Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 1/1 p. 22-24
  • Ị̀ Na-enwe Ekele n’Ezie Maka Ngọzi Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-enwe Ekele n’Ezie Maka Ngọzi Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Na-enye Ihe Na-enweghị Atụ
  • Ngọzi Ndị Na-eme Anyị Ọgaranya
  • Iji Ndidi Na-echere Jehova
  • Chọọ Ngọzi Ya
  • ‘Iji Anya Mmiri Na-agha Mkpụrụ Ma Jiri Mkpu Ọṅụ Na-ewe Ihe Ubi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ọṅụ Ndị Dị n’Ije Ije n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • ‘Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 1/1 p. 22-24

Ị̀ Na-enwe Ekele n’Ezie Maka Ngọzi Jehova?

KENICHI, otu nwa amadị katatụrụ ahụ, gara ebe a na-ere ọgwụ ịzụta ọgwụ maka obere ahụ ọkụ. Mgbe ọ ṅụrụ ọgwụ ahụ, ahụ ya anabataghị ọgwụ ahụ wee ghaa ya ọkọ na etuto na-agba mmiri n’ahụ ya nile. N’ụzọ na-ejughị anya, Kenichi bidoro inwe obi abụọ ma onye ahụ na-ere ọgwụ ò lebaara mkpa ya anya nke ọma.

Ụfọdụ pụrụ iwere Jehova Chineke otú ahụ Kenichi si were onye ahụ na-ere ọgwụ. Ha na-enwe obi abụọ na Chineke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, nwere mmasị n’ezie n’ebe anyị nọ n’otu n’otu. Ọ bụ ezie na ha na-anakwere na Chineke dị mma, obi esighị ha ike na ọ na-eche banyere anyị n’otu n’otu. Nke a na-abụkarị eziokwu mgbe ihe na-agazighịrị ha nke ọma ma ọ bụ mgbe nsogbu ndị siri ike na-esochi nrapara ha na-arapara n’ụkpụrụ Bible. N’ihi enweghị nghọta, ha na-ele nsogbu ha anya, dị ka ọkọ na etuto ahụ Kenichi malitere inwe na mberede, dị ka a ga-asị na n’ụzọ ụfọdụ ha si Chineke n’aka.—Ilu 19:3.

A gaghị eji Jehova tụnyere mmadụ na-ezughị okè. A kpaara ihe ọmụma na ike mmadụ ókè. Ha na-ada n’ịmatazu mkpa nke ndị ọzọ n’ezie, dị ka onye resịrị Kenichi ọgwụ dara. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ dịghị ihe Jehova na-adịghị ahụta. Jehova na-enyere anyị aka ọtụtụ oge mgbe anyị na-adịghị ama ma na-aghọta ya n’ihi na anyị nwere omume nke ilekwasị anya n’ihe anyị na-enweghị ma leghara ọtụtụ ngọzi anyị nwere anya. Kama ime ngwa ịta Jehova ụta maka nsogbu ọ bụla anyị chere ihu, anyị kwesịrị ịgbalị ịhụta ngọzi ndị sitere n’aka Jehova ndị anyị na-anụ ụtọ ha.

Dị ka Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary si kwuo, a pụrụ ịkọwa “ngọzi” dị ka “ihe dị mma maka obi ụtọ ma ọ bụ ọdịmma.” Ị̀ ghọtara na ọ dị otú a karịsịa n’ebe ngọzi ndị sitere n’aka Jehova dị?

Onye Na-enye Ihe Na-enweghị Atụ

Mgbe nwanyị sịrị na di ya bụ ezi onye na-enye ihe, ihe ọ na-ekwu n’ozuzu ya bụ na ọ na-egbo mkpa ezinụlọ ahụ n’ụzọ zuru ezu, na-enye ihe oriri zuru ezu, ụlọ na ákwà maka obi ụtọ na ọdịmma nke ezinụlọ ahụ. Ruo ókè hà aṅaa ka Jehova bụ ezi Onye Na-enye anyị ihe? Lerukwuo mbara Ụwa anyị, ebe obibi mmadụ anya. Ọ dị kilomita 150,000,000 site n’anyanwụ, kpọmkwem ịdị anya kwesịrị ekwesị maka ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị mma na-eme ka e nwee ike inwe ndụ n’ụwa. E mere ndalaga otu akụkụ nke ụwa anyị nke dị 23.5 degree n’ụzọ dị mma, na-akpata inwe oge dịgasị iche iche ndị na-atụnye ụtụ n’ụbara ihe ubi. N’ihi ya, elu ala na-enye ihe karịrị ijeri mmadụ ise nri. Jehova bụ n’ezie Onye Na-enye ihe dị ebube!

Ọzọkwa, Bible na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova nwere mmasị miri emi n’ebe anyị nọ n’otu n’otu na n’ọdịmma anyị. Cheedị nnọọ, Jehova maara nke ọ bụla n’ọtụtụ ijeri kpakpando n’aha, ọ dịghịkwa ọbụna otu egwele na-ada n’ala ọ ghara ịma. (Aịsaịa 40:26; Matiu 10:29-31) Lee ka o si na-eche nnọọ karị banyere ụmụ mmadụ bụ́ ndị hụrụ ya n’anya, ndị e jikwa ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst, zụta! (Ọrụ 20:28) Nwoke ahụ maara ihe kwuru nke ọma, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.

Ngọzi Ndị Na-eme Anyị Ọgaranya

Anyị nwere ihe dị oké ọnụ ahịa nke anyị kwesịrị inwe ekele miri emi maka ya. Gịnị ka ọ bụ? Bible na-eme ka a mara ya mgbe ọ na-ekwu, sị: “Iwu ọnụ Gị dị m mma karịa ọlaedo na ọlaọcha na-adịghị ịgụta ọnụ.” (Abụ Ọma 119:72; Ilu 8:10) N’agbanyeghị abamuru nke ọlaedo mara mma, iwu Jehova ka a ga-achọsi ike karị. Ezi ihe ọmụma nke iwu ya tinyere nghọta nke Jehova na-enye ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu bụ ihe ndị a ga-ewere n’ihe dị oké ọnụ ahịa. Ha na-akwadebe anyị ichebe onwe anyị, ịnagide ọnọdụ ndị siri ike, imeri nsogbu, wee si otú ahụ nwee afọ ojuju na obi ụtọ.

Nke a bụ eziokwu ọbụna maka ụmụntakịrị. Tụlee otú otu nwatakịrị nwanyị si merie nsogbu ya site n’ịgbaso iwu Jehova. Nwa agbọghọ ahụ, Akemi, bi na nso Tokyo. Nna na nne ya tinyere ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ịzụlite ya, sitekwa n’okwu ọnụ na ihe nlereanya ha nyeere nwa ha nwanyị aka ịmalite inwe ịhụnanya maka Jehova na maka ndị agbata obi. N’ibu ụzọ hụ nsogbu ndị ọ ga-enwe n’ụlọ akwụkwọ, ha gbalịrị ịkwadebe ya ruo ókè ha pụrụ ime. Ma, mgbe Akemi banyere ụlọ akwụkwọ elementrị, ụfọdụ n’ime ụmụ klas ya lere ya anya dị ka onye dị “iche” n’ihi na ọ na-ekpe ekpere tupu o rie nri ma jiri ezi akọ na uche na-esepụ aka n’omume ụfọdụ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. N’oge na-adịghị anya ọ ghọrọ onye ìgwè ndị ọchọ okwu lekwasịrị anya bụ́ ndị ga-echechi ya n’otu akụkụ ma a gbasaa akwụkwọ wee maa ya ọra, hijie ya aka, ma jiri ya mee ihe ọchị.

Obere Akemi emegwaraghị, ọ tụghịkwa ndị na-emekpọ ya ọnụ ụjọ. Kama nke ahụ, ọ gbalịrị itinye ihe ọ mụtaworo n’ọrụ. N’ihi àgwà ọma na obi ike ya, o nwetara nkwanye ùgwù nke ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ibe ya. Ha wetara okwu ahụ n’ihu onye nkụzi, kemgbe ụbọchị ahụkwa, Akemi enwetabeghị mmegbu ọzọ n’ụlọ akwụkwọ.

Gịnị nyeere Akemi aka imeri otu ọnọdụ siri ike? Ezi ihe ọmụma ahụ, nghọta, na amamihe sitere n’aka Jehova nke nne na nna ya kụnyeworo n’ime ya. Ọ maara banyere ntachi obi Jisọs nke ọma, nke ahụ kpalikwara ya iṅomi ihe nlereanya ya. Bible nyeere ya aka ịmata na ndị mmadụ ụfọdụ na-eme ihe ọjọọ n’amaghị ama, ọ gbakwara ya ume ịkpọ ihe ọjọọ ndị ọchọ okwu ahụ mere asị n’akpọghị ndị ahụ n’onwe ha asị.—Luk 23:34; Ndị Rom 12:9, 17-21.

N’ezie, ọ dịghị nne na nna ga-achọ ịhụ ka a na-akwa nwa ha emo ma na-emegbu ya. Ma, cheedị echiche ụdị obi ụtọ nne na nna Akemi nwere mgbe ha nụrụ ihe nile meworonụ. Ụdị ụmụaka ahụ bụ n’ezie ngọzi sitere n’aka Jehova.—Abụ Ọma 127:3; 1 Pita 1:6, 7.

Iji Ndidi Na-echere Jehova

Ma tupu ị nata ngọzi Jehova, mgbe ụfọdụ ị ghaghị ichere oge ya. Jehova maara ọnọdụ gị, na-egbokwa mkpa ọ bụla mgbe ọ ga-abakarịsịrị gị uru. (Abụ Ọma 145:16; Eklisiastis 3:1; Jemes 1:17) Mkpụrụ osisi pụrụ ịdị na-atọpịa gị isi, ma gịnị ka ị ga-eche banyere onye nwe ụlọ i letara nke nyere gị mkpụrụ osisi na-achaghị acha? Ma ọ bụ apple, oroma, ma ọ bụ ihe ọzọ, ị ga-ahọrọ ka mkpụrụ osisi gị chaa acha, nwee nnukwu mmiri, ma dị ụtọ. N’otu aka ahụ, Jehova na-enye ihe dị gị mkpa n’oge kwesịrị ekwesị—ọ bụghị mgbe oge ya na-erubeghị, ọ bụghịkwa mgbe oge ya gafeworo.

Cheta ahụmahụ Josef. N’adịghị ihe ọjọọ o mere, ọ chọtara onwe ya n’ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala n’Ijipt. Onye mkpọrọ ibe ya, obu ihe ọṅụṅụ Fero, nwere olileanya na a ga-atọpụ ya wee kwee nkwa iwelite okwu Josef n’ihu Fero. Ma mgbe a tọpụsịrị ya o chezọrọ ihe nile banyere Josef. O yiri ka a ga-asị na a gbahapụla Josef. Otú ọ dị, afọ abụọ zuru ezu n’ikpeazụ, e mesịrị si n’ụlọ mkpọrọ tọpụ ya, mesịakwa mee ya onye ọchịchị nke abụọ n’Ijipt. Kama ịbụ onye na-enweghị ndidi, Josef cheere Jehova. Maka nke a, a gọziri ya n’ụzọ pụtara nchebe nke ndụ nye ma ndị Israel ma ndị Ijipt.—Jenesis 39:1–41:57.

Masashi bụ okenye n’otu ọgbakọ dị n’ebe ugwu Japan. Ọ nọghị n’ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala, ma ọ ghaghị ichere Jehova. N’ihi gịnị? Kemgbe Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ụlọ akwụkwọ maka ọzụzụ ndị ozi bụ́ ndị Kraịst ruru eru, malitere na Japan, o zubesiri ike ịga ya. O kpesiri ekpere ike maka ihe ùgwù ahụ. A kpọrọ onye ya na ya na-asụkọ ụzọ, ma n’agbanyeghị oké mmasị ya, a kpọghị Masashi. O nwere oké ndakpọ olileanya.

Ka o sina dị, o mere ihe iji nagide mmetụta ya. Ọ mụrụ Bible na mbipụta dị iche iche nke Watch Tower Society na-ebipụta, na-elekwasị anya n’isiokwu ndị dị ka ịdị obi umeala na ịchịkwa mmetụta uche onwe onye. Ọ gbanwere echiche ya ma si otú a nwekwuo afọ ojuju n’ọrụ ya. E mesịa, mgbe ọ na-atụghị anya ya, ọ natara ịkpọ òkù ịga ụlọ akwụkwọ ahụ.

Ebe ọ zụliteworo àgwà ndị ahụ dị ka ndidi na ịdị umeala n’obi, o ritere uru karị n’ụlọ akwụkwọ ahụ. N’ikpeazụ, e nyere Masashi ihe ùgwù nke ijere ụmụnna ya ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ee, Jehova maara ihe dị Masashi mkpa ma weta ya nnọọ mgbe ọ ga-arụzu ihe kasị mma.

Chọọ Ngọzi Ya

Ya mere, Jehova adịghị ka onye ahụ na-ere ọgwụ. Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ghara ịghọta nlekọta na nchegbu Jehova, obi ebere ya na-abịa n’ụdị dị iche iche—n’oge na n’ụzọ na-akasị abara anyị uru. Ya mere nọgide na-achọ ngọzi ya. Cheta na i nweworị ọtụtụ ihe kpatara ị ga-eji nwee ekele. E jiriwo ndokwa ndị bụ isi maka ịnọgide na-adị ndụ n’ụwa gọzie gị. E nyewo gị ihe ọmụma Jehova na nke ụzọ ya zuru okè. E nyewo gị nghọta. I nwetawokwa ezi uche. Ihe ndị a nile na-atụnye ụtụ n’ọdịmma na n’obi ụtọ gị.

Iji nwetakwuo ngọzi Jehova n’ụzọ zuru ezu, nọgide na-amụchi Bible anya. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịghọta ma tinye nkụzi yiri ọla dị oké ọnụ ahịa n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee n’ọrụ. Ha ga-eme gị ọgaranya n’ezie, ka ọ ghara inwe ihe kọrọ gị. Ee, ha ga-apụta obi ụtọ na afọ ojuju gị ugbu a na ndụ n’uju n’ime ụwa ọhụrụ gaje ịbịa.—Jọn 10:10; 1 Timoti 4:8, 9.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ngọzi Jehova dị oké ọnụ ahịa karịa ọlaedo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya