Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 10/1 p. 8-13
  • Tụkwasị Obi n’Ógwè Aka Nzọpụta nke Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụkwasị Obi n’Ógwè Aka Nzọpụta nke Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ógwè Aka nke Nzọpụta Chineke nọ n’Ọrụ
  • Enyemaka n’Ọgbakọ
  • Enyemaka Mgbe Ọnwụnwa Dakwasịrị Anyị
  • Enyemaka n’Ihe Onwe Onye
  • Site ná Mkpagbu Nile
  • Imeri Adịghị Ike Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa
    Teta!—2014
  • “Ka Unu Wee Ghara Ịbanye n’Ọnwụnwa”
    Nọrọ na Nche!
  • Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 10/1 p. 8-13

Tụkwasị Obi n’Ógwè Aka Nzọpụta nke Jehova

“Jehova, . . . bụrụ ógwè aka ha [“anyị,” NW] kwa ụtụtụ, bụrụkwa nzọpụta anyị na mgbe ahụhụ.”—AỊSAỊA 33:2.

1. N’echiche dị aṅaa ka Jehova nwere ógwè aka dị ike?

JEHOVA nwere ógwè aka dị ike. N’ezie, ebe “Chineke bụ Mmụọ,” ógwè aka ya abụghị nke anụ ahụ. (Jọn 4:24) N’ime Bible, ógwè aka ihe atụ nọchiri anya ikike nke iji ike mee ihe. Otú a, ọ bụ site n’ógwè aka ya ka Chineke na-anapụta ndị ya. N’eziokwu, ‘dị ka onye ọzụzụ atụrụ, Jehova na-azụ ìgwè atụrụ ya. O ji ógwè aka ya na-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi ya ka ọ na-ekuru ha.’ (Aịsaịa 40:11; Abụ Ọma 23:1-4) Lee nnọọ ka ndị Jehova na-esi enwe mmetụta nke ndị nọ ná ntụkwasị obi mgbe ha nọ n’ógwè aka ya nke na-ahụ n’anya!—Tụlee Deuterọnọmi 3:24.

2. Ajụjụ dịgasị aṅaa kwesịrị ka anyị tụlee ha?

2 Olee ụzọ ógwè aka Jehova siworo zọpụta ndị ya, n’oge gara aga na n’oge ugbu a? Enyemaka dị aṅaa ka Chineke na-enye ha dị ka otu ọgbakọ? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ndị ya pụrụ iji tụkwasị obi n’ógwè aka ya nke nzọpụta n’oge ihe isi ike ha nile?

Ógwè Aka nke Nzọpụta Chineke nọ n’Ọrụ

3. Gịnị ka Akwụkwọ nsọ nyere otuto maka nnapụta nke Israel site n’Ijipt?

3 Tupu ọ napụta ụmụ Israel site n’agbụ Ijipt 3,500 afọ gara aga, Chineke gwara onye amụma ya bụ́ Mosis, sị: “Sị ụmụ Israel, Mụ onwe m bụ Jehova, m ga-emekwa ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndị Ijipt pụọ, m ga-anapụtakwa unu n’ofufe ha, werekwa ógwè aka e setịrị esetị, werekwa ikpe ukwu dị iche iche, gbapụta unu.” (Ọpụpụ 6:6) Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, Chineke ‘weere ógwè aka dị elu’ dupụta ụmụ Israel site n’Ijipt. (Ọrụ 13:17) Ụmụ Kora nyere Chineke otuto maka mmeri e meriri Ala Nkwa ahụ, na-asị: “Ọ bụghị mma agha ha ka ha ji nweta ala ahụ, ógwè aka ha azọpụtaghịkwa ha: kama ọ bụ aka nri gị, na ógwè aka gị, na ìhè nke ihu gị, n’ihi na ihe ha tọrọ gị ụtọ.”—Abụ Ọma 44:3.

4. Olee ụzọ ịtụkwasị obi n’ógwè aka nzọpụta nke Jehova si nweta ụgwọ ọrụ n’oge mwakwasị ndị Asiria?

4 Ógwè aka Jehova bịakwara nyere ndị ya aka n’oge mwakwasị nke ndị Asiria. N’oge ahụ, Aịsaịa onye amụma kpere ekpere, sị: “Jehova, meere anyị amara; gị ka anyị leworo anya: bụrụ ógwè aka ha [“anyị,” NW] kwa ụtụtụ, bụrụkwa nzọpụta anyị na mgbe ahụhụ.” (Aịsaịa 33:2) A zara ekpere ahụ mgbe mmụọ ozi Chineke gburu 185,000 n’ọmụma ụlọ ikwuu ndị Asiria, na-eme ka Eze Senakerib “were ihere ihu” hapụ Jerusalem. (2 Ihe Emere 32:21; Aịsaịa 37:33-37) Inwe ntụkwasị obi n’ógwè aka nke Jehova na-eweta ụgwọ ọrụ mgbe nile.

5. Gịnị ka ógwè aka dị ike nke Chineke meere ndị Kraịst a na-akpagbu akpagbu mgbe Agha Ụwa Mbụ gwụsịrị?

5 Ógwè aka dị ike nke Chineke zọpụtara ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị a kpagburu mgbe Agha Ụwa Mbụ ahụ gasịrị. Na 1918, ndị iro wakwasịrị isi ụlọ ọrụ nke Òtù Na-achị Isi, a tụkwara ụmụnna ndị a ma ama mkpọrọ. N’ịtụ egwu nke ndị ọchịchị ụwa, ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ndị ahụ e tere mmanụ kwụsị ọrụ ịgba àmà ha. Ma ha kpere ekpere maka ntụteghachi ya, nakwa maka ịbụ ndị e mere ka ha dị ọcha pụọ ná mmehie nke arụghị ọrụ na adịghị ọcha nke egwu. Chineke zaghachiri site n’ime ka a tọhapụ ụmụnna ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ, na-akachapụkwa ebubo nile e boro ha kpam kpam n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị. N’ihi eziokwu ndị e kwupụtara ná mgbakọ ha e mere na 1919 nakwa mwụpụ nke mmụọ Chineke nke kpaliri ha ịrụ ọrụ, a tụteghachiri ndị ahụ e tere mmanụ maka ijere Jehova ozi n’atụghị egwu ná mmezu ikpeazụ nke Joel 2:28-32.—Mkpughe 11:7-12.

Enyemaka n’Ọgbakọ

6. Anyị si aṅaa mara na o kwere omume inwe ntachi obi n’ọnọdụ na-etinye mmadụ n’ule n’ọgbakọ?

6 Dị ka Chineke na-akwado nzukọ ya n’ozuzu ya, ógwè aka ya na-akwadokwa ndị mmadụ n’otu n’otu, bụ́ ndị nọ n’ime ya. N’eziokwu, ọ dịghị ọgbakọ ọ bụla nke nwere ọnọdụ zuru okè n’ihi na mmadụ nile bụkwa ndị na-ezughị okè. (Ndị Rom 5:12) Ya mere, ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova pụrụ ịnọ n’ọnọdụ na-etinye mmadụ n’ule mgbe ụfọdụ n’ime ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na Gaịọs “na-eme ihe kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ” n’ịnabata ụmụnna nke ọma, Dịọtrefis anabataghị ha nke ọma, ọbụna na ọ nwakwara ịchụpụ ndị ahụ na-ele ndị ọbịa anya nke ọma n’ọgbakọ. (3 Jọn 5, 9, 10) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyeere Gaịọs na ndị ọzọ aka ịnọgide na-ele ndị ọbịa anya nke ọma n’ịkwado ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Iji ekpere na-adabere na Chineke kwesịrị inyere anyị aka ịnọgide na-arụ ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi ka anyị nọ na-echere ya ka o dozie ọnọdụ nke pụrụ ịbụrụ okwukwe anyị ule.

7. N’agbanyeghị ọnọdụ dịgasị aṅaa n’ọgbakọ ahụ dị na Kọrint ka ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe nọ n’ebe ahụ mezuru ihe nrara ha raara onwe ha nye Chineke chọrọ ha n’aka?

7 Ka e were ya na ị nọ n’ọgbakọ narị afọ mbụ ahụ dị na Kọrint. N’otu oge, ịrọ òtù dị iche iche yiri ịdị n’otu ya egwu, ịgbachi nkịtị ka ndụ adịghị ọcha dịgide tinyekwara mmụọ ya n’ihe ize ndụ. (1 Ndị Kọrint 1:10, 11; 5:1-5) Ndị kwere ekwe kpụpụrịtara ibe ha n’ụlọikpe ndị ụwa, ụfọdụ ndị serịtakwara okwu n’ihi ihe dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 6:1-8; 8:1-13) Esemokwu, ekworo, iwe, na adịghị n’usoro mere ka ndụ bụrụ ihe siri ike. Ọbụna na ụfọdụ mara aka ikike Pọl nwere, ledakwa ikike ikwu okwu ya anya. (2 Ndị Kọrint 10:10) Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, ndị na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ mezuru ihe nrara ha raara onwe ha nye Chineke chọrọ ha n’aka n’oge ule ahụ.

8, 9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọnọdụ na-etinye mmadụ n’ule echee anyị ihu n’ime ọgbakọ?

8 Ọ bụrụ na ọnọdụ nke na-etinye mmadụ n’ule ebilite, ọ dị mkpa ka anyị rapagidesie ike n’ahụ ndị Chineke. (Tụlee Jọn 6:66-69.) Ka anyị nwee ndidi n’ebe ibe anyị nọ, na-aghọta na ọ na-ewe mmadụ ụfọdụ ogologo oge karị ndị ọzọ iji yikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ,” wee yikwasị onwe ha obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi. Ebe ndị ohu Chineke dịrịtakwara iche n’ihe banyere nzụlite ha, ọ dị mkpa ka anyị nile gosi ịhụnanya, na-agbagharakwa ndị mmadụ mmehie.—Ndị Kọlọsi 3:10-14.

9 Mgbe ọtụtụ afọ nke ijere Jehova ozi gasịrị, otu nwanna nwoke sịrị: “Ọ bụrụ na ọ bụ otu ihe bụ ihe kasịworo dị mkpa nye m, ọ bụwo okwu banyere ịnọ nzukọ Jehova a na-ahụ anya nso. Ahụmahụ m nwere ná mmalite kụziiri m ụzọ o si bụrụ ihe na-emerụ ahụ ịdabere n’echiche mmadụ. Ozugbo m meworo mkpebi n’ihe banyere nke ahụ, ekpebisiri m ike ịnọgidesi ike n’akụkụ nzukọ nke a kwesịrị ntụkwasị obi. Olee nnọọ ụzọ ọzọ mmadụ pụrụ isi nweta ihu ọma na ngọzi Jehova?” Ì ji ihe ùgwù i nwere iso ndị Jehova na-enwe ọnụ na-ejere ya ozi kpọrọ ihe dị mkpa n’otu aka ahụ? (Abụ Ọma 100:2) Ya bụrụ otú ahụ, ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla dọpụ gị site ná nzukọ Chineke ma ọ bụ bibie mmekọrịta gị na onye ahụ nke ógwè aka ya na-azọpụta mmadụ nile, bụ́ ndị hụrụ ya n’anya.

Enyemaka Mgbe Ọnwụnwa Dakwasịrị Anyị

10. (a) Olee ụzọ ekpere si enyere ndị Chineke aka iche ọnwụnwa ihu? (b) Nkwa dị aṅaa ka Pọl na-ekwe ná 1 Ndị Kọrint 10:13?

10 Dị ka mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị nọ ná nzukọ Chineke, anyị nwere enyemaka ya n’oge ule. Dị ka ihe atụ, ọ na-enyere anyị aka ịnọgide ná nguzosi ike n’ezi ihe anyị n’ebe ọ nọ mgbe ọnwụnwa dakwasịrị anyị. N’ezie, anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Jisọs, bụ: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa, kama dọpụta anyị n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu. (Matiu 6:9-13) Nke a pụtara na anyị si otú a na-arịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a nwara anyị inupụrụ ya isi. Ọ na-azakwa ekpere anyị maka amamihe iji merie ọnwụnwa dị iche iche. (Jemes 1:5-8) Ndị ohu Jehova pụkwara ijide n’aka na ọ ga-enyere ha aka, n’ihi na Pọl kwuru, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karị nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Olee ebe ọnwụnwa dị otú ahụ na-esi abịa, oleekwa ụzọ Chineke na-esi emere anyị ụzọ mgbapụ?

11, 12. Ọnwụnwa dịgasị aṅaa ka ụmụ Israel dabara na ha, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi rite uru site n’ahụmahụ ha?

11 Ọnwụnwa na-abịa site n’ọnọdụ ndị pụrụ ịkpali anyị ime ihe n’ekwesịghị ntụkwasị obi nye Chineke. Pọl sịrị: “Ihe ndị a ghọrọ ihe atụ nye anyị, ka anyị wee ghara ịbụ ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ, dị ka agụụ ihe ọjọọ gụkwara ndị [Israel]. Unu aghọkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha ghọrọ; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị Israel nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwu. Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [puku iri abụọ na atọ]. Ka anyị gharakwa ịnwa Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], dị ka ụfọdụ n’etiti ha nwara, agwọ wee laa ha n’iyi. Unu atamukwala, dị ka ụfọdụ n’etiti ha tamuru, onye mbibi ahụ wee laa ha n’iyi.”—1 Ndị Kọrint 10:6-10.

12 Ụmụ Israel nwere agụụ ihe ọjọọ mgbe ha dabara n’ọnwụnwa ahụ nke inwe anyaukwu n’ịchịkọta na iri nnụnụ quail nke Chineke nyere ha n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọnụ Ọgụgụ 11:19, 20, 31-35) Tupu mgbe ahụ, ha ghọrọ ndị na-ekpere arụsị mgbe ọnụnọ Mosis na-anọghị ya wetara ọnwụnwa nke itinye aka n’ofufe nwa ehi. (Ọpụpụ 32:1-6) Ọtụtụ puku mmadụ lara n’iyi n’ihi na ha dabara n’ọnwụnwa wee soro ndị inyom Moab kwaa iko. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9) Mgbe ụmụ Israel dabara n’ọnwụnwa wee tamuo ntamu banyere mbibi nke Kora onye nnupụisi, Detan, Abaịram, na ndị ọzọ sonyeere ha, 14,700 n’ime ha lara n’iyi site n’otu ihe otiti Chineke zitere. (Ọnụ Ọgụgụ 16:41-49) Anyị pụrụ irite uru site n’ahụmahụ ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị aghọta na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ọnwụnwa ndị a hiri nne nke ukwuu nke na ụmụ Israel apụghị iguzogideworịị ya. Ha pụrụ imeworị nke ahụ ma a sị na ha nwere okwukwe, nwee ekele maka nlekọta ịhụnanya Chineke, ghọtakwa izi ezi nke Iwu ya. Mgbe ahụ, ógwè aka Jehova gaara azọpụtawo ha rịị, ọbụna dị ka ọ pụrụ ịzọpụta anyị.

13, 14. Olee ụzọ Jehova na-esi emeghe ụzọ mgbapụ mgbe ndị ohu ya na-eche ọnwụnwa ihu?

13 Dị ka ndị Kraịst, anyị na-eche ọnwụnwa ndị na-abịara ihe nile a kpọrọ mmadụ ihu. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke site n’ikpe ekpere maka enyemaka ya na ịrụ ọrụ iji guzogide ọnwụnwa. Chineke bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwekwa ka a nwaa anyị karịa otú anyị ga-enwe ike ịnagide. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ ga-abụrụ anyị ihe na-ekweghị omume ime ihe ọ na-achọ. Ọ na-emere anyị ụzọ mgbapụ site n’iwusi anyị ike iji guzogide ọnwụnwa. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-akpagbu anyị, a pụrụ ịnwa anyị imebi okwukwe anyị n’olileanya nke izere ntaramahụhụ ma ọ bụ ọnwụ. Ma ọ bụrụ na anyị na-atụkwasị obi n’ógwè aka dị ike nke Jehova, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọnwụnwa ga-eru n’ebe ọ na-agaghị enwe ike iwusi okwukwe anyị ike, nyekwa anyị ike zuru ezu iji nọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe. Dị ka Pọl onyeozi kwuru: “A na-akpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị ókè; anyị nwere obi abụọ, ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè; a na-esogbu anyị, ma a dịghị ahapụ nanị anyị; a na-atụda anyị n’ala, ma a dịghị ala anyị n’iyi.”—2 Ndị Kọrint 4:8, 9.

14 Jehova na-akwadokwa ndị ya site n’iji mmụọ ya mee ihe dị ka onye ncheta na onye ozizi. Ọ na-echetara anyị isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ nsọ, na-enyekwara anyị aka ịghọta ụzọ anyị ga-esi tinye ha n’ọrụ ka anyị wee guzogide ọnwụnwa. (Jọn 14:26) Ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na-aghọta isi ihe ndị ọnwụnwa metụtara, a dịghị aghọgbukwa ha gaa n’ịgbaso ụzọ nke na-ezighị ezi. Chineke emegheworo ha ụzọ mgbapụ site n’ime ka ha nwee ike inwe ndidi ọbụna ruo ọnwụ n’adabaghị n’ọnwụnwa. (Mkpughe 2:10) E wezụga inyere ndị ohu ya aka site ná mmụọ ya, Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya emere nzukọ ya ihe.—Ndị Hibru 1:14.

Enyemaka n’Ihe Onwe Onye

15. Enyemaka onwe onye dị aṅaa ka anyị pụrụ ịchọta n’akwụkwọ Abụ nke Abụ?

15 Ndị ahụ nọ ná nzukọ Jehova na-enweta enyemaka ya n’ihe onwe onye ha dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ ṇa ụfọdụ na-achọ onye Kraịst ha ga-alụ dị ka di ma ọ bụ nwunye. (1 Ndị Kọrint 7:39) Ọ bụrụ na e nwetaghị ihe a chọrọ, ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka ịtụle ihe banyere eze Israel bụ Solomọn. Ọ dara ada ná mgbalị ya ime ka otu nwa agbọghọ onye Shulem kwere ya di n’ihi na nwa agbọghọ ahụ hụrụ otu onye ọzụzụ atụrụ dị ala n’anya. A pụrụ ịkpọ ihe ndekọ eze ahụ banyere okwu nke a Abụ nke Ịhụnanya Dara Ada nke Solomọn. Anyị pụrụ ịkwa ákwá ma ọ bụrụ na mgbalị ịhụnanya ndị anyị mere n’onwe anyị arụpụtaghị ihe n’ọnọdụ ụfọdụ, ma Solomọn gabigara nnweta ahụ ọ na-enwetaghị ihe ọ chọrọ, anyị pụkwara ime otú ahụ. Mmụọ Chineke pụrụ inyere anyị aka igosipụta njide onwe onye na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ. Okwu ya na-enyere anyị aka ịnakwere eziokwu ahụ na-abụkarị ihe mgbu nke bụ na mmadụ apụghị inwe mmetụta ịhụnanya maka onye ọ bụla ọ hụrụ. (Abụ Nke Abụ 2:7; 3:5) Ma e wezụgakwa nke ahụ, Abụ nke Abụ na-egosi na ọ pụrụ ikwe omume ịchọta onye kwere ekwe ibe anyị, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya n’ụzọ dị omimi. Nke ka mkpa bụ na “abụ nke abụ” nke a nwere mmezu ya n’ịhụnanya ahụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ bụ́ Jisọs Kraịst, nwere n’ahụ ‘nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ’ nke 144,000 ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ.—Abụ Nke Abụ 1:1; Mkpughe 14:1-4; 21:2, 9; Jọn 10:14.

16. “Mkpagbu n’anụ ahụ ha” nke ndị Kraịst lụworo di na nwunye na-enwe pụrụ ịgụnye gịnị?

16 Ọbụna ndị ahụ na-alụ ndị kwere ekwe na-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) A ga-enwe nchekasị na nchegbu banyere di na nwunye na ụmụ ha. (1 Ndị Kọrint 7:32-35) Ọrịa pụrụ iweta ibu arọ na nchekasị. Mkpagbu ma ọ bụ ihe isi ike akụ na ụba pụrụ ime ka o siere onye Kraịst bụ nna ike ịchọtara ezinụlọ ya ihe ndị dị mkpa ná ndụ. A pụrụ ikewapụ ndị bụ nna n’ebe ụmụ ha nọ n’ihi ịtụ mkpọrọ, a pụkwara ịta ụfọdụ ahụhụ, ọbụna gbuo ha egbu. Ma n’ọnọdụ nile dị otú ahụ, anyị pụrụ iguzogide ọnwụnwa nke ịgọnarị okwukwe anyị ma ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị obi n’ezie n’ógwè aka nzọpụta nke Jehova.—Abụ Ọma 145:14.

17. Nsogbu ezinụlọ dị aṅaa ka Chineke mere ka Aịsak na Rebeka nwee ike inwe ntachi obi na ya?

17 Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị nwee ntachi obi n’ule ụfọdụ ruo ogologo oge. Dị ka ihe atụ, onye bụ nwa pụrụ ịkpatara ndị mụrụ ya, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke nchekasị site n’ịlụ onye na-ekweghị ekwe. Nke ahụ mere n’ezinụlọ nna ochie ahụ bụ Aịsak na nwunye ya bụ Rebeka. Nwa ha nwoke nke gbara 40 afọ, bụ́ Ịsọ, lụrụ ndị inyom Het abụọ, ndị “ghọọrọ Aịsak, ghọọkwara Rebeka, ihe mmụọ ilu.” N’eziokwu, “Rebeka wee si Aịsak, Ike ndụ m agwụsịwo m site n’ihu ụmụ ndị inyom Het: ọ bụrụ na Jekọb [bụ nwa ha nke ọzọ] lụrụ nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Het, dị ka ndị a, bụ́ site n’ụmụ ndị inyom ala nke a, uru gịnị ka ndụ baara m?” (Jenesis 26:34, 35; 27:46) Ọ pụtara ìhè na a na-akpagbu mkpụrụ obi ezi omume Rebeka site n’ihe isi ike nke a nọgidere na-aga n’ihu. (Tụlee 2 Pita 2:7, 8.) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ógwè aka Jehova kwadoro Aịsak na Rebeka, na-eme ka ha nwee ike inwe ntachi obi n’ọnwụnwa nke a ma na-ejigidekwa mmekọrịta siri ike nke ha na Ya.

18. Ule onwe onye dị aṅaa ka C. T. Russell nwere ntachi obi na ya site n’enyemaka Chineke?

18 Ọ bụ ihe na-enye nsogbu n’obi mgbe onye meworo baptism nke nọ n’ezinụlọ malitere ịla azụ n’ijere Chineke ozi. (Tụlee 2 Timoti 2:15.) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna na di ma ọ bụ nwunye ụfọdụ ndị efunarịwo ha n’ụzọ ime mmụọ, dị ka o funarịrị Charles T. Russell, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society. Nwunye ya gbubiri ihe nile jikọrọ ya na Society, gbahapụkwa ya na 1897, mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 18 afọ nke alụmdi na nwunye ha gasịrị. O tinyere akwụkwọ maka nkewa nke iwu kwadoro na 1903, e nyekwara ya ike nkewa dị otú ahụ na 1908. Mwute Russell nwere pụtara ìhè mgbe ọ gwara nwunye ya n’otu akwụkwọ ozi o degaara ya n’oge na-adịghị anya mgbe ha kewasịrị, sị: “Ekpesiwo m ekpere ike nye Onyenwe anyị n’ihi gị. . . . Agaghị m ebogbu gị n’ịkọ akụkọ banyere iru újú m, ma ọ bụkwanụ nwaa ịkpali ọmịiko gị n’ebe m nọ site n’ịkọwa ụdị mmetụta nile m na-enwe, ebe ọ bụ na site n’oge ruo n’oge, ana m ahụ uwe gị na ihe ndị ọzọ ndị na-eme ka m chetaghachi ọnọdụ gị na mbụ—nke jupụtara n’ịhụnanya na ọmịiko na enyemaka—na-egosipụta mmụọ nke Kraịst. . . . Oo, biko jiri ekpere tụlee ihe m gaje ikwu. Jidekwa n’aka na ihe kasị bụrụ m ihe mgbu, mmetụta kasị pụta ìhè m nwere, abụghị owu ọmụma m n’akụkụ fọdụrụ ná ndụ m, kama ọ bụ ọdịda gị, onye m hụrụ n’anya, mfu ebighị ebi gị, ruo n’ókè m pụrụ ịhụ ya anya.” N’agbanyeghị obi mgbu dị otú ahụ, Russell nwere nkwado Chineke ruo ọgwụgwụ nke ndụ elu ala ya. (Abụ Ọma 116:12-15) Jehova na-akwado ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe mgbe nile.

Site ná Mkpagbu Nile

19. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ihe isi ike anọgide na-aga n’ihu?

19 Ndị Jehova maara na ọ bụ “Chineke na-azọpụta azọpụta,” Onye ‘na-eburu anyị ibu kwa ụbọchi.’ (Abụ Ọma 68:19, 20) Ya mere, dị ka mmadụ ndị raara onwe ha nye, ndị nọ ná nzukọ elu ala ya, ka anyị ghara ikwe ka obi ịda mbà rikpuo anyị ma ọ bụrụ na ọnọdụ na-akpata mwute anọgide na-adị. Cheta na “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, o mewo ka a chọta ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” (Abụ Ọma 46:1) Ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ọ nọ na-enweta ụgwọ ọrụ mgbe nile. Devid sịrị, “Achọrọ m Jehova, ọ zakwara m, wee napụta m n’ụjọ m nile. . . . Onye a e wedara n’ala kpọrọ òkù, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.”—Abụ Ọma 34:4-6.

20. Ajụjụ dị aṅaa fọdụrụ ka anyị tụlee ya?

20 Ee, Nna anyị nke eluigwe na-azọpụta ndị ya site ná mkpagbu nile. Ọ na-akwado nzukọ elu ala ya, na-eweta enyemaka n’ihe banyere ọgbakọ na n’ihe onwe onye dị iche iche. N’eziokwu, “Jehova agaghị aha ndị ya aka.” (Abụ Ọma 94:14) Ma ka anyị gaa n’ihu ịtụle ụzọ ndị ọzọ Jehova na-esi enyere ndị ya aka n’otu n’otu. Olee ụzọ Nna anyị nke eluigwe na-esi akwado ndị ohu ya ndị nọ n’ọrịa, ndị nọ n’ịda mbà nke uche, ndị iru újú rikpuru n’ihi na mmadụ nwụnahụrụ ha, ma ọ bụ ndị na-enwe nsogbu n’ihi mmejọ ihe nke onwe ha? Dị ka anyị ga-ahụ, n’okwu ndị a kwa, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji dabere n’ógwè aka dị ike nke Jehova.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ Olee ụzọ ógwè aka Jehova siworo weta nzọpụta n’oge ndị gara aga?

◻ Olee ụzọ Jehova na-esi enyere ndị ya nọ n’ime ọgbakọ aka taa?

◻ Enyemaka dị aṅaa ka Chineke na-enye n’ihe onwe onye dị iche iche?

◻ Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nsogbu ndị na-akpata mwute anọgide na-adị?

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Chineke “weere aka dị elu” dupụta ụmụ Israel n’Ijipt

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya