Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 10/15 p. 15-20
  • Yikwasịnụ Ịdị Nwayọọ Dị Ka Uwe!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Yikwasịnụ Ịdị Nwayọọ Dị Ka Uwe!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Dị Mkpa Inwe Ndị Ọzụzụ Atụrụ Dị Nwayọọ n’Obi
  • Ịdị Nwayọọ Na-eduzi Onye Ndụmọdụ nke Nwere Amamihe
  • Uru nke Ìgwè Ndị Ndụmọdụ
  • Iji Ịdị Nwayọọ Na-agba Àmà
  • A Chọrọ Ịdị Nwayọọ n’Aka Mmadụ Nile
  • Lee Ka Ha Si Bụrụ Ndị Obi Ụtọ, Bụ́ Ndị Dị Nwayọọ n’Obi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Na-egosipụta “Ịdị Nwayọọ Nile n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịdị Nwayọọ—Àgwà Dị Oké Mkpa nke Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịdị Nwayọọ—Olee Uru Ọ Na-abara Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 10/15 p. 15-20

Yikwasịnụ Ịdị Nwayọọ Dị Ka Uwe!

“Dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.”—NDỊ KỌLỌSI 3:12.

1-3. Ná Ndị Kọlọsi 3:12-14, gịnị ka Pọl onyeozi kwuru banyere ịdị nwayọọ na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ?

JEHOVA na-enye ndị ya uwe ihe atụ nke kachasị mma. N’eziokwu, ndị nile chọrọ ịnata ihu ọma ya aghaghị iyikwasị onwe ha uwe nke e ji ịdị nwayọọ kwesie ike. Àgwà nke a bụ ihe na-enye nkasi obi n’ihi na ọ na-ebelata nrụgide nke ọnọdụ ihe isi ike. Ọ bụkwa ihe nchebe n’ihi na ọ na-ewepụ esemokwu.

2 Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst e tere mmanụ ibe ya ume, sị: “Dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ọnọdụ okwu Grik ahụ dị na ya nke a sụgharịrị ịbụ “yikwasịnụ” na-egosi ihe a ga-eme ngwa ngwa. Ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ, ndị ọ hụwokwara n’anya, agaghị egbu oge n’iyikwasị onwe ha àgwà ndị dị ka ịdị nwayọọ.

3 Pọl kwukwara, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a: ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:13, 14) Ịhụnanya, ịdị nwayọọ, na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ na-eme ka o kwe Ndịàmà Jehova omume “ibikọ n’otu.”—Abụ Ọma 133:1-3.

Ọ Dị Mkpa Inwe Ndị Ọzụzụ Atụrụ Dị Nwayọọ n’Obi

4. Ezi ndị Kraịst na-eyi uwe ihe atụ nke e ji àgwà ndị dị aṅaa kwee?

4 Ezi ndị Kraịst na-agbalịsi ike ‘ime ka ihe nile dị ha n’ahụ nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, ọchịchọ ọjọọ, na anya ukwu,’ ha na-arụkwa ọrụ iji wepụ uwe ochie ọ bụla nke nwere ihe ọ bụla metụtara ọnụma, iwe iwe, obi ọjọọ, na okwu rere ure. (Ndị Kọlọsi 3:5-11) Ha na-eyipụ “mmadụ ochie ahụ” (n’ụzọ nkịtị “onye ochie ahụ”), yikwasịkwa ‘mmadụ ọhụrụ ahụ’ (ma ọ bụ “onye ọhụrụ ahụ”), nke bụ uwe kwesịrị ekwesị. (Ndị Efesọs 4:22-24, Kingdom Interlinear) Uwe ọhụrụ ha, nke e ji obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, wee kwee, na-enyere ha aka idozi nsogbu dị iche iche nakwa ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke.—Matiu 5:9; 18:33; Luk 6:36; Ndị Filipaị 4:2, 3.

5. Gịnị banyere ụzọ ọgbakọ ndị Kraịst si arụ ọrụ na-eme ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ịbụ akụkụ ya?

5 Ụmụ mmadụ ndị a na-agụ ná ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ụwa nke a na-abụkarị ndị aka ike, ọbụna ndị nwere obi ọjọọ. (Ilu 29:22) Lee nnọọ ka ọnọdụ si dị iche n’ụzọ na-enye ume ọhụrụ n’etiti ndị Jehova! Ọgbakọ ndị Kraịst adịghị arụ ọrụ n’ụzọ ahụ ụfọdụ ụmụ mmadụ si eduzi ụlọ ọrụ ha—n’ụzọ na-aga nke ọma ma bụrụ nke aka ike, nke pụrụ ime ka ndị mmadụ ghara inwe obi ụtọ. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe ọṅụ ịbụ akụkụ nke ọgbakọ ahụ. Otu ihe kpatara nke a bụ na ịdị nwayọọ n’obi bụ otu akụkụ nke amamihe ahụ ndị Kraịst na-egosipụta n’ozuzu ha, karịsịakwa ndị ikom ndị ruru eru izi ndị kwere ekwe ibe ha ihe. Ee, ọṅụ na-abịa site ná ntụziaka na ndụmọdụ ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-enye, bụ́ ndị na-ezi ihe “n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe.”—Jemes 3:13.

6. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ okenye na-aghaghị iji bụrụ ndị dị nwayọọ n’obi?

6 Mmụọ, ma ọ bụ àgwà bụ isi, nke ndị Chineke chọrọ ka ndị ikom e nyere ọrụ nlekọta n’ọgbakọ bụrụ ndị dị nwayọọ n’obi, ndị nwere ezi uche na nghọta. (1 Timoti 3:1-3) Ndị ohu Jehova yiri atụrụ ndị dị nwayọọ, ọ bụghị ewu ndị na-eme isi ike, ịnyịnya ibu ndị na-eme isi ike, ma ọ bụ anụ ọhịa wolf ndị na-adọgbu adọgbu. (Abu Ọma 32:9; Luk 10:3) N’ịbụ ndị yiri atụrụ, ọ dị mkpa ka e jiri ịdị nwayọọ na ịdị nro mesoo ha. (Ọrụ 20:28, 29) Ee, Chineke tụrụ anya ka ndị okenye bụrụ ndị dị nwayọọ, ndị nwere obi ọma, ndị na-ahụ n’anya, ndị na-enwekwa ndidi n’ebe ìgwè atụrụ ya dị.—Ezikiel 34:17-24.

7. Olee ụzọ ndị okenye kwesịrị isi zie ndị ọzọ ihe ma ọ bụ nyere ndị ahụ na-esighị ike n’ime mmụọ aka?

7 Dị ka “ohu nke Onyenwe anyị,” onye okenye ‘aghaghị ịdị nro n’ebe mmadụ nile nọ, ọ ghaghịkwa ịbụ onye nwere ike izi ihe, onye na-anagide ihe ọjọọ, na-eji ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị; ma a sị na ọ bụ ezie ma eleghị anya na Chineke ga-enye ha nchegharị ka ha wee mazuo eziokwu.’ (2 Timoti 2:24, 25) Ndị Kraịst bụ ndị na-azụ atụrụ kwesịrị iji ịdị nwayọọ na-elebara ndị ọzọ anya mgbe ha na-agbalị inyere ndị ahụ na-esighị ike n’ụzọ ime mmụọ aka, n’ihi na ìgwè atụrụ ahụ bụ nke Chineke. Ndị okenye ekwesịghị imeso ha dị ka onye ọrụ e goro ego ga-esi mesoo ha kama ọ dị mkpa ka ha dịrị nwayọọ n’obi, dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst.—Jọn 10:11-13.

8. Gịnị mere Mosis ahụ nke dị nwayọọ n’obi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

8 Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri onye okenye ike ijigide mmụọ dị nwayọọ. ‘Mosis dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa madụ nile ndị nọ n’elu ala.’ (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Ma mgbe ụmụ Israel zutere ụkọ mmiri na Kedesh, ha sesoro Mosis okwu, taakwa ya ụta maka idupụta ha n’Ijipt wee banye n’ọzara nke ihe ọ bụla na-adịghị na ya. N’agbanyeghị ihe nile Mosis jiworo obi dị umeala wee tachie obi na ya, o kwuru okwu n’ike, n’echeghị echiche. Ya na Erọn guzoro n’ihu ndị ahụ wee dọrọ uche bịa n’ebe ha onwe ha nọ, Mosis na-asị: “Biko, nụrụnụ, ndị na-enupụ isi, ànyị ga-eme ka mmiri si na nkume a dị elu pụtara unu?” Mgbe ahụ, Mosis jiri mkpanaka ya tie nkume ahụ ugbo abụọ, Chineke wee mee ka “mmiri hiri nne” pụtara ndị ahụ na anụ ụlọ ha nile. Jehova enweghị obi ụtọ n’ihi na Mosis na Erọn edoghị Ya nsọ, ya mere Mosis enweghị ihe ùgwù nke iduru ụmụ Israel banye n’Ala Nkwa ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 20:1-13; Deuterọnọmi 32:50-52; Abụ Ọma 106:32, 33.

9. Olee ụzọ a pụrụ isi tinye ịdị nwayọọ nke onye okenye n’ule?

9 A pụkwara itinye ịdị nwayọọ nke onye Kraịst bụ okenye n’ule n’ụzọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị na mmadụ nke ‘a fụliworo elu, onye ọrịa banyere ajụjụ na esemokwu n’ihi okwu efu na-arịa’ pụrụ ibilite. Pọl kwukwara, sị: “Ekworo, esomokwu, nkwulu, ajọ echiche, na-esi n’ime ha na-apụta, bụ́ ịrụ ụka nke mmadụ ndị mebiworo n’uche, ndị a pụnarawokwara ha eziokwu.” Onye nlekọta ahụ bụ Timoti agajeghị ime ihe n’ike kama ọ ga “na-agbanarị ihe ndị a,” ọ ga “na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ.”—1 Timoti 6:4, 5, 11.

10. Gịnị ka Taịtọs ga-echetara ọgbakọ ndị ahụ?

10 Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka ndị okenye bụrụ ndị dị nwayọọ, ọ dị mkpa ka ha guzosie ike maka ihe ziri ezi. Taịtọs mere otú ahụ, na-echetara ndị ahụ nọ n’ọgbakọ ndị ahụ dị na Krit “ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka ha nwee obi ọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (Taịtọs 3:1, 2) N’igosi ihe mere ndị Kraịst ji kwesị ịdị nwayọọ n’obi n’ebe mmadụ nile nọ, Taịtọs gaje ime ka ọ pụta ìhè otú Jehova siworo gosi obi ọma na ịhụnanya. Chineke azọpụtabeghị ndị kwere ekwe n’ihi ezi omume ọ bụla ha meworo kama ọ bụ dị ka ebere ya nke sitere n’aka Jisọs Kraịst si dị. Ịdị nwayọọ na ndidi nke Jehova pụtakwara nzọpụta nye anyị. Ya mere, dị ka Taịtọs, ndị okenye nke oge a kwesịrị ichetara ọgbakọ dị iche iche ka ha doo onwe ha n’okpuru Chineke, na-eṅomi Ya site n’imeso ndị ọzọ n’ụzọ dị nwayọọ.—Taịtọs 3:3-7; 2 Pita 3:9, 15.

Ịdị Nwayọọ Na-eduzi Onye Ndụmọdụ nke Nwere Amamihe

11. Dị ka Ndị Galetia 6:1, 2 si kwuo, olee ụzọ e kwesịrị isi nye ndụmọdụ?

11 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye bụ atụrụ n’ụzọ ihe atụ emehiewo? Pọl sịrị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị. Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.” (Ndị Galetia 6:1, 2) Ndụmọdụ na-adị irè karị ma ọ bụrụ na e nye ya ná mmụọ nke ịdị nwayọọ. Ọbụna ma a sị na ndị okenye na-anwa inye onye iwe na-ewe ndụmọdụ, ha kwesịrị igosipụta njide onwe onye, na-aghọta na “ire nro na-anyajikwa ọkpụkpụ.” (Ilu 25:15) A pụrụ iji okwu dị nro mee ka onye siri ike dị ka ọkpụkpụ dịtụ nro, àgwà ya nke siri ike pụkwara ịgbazelata.

12. Olee ụzọ mmụọ dị nwayọọ pụrụ isi nyere onye na-enye ndụmọdụ aka?

12 Jehova bụ Onye Ozizi nke dị nwayọọ n’obi, ụzọ izi ihe ya nke dị nwayọọ na-adịkwa irè n’ime ọgbakọ. Nke a na-adị otú a karịsịa mgbe ndị okenye hụrụ ya dị ka ihe dị mkpa inye ndị mmadụ ndụmọdụ, bụ́ ndị enyemaka ime mmụọ dị mkpa. Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ònye bụ onye amamihe nke na-aghọtakwa ihe n’etiti unu? Ya site n’ibi obi ọma ya gosi ọrụ ya nile n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe.” Ịdị nwayọọ na-abịa site ná nsọpụrụ na inwe ekele maka “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” ya na mmadụ iji obi dị umeala mata ebe ike ya ruru. Mmụọ nke dị nwayọọ, dịkwa umeala na-echebe onye na-enye ndụmọdụ pụọ n’ikwu okwu ndị na-emebi ihe na imehie ihe, na-emekwa ka ndụmọdụ ọ na-enye bụrụ nke dị mfe karị ịnakwere.—Jemes 3:13, 17.

13. Olee ụzọ “ịdị nwayọọ nke amamihe” na-esi emetụta ụzọ e si enye ndụmọdụ?

13 “Ịdị nwayọọ nke amamihe” adịghị agụnye onye na-enye ndụmọdụ ịbụ onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche banyere mmetụta ọ ga-enwe ma ọ bụ ikwu okwu n’ụzọ dị ike. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, inwe nchegbu banyere ọbụbụenyi ma ọ bụ inweta ihu ọma nke mmadụ ekwesịghị ịkpali onye okenye ka o kwuo ihe ndị a haziri ka ha tọọ onye a na-agwa ha ụtọ kama iji nwayọọ nye ndụmọdụ guzoziri eguzozi, nke dabeere n’Okwu Chineke. (Ilu 24:24-26; 28:23) Ndụmọdụ nke Amnọn natara n’aka nwa nwanne nna ya masịrị ya, ma o mere ka ọ tụfuo ndụ ya. (2 Samuel 13:1-19, 28, 29) N’ihi ya, ndị okenye nke oge a aghaghị izere ịgwagbu ụkpụrụ Bible iji mee ka akọ na uche otu onye nwee ntụsara ahụ, n’ihi na ime otú ahụ pụrụ itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ. Dị ka Pọl, ndị okenye agaghị ala azụ n’ịgwa ndị ọzọ “izu nile nke Chineke.” (Ọrụ 20:26, 27; 2 Timoti 4:1-4) Onye Kraịst tozuru okè nke na-enye ndụmọdụ na-egosipụta egwu Chineke, na-enyekwa ndụmọdụ ezi omume site n’ịdị nwayọọ nke amamihe.

14. N’ihi gịnị ka onye okenye kwesịrị iji lezie anya ka ọ ghara ime mkpebi ndị ọzọ kwesịrị imere onwe ha?

14 Ịdị nwayọọ nke e jikọtara ya na amamihe nke sitere n’eluigwe ga-egbochi onye okenye ịchọ ihe ndị siri ike n’aka mmadụ. O kwesịkwara ịghọta na ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya na ihe na-ekwesịghị ekwesị ya ime mkpebi onye ọzọ kwesịrị imere onwe ya. Onye okenye ga-aza ajụjụ maka ihe si na ya pụta ma ọ bụrụ na o meere ndị ọzọ mkpebi, ọ ga-ekerekwa òkè n’ịta ụta maka ihe ọjọọ ọ bụla si na ya pụta. Onye okenye pụrụ ịkpọtụ uche n’ihe Bible kwuru, ma ọ bụrụ na e nweghị iwu Akwụkwọ nsọ metụtara okwu ahụ, echiche na akọ na uche nke onye ahụ n’onwe ya aghaghị ịbụ ihe ga-ekpebi ihe ọ ga-eme ma ọ bụ ihe ọ na-agaghị eme. Dị ka Pọl kwuru: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5; Ndị Rom 14:12) Otú ọ dị, a pụrụ inyere onye na-ajụ ajụjụ aka irute ná mkpebi ziri ezi site n’onye okenye ịjụ ajụjụ ndị ga-enyere onye ahụ aka ịtụgharị uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị metụtara nhọrọ ndị ọ pụrụ ime.

15. Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye okenye amaghị azịza nye otu ajụjụ?

15 Ọ bụrụ na onye okenye amaghị azịza nye otu ajụjụ, o kwesịghị ịzaghachi nanị ka o wee mepụ onwe ya ihere n’ihu. Ịdị nwayọọ nke amamihe ga-egbochi ya ịza azịza site n’ịkọ nkọ wee si otú a, ma eleghị anya, nye azịza na-ezighị ezi nke pụrụ ịkpata ihe isi ike mgbe e mesịrị. E nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3:7; tụlee Ilu 21:23.) Onye okenye kwesịrị “ikwu okwu” nanị mgbe ọ maara azịza nye ajụjụ ahụ ma ọ bụ mgbe o meworo nnyocha zuru ezu iji nye nzaghachi ziri ezi. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịhapụ ajụjụ ndị metụtara ịkọ nkọ n’azaghị ha aza.—Ilu 12:8; 17:27; 1 Timoti 1:3-7; 2 Timoti 2:14.

Uru nke Ìgwè Ndị Ndụmọdụ

16, 17. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka ndị okenye jụta ihe n’ọnụ ndị okenye ibe ha?

16 Ekpere na ọmụmụ ihe ga-enyere ndị okenye aka ịza ajụjụ na idozi nsogbu ndị siri ike, ma e kwesịrị icheta na ‘n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka a na-arụzu ihe.’ (Ilu 15:22) Ịjụta ihe n’ọnụ ndị okenye ndị ọzọ na-arụpụta nchịkọta nke amamihe bara uru. (Ilu 13:20) Ndị okenye nile enweghị ahụmahụ ma ọ bụ ihe ọmụma Bible hà nhata. Ya mere, ịdị nwayọọ nke amamihe ga-akpali onye okenye nke na-enwechabeghị ahụmahụ ịjụta ihe n’ọnụ ndị okenye nwere ihe ọmụma na ahụmahụ dị ukwuu karị, karịsịa mgbe e nwere okwu siri ike a ga-elebara anya.

17 Mgbe a họpụtara ndị okenye ileba anya n’okwu siri ike, ha ka pụkwara ịchọ enyemaka n’emeghị ka nke a pụta ìhè. Iji nyere ya aka n’ikpe ụmụ Israel ikpe, Mosis họpụtara “ndị dimkpa, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị na-ekwu eziokwu, ndị na-akpọ uru na-ezighị ezi asị.” Ọ bụ ezie na ha bụ ndị okenye, ha enweghị ihe ọmụma na ahụmahụ ruru ka nke Mosis nwere. Ya mere, “okwu nile nke siri ike ka ha na-ewetara Mosis, ma ha onwe ha na-ekpe okwu nta nile.” (Ọpụpụ 18:13-27) Ya mere, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, o ziri ezi na ndị okenye ndị na-eleba anya n’okwu siri ike n’oge a pụrụ ịchọ enyemaka nke ndị nlekọta nweworo ahụmahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ ha onwe ha na-eme mkpebi ikpeazụ.

18. N’ileba anya n’okwu ikpe, gịnị bụ ihe ndị na-ekpebi ihe, ndị na-eme ka e jide n’aka na e mere mkpebi ziri ezi?

18 Mishnah ndị Juu kwuru na n’Israel, ọnụ ọgụgụ ndị na-anọ n’ụlọ ikpe obodo na-adị iche iche na-adabere n’otú okwu ahụ siruru n’ike. E nwere ezi uru na-abịa site n’inwe ọtụtụ ndị na-enye ndụmọdụ, ọ bụ ezie na ọ bụghị ọnụ ọgụgụ nanị na-eme ka e jide n’aka na ihe a na-eme ziri ezi, n’ihi na ndị ka n’ọnụ ọgụgụ pụkwara ijehie. (Ọpụpụ 23:2) Ihe ndị e ji ekpebi ikpe ndị na-eme ka e jide n’aka na a ga-eme mkpebi ndị ziri ezi bụ Akwụkwọ nsọ na mmụọ Chineke. Amamihe na ịdị nwayọọ ga-akpali ndị Kraịst ido onwe ha n’okpuru ihe ndị a.

Iji Ịdị Nwayọọ Na-agba Àmà

19. Olee ụzọ ịdị nwayọọ na-esi enyere ndị Jehova aka ịgbara ndị ọzọ àmà?

19 Ịdị nwayọọ na-enyekwara ndị ohu Jehova aka ịgba àmà nye mmadụ ndị nwere ọnọdụ obi dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 9:22, 23) N’ihi na Jisọs ji ịdị nwayọọ zie ihe, ndị dị umeala n’obi atụghị ya egwu, dị ka ha tụrụ ndị ndú okpukpe ahụ na-eme ihe n’aka ike. (Matiu 9:36) N’eziokwu, ụzọ ya nile nke ịdị nwayọọ dọọrọ ndị bụ “atụrụ” bịa n’ebe ọ nọ, ọ bụghị ndị bụ “ụmụ ewu.” (Matiu 25:31-46; Jọn 3:16-21) Ọ bụ ezie na Jisọs jiri okwu ndị siri ike mee ihe n’ihe banyere ndị ihu abụọ ahụ yiri ewu, Ndịàmà Jehova aghaghị ịdị nwayọọ mgbe ha na-akpọsa ozi ikpe ọmụma Chineke n’oge a n’ihi na ha enweghị otu ụdị nghọta na ikike ahụ Jisọs nwere. (Matiu 23:13-36) Ka ha na-anụ ka a na-eji ịdị nwayọọ na-ekwusa ozi Alaeze ahụ, ‘ndị ahụ e doziworo maka ndụ ebighị ebi na-aghọ ndị kwere ekwe,’ dị ka ha mere, bụ́ ndị ahụ yiri atụrụ, bụ́ ndị nụrụ ihe Jisọs kwuru.—Ọrụ 13:48.

20. Olee ụzọ onye mmụta Bible na-esi erite uru mgbe e ji ịdị nwayọọ zie ya ihe?

20 A na-arụpụta ezi ihe mgbe e ji ịdị nwayọọ na-agbara ndị ọzọ àmà, na-ezikwa ha ihe, sitekwa n’ịgwa ha okwu n’ihe ndabere nke ezi usoro echiche, ụkpụrụ Bible, na eziokwu. “Doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka Onyenwe unu,” ka Pita dere, “bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:15) Nwata akwụkwọ nke a na-ezi ihe n’ụzọ dị nwayọọ ga-enwe ike ịtụkwasị uche n’ihe ọ na-amụ kama ịbụ onye a dọpụrụ uche ya, ọbụna ma eleghị anya mee ka ọ sụọ ngọngọ, site n’àgwà olu ike nke na-arụkarị ụka. Dị ka Pọl, ndị na-eje ozi, ndị ji ịdị nwayọọ na-ezi ihe pụrụ ikwu, sị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ije ozi anyị ụta.” (2 Ndị Kọrint 6:3) Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị na-emegide emegide na-anabata ndị ahụ ji ịdị nwayọọ na-ezi ihe.

A Chọrọ Ịdị Nwayọọ n’Aka Mmadụ Nile

21, 22. Olee ụzọ ịdị nwayọọ na-esi abara ndị Jehova nile uru?

21 Ịdị nwayọọ nke ndị Kraịst ekwesịghị ịbụ ihe e yikwasịrị nanị iji dọrọ mmasị ndị na-anọghị n’ime nzukọ Jehova. Àgwà nke a dịkwa oké mkpa ná mmekọrịta dị n’etiti ndị Chineke. (Ndị Kọlọsi 3:12-14; 1 Pita 4:8) A na-ewulite ọgbakọ dị iche iche elu n’ime mmụọ mgbe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, bụ́ ndị dị nwayọọ n’obi na-arụkọ ọrụ. Igosipụta ịdị nwayọọ na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ dị mkpa nye onye ọ bụla n’etiti ndị Jehova n’ihi na e nwere “otu iwu” nye mmadụ nile.—Ọpụpụ 12:49; Levitikọs 24:22.

22 Ịdị nwayọọ na-atụkwasị ihe n’udo na obi ụtọ nke ndị Chineke. Ya mere, o kwesịrị ịbụ otu akụkụ nke àgwà ndị bụ isi ndị mejupụtara uwe ndị Kraịst nile na-eyi n’ebe obibi, n’ọgbakọ, na n’ebe ndị ọzọ. Ee, ọ dị ndị ohu Jehova nile mkpa iyikwasị ịdị nwayọọ dị ka uwe.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ okenye na-aghaghị iji bụrụ ndị dị nwayọọ n’obi?

◻ Olee ụzọ ịdị nwayọọ na-esi eduzi onye maara ihe nke na-enye ndụmọdụ?

◻ Abamuru dị aṅaa dị n’inwe ọtụtụ ndị na-enye ndụmọdụ?

◻ N’ihi gịnị ka ọ na-eji aba uru ịgba àmà n’ịdị nwayọọ?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị Jehova bụ ndị yiri atụrụ, ọ dịkwa mkpa imeso ha ihe n’ịdị nwayọọ

[Ebe e si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

[Foto dị na peeji nke 19]

Ịdị nwayọọ na-enyere ndị Jehova aka ịgbara ndị nwere ọnọdụ obi dị iche iche àmà

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya