga-esi dịrị oké njọ nye ndị ndú okpukpe Krisendọm na ndị na-eso ha ịchọpụta, mgbe oge gabigasịworo, na ha atụkwasịwo obi n’okwu ụgha!
Aha Jehova Bụ “Ụlọ Elu Dị Ike”
23, 24. Kama ịchọ ịnọ ná ntụkwasị obi n’ime ụwa nke a, gịnị ka Ndịàmà Jehova ga-eme?
23 Ma gịnị banyere Ndịàmà Jehova? Ọbụna n’agbanyeghị ịkpọasị na mkpagbu ha na-enweta n’ụwa nile, ha nọgidere na-anọpụ iche n’ụwa. Ha adịghị echefu mgbe ọ bụla na Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) N’ime mgbe ikpeazụ ndị a, ha atụkwasịwo obi n’Alaeze Jehova, ọ bụghị n’atụmatụ ụmụ mmadụ. N’ihi ya, ọdachi nke Krisendọm agaghị eme ka Ndịàmà Jehova tụọ egwu. Dị ka Aịsaịa buru n’amụma: “Onye na-ekwere agaghị ewere ọsọ ọsọ gbalaga.”—Aịsaịa 28:16.
24 Ilu 18:10 na-asị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” N’ihi ya, anyị na-akpọ ndị nile yiri atụrụ òkù ka ha gbaba na Jehova nakwa n’Alaeze ya nke dị n’aka Kraịst. Dị ka ebe nzuzo, Jehova abụghị ihe ụgha! Alaeze ya nke dị n’aka Kraịst abụghị okwu ụgha! Ebe mgbaba nke Krisendọm bụ okwu ụgha, ma ebe mgbaba nke ezi ndị Kraịst bụ eziokwu.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee otú Juda oge ochie si jiri okwu ụgha mere ebe mgbaba?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Krisendọm siworo nwaa izobe onwe ya n’ime okwu ụgha?
◻ Olee ụzọ Aịsaịa si dọọ Juda aka ná ntị, oleekwa ụzọ Ndịàmà Jehova si na-akpọsa ịdọ aka ná ntị yiri nke ahụ taa?
◻ Olee otú Krisendọm ga-esi chọpụta na obi ike ya adịwo n’ebe na-ekwesịghị ekwesị?
◻ N’ụzọ na-eyighị Krisendọm, ọnọdụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-anọgidesi ike na ya?
Igbe dị na peeji nke 17]
E KWUPỤTAWO OLILEANYA DỊ ELU MAKA ÒTÙ UNITED NATIONS
“Na nke mbụ ya kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ụwa dum dị n’otu. Ndị ndú òtù United Nations, n’ụzọ bụbu nanị ihe e nwere olileanya ya, na-emezi ihe kwekọrọ n’echiche nke ndị guzobere ya. . . . Ụwa nweziri ike iji ohere nke a mee ihe imezu nkwa ahụ dịworo ogologo oge nke iguzobe ọnọdụ ụwa ọhụrụ.”—President Bush nke mba United States n’okwu State of the Union ọ gwara mba ahụ, January 29, 1991