Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Chineke Ga-enweru Ndidi?
N’IHE dị ka 3,000 afọ gara aga, otu nwoke onye amamihe dere, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Eri mgbe o kwuru ihe ahụ, ọnọdụ adịwanyebeghị mma. N’akụkọ ihe mere eme dum, ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ ìgwè mmadụ dị iche iche ewegharawo ike ọchịchị, otu gasịa ibe ya esochie, na-enwe ike n’ahụ mmadụ ndị ọzọ, na-erigbukwa ha. Jehova Chineke ejiwo ndidi nagide nke a.
Jehova enwewo ndidi mgbe ọchịchị dị iche iche dujeworo ọtụtụ nde mmadụ gaa n’ọnwụ ha n’agha dị iche iche, kwerekwa ka ajọ ikpe na-ezighị ezi nke akụ na ụba dịgide. Taa, ọ ka na-enwe ndidi ka ụmụ mmadụ na-ebibi ihe mkpuchi ozone, na-emetọkwa ikuku na oké osimiri. Lee ka ọ na-aghaghị isi bụrụ ya ihe mgbu ịhụ mbibi nke ala dị mma nke na-emepụta ihe nakwa mbibi ezi uche na-adịghị na ya nke oké ọhịa na ụdị anụ ọhịa dị iche iche!
N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Enwe Ndidi Otú a?
Otu ihe atụ dị mfe pụrụ inyere anyị aka ịza ajụjụ nke a. Tụlee mmetụta ọ na-enwe n’ọrụ mgbe onye e were n’ọrụ nọgidere na-abịa ọrụ n’azụ oge. Gịnị ka onye nwe ụlọ ọrụ ahụ kwesịrị ime? Ikpe ziri ezi nkịtị pụrụ ịchọ ya n’aka ịchụpụ onye ahụ e were n’ọrụ ozugbo ahụ. Ma ọ pụrụ icheta ilu ahụ dị na Bible, bụ: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nwere ọtụtụ nghọta: ma onye nwere obi ọkụ na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ.” (Ilu 14:29) Inwe nghọta pụrụ ime ka o cheretụ tupu o mee ihe. Ọ pụrụ ikpebi ichere ka ogologo oge ụfọdụ gafee ka e wee zụọ onye ga-anọchi onye ahụ ka a ghara ịkpata nsogbu ọbụna karị n’ọrụ ahụ.
Inwe mmetụta banyere mmadụ ibe ya pụkwara ime ka o chere. Gịnị banyere ịdọ onye ahụ e were n’ọrụ nke na-adịghị eji ihe kpọrọ ihe aka ná ntị iji lee ma ọ ga-agbanwe omume ya? N’ihi gịnị ka ị na-agwaghị ya okwu iji wee mara ma ọbịbịa ọ na-abịa n’azụ oge mgbe nile ọ̀ bụ otu nsogbu kpatara ya, bụ́ nke a pụrụ idozi edozi ma ọ bụ na ọ bụ àgwà ọjọọ nke a na-apụghị ịgwọta ịgwọta? Ọ bụ ezie na onye nwe ọrụ ahụ pụrụ ikpebi inwe ndidi, otú ọ dị, ndidi ya agaghị abụ ruo ogologo oge a na-akparaghị ókè. Onye ahụ e were n’ọrụ aghaghị ime mgbanwe ma ọ bụkwanụ a chụọ ya n’ọrụ ma e mesịa. Nke a ga-abụ mmeso dị mma nye ọrụ ahụ, nyekwa ndị e were n’ọrụ, bụ́ ndị na-agbaso iwu.
N’ụzọ yiri nnọọ nke ahụ, Jehova Chineke na-enwe ndidi n’agbanyeghị ajọ omume ka o wee nye oge iji chọpụta ihe ngwọta ziri ezi nye nsogbu ụfọdụ. Ọzọkwa, ndidi ya na-enye ndị na-eme ihe ọjọọ ohere ịgbanwe ụzọ ha nile wee nweta abamuru ebighị ebi. N’ihi nke a, Bible na-agba anyị ume ka anyị ghara ịbụ ndị na-enweghị obi ụtọ n’ihi ndidi nke Chineke. Kama nke ahụ, ọ na-asị: “Na-agụkwanụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.”—2 Pita 3:15.
Ihe Atụ nke Ndidi Chineke
Jehova Chineke nwere ndidi tupu oké Iju Mmiri ahụ nke ụbọchị Noa. Ụwa nke oge ahụ jupụtara n’ime ihe ike, na-emebikwa iwu nke ukwuu. Anyị na-agụ, sị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa . . . Jehova wee sị, M ga-ekpochapụ mmadụ n’elu ala, bụ́ ndị m keworo.” (Jenesis 6:5, 7) Ee, Jehova bu n’uche ịgwọta kpam kpam nsogbu nke mmebi iwu e nwere n’oge ahụ: mwepụ nke ndị na-emebi iwu. Ma o meghị ihe ozugbo ahụ. N’ihi gịnị?
N’ihi na ọ bụghị mmadụ nile bụ ndị mmebi iwu. Noa na ezinụlọ ya bụ ndị ezi omume n’anya Chineke. Ya mere, n’ihi ha, Jehova jiri ndidi chere iji nye ndị ezi omume ole na ole ahụ ohere ime nkwadebe maka nzọpụta. Ọzọkwa, nchere ahụ dịruru ogologo oge nyere Noa ohere nke ịbụ “onye na-ekwusa ezi omume,” na-enye ndị ajọ omume ahụ ohere ịgbanwe ụzọ ha nile. Bible na-asị: “Ogologo ntachi obi Chineke na-echesi ike n’ụbọchị Noa, mgbe a na-edozi ụgbọ, nke e weere mmiri zọpụta mmadụ ole na ole, ya bụ mmadụ asatọ, n’ime ya.”—2 Pita 2:5; 1 Pita 3:20.
Ihe Mere Chineke Ji Nwee Ndidi Ugbu a
Taa, ọnọdụ dịnụ yikwara nke ahụ. Ụwa ejupụtawokwa ọzọ n’ihe ike. Dị ka ọ dị n’oge Noa, Chineke ekpeworị ụwa nke a ikpe, nke Bible kwuru na “a na-edebe [ya] nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) Mgbe nke ahụ mere, a gaghị enwekwa mmebi nke gburugburu ebe obibi, mmegbu nke ndị na-adịghị ike, ma ọ bụ iji anyaukwu jiri ike na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.
Ya mere, n’ihi gịnị ka Chineke na-ejibeghị bibie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kemgbe ogologo oge gara aga? N’ihi na e nwewo ihe iseokwu ndị a ga-edozi nakwa ndokwa ndị dị mkpa a ga-eme. N’eziokwu, Jehova na-aga iweta ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu nke ajọ omume, bụ́ nke metụtara ọtụtụ ihe, gụnyere nzọpụta nke ụmụ mmadụ ndị obi ha ziri ezi pụọ n’agbụ nye ọrịa na ọnwụ.
N’iburu ihe ikpeazụ ndị ahụ n’uche, Jehova zubere iweta Onye Nzọpụta onye ga-enye ihe mgbapụta maka mmehie anyị nile. Banyere ya, Bible na-asị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) O were ọtụtụ puku afọ iji mee nkwadebe ka Jisọs wee bịa, jiri ndụ ya chụọ àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. N’ime afọ ndị ahụ dum, Chineke ji ịhụnanya na-enwe ndidi. Ma ọ̀ bụ na ndokwa dị otú ahụ ekwesịghị ka e chere ya?
Jisọs wetara ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. Ya mere, n’ihi gịnị ka Chineke ka ji na-enwe ndidi? Otu ihe bụ na ọnwụ Jisọs kpaliri mmalite nke ọrụ ozizi ihe. Ọ dị mkpa ka ihe a kpọrọ mmadụ mata banyere ndokwa ịhụnanya nke a, ka e nyekwa ha ohere ịnakwere ma ọ bụ ịjụ ya. Nke ahụ ga-ewe oge, ma ọ ga-abụ oge e ji mee ihe dị mma. Bible na-asị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” New World Translation] anọghị ọdụ n’ime nkwa ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na o zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.”—2 Pita 3:9.
Ihe Iseokwu Metụtara Ọchịchị
Otu okwu ọzọ dị mkpa ga-ewekwa oge. Ọ dịrị mkpa idozi nsogbu metụtara ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ná mmalite, mmadụ nọ n’okpuru ọchịchị Chineke. Ma n’ogige Iden, nne na nna mbụ anyị gbakụtara nke ahụ azụ. Ha họọrọ ịkwụụrụ onwe ha n’adabereghị na Chineke, na-achọ ịchị onwe ha. (Jenesis 3:1-5) Ma n’ezie, e keghị mmadụ ka ọ na-achị onwe ya. Jeremaịa onye amụma dere, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23; Ilu 20:24.
Otú o sina dị, eri mgbe e welitere ihe iseokwu ahụ metụtara ọchịchị, Jehova ejiwo ndidi kwere ka oge gabiga iji wee dozie ya. N’eziokwu, o kwewo ka ọtụtụ puku afọ gabiga ka ụmụ mmadụ nwalee ụdị ọchịchị ọ bụla ha pụrụ ichepụta n’echiche. Gịnị siworo na nke a pụta? Ọ bụwo ihe doro anya na ọ dịghị ọchịchị mmadụ nke pụrụ iwepụ mmegbu, ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-akpata enweghị obi ụtọ.
N’eziokwu, n’iburu akụkọ ihe mere eme nke mmadụ n’uche, ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ ikwu n’ezie na Chineke adịghị eme ihe n’ikpe ziri ezi mgbe ọ mara ọkwa nzube ya iwepụchasị ọchịchị mmadụ nile wee jiri nke aka ya dochie anya ha? N’ezie ọ dịghị onye ga-ekwu otú ahụ! N’ezie, anyị na-anabata mmezu nke amụma Bible nke a: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Eze eluigwe nke Alaeze ahụ bụ Jisọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilie. Ịkwadebe ya maka ọnọdụ ahụ—nakwa ịhọpụta ụmụ mmadụ ndị ya na ha ga-eso chịa achị—ewewo ogologo oge. N’ime ogologo oge ahụ dum, Chineke enwewo ndidi.
Rite Uru Ugbu a Site na Ndidi nke Chineke
Taa, ọtụtụ nde mmadụ n’ime ihe na-adịghị ala karịa 212 ala dị iche iche na-erite uru site na ndidi nke Chineke. Ha aghọwo ndị dị n’otu n’ọchịchọ ha irubere Chineke isi na ijere ọchịchị eluigwe ya ozi. Mgbe ha na-ezukọta n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha dị iche iche, ha na-amụta ụzọ o si dị mma karị itinye ụkpụrụ Bible dị iche iche n’ọrụ ná ndụ ha. Ha adịghị ekere òkè ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata nkewa nke ụwa nke a, ọ bụ ezie na ha na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị ụmụ mmadụ ruo ogologo oge Chineke ji ndidi na-ekwere ka ọchịchị indị a na-arụ ọrụ.—Matiu 22:21; Ndị Rom 13:1-5.
Nrụkọ ọrụ dị otú ahụ n’etiti ọtụtụ mmadụ na-akwado eziokwu ahụ nke bụ na Jehova bụ Onye pụrụ iweta nkwekọrịta n’etiti ụmụ mmadụ ndị nwere ohere ime nhọrọ, ndị na-amụta ịhụ ya n’anya, ndị chọkwara ijere ya ozi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i zutewo ndị a ka ha na-aga n’ihu n’otu ọrụ ahụ Jisọs n’onwe ya malitere, bụ́ nke kwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Jisọs buru amụma ọgwụgwụ nke ọrụ nke a mgbe o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
Ọ Gaghị Ewekwa Ogologo Oge!
Ihe àmà a na-ahụ anya na-egosi na ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ndokwa nile zuo ezu, ka ọchịchị ezi omume nke Chineke weghara ịchị achị n’elu ala site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Mgbe ọ kọwasịrị ajọ ihe sitere n’ọdịda nke ọchịchị ụmụ mmadụ pụta, bụ́ ndị anyị hụworo n’ime narị afọ nke a, Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.”—Luk 21:10, 11, 31.
N’isi nso, Chineke ga-ewepụ ndị mmebi iwu site n’elu ala. Okwu onye ọbụ abụ ahụ ga-enwe mmezu nkịtị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ.” (Abụ Ọma 37:9, 10) Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ ụwa nke mmebi iwu na-adịghị na ya? Ònye ga-elekọta ihe ndị na-emenụ n’oge ahụ? Bible na-asị: “N’ezi omume ka otu eze [Kraịst Jisọs nke e dokwasịworo n’ocheeze n’eluigwe] ga-abụ eze, ndị isi kwa [ndị na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị ọ họpụtara n’elu ala], n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi. Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebịghị ebi. Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.”—Aịsaịa 32:1, 17, 18.
Otú a, ọchịchị eluigwe nke Chineke ga-ewepụchasị mmetụta ọjọọ nile nke ajọ omume mmadụ, haziekwa ndị ahụ nwere olileanya n’ebe Ọ nọ gaa n’òtù ụmụ mmadụ nke nwere nkwekọrịta. N’ịkọwa inwe nkwekọrịta nke a, Bible na-asị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha . . . Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:6-9.
Lee nnọọ ihe dị oké ebube a ga-arụpụta n’ihi inwe ndidi nke Chineke! Ya mere, kama ịdị na-eme mkpesa na Chineke echerewo ruo ogologo oge hie nne, gịnị mere i wereghị oge ndidi ya mee ihe iji doo onwe gị n’okpuru Alaeze ya? Mụta site na Bible ihe ndị bụ ụkpụrụ ya, meekwa ihe iji kwekọọ na ha. Soro ndị ọzọ kpakọrịta, bụ́ ndị ji nkwekọrịta na-edo onwe ha n’okpuru ya. Mgbe ahụ, ndidi nke Chineke ga-arụpụtara gị ngọzi ebighị ebi.