Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 3/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Ọnwụ Jizọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Olee Otú E Si Echeta Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Na-emenụ Nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 3/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-echeta ọnwụ Jizọs?

Ebe ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ mgbe ụwa ghọrọ paradaịs

Olee ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ihi ọnwụ Jizọs?​—Aịzaya 25:8; 33:24

N’ihe niile merela n’ụwa a, ọ bụ ọnwụ Jizọs kacha mkpa. Jizọs nwụrụ ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdịghachi otú Chineke chọrọ ka ha dịrị. Chineke ekeghị anyị ka anyị na-eme ihe ọjọọ, na-arịa ọrịa, ma na-anwụ anwụ. (Jenesis 1:31) Ma, mmehie si n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam bata n’ụwa. Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka ịgbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ.—Gụọ Matiu 20:28; Ndị Rom 6:23.

Otú kachanụ Chineke si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ izite Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka anyị. (1 Jọn 4:9, 10) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri achịcha na mmanya na-eme ncheta ọnwụ ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya kwa afọ, anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị na-ekele Chineke na Jizọs maka ihe ọma ha meere anyị.—Gụọ Luk 22:19, 20.

Ole ndị kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs?

Mgbe mbụ Jizọs gwara ndịozi ya ka ha na-echeta ọnwụ ya, o kwuru banyere ọgbụgba ndụ ya na ha na-agba. (Matiu 26:26-28) Ọgbụgba ndụ a mere ka ndịozi Jizọs nakwa ndị ọzọ ga-emecha soro n’ọgbụgba ndụ a nwee olileanya iso Jizọs bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. N’agbanyeghị na ọtụtụ nde mmadụ na-echeta ọnwụ Jizọs taa, ọ bụ naanị ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ahụ na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs.—Gụọ Mkpughe 5:10.

Kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ ugbu a, Jehova na-ahọrọ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. (Luk 12:32) Ha adịghị ọtụtụ ma e jiri ha tụnyere ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Gụọ Mkpughe 7:4, 9, 17.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya