Ì Nwere Ekele Maka Nzukọ Elu Ala nke Jehova?
LEE anya na nkume diamond mara mma nke a kwọchasịrị nke ọma, gịnịkwa ka ị na-ahụ? Nkume dị oké ọnụ ahịa nke bụ ihe mara mma n’ezie. Ugbu a, jiri enyo microscope nyochaa diamond ahụ, gịnịkwa ka ị na-ahụ? O yikarịrị ka à ga-enwe ebe ihe kawasịrị ahụ ya, ebe ndị o mere mgbawa, ihe ndị ọzọ dị n’ime ya, ma ọ bụ ntụpọ ndị ọzọ
Ị̀ ga-ebibi ma ọ bụ tụfuo diamond ahụ n’ihi otú ọ dị ma e si n’enyo microscope nyochaa ya? O doro anya na ị gaghị eme otú ahụ! Ị hapụtụhaala enyo microscope ahụ, ị ka pụkwara inweta ọṅụ site n’ịma mma na mgbukepụ na-enweghị atụ nke mere ka ọ bụrụ ihe pụrụ iche n’etiti nkume ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa.
Dị ka diamond, nzukọ elu ala nke Jehova guzopụrụ iche n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Ọ dịghị nzukọ ọ bụla ọzọ n’elu ala nke ya na Onye Okike ahụ nwere mmekọrịta chiri anya. N’otu akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst e tere mmanụ na narị afọ mbụ, bụ́ ndị nwere olileanya eluigwe ahụ, Pita onyeozi zoro aka ná mmekọrịta nke a pụrụ iche. Ọ sịrị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụaja ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” (1 Pita 2:9) Taa, oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ,” ndị nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala, esonyerewo ndị fọdụrụ ná ‘mba ahụ dị nsọ’ n’ife Chineke. (Jọn 10:16) N’ịdị n’otu, òtù abụọ nke a mejupụtara nzukọ nke guzopụrụ iche dị ka nkume dị oké ọnụ ahịa nke mara mma, na-egbukepụkwa n’ụzọ na-enweghị atụ.
Zere Iji Anya Nchọpụta Mmejọ Na-ele Ndị Ọzọ
Ma anyị aghaghị ịmata na ihe mejupụtara nzukọ nke a zuru ụwa ọnụ bụ ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè. Ya mere, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ejiri enyo microscope ihe atụ wee nyochaa ya? Ee, anyị ga-ahụ mmụọ ime mmehie na ntụpọ ọdịdị mmadụ dị iche iche n’ime mmadụ ndị so na ya.—Ndị Rom 3:23.
Pọl onyeozi nakweere na ya nwere ntụpọ ndị dị otú ahụ. Ọ sịrị: “Ihe ọjọọ dị m nso n’ebe aka m ga-eru, mụ, bụ́ onye na-achọ ime ihe ọma.” (Ndị Rom 7:21) Onye Kraịst ọ bụla na-enwe otu mburịta agha ahụ. Mmadụ nile na-emehiecha ihe. Karịsịa, mgbe ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-ata ahụhụ n’ihi mmehie ihe nke onye ọzọ. Ànyị kwesịrị ịkụda aka wee nwee ịda mbà n’obi mgbe ntụpọ na ezughị okè nke ndị Kraịst ibe anyị pụtara ìhè? Nke ahụ ò kwesịrị ibelata ekele anyị nwere maka nzukọ Jehova? O kwesịghị ime otú ahụ ma ọlị! Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịhapụtụ enyo microscope ahụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, ma kwụsị ilekwasị anya n’ezughị okè nke ndị mmadụ n’otu n’otu.
Akwụkwọ nsọ depụtara àgwà dị iche iche ndị ga-eme ka a mara ndị mmụọ nsọ na-arụ ọrụ n’ahụ ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe [“ikwesị ntụkwasị obi,” NW] ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ụzọ megidere nke ahụ, òtù okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke azụmahịa nke ụwa nke a na-egosipụtakarị ihe Bible zoro aka na ya dị ka ọrụ nile nke anụ ahụ, bụ́: “ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa, ịrọ òtù, ịkpọasị, ịṅụbiga mmanya ókè, ite egwú [“oriri oké mkpọtụ,” NW], na ihe yiri ihe ndị a.” (Ndị Galetia 5:20, 21) Otú a, dị ka diamond nke na-egbukepụ egbukepụ n’etiti nkume dị iche iche, ndị Jehova guzopụrụ iche n’etiti ụwa nke rụrụ arụ n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 5:14-16.
“Ka Unu Zuo Okè n’Otu Uche ahụ”
Otu ihe pụrụ iche banyere nkume diamond bụ nhazi atom ndị dị na ya nke kpachikọtara nnọọ ọnụ. N’otu aka ahụ, nzukọ elu ala nke Jehova na-egosipụta ịdị n’otu na-enweghị atụ n’ozizi na ịbụ ụmụnna. Ndị nọ ná nzukọ ahụ na-etinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ, bụ́ nke a na-achọta n’ime Bible ná 1 Ndị Kọrint 1:10, nke na-asị: “Ma, ụmụnna m, esitere m n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst rịọ unu, ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu; kama ka e mee unu ka unu zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.”
Ndịàmà Jehova emeriwokwa ịkpọasị nke agbụrụ na mpako nke mba. Ebe ha nwere “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” ha adịghị ‘ele mmadụ anya n’ihu.’ (Jemes 3:17) Anyị na-enye Jehova otuto maka ihe o mezuworo n’ihe banyere nke a ná nzukọ ya nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè mejupụtara.
N’ụzọ megidere nke a, magazin bụ The Christian Century, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere afọ 1990, o kwuru na “ụwa yiri ka è kewasịrị ya ekewasị n’ụzọ ọ na-adịbeghị mbụ n’ihi òtù okpukpe dị iche iche nakwa n’ihi mmetụta agbụrụ na mba dị iche iche ndị nwere njikọ chiri anya n’etiti ha na nkwenkwe okpukpe dị iche iche. Site n’India ruo Europe, sitekwa n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ruo n’ógbè Pacific, okpukpe gwakọtara ná nrubeisi nke agbụrụ na nke mba dị iche iche—bụ́ nke na-arụpụtakarị ọnọdụ ọgba aghara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” O doro anya na ndị ahụ na-achọ ijere Chineke ozi pụrụ nanị ichigharịkwuru otu nzukọ ahụ nke na-enweta mmụọ na ngọzi Jehova.
‘Dị Ka Diamond, Ka M Meworo Egedege Ihu Gị’
Nkume diamond bụ ihe si n’okike pụta nke kasị sie ike mmadụ maworo. Bible na-ezo aka n’ojiji a na-eji diamond eme ihe n’ịka akara ma ọ bụ ide ihe n’elu ihe ndị siri ike. (Jeremaịa 17:1) Rịbakwa ama okwu Jehova gwara Ezikiel: “Lee, emewo m ihu gị ka ọ dị ike megide ihu ha, ọ bụkwa egedege ihu gị ka m meworo ka ọ dị ike megide egedege ihu ha. Dị ka nkume adamant [“diamond,” NW] nke dị ike karị ọmụ, otú a ka m meworo egedege ihu gị.” (Ezikiel 3:8, 9) Jehova nyere Ezikiel mkpebi nke siri ike dị ka diamond, bụ́ nke mere ka o nwee ike iburu ndị isi ike amụma.—Ezikiel 2:6.
N’otu aka ahụ taa, Jehova emewo ka ndị ya sie ike dị ka diamond n’agbanyeghị oké mmegide. Ndịàmà Jehova anagidewo mmachibido iwu, mwakwasị nke ìgwè ndị na-eme ihe ike, ntigbu, otiti ihe, ịtụ mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi, ntaramahụhụ, ọbụna ogbugbu. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha egosipụtawo na okwukwe ha bụ nke a na-apụghị imebi emebi.
“Ndị Ohu M Ga-aṅụrị Ọṅụ”
Bible buru amụma banyere oge mgbe ndị mmadụ ‘ga-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke’ ma ‘na-agọ ike ya.’ (2 Timoti 3:1, 5) Otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ kọrọ na “Ndị Protestant, Roman Katọlik na ndị Juu na-echegbucha onwe ha banyere ndalata ahụ” e nwere na chọọchị na n’ụlọ nzukọ ha dị iche iche. N’aka nke ọzọ, Ndịàmà Jehova bụ ndị na-amụsi Bible ike. N’ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye, ma ụmụntakịrị ma ndị agadi, ndị ikom na ndị inyom, ha nile na-eje nzukọ dị iche iche a na-enwe kwa izu. Otu akwụkwọ ozi e degaara otu akwụkwọ akụkọ kwuru banyere ha na “okpukpe ha bụ ihe kasị dịrị oké ọnụ ahịa ha nwere, nanị ihe bụ nchegbu ha bụkwa iso ndị ọzọ kerịta ya.”
Àgwà dị otú ahụ na-eme ka nzukọ Jehova guzopụ iche dị ka diamond dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụkwa Onye ahụ nke na-ewusi mmadụ ndị na-ezughị okè ike, ma na-eduzi ha site ná mmụọ nsọ ya ka nsọpụrụ dịịrị maka nke a.
Aịsaịa onye amụma buru amụma, sị: “N’ihi nke a ka Onyenwe anyị Jehova ji kwuo otú a, sị, Lee, ndị ohu m ga-eri ihe . . . Lee ndi ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ . . . Lee, ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ . . . Lee ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.”—Aịsaịa 65:13, 14.
Taa, anyị na-ahụ mmezu nke amụma nke a. Chineke na-elekọta ndị ya n’ụzọ na-enweghị atụ! Ya mere, ọ bụrụ na i soro ha na-akpakọrịta, ekwela ka echiche ọ bụla na-ezighị ezi napụ gị ọṅụ gị. Lezuo ihe dum anya ma cheta: Ọ dịghị nzukọ ọ bụla ọzọ dị n’elu ala nke nwere nlekọta na nchebe pụrụ iche nke Chineke. Akwụsịkwala iji ihe ùgwù gị nke iso na ya kpọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa.