Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/15 p. 13-18
  • Ịdị Mma Bara Ụba nke Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdị Mma Bara Ụba nke Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị Mma nke Chineke
  • E Gosipụtara Ịdị Mma n’Ihe Okike
  • Ọdịda na Nnapụta nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
  • Ịdị Mma Chineke n’Oge a
  • Jehova—Onye Nlereanya Kasịnụ nke Ịdị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Lee Ka Ịdị Mma Ya Si Dị Ukwuu!”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ịdị Mma—Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mụta Ya?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Nọgide Na-egosipụta Ịdị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/15 p. 13-18

Ịdị Mma Bara Ụba nke Jehova

“Lee ka ezi ihe [“ịdị mma,” NW] gị si baa ụba, nke ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu gị.”—ABỤ ỌMA 31:19.

1, 2. (a) Oké ọrụ dị aṅaa ka Jehova rụrụ n’otu mgbe n’ogologo oge gara aga? (b) Olee ụzọ Jehova si kọwaa ihe sitere n’ọrụ okike ihe ya pụta?

ENWERE oge mgbe Chineke malitere ike ‘eluigwe dị ka ocheeze ya nakwa ụwa dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ ya.’ (Aịsaịa 66:1) Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ ekpugheghị mgbe nke a weere ọnọdụ. Ihe o kwuru bụ nanị: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) N’ogologo oge okike ihe, e mepụtara ọtụtụ nde ìgwè ụyọkọ kpakpando, ọtụtụ n’ime ha nwere ọtụtụ puku nde kpakpando. N’ọnụ ọnụ nke otu n’ime ụyọkọ kpakpando ndị ahụ ka e nwere otu kpakpando na-enwusi ike, nke ala mbara igwe ndị dị nta ma e jiri ha tụnyere ya, ndị dị oji, na-agba ya gburugburu. E mesịrị kpọọ otu n’ime ha ụwa. Ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere nnukwu kpakpando ndị ahụ na-enwu enwu, ụwa dị nta nke ukwuu. Ma, ọ bụ nke a ka Jehova zubere iji mere ihe mgbakwasị ụkwụ ya.

2 Jehova si otú a chee ike okike ihe ya ihu n’ebe mbara ala bụ Ụwa dị. ‘Onye ahụ e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke’ nọ n’akụkụ ya dị ka Onye Ọkà mgbe a gbanwere obere mkpụkọta ihe nke a dị oji n’ime ogologo “ụbọchị” okike ihe isii dị iche iche. Ọ ghọrọ, n’ụzọ ihe atụ, ebe kwesịrị ekwesị Chineke ga-edokwasị ụkwụ ya. (Ndị Kọlọsi 1:15; Ọpụpụ 20:11; Ilu 8:30) Ọ bụ n’ebe a ka Chineke zubere idebe ụdị ọhụrụ nke ihe dị ndụ nke nwere ọgụgụ isi: ihe a kpọrọ mmadụ. Mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ ndị e jiri ihe ndị e nwetara n’ala kee, ka e debere n’ọmarịcha gburugburu ebe bụ paradaịs. (Jenesis 1:26, 27; 2:7, 8) Ihe ikpeazụ sitere n’ọrụ okike ihe nke a pụrụ iche pụta zuru okè nke ukwuu, maakwa mma nke ukwuu, nke na Bible gosipụtara mmetụta Chineke nwere n’ụtụtụ—akụkụ ikpeazụ—nke ụbọchị okike ihe nke isii, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla o mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:31.

Ịdị Mma nke Chineke

3. Àgwà Chineke dị aṅaa nke pụrụ iche ka e gosipụtara site n’ihe okike?

3 Mgbe ọtụtụ puku afọ gasịrị, otu onye sitere n’usoro ọmụmụ nke mmadụ abụọ mbụ ahụ leghachiri anya n’oge okike ihe wee dee, sị: “Ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi ya na ụdị Chineke ya.” (Ndị Rom 1:20) Ee, ịma mma na-enweghị atụ nke elu ala na nke ihe okike ndị dị na ya bụ n’ezie ngosipụta dị ebube nke àgwà Chineke ndị a na-adịghị ahụ anya—nke ịdị mma bara ụba nke Chineke na-abụghịkwa nke kasị dịrị nta n’ime ha. Ya mere, lee nnọọ ka o si kwesị ekwesị na Chineke kwupụtara na ihe nile o keworo dị mma!—Abụ Ọma 31:19.

4, 5. Gịnị bụ ịdị mma?

4 Ịdị mma bụ akụkụ nke isii nke mkpụrụ nke mmụọ Chineke nke Pọl onyeozi kọwara ná Ndị Galetia 5:22. Ọmụmụ ihe ndị gaworo aga nke magazin Ụlọ Nche atụlewo mkpụrụ ise ndị mbụ nke mmụọ ahụ, na-egosi ịdị mkpa nke mkpụrụ ndị a iji zụlite ọdịdị onye Kraịst nke tozuru okè.a Ma, lee ka o si dị mkpa na anyị agaghị echefu ịdị mma! N’ikwekọ na nke ahụ, anyị na-elebara àgwà nke a anya ugbu a.

5 Gịnị bụ ịdị mma? Ọ bụ àgwà ma ọ bụ ọnọdụ nke ịdị mma. Ọ bụ akparamagwa ọma na-enweghị atụ, ezi àgwà. Ya mere, ọ bụ àgwà dị mma nke na-egosipụta onwe ya n’ime ezi ihe na ihe na-abara ndị ọzọ uru. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta àgwà nke a nke na-eme ka a hụ mmadụ n’anya? N’ụzọ bụ isi, ọ bụ site n’iṅomi Jehova. N’ihi ya, tupu anyị agaa n’ihu n’ịtụle ụzọ anyị onwe anyị, dị ka ndị Kraịst n’otu n’otu, pụrụ isi gosipụta ịdị mma, ka anyị nyochaa ịdị mma nke Chineke anyị onye na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, gosiworo ná ndokwa o meworo maka ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ nakwa ụzọ o si emeso anyị.

E Gosipụtara Ịdị Mma n’Ihe Okike

6. Gịnị kpaliri Jehova ike ihe ndị ọzọ dị ndụ nwere ọgụgụ isi?

6 Gịnị kpaliri Nna anyị nke eluigwe ná mmalite iso ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi kerịta ọṅụ nke ịdị ndụ? Jọn onyeozi na-aza ajụjụ ahụ mgbe ọ sịrị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ee, ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma nanị onwe ya kpaliri oké Isi Iyi nke ndụ ahụ ike ụdị ihe ndị ọzọ dị ndụ, na-enye ụfọdụ n’ime ha ebe obibi n’eluigwe, na-enyekwa ndị ọzọ ebe obibi n’elu ala. N’ezie, anyị maara ihe dị nta banyere otú eluigwe ma ọ bụ ihe okike ndị dị n’eluigwe dị. Ha bụ mmụọ—ndị anya mmadụ na-adịghị ahụ—ebe obibi ha bụkwa n’ógbè nke ndị bụ mmụọ. Ma legharịa anya na gburugburu ebe obibi elu ala gị nke Jehova nyeworo ụmụ ya ndị bụ mmadụ. Tụleekwa ihe banyere ihe a kpọrọ mmadụ n’onwe ya. Mgbe ahụ, ị ga-amalite iji anya nke gị hụ ihe àmà siri ike nke ịdị mma Chineke.

7-9. Olee ụzọ e si ahụta ịdị mma Chineke n’ụzọ o si kee elu ala na mmadụ n’elu ya?

7 Jehova nyere nne na nna anyị mbụ ndụ. Karịa nke ahụ, o mere ka o kwe omume ka ndụ bụrụ ihe dị ụtọ nke ukwuu, ihe a na-enweta ọṅụ site na ya. Iji malite, o kere ebe obibi ha bụ ụwa, wee mee ka ọ na-agbagharị agbagharị, ka o nwee ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, ka o nweekwa mbara ngwakọta ikuku nke kwesịrị nnọọ ekwesị. O mere ka e nwee usoro mmiri, ikuku nitrogen, na ikuku ndụ oxygen ndị na-arụ ọrụ n’ụzọ zuru okè maka abamuru na ntụsara ahụ nke ụmụ mmadụ. O ji ọtụtụ puku ụdị ihe ọkụkụ dị iche iche kpuchite elu ala, nke ụfọdụ n’ime ha ga-abụrụ mmadụ ihe oriri, ụfọdụ ga-abụkwa oké ihe ịma mma nye anya. O mere ka mbara igwe jupụta ná nnụnụ ndị na-enye obi ụtọ dị ukwuu site n’ụcha dị iche iche ha nwere na abụ dị iche iche ha na-abụ. O mere ka oké osimiri jupụta n’azụ, ka ala jupụtakwa n’ọtụtụ ụdị anụmanụ dị iche iche, ụfọdụ bụ anụ ọhịa, ụfọdụ bụkwa ndị a pụrụ ịzụ maka idebe n’ụlọ. Lee nnọọ oké afọ ofufo nke a bụ! Leekwa ihe àmà ọ bụ banyere obi ịdị mma nke Chineke!—Abụ Ọma 104:24.

8 Ugbu a, lee anya n’ụzọ Chineke si mee mmadụ. Ógwè aka ya, ụkwụ ya, na aka ya bụ nnọọ ihe dị mkpa iji nyere ya aka iguzozi nke ọma, ka ọ dịkwara ya mfe ijegharị ejegharị. Otú a, site n’ihe ndị a pụrụ ịchọta n’ụba n’elu ala nke dị ya gburugburu, ọ pụrụ inweta ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị ya mkpa. Jehova nyere ya ihe ndị e ji anụ ụtọ ka iri ihe na ịṅụ ihe wee ghara ịbụ ihe omume mmeghachi efu ndị a na-eme iji nweta ike—dị ka ịkwụnye ngwá ụlọ n’ebe e si enweta ike eletrik taa. Ee e, e mere ka iri ihe na ịṅụ ihe bụrụ ihe ndị na-enye ọṅụ, ebe ọ bụ na ọ bụghị nanị na ha na-emejupụta afọ, kama ha na-akpalikwa mmetụta nke ịnụ ụtọ ihe. Jehova nyere mmadụ ntị, meekwa ka ọtụtụ ụda ihe dị iche iche gbaa ya gburugburu inye ihe ndị na-atọ ntị ụtọ. Lee nnọọ ihe ụtọ ọ bụ ige ntị n’ụda mmiri iyi nta nke yiri ịgba izu nke na-eme ka ahụ dajụọ, ube nke kpalakwukwu, ma ọ bụ ịchị ọchị nke nwa a mụrụ ọhụrụ! Ee, n’ihi ịdị mma nke Chineke, n’agbanyeghị ihe ọjọọ nile ndị meworo eri mgbe o kere ihe, ọ ka bụkwa ihe ọṅụ ịdị ndụ.

9 Leekwa anya n’ike mmetụta ndị ọzọ anyị nwere. Lee ọtụtụ ụcha ihe dị iche iche dị mma ndị dịnụ iji bụrụ ihe ụtọ nye anya anyị! Leekwa ka ọ na-esi enye afọ ojuju ịnụ ísìsì ụtọ nke okooko osisi! Ka a sịkwa ihe mere onye ọbụ abụ ahụ ji tikuo Jehova mkpu, sị: “M ga-ekele gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ gị nile dị”!—Abụ Ọma 139:14.

Ọdịda na Nnapụta nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ

10. Olee ụzọ ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ siworo meghachi omume n’ịdị mma nke Chineke, ma n’agbanyeghị nke ahụ, olee ụzọ ha si nọgide na-erite uru site na ya?

10 Ọ bụ ihe mwute na mgbe oge na-aga, nne na nna anyị mbụ gosipụtara enweghị ekele maka ịdị mma nile nke Chineke n’ebe ha nọ. Ha gosiri nke a mgbe ha nupụrụ isi n’ihe Jehova nyere n’iwu wee mehie megide nanị otu mmachibido iwu ahụ o nyeworo. Dị ka ihe si na nke a pụta, ha na ụmụ ha malitere inwe iru újú, ịta ahụhụ, na ọnwụ. (Jenesis 2:16, 17; 3:16-19; Ndị Rom 5:12) N’ime ọtụtụ puku afọ ndị gabigaworo eri mgbe e mesịrị nnupụisi ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ egosiwo enweghị mmasị ma ọ bụ enweghị ekele maka ịdị mma nke Chineke. Ma n’agbanyeghị nke a, ndị na-enweghị ekele ka na-eritekwa uru site n’ịdị mma nke Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Pọl onyeozi kọwaara ndị bi na Listra n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, sị: “[Chineke ahapụghị] onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe ọ na-eme ezi ihe, na-enyekwa unu mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi unu n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.”—Ọrụ 14:17.

11. N’ụzọ dị aṅaa ka ịdị mma Chineke si mee ihe karịrị inye ihe a kpọrọ mmadụ ebe obibi mara mma?

11 Ma, ịdị mma Chineke ejedebeghị n’ịnọgide na-enye ihe ụtọ ndị na-akwado ndụ ndị jupụtara n’elu ala. Ee e, o mere ihe karịrị nke ahụ. Jehova gosiri onwe ya ịbụ onye dị njikere ịgbaghara mmehie nke ụmụ Adam, ịnọgidekwa na-akwado mmekọrịta nke ya na ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. E mere ka akụkụ nke a nke ịdị mma Chineke pụta ìhè n’ihu Mosis mgbe Jehova kwere nkwa ime ka ‘ịdị mma ya nile gabiga n’ihu [Mosis].’ Mgbe ahụ, Mosis mụtara nkwupụta okwu ahụ, bụ: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; onye na-edebere [otu puku] ọtụtụ ugbo ebere, onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.”—Ọpụpụ 33:19; 34:6, 7.

12. Ndokwa dị aṅaa dị n’Iwu Mosis gosiri ịdị mma nke Jehova?

12 N’oge Mosis, Jehova guzobere usoro iwu maka mba ọhụrụ ahụ nke bụ Israel, ebe ndị na-elezighị anya mee mmehie pụrụ inweta mgbaghara mmehie nke dabeere n’ihe ụfọdụ ma ọ bụ nke ihe atụ. Site n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke Mosis bụ onye ogbugbo ya, ụmụ Israel ghọrọ mba pụrụ iche nye Chineke, a kụzikwaara ha iche àjà anụmanụ dị iche iche n’ihu Jehova, bụ́ ndị ndị ga-ekpuchi mmehie ha na omume ha na-adịghị ọcha. Otú a, n’agbanyeghị ọdịdị ha nke na-ezughị okè, ndị Israel nwere nchegharị pụrụ ịnọgide na-abịakwute Jehova n’ụzọ a na-anara nke ọma, na-amarakwa na ofufe ha bụ ihe na-atọ ya ụtọ. Eze Devid, onye so ná mba ahụ nke dị n’okpuru Iwu ahụ, kwupụtara ọmụma ọ maara banyere ịdị mma nke Chineke n’ihe banyere nke a, sị: “Echetala mmehie nile m mehiere n’okorobịa m, ha na njehie m nile: dị ka ebere gị si dị gị onwe gị cheta m, n’ihi ịdị mma gị, Jehova.”—Abụ Ọma 25:7.

13. Olee ụzọ Jehova si mee ka e nwee ụzọ dị irè karịa àjà ụmụ anụmanụ e si na-agbaghara mmehie?

13 Ka oge na-aga, ịdị mma Jehova kpaliri ya iweta ụzọ dị irè karị, nke na-adịgidekwa adịgide karị, a ga-esi na-agbaghara mmehie. Nke a bụ site n’àjà nke Jisọs, bụ́ onye sitere n’usoro ọmụmụ Eze Devid. (Matiu 1:6-16; Luk 3:23-31) Jisọs emeghị mmehie ọ bụla. N’ihi ya, mgbe ọ nwụrụ, ndụ ya nke e jiri chụọ àjà nwere abamuru dị ukwuu, Chineke narakwara ya dị ka ihe mgbapụta nke pụrụ ịgazu ụmụ Adam nile ndị na-emehie emehie. Pọl onyeozi dere, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke; a na-ewerekwa amara ya na-agụ ha ná ndị ezi omume n’onyinye efu site ná mgbapụta ahụ nke dị n’ime Kraịst Jisọs: onye Chineke chere n’ihu ọha mmadụ ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi, site n’okwukwe e kwere n’ọbara ya.”—Ndị Rom 3:23-26.

14. Olileanya dịgasị aṅaa dị ebube ka e mere ka ha kwe ụmụ mmadụ omume inweta site n’àjà mgbapụta ahụ?

14 Inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs na-arụzuru ndị Kraịst ihe dị ukwuu, nke dị ukwuu karịa ihe àjà anụmanụ ndị ahụ a na-achụ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mezuuru ụmụ Israel. O dujere n’ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè nke ndị Kraịst ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume, ndị e jikwa mmụọ Chineke nabata ịbụ ụmụ ya. Ha si otú a ghọọ ụmụnne Jisọs, nwetakwa olileanya nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ dị ka ndị e kere eke bụ mmụọ iso ya kere òkè n’Alaeze eluigwe ya. (Luk 22:29, 30; Ndị Rom 8:14-17) Cheedị nnọọ echiche na Chineke ga-emeghe olileanya eluigwe dị otú ahụ nye ihe e kere eke ndị dị ndụ n’ime mbara ala nta nke a, bụ́ ụwa! Ìgwè nta ndị nwere olileanya nke a ka nọ ndụ. Ma nye ọtụtụ nde ndị Kraịst ndị ọzọ, inwe okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ na-emeghere ha ụzọ inweta ihe Adam na Iv tụfuru—ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs, nke yiri ubi a gbara ogige. Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nanị enweghị ike inye ndị gbasoro ya ma olileanya nke eluigwe ma olileanya nke ịdị ndụ n’elu ala n’ọdịnihu.

15. Gịnị ka ozi ọma ahụ gụnyere?

15 Lee nnọọ ka o si kwesị ekwesị na a kpọrọ ozi ahụ banyere ndokwa ọhụrụ ndị Chineke meworo site na Jisọs Kraịst ‘ozi ọma,’ n’ihi na ọ na-egosipụta ịdị mma nke Chineke. (2 Timoti 1:9, 10) N’ime Bible, mgbe ụfọdụ a na-akpọ ozi ọma ahụ ‘ozi ọma alaeze.’ Taa, ihe bụ isi dị na ya bụ eziokwu ahụ nke bụ na e guzobewo Alaeze ahụ n’okpuru ọchịchị nke Jisọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilie. (Matiu 24:14; Mkpughe 11:15; 14:6, 7) Otú o sina dị, e nwere ihe ka ukwuu ozi ọma ahụ metụtara. Dị ka okwu ahụ Pọl gwara Timoti nke a ka hotasịrị ugbu a gosiri, ọ gụnyere ịmara na Jisọs chụrụ àjà mgbapụta n’ọnọdụ anyị. E wezụga àjà ahụ, mmekọrịta anyị na Chineke nwere, nzọpụta anyị n’onwe ya—ma ya fọdụkwa Alaeze nke Jisọs na 144,000 ndị nchụaja na ndị eze ahụ e si n’elu ala weta—ga-abụ ihe na-agaghị ekwe omume. Lee nnọọ ngosipụta dị ebube nke ịdị mma Chineke àjà mgbapụta ahụ bụ!

Ịdị Mma Chineke n’Oge a

16, 17. Olee ụzọ Hosea 3:5 si mezuo (a) na 537 T.O.A.? (b) na 1919 O.A.?

16 N’ilepụ anya gaa na “mgbe ikpeazụ” ahụ, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Mmadụ ga-abụ . . . ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Timoti 3:1-3) Ọbụna ngosipụta nkịtị nke ịdị mma, dị ka imesapụ aka na ịbụ ezi onye agbata obi, bụ ihe ndị a na-agaghị enwe mmasị na ha. Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe agbamume, bụ́ amụma ahụ na-enye obi ụtọ nke Hosea 3:5: “E mesịa ụmụ Israel ga-alata, chọọ Jehova, bụ́ Chineke ha, na Devid, bụ́ eze ha; ha ga-ejikwa oké egwu bịakwute Jehova, bịaruokwa ịdị mma ya na mgbe ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.”

17 Amụma nke a nwere mmezu mbụ ya n’afọ 537 T.O.A. mgbe ndị Juu laghachiri n’Ala Nkwa ahụ site ná ndọta n’agha na Babilọn. N’oge a, ọ malitere mmezu ya n’afọ 1919 mgbe ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ si ná nzukọ Setan pụta wee jiri ịnụ ọkụ n’obi malite ịchọ Jehova na ịdị mma ya. Ha chọpụtara na Jisọs Kraịst anọworị na-achị achị dị ka “Devid, bụ́ eze ha” n’eluigwe kemgbe 1914. N’okpuru nduzi ya sitere n’eluigwe, ha ji ịnụ ọkụ n’obi malite ọrụ nke ịkpọsa ozi ọma nke a nye mba nile. Otú a, ha malitere ịrụzu ọrụ ahụ nke e mere ihe ndekọ ya na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe [nke e guzobeworo] n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”

18. Olee ndị sonyewooro ihe ahụ fọdụrụ n’Israel ime mmụọ n’ikwusa ozi ọma ahụ?

18 Taa, “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị na-ajakwa ịdị mma Jehova mma n’otu aka ahụ esonyeworo ihe ahụ fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ. (Mkpughe 7:9) Ugbu a, ihe karịrị nde mmadụ anọ na-ekwughachi ihe mmụọ ozi ahụ na-ekwu, bụ́ nke Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ ka ha na-akpọsara mba nile, sị: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.”—Mkpughe 14:7.

19. Kpọtụ aha otu n’ime ihe àmà ndị kasị ukwuu nke ịdị mma Chineke.

19 Otu n’ime ihe àmà ndị kasị ukwuu nke ịdị mma Chineke bụ na ọ na-enye anyị ohere ịbụ ndị anyị na ya na-arụkọ ọrụ n’oké ọrụ nke a. Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ ịbụ ndị e ji ntụkwasị obi nye “ozi ọma nke ebube nke Chineke dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW]”! (1 Timoti 1:11) Site n’anyị ikwusa, na-ezikwa ndị ọzọ nke a, anyị na-egosipụta ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu, mkpụrụ ahụ dị mkpa nke mmụọ Chineke, bụ́ ịdị mma. Otú a, anyị nwere àgwà yiri nke ohu Chineke oge ochie ahụ bụ Devid, onye sịrị: “Ncheta nke ịba ụba nke ịdị mma gị ka ha ga-ekwuwa, ọ bụkwa ezi omume gị ka ha ga-eti mkpu ọṅụ banyere ya.”—Abụ Ọma 145:7.

20. Gịnị ọzọ banyere ịdị mma ka a ga-atụle n’isiokwu nke na-eso?

20 Otú ọ dị, ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ ọ̀ bụ nanị ụzọ anyị ga-esi gosipụta ịdị mma ná ndụ anyị? Ọ dịghị ma ọlị! A na-agba anyị ume ịghọ “ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) A na-egosipụta ịdị mma Chineke n’ụzọ dị iche iche. N’ihi ya, ịdị mma anyị aghaghịkwa imetụta ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke ndụ anyị. A ga-atụle ụfọdụ n’ime ndị a n’ime isiokwu na-esochinụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mkpụrụ nke mmụọ ndị ahụ n’otu n’otu bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ihe okike si egosipụta ịdị mma Chineke?

◻ Ndokwa dịgasị aṅaa ka Jehova mere iji gbaghara ụmụ mmadụ nwere nchegharị mmehie ha?

◻ Ná mmezu nke Hosea 3:5, olee mgbe ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ bịakwutere Jehova na ịdị mma ya, gịnịkwa ka nke a dujere na ya?

◻ Gịnị bụ otu n’ime ihe àmà kasị ukwuu nke ịdị mma Chineke taa?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ihe okike na-enye ihe àmà nke ịdị mma bara ụba nke Chineke

[Foto dị na peeji nke 16]

Ikwe ka anyị kere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ bụ ihe àmà pụtara ìhè nke ịdị mma Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya