Mee Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Site n’Igosi Obi Ọma
“Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.
1. N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya na Jehova na-atụ anya ka ndị ya na-egosi obi ebere?
JEHOVA na-atụ anya ka ndị ya na-egosi obi ebere. Nke a ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya. Chineke n’onwe ya nwere obi ebere n’ebe mmadụ nile nọ, ọbụna n’ebe ndị ajọ mmadụ na-enweghị ekele nọ. N’ihe banyere nke a, Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ezi ihe nye ha, na-ebinyekwa ihe, ghara iwepụ ịtụkwasị obi [“n’anaraghị ego ụma,” NW]; ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu: n’ihi na ya onwe ya nwere ihu ọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị bụ ajọ mmadụ nọ. Nweenụ obi ebere, dị ka Nna unu nwere obi ebere.”—Luk 6:35, 36.
2. Ajụjụ dịgasị aṅaa banyere obi ọma kwesịrị ka anyị tụlee ha?
2 Dị ka Maịka 6:8 kwuru, ndị ahụ so Chineke na-ejekọ ije aghaghị “ịhụ ebere n’anya” n’ezie. O doro anya na Jehova na-enwe obi ụtọ mgbe ndị ohu ya hụrụ ebere n’anya, na-egosipụtakwa ya n’ụzọ sitere n’ala ala obi ha. Ma gịnị bụ ebere? Abamuru dị aṅaa na-esite n’igosi ya abịa? Oleekwa ụzọ a pụrụ isi gosipụta àgwà nke a?
Ihe Obi Ọma Bụ
3. Olee ụzọ ị ga-esi kọwaa obi ọma?
3 Obi ọma bụ àgwà nke inwe ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. A na-egosi ya site n’ime ihe iji nyere ndị ọzọ aka na ikwu okwu ndị na-egosi ichebara ndị ọzọ echiche. Inwe obi ọma pụtara ime ezi ihe kama ime ihe ọ bụla ga-emerụ ahụ. Onye nwere obi ọma na-eme omume nke onye bụ enyi, dịrị nwayọọ, na-egosi ọmịiko, dịkwa amara. Ọ na-enwe àgwà mmesapụ aka nke na-egosi ichebara ndị ọzọ echiche. Inwe obi ọma bụkwa otu akụkụ nke ákwà e ji kwaa uwe ihe atụ ezi onye Kraịst ọ bụla ga-eyi, n’ihi na Pọl gbara ume, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.
4. Olee ụzọ Jehova siworo bute ụzọ n’igosi ihe a kpọrọ mmadụ obi ọma?
4 Jehova na-ebute ụzọ n’igosi obi ọma. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, ọ bụ “mgbe e gosiri obi ọma nke Onye nzọpụta anyị Chineke, ya na ịhụnanya ya n’ebe mmadụ nọ,” ka ‘ọ zọpụtara anyị dị ka ebere ya si dị, site n’ọsịsa nke ịmụ ọzọ na nke ime ọhụrụ nke mmụọ nsọ na-eme.’ (Taịtọs 3:4, 5) Chineke na-eme ka ha dị ọcha, ma ọ bụ ‘na-asa ha ahụ,’ bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ n’ime ọbara Jisọs, na-eji uru nke àjà mgbapụta Kraịst na-emere ha ihe. A na-emekwa ka ha dị ọhụrụ site ná mmụọ nsọ, ha na-aghọ ‘ndị e kere ọhụrụ’ dị ka ụmụ Chineke e jiri mmụọ mụta. (2 Ndị Kọrint 5:17) N’ezie, obi ọma na ịhụnanya Chineke n’ebe mmadụ nọ gbasapụkwara ruoro “oké ìgwè mmadụ” zuru mba nile ọnụ, bụ́ ndị “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9, 14; 1 Jọn 2:1, 2) Ọzọkwa, ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, nọcha n’okpuru yoke ‘na-adịghị egbu mgbu’ nke Jisọs.—Matiu 11:30.
5. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya na ndị ahụ mmụọ Chineke na-eduzi ga na-egosi ndị ọzọ obi ọma?
5 Obi ọma bụkwa akụkụ nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ, nke Chineke. Pọl sịrị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ontachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, [“okwukwe,” NW] ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ịtụ anya ya n’aka ndị ahụ mmụọ Chineke na-eduzi? N’ezie, ha ga-egosi ndị ọzọ obi ọma.
6. Obi ọma kwesịrị ịkpali ndị okenye na ndị Kraịst ndị ọzọ ime ihe n’ụzọ dị aṅaa?
6 A pụrụ igosipụta obi ọma n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Anyị na-egosi obi ọma mgbe anyị bụ ndị na-eme ebere. Dị ka ihe atụ, ndị okenye bụ ndị Kraịst na-egosi obi ọma mgbe ha meere onye mere ihe ọjọọ nke nwere nchegharị ebere, ma na-achọ ụzọ inyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. Àgwà obi ọma ahụ nke Chineke nyere mmadụ na-eme ka ndị nlekọta nwee ndidi, na-echebara ndị ọzọ echiche, nwee ọmịiko, dịkwa nwayọọ. Ọ na-akpali ha ‘imere ìgwè atụrụ ahụ ebere.’ (Ọrụ 20:28, 29) N’eziokwu, mkpụrụ nke mmụọ ahụ nke bụ obi ọma kwesịrị ime ka ndị Kraịst nile na-eme ebere, nwee ndidi, na-echebara ndị ọzọ echiche, nwee ọmịiko, na-eme omume enyi, na-elekwa ndị ọbịa anya nke ọma.
Zere Inwe Obi Ọma nke Hiere Ụzọ
7. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na obi ọma nke hiere ụzọ bụ adịghị ike?
7 Ụfọdụ ndị na-ele inwe obi ọma anya dị ka ihe àmà nke adịghị ike. Ha na-eche na mgbe ụfọdụ, mmadụ aghaghị ime omume aka ike ma ọ bụ ọbụna inwe ọnụ ọjọọ, ka ndị mmadụ wee mara otú ike ya hà. Ma e kwuwo nke ọma na “inwe ọnụ ọjọọ bụ ụzọ onye na-esighị ike si eme ka à ga-asị na ya dị ike.” N’eziokwu, ọ na-achọ inwe ike dị ukwuu iji gosi ezi obi ọma ma zere obi ọma nke hiere ụzọ. Obi ọma nke bụ mkpụrụ nke mmụọ Chineke abụghị àgwà nke adịghị ike, nke na-anabata omume na-ezighị ezi. Kama nke ahụ, obi ọma nke hiere ụzọ bụ adịghị ike nke na-anabata omume ọjọọ.
8. (a) N’ihe banyere ụmụ ya, olee ụzọ Ilaị si gosi onwe ya ịbụ onye na-adịghị ike? (b) N’ihi gịnị ka ndị okenye na-aghaghị iji nọrọ na nche megide igosi obi ọma nke hiere ụzọ?
8 Onye isi nchụaja Israel bụ Ilaị emesighị ihe ike n’inye ụmụ ya bụ Họfnaị na Finehas ọzụzụ, bụ́ ndị jere ozi dị ka ndị nchụaja n’ụlọ ikwuu ahụ. N’ịbụ ndị na-enweghị afọ ojuju n’akụkụ ihe ịchụ aja ahụ Iwu Chineke kenyere ha, ha dunyere otu onye na-eje ozi ka o jee nata onye ahụ bịara ịchụ àjà anụ a na-esibeghị esi tupu e suree abụba nke anụ ahụ e jiri chụọ àjà n’ọkụ n’elu ebe ịchụaja. Ụmụ Ilaị sokwara ndị inyom na-eje ozi n’ọnụ ụzọ mbata ụlọ ikwuu ahụ na-enwe mmekọahụ na-adịghị ọcha. Otú ọ dị, kama iwepụ Họfnaị na Finehas n’ọkwá ha, ihe Ilaị mere bụ nanị ịbara ha mba n’ụzọ dị nnọọ nro, na-enye ụmụ ya nsọpụrụ karịa Chineke. (1 Samuel 2:12-29) Ka a sịkwa ihe mere na ‘a dịghị anụkebe okwu Jehova na mgbe ahụ’! (1 Samuel 3:1) Ya mere, ndị okenye bụ ndị Kraịst ekwesịghị ịdaba ná ntụgharị uche na-ezighị ezi ma ọ bụ gosipụta obi ebere hiere ụzọ nke pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ n’ihe ize ndụ. Ezi obi ọma abụghị nke kpuru ìsì n’ebe ajọ okwu na ajọ omume dị, bụ́ ndị na-emebi ụkpụrụ Chineke.
9. (a) Àgwà dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka izere igosi obi ọma nke hiere ụzọ? (b) Olee ụzọ Jisọs si gosi na ya dị ike n’imeso ndị okpukpe dapụworo n’ezi ofufe ihe?
9 Ka anyị wee zere igosi obi ọma nke hiere ụzọ, anyị aghaghị ikpe ekpere maka enyemaka Chineke iji nwee ike yiri nke ahụ pụtara ìhè n’okwu ndị a nke onye ọbụ abụ ahụ: “Sinụ n’ebe m nọ wezụga onwe unu, unu ndị na-eme ihe ọjọọ; ka m wee chebe ihe nile Chineke m nyere n’iwu.” (Abụ Ọma 119:115) Ọ dịkwa anyị mkpa ịgbaso ihe nlereanya Jisọs Kraịst, bụ́ onye ọ na-adịghị mgbe ọ bụla ikpe igosi obi ọma nke hiere ụzọ mara ya. N’eziokwu, Jisọs bụ ihe atụ kasị elu nke ezi obi ọma. Dị ka ihe atụ, ‘o nwere ọmịiko n’ahụ ndị mmadụ n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ N’ihi nke a, ndị nwere obi eziokwu nweere onwe ha ịbịakwute Jisọs, ọbụna na-akpọtara ya ụmụntakịrị ha. Cheekwa nnọọ echiche ụdị obi ebere na ọmịiko o gosipụtara mgbe ‘o kuuru ụmụntakịrị ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha’! (Matiu 9:36; Mak 10:13-16) Ọ bụ ezie na Jisọs nwere obi ọma, ma ọ na-eguzosikwa ike maka ihe ziri ezi n’anya Nna ya nke eluigwe. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs kwadoro ajọ ihe; o nwere ike ahụ Chineke nyere ya iji katọọ ndị ndú okpukpe ahụ nwere ihu abụọ. Na Matiu 23:13-26, ọtụtụ ugbo o kwughachiri okwu ahụ bụ: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ.” Mgbe ọ bụla o kwuru ya, Jisọs na-enye ihe kpatara ha ga-eji nata ikpe ọmụma Chineke.
E Jikọrọ Obi Ọma na Ịhụnanya
10. Olee ụzọ ndị na-eso ụzọ Jisọs na-esi egosi obi ọma na ịhụnanya n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ?
10 Banyere ndị na-eso ụzọ ya, Jisọs sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Gịnị bụkwa otu akụkụ nke ịhụnanya nke e ji amara ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs? Pọl sịrị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obi ọma.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Inwe ogologo ntachi obi na obi ọma pụtara anyị ịnagide ezughị okè na adịghị ike nile nke ndị ọzọ, ọbụna dị ka Jehova ji obi ọma na-eme. (Abụ Ọma 103:10-14; Ndị Rom 2:4; 2 Pita 3:9, 15) Ịhụnanya na obi ọma ndị Kraịst na-apụtakwa ìhè mgbe ihe isi ike bịakwasịrị ndị kwere ekwe ibe ha n’otu ebe n’elu ala. N’iji ihe karịrị “obi ọma” zaghachi, ndị Kraịst nọ n’ebe ndị ọzọ na-egosi ịhụnanya ụmụnna site n’inye onyinye ihe onwunwe iji nyere ndị dị otú ahụ na-efe Jehova aka.—Ọrụ 28:2.
11. N’ikwu ya n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ nsọ, gịnị bụ obi ebere ịhụnanya?
11 E jikọtara obi ebere na ịhụnanya n’okwu ahụ bụ ‘obi ebere ịhụnanya,’ bụ́ nke e ji mee ihe ọtụtụ ugbo n’ime Akwụkwọ nsọ. Nke a bụ obi ọma nke gbanyere mkpọrọgwụ n’ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe. Mkpọaha Hibru ahụ nke a sụgharịrị ịbụ ‘obi ebere ịhụnanya’ (cheʹsedh) gụnyere ihe karịrị nanị iji obi dị nro lebara ihe anya. Ọ bụ obi ọma nke na-eji ịhụnanya na-arapagidesi ike n’ihe ruo mgbe e mezuru nzube ya n’ebe ihe ahụ dị. Obi ebere ịhụnanya, ma ọ bụ ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe, nke Jehova bụ nke a na-egosipụta n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, a na-egosi ya n’ọrụ nzọpụta na nchebe dị iche iche ọ na-arụ.—Abụ Ọma 6:4; 40:11; 143:12.
12. Mgbe ndị ohu Jehova kpere ekpere maka enyemaka ma ọ bụ mgbapụta, gịnị ka ha pụrụ ijide n’aka?
12 Ka a sịkwa ihe mere na obi ebere ịhụnanya nke Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ! (Jeremaịa 31:3) Mgbe ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nwere mkpa nke nnapụta ma ọ bụ enyemaka, ha maara na obi ebere ịhụnanya ya bụ n’ezie ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe, nke na-agaghị agbaba ha aka. N’ihi ya, ha pụrụ iji okwukwe kpee ekpere, dị ka onye ọbụ abụ ahụ ahụ mere, bụ́ onye sịrị: “Ma ọ bụ ebere [“obi ebere ịhụnanya,” NW] gị ka mụ onwe m tụkwasịworo obi; ka obi m tegharịa egwu ọṅụ ná nzọpụta gị.” (Abụ Ọma 13:5) Ebe ịhụnanya Chineke na-eguzosi ike n’ihe, ọ bụghị n’efu ka ndị ohu ya na-atụkwasị obi n’obi ebere ịhụnanya ya. Mgbe ha kpere ekpere maka enyemaka ma ọ bụ mgbapụta, ha na-enwe obi ike nke a: “Jehova agaghị aha ndị ya aka, ọ gaghị ahapụkwa ihe nketa ya.”—Abụ Ọma 94:14.
Ụgwọ Ọrụ nke Inwe Obi Ọma
13, 14. N’ihi gịnị ka onye nwere obi ọma na-eji enwe ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe?
13 N’iṅomi Jehova, ndị ohu ya ‘na-enwe ebere na obi ọma nile, onye ọ bụla n’ahụ nwanne ya.’ (Zekaraịa 7:9; Ndị Efesọs 5:1) “Ihe na-eme ka a na-achọsi mmadụ ike bụ ebere ya,” onye na-egosipụta àgwà nke a na-enwetakwa ụgwọ ọrụ n’ụba. (Ilu 19:22) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a?
14 Obi ọma na-eme ka anyị jiri akọ na-eme ihe, wee si otú a na-enyere anyị aka ịnọgide ná mmekọrịta dị mma nke anyị na ndị ọzọ. Onye dị akọ na-ekwu okwu, na-emekwa ihe, ma ọ bụ na-eme ihe banyere ọnọdụ ndị siri ike n’ụzọ ndị na-egosi ichebara ndị ọzọ echiche, ndị na-agaghị akpasukwa ha iwe. Ebe “onye na-enweghị obi ebere” bụ onye a na-adịghị akparu nso, “onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ.” (Ilu 11:17) Ndị mmadụ na-eze onye nwere obi ọjọọ eze, ma a na-adọrọ ha bịa n’ebe onye na-egosi ha obi ebere ịhụnanya nọ. N’ihi nke a, onye nwere obi ọma na-enwe ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe.—Ilu 18:24.
15. Mmetụta dị aṅaa ka inwe obi ọma pụrụ inwe n’ezinụlọ nke kewara ekewa n’ihe banyere okpukpe?
15 Onye Kraịst bụ nwunye nke nwere di na-ekweghị ekwe pụrụ ịdọta ya n’ebe eziokwu Chineke dị site n’àgwà dị ka obi ọma. Tupu ọ mụta eziokwu ahụ ma yikwasị ‘mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ,’ ọ pụrụ ịbụworị onye na-enweghị obi ọma, ọbụna onye na-ese okwu. (Ndị Efesọs 4:24) Ọ bụrụ na di ya maara ụfọdụ ilu, ọ pụrụ ikwenyeworị na “mmiri ọtụ́tụ́ na-atụ mgbe nile ka iseokwu nwunye bụ,” na “ọ [dịkwa] mma ịnọ n’ala bụ nanị ọzara, karịa ịnọnyere nwanyị na-ese okwu na-akpasukwa iwe.” (Ilu 19:13; 21:19) Ma ugbu a, àgwà dị ọcha na nsọpụrụ dị omimi nke nwunye ahụ bụ onye Kraịst, tinyere àgwà ndị dị ka inwe obi ọma, pụrụ inye aka irite di ya n’uru bịa n’ezi okwukwe ahụ. (1 Pita 3:1, 2) Ee, nke a pụrụ ịbụ otu ụgwọ ọrụ nke obi ọma nwanyị ahụ.
16. Olee ụzọ anyị pụrụ isi rite uru n’obi ọma nke e gosiri anyị?
16 Obi Ọma nke e gosiri anyị pụrụ ịba uru site n’ime ka anyị bụrụ ndị nwere ọmịiko karị, na-agbagharakwa agbaghara karị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị nọ ná mkpa nke inweta enyemaka ime mmụọ, e wee mesoo anyị n’ụzọ obi ọma na n’ụzọ dị nwayọọ, ọ̀ bụ na nke ahụ agaghị akpali anyị karị imeso ndị ọzọ n’ụzọ dị otú ahụ? Ee, a pụrụ ịtụ anya inweta mmeso obi ọma na nke dị nwayọọ site n’aka ndị ruru eru n’ime mmụọ n’ihi na Pọl dere, sị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” (Ndị Galetia 6:1) Ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-eji ịdị nwayọọ na obi ọma na-ekwu okwu mgbe ha na-achọ inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka, bụ́ ndị mehieworonụ. Otú ọ dị, ma ànyị anatawo enyemaka obi ọma dị otú ahụ n’onwe anyị ma ọ bụ na anyị anatabeghị, gịnị ka Chineke na-atụ anya ya n’aka ndị nile na-ejere ya ozi? Ndị Kraịst nile kwesịrị igosipụta obi ọma n’ebe ndị ọzọ nọ, ha kwesịkwara ịgbaso ndụmọdụ Pọl, bụ́: “Nwerịtanụ obi ọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” (Ndi Efesọs 4:32) N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ agbagharawo anyị ma ọ bụ na e jiwo obi ọma nyere anyị aka ịpụta n’ihe isi ike ime mmụọ, nke a kwesịrị ịmụba ikike anyị onwe anyị nwere igosi mgbaghara, obi ọmịiko, na obi ọma.
Nwee Ekele maka Obi Ebere Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ
17. Ebe anyị bụ ndị mmehie site n’ọmụmụ, n’ihi obi ebere dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe ekele n’ụzọ pụrụ iche?
17 Ebe a mụrụ anyị nile dị ka ndị mmehie a maworo ikpe ọnwụ, e nwere otu obi ọma nke ọ dị mkpa ka anyị nwee ekele maka ya n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ obi ebere Jehova Chineke nke na-erughịrị mmadụ. Ndị mmehie ịbụ ndị a tọhapụrụ site n’amamikpe ọnwụ na ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume bụ obi ebere nke na-erughịrị mmadụ ma ọlị. Pọl, onye hotara obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ 90 ugbo n’ime akwụkwọ ozi 14 ya ndị sitere n’ike mmụọ nsọ, gwara ndị Kraịst na Rom oge ochie, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke; a na-ewerekwa amara ya na-agụ ha ná ndị ezi omume n’onyinye efu site ná mgbapụta ahụ nke dị n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Rom 3:23, 24) Lee nnọọ ka anyị si kwesị inwe ekele maka obi ebere na-erughịrị mmadụ nke Jehova Chineke gosiri!
18, 19. Olee ụzọ anyị pụrụ isi zere ikwe ka nzube nke obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ funarị anyị?
18 Site n’ịbụ ndị na-enweghị ekele, nzube nke obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ pụrụ ifunarị anyị. N’ihe banyere nke a, Pọl sịrị: “Ya mere anyị bụ ndị ụkọ [“ndị nnọchianya,” NW] n’ọnọdụ Kraịst, dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọ arịrịọ site n’aka anyị: anyị nọ n’ọnọdụ Kraịst na-arịọ unu, meenụ ka unu na Chineke dị n’otu. Onye ahụ nke na-amaghị mmehie ka o mere ka ọ bụrụ mmehie n’ọnọdụ anyị; ka anyị onwe anyị wee ghọọ ezi omume Chineke n’ime ya. Ma, dị ka ndị anyị na ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa unu ka unu ghara ịnara amara Chineke n’efu, n’ihi na ọ na-asị [n’Aịsaịa 49:8, Septuagint], N’oge a na-anara mmadụ nke ọma ka m nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka m nyeere gị aka: lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta: anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ije ozi anyị ụta; kama n’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi.” (2 Ndị Kọrint 5:20–6:4) Gịnị ka okwu Pọl pụtara?
19 Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ndị nnọchianya nọ n’ọnọdụ Kraịst, oké ìgwè mmadụ ahụ bụkwa ndị ozi ya. N’ịdị n’otu, ha na-agba ụmụ mmadụ ume ka ha mee ka ha na Chineke dịrị n’otu ka ha wee nweta nzọpụta. Pọl achọghị ka onye ọ bụla nara obi ebere Jehova Chineke nke na-erughịrị mmadụ site na Jisọs Kraịst ma kwere ka nzube ya funarị ya. Nke ahụ pụrụ ime anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ịrụ ọrụ ahụ nke obi ebere na-erughịrị mmadụ mere ka anyị ruo eru ịrụ. N’ịbụ ndị ha na Chineke bụ enyi dị ka ndị e mere ka ha na ya dị n’otu, anyị agaghị na-anara obi ebere ahụ na-erughịrị mmadụ n’efu ma ọ bụrụ na anyị na-arụzu “ije ozi nke ime ka a dị n’otu ahụ; nke bụ na Chineke nọrịị n’ime Kraịst na-eme ka ya onwe ya na ụwa dị n’otu.” (2 Ndị Kọrint 5:18, 19) Ọ ga-abụkwa obi ọma kachasị ukwuu ka anyị na-egosi ndị ọzọ site n’inyere ha aka ime ka ha na Chineke dị n’otu.
20. Gịnị ọzọ ka anyị ga-atụle?
20 Ndị ohu Jehova na-eji oge na ihe onwunwe ha na-eme ihe n’ọrụ dị iche iche nke obi ọma mgbe ha na-achọ inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ site n’ije ozi ndị Kraịst. Ma gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Akwụkwọ nsọ nke itinye obi ọma n’ọrụ? Ka anyị gaa n’ihu ma nyochaa ụfọdụ n’ime ndị a ma tụlee ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi mee ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’igosi obi ọma.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Gịnị bụ obi ọma?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi zere igosi obi ọma nke hiere ụzọ?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Jehova pụrụ iji nwee ntụkwasị obi n’obi ebere ịhụnanya ya?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ ụgwọ ọrụ nke obi ọma?
◻ Site n’ime gịnị ka nzube nke obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ na-agaghị efunarị anyị?
[Foto dị na peeji nke 13]
Obi ọma na-eme ka ndị okenye bụ ndị Kraịst na-enwe ndidi, na-echebara ndị ọzọ echiche, na-enwekwa ọmịiko
[Foto dị na peeji nke 15]
Obi ọma nke onye Kraịst bụ nwunye pụrụ inye aka irite di ya n’uru bịa n’ezi okwukwe ahụ
[Foto dị na peeji nke 17]
Anyị pụrụ igosi ndị ọzọ obi ọma kasị ukwuu site n’inyere ha aka ịbụ ndị ha na Chineke dị n’otu