Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 3/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ Ma Nwụọ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ajụjụ nke Abụọ: Gịnị Ga-eme M Ma M Nwụọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Olee Uru Ọnwụ Jizọs na Mbilite n’Ọnwụ Ya Ga-abara Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 3/1 p. 16
Ebe ndị mmadụ na-ekpori ndụ n’ụsọ oké osimiri n’ụwa ọhụrụ nakwa ebe ụmụaka na-egwu mmiri

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee uru ọnwụ Jizọs baara anyị?

Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, ọ chọrọ ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ chọkwara ka ha ghara ịrịa ọrịa ma ọ bụ nwụọ anwụọ. Ma, nwoke mbụ bụ́ Adam adịghị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na o nupụụrụ Chineke isi. Anyị niile ketara ọnwụ n’aka Adam n’ihi na anyị bụ ụmụ ya. (Ndị Rom 5:8, 12; 6:23) Jehova Chineke zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs n’ụwa ka ọ nwụọ ma weghachiri anyị ihe ahụ Adam mere ka ọ kwaa anyị.—Gụọ Jọn 3:16.

Jizọs nwụrụ ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú i chere ụwa ga-adị mgbe ndị mmadụ na-agaghị anwụkwa anwụ?

Ọnwụ Jizọs nwụrụ n’ihi anyị mere ka Chineke na-agbaghara anyị mmehie anyị, ọ bụkwa ọnwụ ya ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl gwara anyị na oge na-abịa mgbe nká, ọrịa na ọnwụ na-agakwaghị adị n’ụwa.—Gụọ Aịzaya 25:8; 33:24; Mkpughe 21:4, 5.

Olee otú anyị ga-esi na-echeta ọnwụ Jizọs?

Tupu Jizọs anwụọ, o gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya. Icheta ọnwụ Jizọs kwa afọ na-eme ka anyị na-echeta na Jizọs na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu.—Gụọ Luk 22:19, 20; 1 Jọn 4:9, 10.

N’afọ a, Ndịàmà Jehova ga-echeta ọnwụ Jizọs na Mọnde, abalị iri na anọ n’ọnwa Eprel, mgbe anyanwụ dachara. Anyị na-akpọ gị òkù ka i soro Ndịàmà Jehova bi gị nso gaa n’ebe ha ga-anọ cheta ọnwụ Jizọs.—Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 4 na isi nke 5 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike ịdanlodu ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya