Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Jun p. 26-28
  • Kwe Ka “Iwu Obiọma” Na-eduzi Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwe Ka “Iwu Obiọma” Na-eduzi Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • KWE KA “IWU OBIỌMA” DỊ N’IRE GỊ
  • INWERE NDỊ ỌZỌ OBIỌMA GA-ABARA HA URU
  • MỤTA ỊNA-ENWERE NDỊ ỌZỌ OBIỌMA KA JEHOVA
  • ÒNYE KA ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-ENWERE OBIỌMA?
  • Ịchụso Obiọma n’Ụwa nke Na-enweghị Omume Enyi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Obiọma Bụ Àgwà A Na-egosi Ma n’Okwu Ma n’Omume
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Mee Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Site n’Igosi Obi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ndị Chineke Aghaghị Ịhụ Obiọma n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Jun p. 26-28
Foto ndị na-egosi: 1. Ebe nwanna bụ́ okorobịa na-ebugara nwanna ọzọ merela agadi akpa nri. 2. Ebe di na nwunye na-enyere otu ezinụlọ na-akwapụ akwapụ aka akwakọta ngwongwo ha. 3. Ebe di na nwunye ọzọ na-enyere nwanna nwaanyị merela agadi aka eme ka ụlọ ya dị ọcha.

Kwe Ka “Iwu Obiọma” Na-eduzi Gị

OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Lisaa sịrị: “Ihe metụrụ m n’obi bụ otú ụmụnna si nweere m obiọma.” O kwuru ihe a mgbe ọ na-ekwu ihe mere ka ọ bata n’ọgbakọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anne. Ọ sịrị: “Ihe mere m ji bata n’ọgbakọ bụ otú ụmụnna si nweere m obiọma, ọ bụghị n’ihi ihe ha na-akụzi.” Ịgụ Baịbụl na ichebara ya echiche na-atọ ụmụnna nwaanyị ndị a ụtọ ugbu a. Ma, ihe nyeere ha aka ịbata n’ọgbakọ bụ otú ụmụnna si nweere ha obiọma.

Olee otú anyị ga-esi na-emere ndị anyị na ha nọ obiọma? Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ ihe anyị na-ekwu. Nke abụọ abụrụ ihe anyị na-eme. Anyị ga-elebakwa anya ná ndị anyị kwesịrị ịna-enwere obiọma.

KWE KA “IWU OBIỌMA” DỊ N’IRE GỊ

“Iwu obiọma” dị n’ire ezigbo nwaanyị e kwuru okwu ya n’Ilu isi nke 31. (Ilu 31:26) Ọ na-ekwekwa ka iwu a na-achị otú o si ekwu okwu na ihe ndị ọ na-ekwu. “Iwu” a kwesịkwara ịdị n’ire ndị nna. O doro ọtụtụ nne na nna anya na iji olu ike agwa nwa ha okwu nwere ike ịkpata nsogbu. Ọ bụrụ na nne na nna ewere ọnụ ọjọọ ma ọ bụ olu ike gwa nwa ha okwu, e nwere ike nwa ahụ agaghị eme ihe ahụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị nne na nna ewetuo olu na-agwa nwa ha okwu, ọ ga-aka adịrị nwa ahụ mfe ige ha ntị.

Olee otú ị ga-esi mụta iji obiọma na-agwa mmadụ okwu ma ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ na ị bụghị? Ihe e kwuru n’Ilu 31:26 nwere ike inyere anyị aka. Ebe ahụ sịrị: “Okwu ya na-egosi na ọ ma ihe.” (Ilu 31:26) Ihe ọ pụtara bụ na ị ga na-ahọ ihe ị na-ekwu ahọ, marakwa otú ị ga-esi kwuo ya. Ihe nwere ike inyere anyị aka bụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe a m chọrọ ikwu ọ̀ ga-akpasu mmadụ iwe, ka ọ̀ ga-eme ka udo dị?’ (Ilu 15:1) N’eziokwu, anyị kwesịrị iche echiche tupu anyị ekwuo okwu.

Ebe ọzọ n’Ilu kwuru, sị: “Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.” (Ilu 12:18) Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ihe anyị chọrọ ikwu na otú anyị chọrọ isi kwuo ya nwere ike ịdị ndị ọzọ, ọ ga-enyere anyị aka anyị ana-ejide ire anyị ma anyị kwuwe okwu. N’eziokwu, ikwe ka “iwu obiọma na-achị” anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-agwa mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ iji olu ike na-agwa mmadụ okwu. (Efe. 4:​31, 32) Anyị ga na-eji obiọma na olu ọma agwa ndị ọzọ okwu kama ịna-eji olu ike agwa ha okwu. Mgbe ezigbo ụjọ ji ohu Jehova bụ́ Ịlaịja, Jehova mere ihe a. Jehova “weturu olu na-ekwu okwu” mgbe o si n’ọnụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu. (1 Eze 19:12) Ma, ịdị obiọma abụghị naanị n’ihe anyị na-ekwu, anyị kwesịkwara ịna-emere ndị mmadụ ihe ga-egosi na anyị dị obiọma. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

INWERE NDỊ ỌZỌ OBIỌMA GA-ABARA HA URU

Ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma na-agwa ndị ọzọ okwu ma na-enwere ha obiọma, anyị na-eme ka Jehova. (Efe. 4:32; 5:​1, 2) Nwanna Nwaanyị Lisa anyị kwuburu okwu ya kwuru otú Ndịàmà Jehova si nweere ya obiọma. Ọ sịrị: “Mgbe a manyere ndị ezinụlọ anyị ịkwapụ na mberede, di na nwunye abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova hapụrụ ọrụ ha bịa nyere anyị aka ịkwakọta ngwongwo anyị. N’oge ahụ, amụwabeghịdị m Baịbụl.” Ihe ọma a Ndịàmà Jehova meere Lisa mere ka ọ mụwa Baịbụl.

Obi dịkwa Nwanna Nwaanyị Anne anyị kwuburu okwu ya ụtọ maka obiọma Ndịàmà Jehova nweere ya. Ọ sịrị: “N’ihi otú ụwa dị, m malitere ịna-enyo onye ọ bụla enyo. Ọ na-esiri m ike ịtụkwasị ndị mmadụ obi. Mgbe mbụ m hụrụ Ndịàmà Jehova, atụkwasịghị m ha obi. M nọ na-eche, sị: ‘Gịnị mere ha ji abịa m nso?’ Ma, otú onye na-amụrụ m Baịbụl si nweere m ezigbo obiọma mere ka m tụkwasịwa ya obi.” Olee uru ọ baara Nwanna Nwaanyị Anne? Ọ sịrị: “M mechaziri bido ichebakwuru ihe ndị m na-amụta echiche.”

Ị ga-achọpụta na ihe kacha ruo Lisa na Anne n’obi bụ ihe ọma ndị nọ n’ọgbakọ meere ha. O nyekwaara ha aka ịchọ ịmụta eziokwu Baịbụl. Obiọma ndị nọ n’ọgbakọ nweere ha nyeere ha aka ịmalite tụkwasịwa Jehova na ndị ya obi.

MỤTA ỊNA-ENWERE NDỊ ỌZỌ OBIỌMA KA JEHOVA

E nwere ndị na-eji obiọma agwa ndị ọzọ okwu, na-amụmụkwa ọnụ ọchị n’ihi otú e si zụlite ha, ebe ha nọ too, ma ọ bụ omenala ha. Ọ dị mma na ihe ndị ahụ na-eme ka ha na-enwere ndị ọzọ obiọma ma jiri obiọma na-agwa ha okwu. Ma, ọ bụrụ naanị ya mere anyị ji enwere ndị ọzọ obiọma, o nwere ike ịbụ na anyị anaghị enwere ndị ọzọ obiọma ka Chineke.​—I nwere ike ịtụle Ọrụ Ndịozi 28:2.

Ezigbo obiọma so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwere ndị ọzọ ezigbo obiọma, anyị kwesịrị ikwe ka mmụọ nsọ na-eduzi echiche anyị na omume anyị. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na-eme ka Jehova na Jizọs. Ihe ọzọ bụ na, ebe anyị bụ Ndị Kraịst, ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. N’ihi ya, ebe ọ bụ na ihe na-eme ka anyị na-enwere ndị mmadụ obiọma bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, hụkwa ndị mmadụ ibe anyị n’anya, obiọma anyị si anyị n’obi, na-emekwa Chineke obi ụtọ.

ÒNYE KA ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-ENWERE OBIỌMA?

Anyị hụ ndị meere anyị ihe ọma ma ọ bụ ndị anyị ma, o nwere ike ịdịrị anyị mfe inwere ha obiọma. (2 Sam. 2:6) Otu ụzọ anyị si eme ya bụ ikele ha. (Kọl. 3:15) Ma, ọ bụrụkwanụ na e nwere onye anyị chere na anyị ekwesịghị inwere obiọma?

Chegodị ihe a: Ọ bụ Jehova kacha emere ndị mmadụ amara. N’Okwu ya bụ́ Baịbụl, ọ kụzikwaara anyị otu ihe dị mkpa gbasara imere ndị ọzọ amara. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu ahụ bụ́ “amara” gbara ọtụtụ ugboro. Olee otú Jehova si enwere anyị obiọma?

Chee gbasara ọtụtụ nde mmadụ Jehova na-enwere obiọma. Otú o si enwere anyị obiọma bụ ịna-enye anyị ihe ndị ga-eme ka anyị dịrị ndụ. (Mat. 5:45) Jehova na-enyedị anyị ihe ndị a tupu anyị amata onye ọ bụ. (Efe. 2:​4, 5, 8) Dị ka ihe atụ, o nyere ụmụ mmadụ ihe kacha mma o nwere, ya bụ, Ọkpara ọ mụrụ naanị ya. Pọl onyeozi kwuru na Jehova nyere anyị ihe mgbapụta n’ihi ‘amara ya na-enweghị atụ.’ (Efe. 1:7) Ihe ọzọkwa bụ na n’agbanyeghị na anyị na-eme mmehie, na-akpasukwa Jehova iwe, ọ ka na-eduzi anyị ma na-akụziri anyị ihe. Ntụziaka ya na okwu ya dị ka “mmiri nke na-abụsa n’ahịhịa.” (Diut. 32:2) O doro anya na anyị agaghị akwụli ya ụgwọ obiọma niile ọ na-enwere anyị. Nke bụ́kwa eziokwu bụ na e wepụ obiọma Jehova, anyị agaaraghị enwe olileanya na ọdịnihu ga-aka mma.​—I nwere ike ịtụle 1 Pita 1:13.

O doro anya na otú Jehova si enwere anyị obiọma na-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, na-emekwa ka anyị chọọ ịna-enwere ndị ọzọ obiọma. N’ihi ya, ka anyị gbalịa na-eme ka Jehova, na-enwere onye ọ bụla obiọma, ọ bụghị ịhọ ndị anyị ga-enwere ya ahọ. (1 Tesa. 5:15) Ọ bụrụ na anyị ana-enwere onye ọ bụla obiọma, anyị ga-adị ka ọkụ ndị mmadụ na-anya n’oge ụgụrụ. Anyị ga na-akasi ndị ezinụlọ anyị, ụmụnna anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, nakwa ndị agbata obi anyị obi.

Chee gbasara onye ezinụlọ gị ma ọ bụ onye ọgbakọ unu okwu ọma gị ma ọ bụ obiọma gị ga-abara uru. O nwere ike ịbụ na e nwere onye nọ n’ọgbakọ unu ọ kacha dịrị ezigbo mkpa ka i nyere ya aka rụọ ọrụ ụlọ, ọrụ ugbo ma ọ bụ gaa zụtara ya ihe. Ọ bụrụkwa na e nwere onye ị chọrọ izi ozi ọma e kwesịrị inyere aka, gbalịa nyere ya aka.

Ka “iwu obiọma” na-achi okwu ọnụ anyị na ihe ndị anyị na-eme. Anyị mee otú ahụ, anyị na-eme ka Jehova.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya