‘Iji Anya Mmiri Na-agha Mkpụrụ Ma Jiri Mkpu Ọṅụ Na-ewe Ihe Ubi’
Dị ka Miyo Idei si kọọ
“Anwụọla m oo! Anwụọla m oo! Nyerenụ m aka oo!” Nna m na-agbalịsi ike iti mkpu. Nanị ihe a na-anụ n’ebe nile bụ olu ya ka m si n’ụlọ na-agbapụta. Ọ bụ n’ime abalị, nna m nwere obi nkụchi. Agbagara m n’ụlọ nwanne nna m nke nwoke, bụ́ onye bi n’ebe dị nso, ma mgbe anyị na-alọghachite, nna m akwụsịwo iku ume.
NKE ahụ mere na December 14, 1918. N’afọ ndụ nke 13, aghọrọ m onye na-enwekwaghị nne na nna. Nne m anwụworị mgbe m ka dị afọ asaa. N’ihi ịbụ onye nne na nna ya nwụnahụrụ mgbe m ka bụ nwata, amalitere m iche, sị, ‘N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji anwụ? Gịnị na-eme mgbe mmadụ nwụsịrị?’
Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a na-azụ ndị nkụzi, aghọrọ m onye nkụzi na Tokyo ma kụzie na Shinagawa Elementry School. Ka oge na-aga, otu enyi m mere ka m zute otu nwa okorobịa, bụ́ Motohiro, onye lụrụ m mgbe m dị 22 afọ. Kemgbe 64 afọ gara aga, anyị ekerịtawo ma ahụmahụ ndị na-atọ ụtọ ma ndị na-elu ilu e nwere ná ndụ. N’oge na-adịghị anya, anyị kwagara Taiwan, nke nọ n’okpuru ọchịchị ndị Japan na mgbe ahụ. N’oge ahụ, amataghị m na m ga-enwe ihe ga-ewetara m iti mkpu ọṅụ n’ala ahụ.
Ịmụ Eziokwu Ahụ
N’oge opupu ihe ubi nke 1932, mgbe anyị bi n’ebe mpụga nke Chiai, nke dị n’ebe etiti Taiwan, otu nwoke aha ya bụ Saburo Ochiai bịara n’ụlọ anyị. O mere ka ọ pụta ìhè na amụma Bible dị iche iche gụnyere nkwa maka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) Lee ọdịnihu mara mma nke ahụ bụ! Achọsiri m ike ịhụ nne na nna m ọzọ. Site n’ịrụ ụka ọgụgụ isi dị na ya, nkọwa ndị ezi uche dị na ha, na ihe àmà siri ike ndị dabeere na Bible, okwu ya nwere ihe na-egosi na ọ bụ eziokwu. Oge gafere ngwa ngwa ka anyị nọ ogologo ụbọchị ahụ nile na-akparịta ụka site na Bible. Na mberede, Bible ghọrọ akwụkwọ na-adọrọ mmasị nye m.
N’oge na-adịghị anya, maazị Ochiai kwagara n’ebe ọzọ, na-ahapụrụ anyị akwụkwọ ndị dị ka Creation, Harp of God, Government, Prophecy, Light, na Reconciliation, bụ́cha akwụkwọ Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Etinyere m oge m nile n’ịgụ ha, ka m na-emekwa otú ahụ, enwere m mkpali nke ịgwa ndị ọzọ ihe m na-agụ. Ọ bụrụ na Jisọs malitere ozi ya n’obodo nke aka ya bụ Nazaret, n’ihi gịnị ka m na-agaghị eji malite n’ebe m bi? M gara n’ụlọ onye bi n’ọnụ ụzọ na-esote nke m. Ọ dịbeghị onye ọ bụla kụziiri m otú e si ekwusa ozi ọma, ya mere m ji Bible na akwụkwọ ndị ahụ m gụworo gaa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-eme nkwusa n’ụzọ kachasị mma m nwere ike. Ndị mmadụ meghachiri omume n’ụzọ dị mma ma nara magazin. Arịọrọ m Todaisha nke bụ aha a na-akpọ Watch Tower Society na Japan n’oge ahụ, ka ha zitere m 150 akwụkwọ nta ahụ a na-akpọ The Kingdom, the Hope of the World, ekesakwara m ha.
Otu ụbọchị, otu onye narawooro akwụkwọ ọgụgụ gwara m na ndị uwe ojii bịara ozugbo m lasịrị ma bukọrọ akwụkwọ ahụ nile. Nwa oge nta mgbe nke ahụ gasịrị, ndị uwe ojii anọ na-eme nchọpụta bịara n’ụlọ m ma bukọrọ akwụkwọ na magazin m nile. Ha hapụrụ nanị Bible. Ruo afọ ise, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị Jehova m zutere, ma ịnụ ọkụ n’obi m na ọchịchọ maka eziokwu ahụ anyụghị mgbe ọ bụla.
E mesịa, December 1937 bịara! Ndị ọsụ ụzọ oge nile abụọ si Japan bịara ileta anyị. N’ịbụ onye nke a tụrụ n’anya, ajụrụ m, sị: “Olee otú unu si mata banyere anyị?” Ha sịrị: “Anyị ji aha unu n’ebe a.” Jehova echetawo anyị! Ndịàmà abụọ ahụ, Yoriichi Oe na Yoshiuchi Kosaka agbarawo ịnyịnya ígwè ndị meworo ochie gaa ihe ruru 150 maịlụ site Taipei ruo Chiai, na-ekeli ngwongwo ha elu n’azụ ịnyịnya ígwè ndị ahụ. Ka anyị na ha na-ekwurịta okwu, enwere m mmetụta dị ka nke onye ọnọzi Etiopia ahụ nke sịrị: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?” (Ọrụ 8:36) N’abalị ahụ ha bịara, e mere ma mụ onwe m ma di m baptism.
Ilekọta Ụmụnna Ndị A Tụrụ Mkpọrọ
Na 1939, na mberede a malitere ijide ọtụtụ Ndịàmà Jehova na Japan nile. Ikuku nke mkpagbu ahụ rutere Taiwan n’oge na-adịghị anya. N’April e jidere ma Nwanna Oe ma Nwanna Kosaka. Ọnwa abụọ n’ihu, e jidekwara anyị. Ebe m bụ onye nkụzi, a hapụrụ m n’echi ya, ma e jigidere di m n’ụlọ mkpọrọ ruo ọnwa atọ. Mgbe a tọhapụsịrị di m, anyị kwagara Taipei. Ebe anyị bizi ugbu a dị nso n’ụlọ mkpọrọ ebe e debere ụmụnna abụọ ndị ahụ, nke a rụrụ nnọọ ọrụ nke ọma.
Ụlọ mkpọrọ Taipei Prison bụ ebe a na-elegide ndị mkpọrọ anya n’esepụghị aka. Eweere m ákwà na nri gaa ileta ụmụnna ndị ahụ. Nke mbụ, Nwanna Kosaka pụtara na window dị 12-inch n’ogologo na uhie nke e ji okporo ígwè ndị gara ogologo na uhie rụchie, otu onye nche na otu onye uwe ojii na-eme nchọpụta sokwa ya n’azụ. O yiri ozu, egbugbere ọnụ ya abụọ na-achakwa ọbara ọbara dị ka mkpụrụ osisi strawberry ka chara nnọọ acha. O butewo ụkwara nta.
Mgbe ahụ Nwanna Oe pụtara na-enwe ihu ọchị, jiri obi ụtọ na-ekwughachi ugbo ugbo, sị: “Ọ dị nnọọ mma na ị bịara.” Ebe ọ bụ na ihu ya na-acha odo odo ma zaa aza, ajụrụ m ya maka ahụ ike ya. “Ahụ dị m nnọọ!” ka ọ zara. “Ebe a mara mma nke ukwuu. Chịnchị ma ọ bụ igwú adịghị n’ebe a. Apụrụ m ọbụna iri achịcha e ji mkpụrụ osisi buckwheat mee. Ebe a dị nnọọ ka ebe obibi ndị ukwu,” ka ọ sịrị. Onye uwe ojii na onye nche ahụ apụghị ijide ọchị ha, ha kwukwara, sị: “Oo, anyị apụghị imeri nwoke a bụ Oe.”
Ịtụ Mkpọrọ Ọzọ
N’ihe dị ka ime abalị na November 30, 1941, bụ́ ụbọchị ole na ole mgbe m lọghachitesịrị ná nleta m gara ileta ụmụnna ahụ, a kụsiri aka ike n’ọnụ ụzọ m. Esi m n’ibo ụzọ ahụ e ji enyo mee, hụ elu elu okpu ndị dị ka ugwu. Agụtara m na ha dị asatọ. Ha bụ ndị uwe ojii. Ha ji ike nubata n’ime ụlọ anyị ma kpugharịa ihe nile dị n’ụlọ ahụ ihu, ma ọ dịghị ihe ha hụrụ. Mgbe otu hour nke ịwagharị n’ebe ahụ gasịrị, ha chịịrị album ole na ole ndị e ji etinye foto ma gwa anyị sochie ha. Echetaghachiri m na e jidere Jisọs n’ime abalị. (Matiu 26:31, 55-57; Jọn 18:3-12) Echiche nke ndị ikom asatọ inye onwe ha nsogbu nke ukwuu banyere anyị abụọ n’ihi ihe na-enweghị isi tọrọ m ọchị.
A kpọgara anyị n’otu ụlọ anyị na-amaghị nke buru ibu nke ukwuu ma gbaa ọchịchịrị. Anyị mesịrị chọpụta na ọ bụ ụlọ mkpọrọ Taipei Hichisei Prison. Anyị nọdụrụ ala n’ihu otu nnukwu table, a malitekwara ịjụ anyị ajụjụ. Ọtụtụ ugbo, ha jụrụ, sị: “Ònye ka ị maara?” anyị na-azaghachikwa n’otu n’otu, sị: “Amaghị m onye ọ bụla.” Olee otú anyị pụrụ isi mara ụmụnna ndị bi n’ime Japan? Anyị maara nanị Nwanna Oe na Nwanna Kosaka, anyị akpọghịkwa aha ọ bụla ná ndị anyị pụrụ ịnụworị ná mkparịta ụka.
N’oge na-adịghị anya, elekere ise nke ụtụtụ kụrụ, ndị uwe ojii abụọ na-eme nchọpụta kpọkwaara m gaa n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nke m. O were oge ụfọdụ tupu gburugburu ebe ọhụrụ ahụ amara m ahụ. Na nke mbụ ná ndụ m, chịnchị tara m. Ụmụ ahụhụ nta ndị a uche ha bụ iji onye ka bịara ọhụrụ mere nri nyere m nsogbu nke ukwuu n’esepụghị aka, na-ahapụ ndị inyom abụọ ndị ọzọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ—n’agbanyeghị na m na-egwepịa ndị nke aka m ruru. N’ikpeazụ akwụsịrị m ma kwere ka ha jiri m mere nri.
Nri anyị bụ otu iko osikapa na-egheghị eghe nke dị ka akamụ, ma n’ọnụ m ọ nọgidere na-adị ka osikapa a na-esighị esi. Ihe e sikọtara ya na osikapa ahụ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke akwụkwọ a na-akpọ daikon (akwụkwọ nri ndị Japan a na-akpọ radish) nke nnú dị na ya, bụ́ nke mkpụrụ ájá ndị dị nta ka dịkwa na ha. Na mbụ, n’ihi na nri ahụ nwere ísìsì ọjọọ ma dị unyi, apụghị m ịnabata ya, ndị ọzọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na-abịakwa rie ya. N’ezie, eji m nke nta nke nta nabata ọnọdụ ahụ iji nwee ike ịdị ndụ.
Ndụ a na-adị n’ụlọ mkpọrọ dị njọ nke ukwuu. N’otu mgbe, anụrụ m olu otu nwoke, onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye nledo, ka ọ na-eti mkpu site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị n’ihi ịbụ onye a na-emekpa ahụ. Ahụkwara m otu onye n’ụlọ mkpọrọ na-esote nke m, onye nwụrụ n’ihe mgbu. N’ihi ihe ndị a nile m na-ahụ ka ha na-eme, echesiri m ike na usoro ihe ochie nke a aghaghị ịbịaru ná njedebe ya, olileanya m nwere ná nkwa nile nke Chineke sikwara ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
Ịjụ Ajụjụ Ọnụ
A kpọchiri m n’ụlọ mkpọrọ ruo ihe dị ka otu afọ ma jụọkwa m ajụjụ ọnụ ugboro ise. Otu ụbọchị, otu onye ọrụ ụlọ ikpe bịara nke mbụ ya, e dukwaara m gaa n’otu ụlọ dị mkpagide ebe a na-anọ ajụ ajụjụ. Ihe mbụ o kwuru bụ: “Ònye ka ukwuu, Amaterasu Omikami [bụ́ chi nwanyị nke anyanwụ] ka ọ bụ Jehova? Gwa m!” Echere m echiche nwa oge otú m ga-esi zaghachi.
“Gwa m onye ka ukwuu, ma ọ bụghị ya, m ga-eti gị ihe!” Ọ nọ na-ele m anya ná mwute.
Eji m olu dị nro zaghachi, sị: “N’isi mmalite nke Bible, e dere, sị, ‘Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.’” Echeghị m na ọ dị mkpa ịtụkwasị ihe ọ bụla ọzọ. O legidere m anya n’ihu n’ekwughị okwu ma gbanweekwa isiokwu ahụ.
E kwuwerị, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji debe m n’ụlọ mkpọrọ? Ihe ndekọ nnwale e nwere kwuru, sị: “A tụrụ ụjọ na ọ pụrụ iduhie ọha mmadụ site n’okwu na omume ya.” Nke a bụ ihe mere e ji kpọchie m n’ekpeghị m ikpe.
Jehova nọ m nso mgbe nile mgbe m na-ezute ihe ndị a. Site n’ebere Jehova, e wetaara m Akwụkwọ nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke na-aba n’akpa uwe. Otu onye uwe ojii na-eme nchọpụta tụbatara ya n’ime ụlọ mkpọrọ m otu ụbọchị, na-asị: “Aga m enye gị nke a.” Agụrụ m ya kwa ụbọchi ruo n’ókè nke iburu ihe m na-agụ n’isi. Ihe nlereanya dị iche iche nke atụghị egwu, nke ndị Kraịst oge gboo n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi ghọrọ isi iyi ukwu nke agbamume. Akwụkwọ ozi 14 ndị ahụ nke Pọl mesikwara m ike. Pọl zutere mkpagbu nke ukwuu gabiga ókè, ma mmụọ nsọ kwadoro ya mgbe nile. Ihe ndekọ ndị dị otú ahụ mere ka m sie ike.
Atara m ahụ nke ukwuu ma dị nro, ma Jehova letara m, n’ụzọ ndị m na-atụghị anya ha mgbe mgbe. N’otu Sunday, otu onye uwe ojii na-eme nchọpụta m na-ahụtụbeghị mbụ, ji otu ngwugwu e kechiri na hankachif bịa. O mepere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ ma kpọrọ m pụọ na gburugburu ebe ahụ. Mgbe anyị bịara n’okpuru otu osisi ukwu a na-akpọ camphor, o mepere ngwugwu ahụ. Ma lee! Unere na akara dị n’ime ya. Ọ gwara m ka m nọrọ n’ebe ahụ rie ha. Onye ahụ na-eme nchọpụta kwuru, sị: “Unu nile bụ ndị ezi mmadụ. Ma anyị na-emeso unu omume ọjọọ dị otú a. Aga m ahapụ ọrụ a n’oge na-adịghị anya. Ndị nche na ndị uwe ojii ahụ na-eme nchọpụta malitere imeso m omume obi ọma. Ha tụkwasịrị m obi ma na-ekwe ka m hichaara ha ụlọ ha, na-enyekwa m ụdị ọrụ ndị ọzọ ùgwù dị na ha.
Ná ngwụsị nke 1942, otu n’ime ndị ahụ na-eme nchọpụta bụ́ ndị jidere anyị kpọrọ m ka m bịa. “Ọ bụ ezie na i kwesịrị ka a maa gị ikpe ọnwụ, anyị ga-atọhapụ gị taa,” ka o kwuru. Di m alaworị ihe dị ka otu ọnwa tupu a tọhapụ m.
Ime ka Mkpakọrịta Mụ na Ndịàmà Dịghachi Ọhụrụ
Mgbe anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ, Japan banyere n’Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe ahụ, na 1945, anyị nụrụ na e meriwo Japan n’agha ahụ, anyị gụkwara n’akwụkwọ akụkọ na a ga-atọhapụ ndị nile a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị maara na Nwanna Kosaka anwụwo n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ọrịa ya, ma m mere ngwa ngwa ziga akwụkwọ ozi n’ụlọ mkpọrọ dị na Taipei, Hsinchu, na obodo ndị ọzọ iji jụọ maka Nwanna Oe. Otú ọ dị, anataghị m nzaghachi ọ bụla. Emesịrị m chọpụta na e gbuwo Nwanna Oe site n’ịgbagbu ya n’ihu ọha.
Na 1948 anyị natara akwụkwọ ozi si Shanghai na mberede. O sitere n’aka Nwanna Stanley Jones, onye e zigaworo China site na Gilead, bụ́ ụlọ akwụkwọ e guzobere ọhụrụ maka ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova. Jehova echetawo anyị ọzọ! Enwebigara m obi ụtọ ókè isoro nzukọ Jehova nwee mmekọrịta dị otú a. Afọ asaa agafewo kemgbe anyị hụrụ Nwanna Oe. Ọ bụ ezie na anyị nọ n’ebe dịpụrụ nnọọ iche n’oge ndị ahụ nile, anọgidewo m na-agwa ndị ọzọ banyere ozi ọma ahụ.
Mgbe Nwanna Jones bịara ileta anyị nke mbụ ya, ọ bụ oge ọṅụ. O nwere nnọọ omume enyi. Ọ bụ ezie na anyị ezutebeghị ya mbụ, o yiri nnọọ ka à ga-asị na anyị na-anabata ezigbo onye ikwu anyị n’ụlọ anyị. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, Nwanna Jones hapụrụ gawa T’ai-tung, n’ofe nke ọzọ nke ugwu ndị ahụ, ya na di m dị ka onye na-asụgharịrị ya okwu. Ha lọghachitere mgbe ihe dị ka otu izu gasịrị, bụ́ oge ha jiworo nwee mgbakọ otu ụbọchị ma mee ihe dị ka 300 ndị agbụrụ Amis bi n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ osimiri baptism.
Nleta nke Nwanna Jones baara m uru n’ụzọ ọzọ. Anọgidewo m na-eje ozi ọma nanị m ruo mgbe ahụ. Ugbu a e nwekwara di na nwunye ọzọ e mere baptism n’oge nleta Nwanna Jones, onye ahụ bụ di bụkwa onye nwe ụlọ anyị bi na ya. Kemgbe ahụ, enwetawo m ọṅụ nke ime ndị na-eso ụzọ ọtụtụ mgbe, tụkwasị n’ọṅụ nke ịkpọsa Alaeze ahụ. E mesịa, anyị kwagara Hsinchu, bụ́ ebe Nwanna Jones bịara leta anyị ugbo atọ, na-anọ izu abụọ na nke ọ bụla ọ bịara. Enwetara m ọṅụ nke ukwuu ná mkpakọrịta ahụ na-aba uru. Ná nleta nke ikpeazụ ya, ọ sịrị: “Na mgbe ọzọ, m ga-akpọ onye òtù m, bụ́ Harold King bịa.” Ma “mgbe ọzọ” ahụ abịaghị ma ọlị, n’ihi na nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, a tụrụ ha abụọ mkpọrọ na China.
Na 1949, Joseph McGrath na Cyril Charles, bụ́ ndị ozi ala ọzọ si na klasị nke 11 nke ụlọ akwụkwọ Gilead bịarutere Taiwan. Ha wusawanyere ọrụ ahụ na Taiwan, jiri ụlọ anyị na-eme ihe dị ka isi ụlọ ọrụ. Ahụmahụ ha gbara m ume. Otú ọ dị, ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere rụgidere ha ịkwapụ gaa Hong Kong. Apụghị m ijidelata anya mmiri m ka ha na onye uwe ojii so na-apụ. “Ebela ákwá, Miyo,” ka Joe kwuru. O kwukwara, sị: “I meela,” ma nye m mkpịsị akwụkwọ ya nke na-ede ihe nke ọma dị ka ihe ncheta.
Iche Ịzụlite Nwa Ihu
Mụ na di m amụtaghị ụmụ ọ bụla, ya mere anyị kpọọrọ nwa nwanne di m mgbe ọ dị ọnwa anọ. Ndụ nne ya nọ n’ihe ize ndụ n’ihi ọrịa ụkwara asthma.
Na 1952, Nwanna Lloyd Barry, bụ́ onye na-eje ozi ala ọzọ na Japan bịara Taiwan ịchọ nkwado iwu maka ọrụ Ndịàmà Jehova. Ọ nọnyeere anyị ma gbaa anyị ume nke ukwuu. N’oge ahụ, nwa anyị nwanyị eruwo ọnwa 18. O kuuru ya ma jụọ ya, sị: “Gịnị bụ aha Chineke?” N’ịbụ onye nke a juru anya, ajụrụ m ya, sị: “Ị̀ na-ekwu na anyị kwesịrị izi ya ihe mgbe ọ ka bụ nnọọ nwata?” “Eenụ,” ka ọ zaghachiri. Mgbe ahụ o gwara m okwu banyere ịdị mkpa nke ịzụ nwata site n’oge ọ ka dị nnọọ nta. Okwu ndị o kwuru bụ́: “Ọ bụ onyinye sitere n’aka Jehova maka ịkasi unu obi,” rapagidesiri ike n’uche m.
Ozugbo, amalitere m ịzụ nwa m nwanyị, bụ́ Akemi, ịmara na ịhụ Jehova n’anya na ịghọ onye na-ejere ya ozi. Akụziiri m ya okwu ndị na-anọchite anya ụda olu na-amalite ná mkpụrụ okwu atọ ndị bụ e, ho, na ba ndị mejupụtara okwu ahụ bụ “Ehoba,” ma ọ bụ Jehova, n’asụsụ Japanese. Mgbe ọ na-erula afọ abụọ, ọ malitere ịghọta ihe ndị m na-agwa ya. Ya mere n’abalị ọ bụla tupu ọ labaa, m na-akọrọ ya akụkọ Bible. Ọ na-eji mmasị gee ntị ma cheta ha.
Mgbe ọ dị afọ atọ na ọkara, Nwanna Barry bịara ọzọ ma nye Akemi Bible e dere n’ụdị nkwurịta okwu nke asụsụ Japanese. O ji Bible ahụ na-agagharị n’ime ụlọ ahụ, na-asị: “Bible Akemi! Bible Akemi!” Mgbe ahụ, minit ole na ole n’ihu, o kwuru, sị: “Bible Akemi enweghị Jehova! Achọghị m nke a!” Ọ tụhapụrụ ya n’ala. Ná mgbagwoju anya, atụlere m ihe dị n’ime ya. Nke mbụ, m sapara Aịsaịa isi 42, amaokwu 8. N’ebe ahụ, e ji okwu bụ “Onyenwe anyị” dochie aha Jehova. Agara m n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ, ma apụghị m ịhụ aha Chineke, bụ́ Jehova. E mere ka obi jụrụ Akemi mgbe m gosikwara ya ọzọ aha Jehova site na Bible ochie m, bụ́ nke e dere n’asụsụ Japanese ochie.
Ịlaghachi Japan
Anyị laghachiri Japan na 1958 ma sonyere Ọgbakọ Sannomiya nke dị na Kobe. N’ihi inwe ọtụtụ ihe mere m ga-eji nwee obi ekele n’ebe Jehova nọ, achọrọ m igosipụta obi ekele ahụ site n’ịghọ onye ọsụ ụzọ—onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ejesiri m ozi ike n’ozi ọsụ ụzọ ahụ. N’ihi nke a, eduziri m ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi ma detụ ọṅụ nke inyere 70 ruo 80 ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu ahụ ire. Ọbụna na enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche n’otu oge, na-arụta ihe ruru 150 hour kwa ọnwa n’ubi, ebe m na-eletakwa di m na nwa m nwanyị.
Ebe anyị biworo na Taiwan ruo ihe karịrị 30 afọ, ibi na Japan bụụrụ anyị oké mgbanwe n’ụzọ ime ihe, ezutekwara m ọtụtụ ahụmahụ ndị na-anwa mmadụ ọnwụnwụ. N’oge ndị dị otú ahụ, Akemi ghọrọ onye nkasi obi na onye nkwado m, dị nnọọ ka Nwanna Barry gwaworo m ọtụtụ afọ gara aga. Mgbe m nwere nkụda mmụọ, ọ ga-agwa m, sị: “Mama, nwee obi ike. Jehova ga-emeghe ụzọ mgbapụ.” “Ee, ọ ga-eme, ka ọ̀ bụ na ọ gaghị?” ka m ga-azaghachi ma makụsie ya ike. Lee nnọọ ụzọ inweta agbamume nke a bụ! Olee ihe m pụrụ ime ma ọ bụghị ikele Jehova!
Inyefe Jehova Nwa m Nwanyị
Akemi ghọrọ onye nkwusa mgbe ọ dị afọ 7 ma mee baptism mgbe ọ dị afọ 12, n’oge okpomokụ nke 1963. Agbalịrị m iwepụta oge dị ukwuu ruo ókè o kwere mee ịnọnyere ya. (Deuterọnọmi 6:6, 7) E nwere oge ụfọdụ nke ihe isi ike mgbe ọ nọ n’oge uto, ma site n’ezi ihe nlereanya na agbamume nke ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche e zitere n’ọgbakọ anyị, Akemi mesịrị mee ya ihe mgbaru ọsọ ya, bụ́ ije ozi ọsụ ụzọ n’ókèala ndị mepere ọhụrụ.
Ná mgbakọ distrikt nke 1968, o mere akụkụ ihe omume nke ada Jefta n’ihe nkiri Bible. Ka m na-ekiri ihe nkiri ahụ, ekpebiri m dị ka Jefta mere, inyefe nanị otu nwa m nwanyị, onye m nweworo mmasị dị ukwuu n’ebe ọ nọ ruo mgbe ahụ n’aka Jehova ije ozi oge nile. Olee otú ndụ ga-adị ma nwa m nwanyị anọghị m nso? Ọ bụ ihe ịma aka, ebe m karịworo 60 afọ.
Na 1970 oge ruru ka ada anyị hapụ anyị. Ọ naara ike n’aka di m ma jee Kyoto ije ozi dị ka ọsụ ụzọ. N’ịghọta mmetụta ndị anyị na-enwe, ọ nọ n’oké ihe mgbu nke obi ka ọ na-ahapụ anyị. Ehotara m Abụ Ọma 126:5, 6 dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ nke iji sị ya gaa nke ọma: “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi. Onye na-ebu njuaka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụ ezie na ọ na-eje ije na-akwa ákwá, ma ọ ghaghị iwere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile.” Okwu ndị a ghọọrọ ọbụna mụ onwe m ndị na-emesi obi ike.
Akemi mesịrị lụọ di ma nọgidekwa n’ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche, ya na di ya. Kemgbe 1977, mgbe a họpụtara di ya dị ka onye nlekọta sekit, ha ejewo ozi n’ọrụ ngagharị ahụ. Ana m agbasapụ map mgbe nile ma soro nwa m nwanyị “mee njem” na map ahụ. Ọ bụ ihe na-amasị m nke ukwuu ịnụ ahụmahụ ha ma mata ọtụtụ ụmụnna ndị inyom site n’aka nwa m nwanyị.
Adị m 86 afọ ugbu a. Ụbọchị ndị gafere agafe dị nnọọ ka otu nche n’abalị. Apụghị m ime ihe ruo n’ókè m na-eme na mbụ, ma ozi ubi ka na-ewetara m ọṅụ. Mgbe m tụgharịrị uche na 60 afọ ndị gafeworo kemgbe m matara eziokwu ahụ, nkwa na-emesighachi obi ike nke Chineke na-emetụ m n’obi. Ee, Jehova, bụ́ onye ga-eme ihe n’iguzosi ike n’ihe n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe nọ na-ekwe ka anyị weta ọṅụ dị ukwuu dị ka ihe ubi.—Abụ Ọma 18:25.