Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
E Mere Ka O Doo Ha Anya na Kathmandu
OTU nwanyị bụ onye ọkà n’ihe osise malitere ọchịchọ ọ na-achọ eziokwu na Brittany, France, na 1980. O sooro ndị chọọchị dị iche iche nke Pentecostal nwee mkparịta ụka dị iche iche ma mụọ banyere okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ—n’enwetaghị afọ ojuju. Mgbe ahụ o sooro otu n’ime Ndịàmà Jehova kwurịta okwu ma kwụsị n’oge na-adịghị anya. O zutere otu nwoke bụkwa onye ọkà n’ise ihe wee gaa soro ya na-arụ ọrụ ma binyere ya.
Na nwa oge mgbe nke a gasịrị, mmadụ abụọ ahụ na-alụghị di na nwunye kpebiri ịga njem nleta na Nepal. Ọ masịrị ha nke ukwuu bụ ịma mma na udo nke dị n’ala ahụ, ma ha nwere nkụda mmụọ n’ihi usoro ịkpa ókè nke ọkwá mmadụ nọ na ya, bụ́ nke na-ezighị ezi n’ụzọ ha si ele ihe anya dị ka ndị ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.
Mgbe ha lọghachitere France, nwanyị ahụ tụụrụ enyi ya aro ka ha mụkọọ Bible ọnụ. Ọ bụkwaara ya ihe ịtụnanya na o kwere. Ha kpọrọ Onyeàmà ahụ onye nke nwanyị sowooro nwee mkparịta ụka afọ abụọ tupu mgbe ahụ. Ná mmalite, ha ji nanị Bible mee ihe, ma n’ikpeazụ, ha kweere iji akwụkwọ ahụ bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, e mesịakwa, akwụkwọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, mee ihe. Tupu otu afọ agwụsịa, ha kwụsịrị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.
Mgbe ha mesịrị nleta ọzọ na Nepal ruo ọnwa abụọ, mmadụ abụọ ahụ lọghachitere France ebe ha nọgidere na-amụ Bible. Ha kwụsịrị ise siga na ịga n’ụlọ ịṅụ mmanya na ụlọ oriri na ọṅụṅụ ndị a na-anọru ime abalị, ma malite ịbịa nzukọ Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, mgbe ha mụsịrị akwụkwọ Ịdị Ndụ, ha kpebiri ịkwụsị ọmụmụ ihe.
Ha gaghachikwara ọzọ na Nepal, bụ́ ebe ha biri n’ụlọ nta dị na ndịda Ugwu Himalaya. Otu ụbọchị, otu nwoke meworo okenye onye yi uwe kootu ma kpọọ taị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ha. Nwanyị ahụ nọ nanị ya n’ụlọ, o chekwara na onye ahụ aghaghị ịbụ onye na-azụ ahịa ihe osise nke na-abịa ịhụ ihe ndị ha sere. Ọ bụụrụ ya ihe ịtụnanya na onye ahụ bụ Onyeàmà nke bịara ịnọchite anya onye ahụ duziwooro ha ọmụmụ ihe na France. N’oge na-adịghị anya onye ya na ya bi lọtara. Mkparịta ụka were hour abụọ sochikwara.
Ụbọchị ole na olekwa n’ihu, mmadụ abụọ ahụ bịara nzukọ Ndịàmà Jehova na Kathmandu, ịdị ọcha nke ndị bịara n’ebe ahụ masịkwara ha nke ukwuu. Ha hụkwara otu ịhụnanya ụmụnna na obi ụtọ ahụ ha hụworo ná nzukọ ndị ha gara na France. Ha hụkwara ịdị n’otu nke ndị Nepal nọ n’ebe ahụ, ọ bụrịị ezie na ndị a sitere n’ọkwá dịgasị iche iche. Ugbu a, obi esiwo ha ike na nke a aghaghị ịbụ nzukọ Jehova.
N’otu ọnwa na-esochi, ha lọghachiri France ma malite ọmụmụ Bible ha ozugbo na ịbịa nzukọ dị iche iche. Ha lụrụ di na nwunye, malite ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà ahụ, ma mesịa mee baptism. Onye ahụ bụ di bụzi ohu na-eje ozi ugbu a, nke nwunye na-ekerekwa òkè site n’oge ruo n’oge n’ọrụ ọsụ ụzọ nwa oge. N’eziokwu, mmụọ Jehova ga-enyere ndị nwere ezi ọnọdụ nke obi aka inwe ọganihu na ịghọ ndị na-efe ya.—Mkpughe 7:15-17.
[Igbe/Map dị na peeji nke 9]
NEPAL
Ọnụ ọgụgụ Ndị Bi ná Mba - 17,712,221
Ọnụ Ọgụgụ Kasị Elu nke Ndị Nkwusa na 1990 - 63
Nkezi 1 Onye Nkwusa Maka - 281,146
Ngụzi nke Ndị Ọsụ Ụzọ - 10
Ọnụ Ọgụgụ Ọgbakọ - 1
Ngụzi Ọmụmụ Bible - 107
Ndị Bịara Ememe Ncheta - 220
[Map]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
NEPAL
INDIA
[Foto dị na peeji nke 9]
Ọgbọ ahịa nke dị na Kathmandu, Nepal