N’isi Nso Ọrịa Ma Ọ Bụ Ọnwụ Agaghị Adịkwa!
ỌDỊGHỊ onye ọ na-amasị ịrịa ọrịa, ụmụ mmadụ adịghị achọkwa ịnwụ anwụ. Otu onye prọfesọ na nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike ọha mmadụ kwuru, sị: “O yiri ka ọ̀ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọchịchọ a na-achọ ịdị ogologo ndụ bụ ihe zuru ebe nile n’akụkọ ihe mere eme dum nakwa n’ihe ka ọtụtụ n’òtù ụmụ mmadụ ndị e nweworo. O nwere njikọ n’etiti ya na ọchịchọ ahụ bụ isi nke mmadụ ichebe onwe ya . . . Ponce de Leon bụ nanị onye a kasị mara ama n’ogologo ahịrị ụmụ mmadụ ndị tinyere ndụ ha dum n’ịchọ ụzọ a ga-esi nweta ogologo ndụ. Akụkụ ka ukwuu nke nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike bụ n’ihe banyere ichebe ogologo ndụ site n’ịlụso ọrịa na ọnwụ ọgụ.”
Ọnwụ na-emegide ọdịdị anyị bu pụta ụwa nke ukwuu nke na mgbe o metụtara enyi ma ọ bụ onye nọ n’ezinụlọ anyị, ọ na-afọdụ nke nta ka ọ bụrụ ihe anyị bu pụta ụwa ịchọ ibelata ihe mgbu ya. Akwụkwọ ahụ bụ Funeral Customs the World Over kwuru, sị: “E nweghị òtù ọ bụla, n’agbanyeghị otú ha si bụrụ ndị na-emepeghị anya ma ọ̀ bụkwanụ otú ha si bụrụ ndị mepere anya nke ukwuu, ndị ọ ga-abụ, a hapụ nanị ha, ruokwa ókè ike ha hà, na-agaghị eji ememe ụfọdụ lie ozu onye òtù ha. . . . Ọ na-emejụ mkpali dị omimi ndị mmadụ na-enwe n’ebe nile. Imezu ya na-eyi ‘ihe ziri ezi,’ emezughị ya, karịsịa n’ebe ndị ahụ e nwere njikọ chiri anya n’ebe ha nọ site n’ezinụlọ, mmetụta, ibikọ ọnụ, ahụmahụ ndị e nwekọrọ ọnụ ma ọ bụ ihe njikọ ndị ọzọ, dị, na-eyi ‘ihe na-ezighị ezi,’ nlefuru anya nke na-ekwekọghị n’usoro okike, ihe a ga-arịọ mgbaghara n’ihi ya ma ọ bụ ihe a ga-eme ihere n’ihi ya. . . . [Mmadụ] bụ ihe okike nke na-eji ememe eli ndị ya nwụrụ anwụ.”
Mmalite nke Ọrịa na Ọnwụ
Otú a, echiche ahụ nke bụ na a ga-emesịa kpochapụ ọrịa na ọnwụ bụ ihe na-adọrọ adọrọ nke ukwuu, ma è nwere ihe ndabere iji kwere n’ihe dị otú ahụ? N’ezie, e nwere, ọ bụkwa ma nke ezi echiche dị na ya, nke a pụrụ ịdabere na ya, nakwa nke na-apụghị ịda ada. Ọ bụ Okwu Onye Okike anyị nke sitere n’ike mmụọ nsọ ya—Bible Nsọ.
Akwụkwọ ahụ kọwara n’ụzọ doro anya mmalite nke ịta ahụhụ ụmụ mmadụ. Ọ na-agwa anyị na Chineke kere mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, wee debe ya n’ebe obibi nke bụ ubi a gbara ogige nke paradaịs n’otu ebe dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. E kere Adam dị ka onye zuru okè; ọ maghị ihe ọ bụla banyere ọrịa na ọnwụ. N’oge na-adịghị anya, nwunye nke zukwara okè sonyeere ya, ha nwekọkwara olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala ọnụ.—Jenesis 2:15-17, 21-24.
Ọnọdụ ọma nke a anọghị ogologo oge. N’ihi gịnị? N’ihi na Adam ji ọchịchọ onwe ya họrọ ụzọ ndụ nke adabereghị na Chineke. Ọrụ ike, ihe mgbu, ọrịa, e mesịakwa, ọnwụ wee si na nke a pụta. (Jenesis 3:17-19) Ụmụ ya ketara ụdị ndụ enweghị obi ụtọ ahụ nke Adam họrọworo. Ndị Rom 5:12 na-akọwa, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” Ndị Rom 8:22 na-ekwukwa, sị: “Anyị matara na ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.”
N’Elu Ala ka ọ̀ bụ n’Eluigwe?
N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-emesi anyị obi ike na n’oge na-adịghị anya, Chineke gaje iweghachite ụmụ mmadụ n’ọnọdụ obi ụtọ ahụ nke Adam na Iv tụfuru. Mkpughe 21:3, 4 na-asị: “Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” N’otu aka ahụ, otu onye amụma oge ochie hụtakwara oge mgbe ‘ọ na-adịghị onye obibi ya ga-asị, Ana m arịa ọrịa.’—Aịsaịa 33:24.
Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ụwa ebe a na-enweghị ụlọ ọgwụ, ebe ndị a na-adọba ozu, na ili dị iche iche? Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ihe ọ ga-adị ka ya ịdị ndụ na-aga n’ihu n’ihu, n’enweghị ọbụna ihe iyi egwu nke ịta ahụhụ na ọnwụ? Ee, nkwa Chineke na-akpali mmetụta ndị dị omimi n’ime anyị nile. Ma olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na olileanya ndị a dị ebube bụ maka mbara ala anyị bụ Ụwa—ọ bụghị maka eluigwe? Rịba ama amaokwu ndị gbara akụkụ ihe odide Akwụkwọ nsọ e hotaworo gburugburu. Amaokwu ndị mbụ nke Mkpughe isi 21 na-ekwu banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” E kwuru okwu doro anya na Chineke ga-anọnyere ihe a kpọrọ mmadụ, na ha ga-abụkwa ndị nke ya. Ihe sochiri nkwa ahụ e kwere n’akwụkwọ Aịsaịa nke bụ na ọ dịghị onye ga na-arịa ọrịa bụ ozuzo aka n’ebe ‘ndị bi n’ala ahụ,’ bụ́ ndị ‘e bupụworo ajọ omume ha’ nọ.
Ya mere, nkwa ndị a na-agba ume na-ezo aka ná ndụ n’elu ala! Ha kwekọkwara n’ekpere ahụ Jisọs kpekuru Nna ya, sị: “Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.
N’ihi Gịnị Ka Ọ Ga-eji Bịa n’Isi Nso?
Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ịghọta na mmezu nke nkwa ndị a ga-abụ n’ọdịnihu dị nso. Ma, ọ̀ bụ n’ihe ndabere dị aṅaa ka ha ji jide nnọọ nke a n’aka? Ọ bụ n’ihe ndabere nke ihe àmà hiri nne e nwere nke na-egosi na anyị na-ebi n’ime “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe ma ọ bụ ndokwa ihe nke a dị n’elu ala. (2 Timoti 3:1-5) Ndị na-eso ụzọ Jisọs rịọrọ ka e nye ha ihe àmà banyere mgbe ọgwụgwụ usoro ihe nke a ga-abụ. Ná nzaghachi, Jisọs buru amụma nke kọwara nke ọma ihe omume dị iche iche na-arịwanye elu ndị na-eme n’ụwa kemgbe ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ na 1914.a Mgbe ahụ o kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na ọ nọ nso, n’ọnụ ụzọ. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” Ya mere, ụfọdụ ọgbọ ndị dị ndụ na 1914 ga-ahụ ọgwụgwụ nke usoro ụwa dị ugbu a.—Matiu 24:33, 34.
N’oge ahụ, Jehova Chineke ga-agwa Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs, ka ọ gaa n’ihu ma bibie ihe nile na-akpata ịta ahụhụ na nhụjuanya pụọ n’elu mbara ala ọma nke a bụ Ụwa. Bible na-ekwu okwu banyere mkpochapụ nke ajọ omume dị ka “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” n’Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16.
Ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu ga-alanarị oké ihe omume nke a ma dịrị ndụ ịhụ mmalite ọchịchị udo nke Kraịst Jisọs. (Mkpughe 7:9, 14; 20:4) Ọ bụ ezie na ọchịchị ya ga-abụ site n’eluigwe, ndị nile bi n’ụwa ga-enweta abamuru nile si na ya apụta—ma ndị lanarịrị agha Amagedọn ma ọtụtụ nde mmadụ ndị a ga-emesịa kpọlite site n’ọnwụ. Nkwa ahụ ga-aghọ ihe mere eme mgbe ahụ: “Ọ [Kraịst] ghaghị ịbụ eze, ruo mgbe ọ ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 15:25, 26.
Otú a, anyị pụrụ iji obi ike tie mkpu, sị: “N’isi nso ọrịa na ọnwụ agaghị adịkwa!” Nke a abụghị nrọ efu, ma ọ bụkwanụ ihe nkịtị a na-eche n’echiche. Ọ bụ nkwa e ji n’aka nke Jehova Chineke, “onye na-apụghị ikwu okwu ụgha.” Ị̀ ga-atụkwasị obi n’olileanya nke a? Ọ pụrụ iwetara gị abamuru ebighị ebi!—Taịtọs 1:2.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe àmà na-egosi na ihe a kpọrọ mmadụ na-ebi n’ime mgbe ikpeazụ, lee isi 18 nke akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 7]
N’oge na-adịghị anya, a ga-eji ezi ahụ ike na ndụ ebighị ebi dochie anya ọrịa na ọnwụ