Lee Ka Ha Si Bụrụ Ndị Obi Ụtọ, Bụ́ Ndị Dị Nwayọọ n’Obi!
“Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.”—MATIU 5:5.
1. Gịnị bụ ịdị nwayọọ n’obi nke Jisọs kwuru okwu ya n’Ozizi Elu Ugwu ya?
N’OZIZI Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst sịrị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Ịdị nwayọọ n’obi, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi nke a, abụghị ihe mkpuchi ụgha nke ime nwayọọ nwayọọ n’ụzọ ihu abụọ, ọ bụghịkwa àgwà nkịtị e ji mụọ mmadụ. Kama nke ahụ, ọ bụ ịdị nwayọọ nke sitere n’ime obi na ịchọ udo nke a na-egosipụta n’ụzọ bụ isi ná nzaghachi nye uche na nduzi nke Jehova Chineke. Ndị dị nwayọọ n’obi n’ezie na-enwe ezi echiche nke ịdabere n’ebe Chineke nọ, bụ́ nke ha na-egosipụta n’àgwà dị nwayọọ n’ebe ndị mmadụ ibe ha nọ.—Ndị Rom 12:17-19; Taịtọs 3:1, 2.
2. N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwupụta na obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi?
2 Jisọs kwupụtara na obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi n’ihi na ha ga-eketa ụwa. Dị ka Ọkpara Chineke nke dị nwayọọ n’obi n’ụzọ zuru okè, Jisọs bụ Onye Isi nke Ga-eketa ụwa. (Abụ Ọma 2:8; Matiu 11:29; Ndị Hibru 1:1, 2; 2:5-9) Ma dị ka “nwa nke mmadụ” nke bụ Mesaịa, ọ gaje inwe ndị ya na ha ga-eso chịa achị n’Alaeze eluigwe ya. (Daniel 7:13, 14, 22, 27) Dị ka ‘ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,’ ndị a e tere mmanụ, bụ́ ndị dị nwayọọ n’obi, ga-ekere òkè n’ihe nketa ya nke bụ ụwa. (Ndị Rom 8:17) Ndị ọzọ dị nwayọọ n’obi, ndị yiri atụrụ ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs nke dị n’akụkụ elu ala nke Alaeze ahụ. (Matiu 25:33, 34, 46; Luk 23:43) Olileanya ahụ na-eme ka ha nwee obi ụtọ n’ezie.
3. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Chineke na Kraịst setịpụrụ n’ihe banyere ịdị nwayọọ?
3 Onye Isi ahụ Ga-eketa ihe, nke dị nwayọọ n’obi na-anata ụwa site n’aka Nna ya, bụ́ Jehova, bụ́ ihe nlereanya kasị ukwuu nke ịdị nwayọọ n’obi. Lee nnọọ ọtụtụ ugbo Akwụkwọ nsọ na-ekwu na Chineke ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, na-abakwa ụba n’ebere’! (Ọpụpụ 34:6; Nehemaịa 9:17; Abụ Ọma 86:15) O nwere ike dị ukwuu, ma ọ na-egosipụta ịdị nwayọọ otú a nke na ndị na-efe ya ofufe nwere ike ịbịakwute ya n’atụghị egwu. (Ndị Hibru 4:16; 10:19-22) Ọkpara Chineke, onye bụ “onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi,” kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụkwa ndị dị nwayọọ. (Matiu 11:29; Luk 6:27-29) Ndị a dị nwayọọ n’obi, bụ́ ndị ohu nke Chineke na nke Ọkpara ya ṅomiri, deekwa ihe banyere “ịdị nwayọọ na obi ọma nke Kraịst.—2 Ndị Kọrint 10:1; Ndị Rom 1:1; Jemes 1:1, 2; 2 Pita 1:1.
4. (a) Dị ka Ndị Kọlọsi 3:12 si kwuo, gịnị ka ndị ahụ dị nwayọọ n’obi n’ezie meworo? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa kwesịrị ka anyị tụlee ha?
4 Taa, ọ dị mkpa ka ma ndị Kraịst e tere mmanụ ma ndị òtù ha nọ n’elu ala bụrụ ndị dị nwayọọ n’obi. N’ịbụ ndị wepụchasịworo ihe ọjọọ, aghụghọ, ihu abụọ, ekworo, na nkwutọ nile, mmụọ nsọ Chineke enyeworo ha aka ịghọ ndị dị ọhụrụ ‘ná mmụọ nke uche ha.’ (Ndị Efesọs 4:22-24; 1 Pita 2:1, 2) A na-agba ha ume iyikwasị onwe ha “obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ma gịnị kpọmkwem ka ịdị nwayọọ gụnyere? N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe bara uru ịbụ onye dị nwayọọ n’obi? Oleekwa ụzọ àgwà nke a pụrụ isi tụkwasị ihe n’obi ụtọ anyị?
Ilerukwu Ịdị Nwayọọ Anya
5. Olee ụzọ a pụrụ isi kọwaa ịdị nwayọọ?
5 Onye dị nwayọọ n’obi bụ onye omume na akparamagwa ya na-adị nwayọọ. Ná nsụgharị ụfọdụ nke Bible, ọ bụ okwu nkọwa ahụ bụ pra·ysʹ ka a na-asụgharị ịbụ “obi umeala,” “ịdị nwayọọ,” “ịdị nwayọọ n’obi,” na “ịdị nro.” N’asụsụ Grik oge ochie, a pụrụ iji okwu nkọwa ahụ bụ pra·ysʹ mee ihe banyere ifufe na-efe nwayọọ nwayọọ ma ọ bụ ụda olu dị nro. Ọ pụkwara igosipụta onye dị amara. Onye ọkà mmụta bụ W. E. Vine na-asị: “Ngosipụta nile nke [mkpọaha ahụ bụ pra·yʹtes] bụ n’ụzọ bụ isi n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ inwe mmụọ ahụ dị nwayọọ nke anyị na-eji anakwere mmeso Ọ na-emeso anyị dị ka nke dị mma, wee si otú a ghara ịrụ ụka ma ọ bụ iguzogide ya; o nwere njikọ chiri anya n’ebe okwu ahụ bụ tapeinophrosunē [ịdị umeala n’obi] dị.”
6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịdị nwayọọ abụghị adịghị ike?
6 Ịdị nwayọọ abụghị adịghị ike. “E nwere ịdị nro na praus,” ka ọkà mmụta bụ William Barclay dere, “ma e nwere ike yiri nke ígwè n’azụ ịdị nro dị otú ahụ.” Ọ na-achọ ike iji bụrụ onye dị nwayọọ n’obi. Dị ka ihe atụ, a chọrọ ike iji wee nọrọ nwayọọ mgbe a kpasuru anyị iwe ma ọ bụ mgbe a na-akpagbu anyị. Ọkpara Chineke nke dị nwayọọ n’obi, bụ́ Jisọs Kraịst, setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere nke a. “Mgbe a na-ekwutọ ya, ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe ọ na-ahụ ahụhụ, ọ dịghị aba mbá; kama ọ raara onwe ya nye n’aka onye ahụ [Jehova Chineke] nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Dị ka Jisọs onye dị nwayọọ n’obi, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke ga-emeso ndị na-ekwutọ anyị na ndị na-akpagbu anyị ihe. (1 Ndị Kọrint 4:12, 13) Anyị pụrụ ịnọ jụụ dị ka Stifen ahụ nke a na-akpagbu nọrọ, na-aghọta na ọ bụrụ na anyị anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-akwado anyị, gharakwa ikwe ka ihe ọ bụla merụọ anyị ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide.—Abụ Ọma 145:14; Ọrụ 6:15; Ndị Filipaị 4:6, 7, 13.
7. Gịnị ka Ilu 25:28 mere ka ọ pụta ìhè banyere onye na-adịghị nwayọọ?
7 Jisọs dị nwayọọ n’obi, ma o gosipụtakwara ike n’iguzosi ike maka ihe ziri ezi. (Matiu 21:5; 23:13-39) Onye ọ bụla nke nwere “uche nke Kraịst” ga-adị ka ya n’ihe banyere nke a. (1 Ndị Kọrint 2:16) Ọ bụrụ na mmadụ adịghị nwayọọ, o yighị Kraịst. Kama nke ahụ, o kwekọrọ n’okwu ndị a: “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” (Ilu 25:28) Onye dị otú ahụ nke na-adịghị nwayọọ nọ n’ihe ize ndụ nke echiche ọjọọ ịwabata n’ime ya, bụ́ nke pụrụ ime ka ọ kpaa àgwà n’ụzọ ndị na-ezighị ezi. Ọ bụ ezie na onye Kraịst nke dị nwayọọ n’obi abụghị onye na-adịghị ike, ọ makwa na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.”—Ilu 15:1.
8. N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị ihe dị mfe ịbụ onye dị nwayọọ n’obi?
8 Ọ bụghị ihe dị mfe ịbụ onye dị nwayọọ n’obi, n’ihi na anyị eketawo ezughị okè na mmehie. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị nwekwara ịlụ ọgụ megide ike ndị mmụọ ọjọọ ndị pụrụ itinye ịdị nwayọọ anyị n’ule site ná mkpagbu. (Ndị Efesọs 6:12) Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-arụkwa ọrụ n’etiti ndị ahụ nwere mmụọ dị ọkụ nke ụwa, bụ́ nke nọ n’okpuru nduzi Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ya mere, olee ụzọ anyị pụrụ isi zụlite ịdị nwayọọ?
Ụzọ E Si Azụlite Ịdị Nwayọọ
9. Ile ihe anya n’ụzọ dị aṅaa ga-enyere anyị aka ịzụlite ịdị nwayọọ?
9 Nkwere nke dabeere na Bible na a chọrọ anyị n’aka igosipụta ịdị nwayọọ ga-enyere anyị aka ịzụlite àgwà nke a. Kwa ụbọchị, anyị aghaghị ịdị na-arụ ọrụ iji zụlite ịdị nwayọọ. Ma ọ bụghị otú ahụ, anyị ga-adị ka ndị na-ele ịdị nwayọọ anya dị ka adịghị ike, na-echekwa na inwe ihe ịga nke ọma na-apụta site n’ịbụ onye dị mpako, onye nsogbu, ọbụna onye nwere obi ọjọọ. Otú ọ dị, Okwu Chineke na-ama ndị nganga ikpe, otu ilu amamihe na-asịkwa: “Onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ: ma onye na-emekpa anụ ahụ nke aka ya ahụ ka onye na-enweghị obi ebere bụ.” (Ilu 11:17; 16:18) Ndị mmadụ na-eze onye nsogbu, onye na-enweghị obi ọma, eze, ọbụna ma a sị na ha na-eme otú ahụ karịsịa iji zere ịbụ ndị obi ọjọọ na adịghị nwayọọ ya merụrụ ahụ.
10. Ọ bụrụ na anyị ga-abụ ndị dị nwayọọ n’obi, gịnị ka anyị na-aghaghị ido onwe anyị n’okpuru ya?
10 Iji wee bụrụ ndị dị nwayọọ n’obi, anyị aghaghị ido onwe anyị n’okpuru mmetụta nke mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya. Dị ka Jehova si mee ka o kwe omume ala imepụta nri, otú ahụ ka o si mee ka o kwe ndị ohu ya omume ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ ya, gụnyere ịdị nwayọọ. Pọl dere, sị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ee, ịdị nwayọọ bụ otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ Chineke, nke ndị ahụ na-eme ihe na-atọ ya ụtọ na-egosipụta. (Abụ Ọma 51:9, 10) Leekwa nnọọ mgbanwe ndị ịdị nwayọọ na-eweta! Iji mee ihe atụ: E nwere otu onye agavu aha ya bụ Tony, onye na-alụ ọgụ, na-ezu ndị mmadụ ohi, na-ere ọgwụ na-egbu egbu na nzuzo, duzie otu òtù ndị omekome na-eji ọgba tum tum aga, nọọkwa oge ụfọdụ n’ụlọ mkpọrọ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, site n’inweta ihe ọmụma Bible na site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ọ gbanwere wee ghọọ ohu Jehova nke nwere omume dị nwayọọ. Akụkọ banyere Tony bụ ụdị ihe a na-ahụkarị. Ya mere, gịnị ka mmadụ pụrụ ime ma ọ bụrụ na adịghị nwayọọ abụwo akụkụ pụtara ìhè nke ọdịdị mmadụ ya?
11. N’ịzụlite ịdị nwayọọ, ọrụ dị aṅaa ka ekpere n’arụ?
11 Ekpere sitere n’ala ala obi maka mmụọ Chineke nakwa maka mkpụrụ ya nke ịdị nwayọọ ga-enyere anyị aka ịzụlite àgwà nke a. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị ‘nọgide na-arịọ,’ dị ka Jisọs kwuru, Jehova Chineke ga-enyekwa anyị ihe anyị na-arịọ. Mgbe ọ kọwasịrị na ụmụ mmadụ bụ nna na-enye ụmụ ha ihe ndị dị mma, Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu [bụ ndị mmehie ndị ọ ga-abụkwa, e jiri ha tụnyere Chineke, ha] jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?” (Luk 11:9-13) Ekpere pụrụ inye aka ime ka ịdị nwayọọ bụrụ akụkụ na-adịgide adịgide nke ọdịdị mmadụ anyị—bụ àgwà nke na-atụkwasị ihe n’obi ụtọ anyị na nke ndị anyị na ha na-akpakọrịta.
12. N’ihi gịnị ka iburu n’uche na ụmụ mmadụ bụ ndị na-ezughị okè ga-eji nyere anyị aka ịbụ ndị dị nwayọọ n’obi?
12 Iburu n’uche na ụmụ mmadụ bụ ndị na-ezughị okè pụrụ inyere anyị aka ịdị nwayọọ n’obi. (Abụ Ọma 51:5) Anyị apụghị iche echiche ma ọ bụ mee omume n’ụzọ zuru okè dịkwa ka ndị ọzọ na-apụghị ime otú ahụ, ya mere anyị kwesịrị n’ezie inwe ọmịiko, mesookwa ha dị ka ọ ga-amasị anyị ka e si mesoo anyị. (Matiu 7:12) Ịmara na anyị nile na-emehiecha ihe kwesịrị ime ka anyị bụrụ ndị na-agbaghara, na-adịkwa nwayọọ n’obi n’imeso ndị ọzọ ihe. (Matiu 6:12-15; 18:21, 22) E kwuwerị, ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele na Chineke na-egosipụta ịhụnanya na ịdị nwayọọ n’ebe anyị nọ?—Abụ Ọma 103:10-14.
13. Olee ụzọ a pụrụ isi nyere anyị aka ịzụlite ịdị nwayọọ ma ọ bụrụ na anyị anakwere eziokwu ahụ nke bụ na Chineke mere ka ụmụ mmadụ bụrụ ndị nwere ohere ime nhọrọ?
13 Ịnakwere eziokwu ahụ nke bụ na Chineke emewo ka ụmụ mmadụ bụrụ ndị nwere ohere ime nhọrọ pụkwara inyere anyị aka ịzụlite ịdị nwayọọ. Nke a adịghị enye onye ọ bụla ohere ilefuru iwu Jehova anya otú ọ masịrị ya, ma ọ na-enye ohere maka ndị dị iche iche n’etiti ndị ya inwe ụdị ihe dị iche iche na-amasị ha na ihe dị iche iche ndị na-adịghị amasị ha. Ya mere, ka anyị nakwere eziokwu ahụ nke bụ na ọ dịghị onye iwu ji ikwekọ n’ụkpụrụ nke anyị pụrụ iche na ọ bụ ya kasị mma. Mmụọ nke a ga-enyere anyị aka ịdị nwayọọ n’obi.
14. N’ihe banyere ịdị nwayọọ, gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike?
14 Ikpebisi ike ịghara ịkwụsị ịdị nwayọọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-azụlite àgwà nke a. Ido onwe anyị n’okpuru mmetụta nke mmụọ Jehova mere ka e nwee mgbanwe n’echiche anyị. (Ndị Rom 12:2) Mmụọ dị nwayọọ, nke yiri nke Kraịst, na-enye aka ugbu a ime ka anyị laa azụ n’ikere òkè “n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, ite egwú [“oriri oké mkpọtụ,” NW] nile, ịṅụbiga mmanya òkè nile, na ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.” Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ịhapụ ịdị nwayọọ n’ihi ego, ihe metụtara ọha mmadụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ma ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ na-ekwu okwu mkparị banyere omume nsọpụrụ Chineke anyị. (1 Pita 4:3-5) Anyị agaghị ekwere ka ihe ọ bụla mee ka anyị kere òkè ‘n’ọrụ nile nke anụ ahụ,’ nke mere na anyị ga-atụfu ịdị nwayọọ anyị wee ghara iketa Alaeze Chineke ma ọ bụ inweta ngọzị ya nile. (Ndị Galetia 5:19-21) Ka anyị were ya n’ihe dị oké ọnụ ahịa mgbe nile, bụ́ ihe ùgwù nke ịbụ ndị dị nwayọọ n’obi nke Chineke, ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ maka ndụ nke eluigwe ma ànyị nwere olileanya elu ala. Iji wee mee nke ahụ, ka anyị tụlee abamuru ụfọdụ nke ịdị nwayọọ.
Uru Ndị Na-esite n’Ịdị Nwayọọ
15. Dị ka Ilu 14:30 si kwuo, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ịbụ onye dị nwayọọ?
15 Onye dị nwayọọ na-enwe obi, uche, na ahụ nke dị jụụ. Ọ dị otú a n’ihi na ọ dịghị ekere òkè n’esemokwu, ọ dịghị abụ onye a kpasuru iwe n’ihi ihe ndị ọzọ mere, ma ọ bụ na-ata onwe ya ahụhụ site ná nchekasị na-enweghị isi. Ịdị nwayọọ na-enyere ya aka ịchịkwa mmetụta ndị ọ na-enwe, nke a na-abakwa uru ma n’echiche ma n’anụ ahụ. Otu ilu na-asị: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) Adịghị nwayọọ pụrụ ịkpata iwe nke pụrụ ime ka e nwee ọbara mgbali elu ma ọ bụ kpata nsogbu nke usoro ngweri nri, ọrịa asthma, ọrịa anya, na nsogbu ndị ọzọ. Onye Kraịst nke dị nwayọọ n’obi na-enweta abamuru dị iche iche, gụnyere “udo nke Chineke” nke na-eche obi na ike echiche ya nche. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Lee ka amamihe si dịrị na ya ịdị nwayọọ n’obi!
16-18. Mmetụta dị aṅaa ka ịdị nwayọọ na-enwe ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ?
16 Àgwà nke ịdị nwayọọ na-emeziwanye mmekọrịta nke anyị na ndị ọzọ. Ma eleghị anya n’oge gara aga anyị nwere agwa nke isi ọnwụ ruo mgbe anyị nwetara ihe anyị chọrọ. Ma eleghị anya ndị mmadụ na-eweso anyị iwe n’ihi na anyị enweghị obi dị umeala, anyị adịghịkwa nwayọọ. N’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ, o kwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya ma ọ bụrụ na anyị na-adaba n’ọtụtụ esemokwu. Otú ọ dị, otu ilu na-asị: “Mgbe nkụ na-adịghị ọkụ ga-anyụ: otú a mgbe ọ dịghị onye na-ekwu okwu azụ, iseokwu ga-adajụ. Dị ka icheku si dị n’ebe icheku na-ere ọkụ dị, na dị ka nkụ si dị n’ebe ọkụ dị; otú a ka onye na-ese okwu dị ime ka ịlụ ọgụ nwuru ọkụ.” (Ilu 26:20, 21) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị dị nwayọọ n’obi, kama ‘ịdị na-akwanye nkụ n’ọkụ’ wee na-akpasu ndị ọzọ iwe, anyị na ha ga-enwe mmekọrịta dị mma.
17 O yiri ka onye dị nwayọọ n’obi ọ̀ ga-enwe ezi ndị enyi. Ọ na-amasị ndị mmadụ iso ya na-akpakọrịta n’ihi na o nwere àgwà dị mma, okwu ya nile na-enye ume ọhụrụ, na-adịkwa ụtọ dị ka mmanụ aṅụ. (Ilu 16:24) Nke ahụ bụ eziokwu n’ihe banyere Jisọs, onye nwere ike ikwu, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:29, 30) Jisọs abụghị onye nsogbu, yoke ya abụghịkwa ihe na-egbu mgbu. E mesoro ndị na-abịakwute ya nke ọma, ha nwetakwara ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọnọdụ na-adịkwa otú ahụ mgbe anyị sooro onye Kraịst bụ enyi nke dị nwayọọ na-akpakọrịta.
18 Ịdị nwayọọ na-eme ka ndị kwere ekwe ibe anyị hụ anyị n’anya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a dọọrọ ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst nọ na Kọrint bịa n’ebe Pọl nọ n’ihi na o “ji ịdị nwayọọ na obi ọma nke Kraịst” mesoo ha ihe. (2 Ndị Kọrint 10:1) O doro anya na ndị ahụ bi na Tesalọnaịka aghaghị ịnaraworị onyeozi ahụ nke ọma, ebe ọ bụ onye ozizi dị nwayọọ, nke dịkwa nro. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:5-8) Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na ndị okenye ahụ nọ n’Efesọs mụtara ihe dị ukwuu site n’aka Pọl, hụkwa ya n’anya nke ukwuu. (Ọrụ 20:20, 21, 37, 38) Ị̀ na-egosipụta ịdị nwayọọ nke na-eme ka ndị ọzọ hụ gị n’anya?
19. Olee ụzọ ịdị nwayọọ na-esi enyere ndị Jehova aka ịnọgide n’ọnọdụ ha n’ime nzukọ ya?
19 Obi dị nwayọọ na-enyere ndị Jehova aka ido onwe ha n’okpuru nzukọ ya, nọgidekwa n’ọnọdụ ha n’ime ya. (Ndị Filipaị 2:5-8, 12-14; Ndị Hibru 13:17) Ịdị nwayọọ na-egbochi anyị ịdị na-achọ otuto, bụ́ nke dabeere ná mpako, bụrụkwa nke na-adịghị amasị Chineke. (Ilu 16:5) Onye dị nwayọọ adịghị agụ onwe ya n’onye dị elu karịa ndị kwere ekwe ibe ya, ọ dịghị agbalịkwa inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ga-ewetara ha mfu. (Matiu 23:11, 12) Kama nke ahụ, ọ na-anakwere ọnọdụ ya dị ka onye mmehie, na ọ dịkwa ya mkpa, bụ́ ndokwa Chineke maka mgbapụta.
Ịdị Nwayọọ Na-akwalite Obi Ụtọ
20. Mmetụta dị aṅaa ka ịdị nwayọọ na-enwe ná ndụ ezinụlọ?
20 Ndị ohu Chineke nile kwesịrị icheta na ịdị nwayọọ bụ mkpụrụ nke mmụọ ya nke na-akwalite obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, n’ihi na ndị Jehova na-egosipụta àgwà ndị dị ka ịhụnanya na ịdị nwayọọ, e nwere ọtụtụ ezinụlọ obi ụtọ n’etiti ha. Mgbe di na nwunye na-emesorịta onwe ha n’ụzọ ịdị nwayọọ, a na-azụlite ụmụ ha na gburugburu ebe dị nwayọọ, ọ bụghị n’ezinụlọ nke na-ekwukarị okwu, na-emekwa ihe ike ike. Ka onye bụ nna na-enye ụmụ ya ndụmọdụ n’ịdị nwayọọ, nke a na-enwe mmetụta dị mma n’echiche ha ndị ka na-eto eto, o yikwara ka mmụọ dị nwayọọ ọ̀ ga-abụ otu akụkụ nke ọdịdị mmadụ ha. (Ndị Efesọs 6:1-4) Obi dị nwayọọ na-enyere ndị bụ di aka ịnọgide na-ahụ nwunye ha n’anya. Ọ na-enyere ndị bụ nwunye aka ido onwe ha n’okpuru di ha, na-akpalikwa ụmụntakịrị irubere ndị mụrụ ha isi. Ịdị nwayọọ na-enyekwara ndị nọ n’ezinụlọ aka inwe mmụọ nke mgbaghara, bụ́ nke na-atụkwasị ihe n’obi ụtọ.—Ndị Kọlọsi 3:13, 18-21.
21. N’ụzọ bụ isi, ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi nyere ná Ndị Efesọs 4:1-3?
21 Ezinụlọ na ndị mmadụ n’otu n’otu, bụ́ ndị dị nwayọọ n’obi na-akwalite obi ụtọ n’ime ọgbakọ ndị ha nọ na ha. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị Jehova mee ezi mgbalị iji bụrụ ndị dị nwayọọ n’obi. Ị̀ na-eme otú ahụ? Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst e tere mmanụ ibe ya ume ka ha jee ije n’ụzọ kwesịrị ọkpụkpọ eluigwe a kpọrọ ha, na-eme nke ahụ “n’obi dị umeala na ịdị nwayọọ nile, n’ogologo ntachi obi, na-anagiderịta ibe [ha] n’ime ịhụnanya; na-anụ ọkụ n’obi idebe ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ime ihe okike nke bụ udo.” (Ndị Efesọs 4:1-3) Ndị Kraịst nwere olileanya elu ala aghaghịkwa igosipụta ịdị nwayọọ na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ. Nke a bụ ụzọ nke na-eweta ezi obi ụtọ. N’ezie, ndị obi ụtọ ka ha bụ, bụ́ ndị dị nwayọọ n’obi!
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị dị nwayọọ n’obi ji enwe obi ụtọ?
◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịdị nwayọọ n’obi?
◻ Olee ụzọ a pụrụ isi zụlite ịdị nwayọọ?
◻ Gịnị bụ abamuru ụfọdụ na-esite n’ịdị nwayọọ?