‘Ajọ Ọrịa Na-efe Efe n’Ebe Dị Iche Iche’
AJỌ ọrịa na-efe efe n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụbeghị mbụ bụ otu akụkụ e buru n’amụma nke “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [Jisọs Kraịst] na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a.” (Matiu 24:3, NW) Onye ahụ dere Oziọma bụ Luk nyere nkọwa nke a a na-ehotaghị n’ihe ndekọ nke Matiu na Mak. (Matiu, isi 24 na 25; Mak, isi 13) A ga-enwe ntiwapụ nke ọrịa na nrịrịa ndị na-akpata oké mbibi “n’ebe dị iche iche” n’ime mgbe ikpeazụ. (Luk 1:3; 21:11) Olee ebe ọrịa ndị dị otú ahụ pụrụ isi bịa?
“Ndị ọkà mmụta sayensị maara banyere njé ọrịa virus dị iche iche ndị na-ezogharị n’akụkụ ụwa ebe okpomọkụ ndị ọ ga-abụ—site n’enyemaka dị nta site n’usoro ihe e kere eke—ga-akpata ọnwụ hiri nne nke ukwuu karịa nke a pụrụ inwe site ná ntiwapụ ọrịa AIDS,” ka akwụkwọ Science News na-ekwu. “Ọbụna ma a sị na ọnụ ọgụgụ njé ọrịa virus e nwere gburugburu ụwa anọgide otú ọ dị, ndị ọkà n’ime nnyocha na-ekwu na akụkụ ụwa ebe okpomọkụ enweworị ‘ike’ njé ọrịa virus zuru ezu ikpochapụ akụkụ ndị dị ukwuu nke ọnụ ọgụgụ mmadụ bi n’Elu Ala.”
Ihe mere ka ọgbọ anyị nke a bụrụ nke ka nọrọ n’ihe ize ndụ bụ ọnụ ọgụgụ mmadụ bi n’ụwa nke na-amụba n’ike n’ike na mkpa ndị na-adịwanye ukwuu nke ụwa ebe mmadụ jubigara ókè. Akwụkwọ Science News na-asị, “Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ntiwapụ ọrịa na-eyi ndụ egwu ndị njé ọrịa virus kpatara anọwo na-esochi ọtụtụ mgbe, mgbe ụmụ mmadụ malitere ịga ebe mmadụ na-agabeghị mbụ ma ọ bụ mgbe ọnọdụ ibi ndụ n’obodo ukwu dị iche iche retọrọ n’ụzọ ndị kpọworo njé ọrịa virus ndị ọhụrụ òkù.” Ka ụmụ mmadụ na-awabanye n’ógbè ndị jupụtara na njé ọrịa virus bụ ebe a na-adịghị ejerubu, ntiwapụ ọrịa ndị ọhụrụ na-esochi. Otu ihe ahụ na-eme ka ụmụ ahụhụ dị iche iche na-agbasapụwanye ebe ha na-ejeru mgbe ọnọdụ ihu igwe zuru ụwa ọnụ na-agbanwe. “Ọzọkwa,” ka magazin ahụ kwuru, “ihe omume ọgbara ọhụrụ ndị a na-eme n’ịgwọ ọrịa dị ka mmịnye ọbara na itinyere onye ọzọ akụkụ ahụ nke onye ọzọ enyewo ụmụ njé ọrịa virus ndị a ụzọ ọhụrụ ha na-esi agafe site n’otu onye gaa n’ibe ya. Otú ahụkwa ka mgbanwe ndị e nweworo n’akparamagwa ọha mmadụ meworo, site ná ndị ọgaranya na ndị a ma aha ha ịga njem nke ukwuu ruo ná ndị ọgwụ ọjọọ riworo ahụ ijirịta otu ntụtụ na-agba onwe ha ọgwụ.”
“Akụkọ ihe mere eme nke oge na-adịbeghị anya na-egosi ihe atụ ndị pụtara ìhè nke mwakwasị nke njé ọrịa virus n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ ndị pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke ntiwapụ ọrịa ndị ka ukwuu n’ọdịnihu,” ka ihe odide ahụ kwukwara. Ihe atụ ụfọdụ bụ: njé ọrịa Marburg ahụ a na-amabughị ama, bụ́ njé ọrịa na-egbu egbu nke dị n’ebe okpomọkụ nke wetaara ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ihe otiti na West Germany n’akụkụ ikpeazụ nke afọ ndị 1960; njé ọrịa virus ahụ nke na-akpata ahụ ọkụ Rift Valley nke jidere ọtụtụ nde mmadụ, gbuokwa ọtụtụ puku mmadụ n’Ijipt na 1977; njé ọrịa virus Ebola ahụ nke na-adị n’ebe okpomọkụ nke jidere ihe karịrị otu puku mmadụ na Zaire na Sudan na 1976, gbuokwa ihe dị ka 500, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị dọkịta na ndị nọọsụ ndị na-elekọta ndị ọ kpatawooro ọrịa.
A naghị enwecha ike ibu ụzọ kwuo mgbe a ga-enwe ntiwapụ ọrịa ndị njé ọrịa virus kpatara. “Dị ka ihe atụ, na 1918, otu ụdị njé ọrịa siri nnọọ ike nke ahụ ọkụ ụmụ mmadụ gbasara gburugburu ụwa, na-egbu ihe e chere na o ruru 20 nde mmadụ,” ka Science News kwuru. “N’oge ndị na-adịbeghị anya karị, mpụta nke otu njé ọrịa virus pụtara n’ahụ ụmụ mmadụ, bụ́ nke ọ pụrụ ịbụ na ọ dịbu nanị n’ime enwe ndị dị n’Africa nwụdekwara ụwa na mberede ọzọ. Ugbu a, njé ọrịa AIDS ejidewo malite na 5 nde mmadụ ruo nde 10 na 149 mba dị iche iche, dị ka atụmatụ òtù World Health Organization mere si dị. Ma n’agbanyeghị ndọrọ uche ihe otiti nke a kasị dịrị ọhụrụ dọtaworo, ndị ọkà mmụta banyere njé ọrịa virus na-atụ egwu na ihe ndị na-eyi egwu karị ka na-eche anyị n’ihu.”
Ọ bụ ezie na ajọ ọrịa na-efe efe na-akpata ihe isi ike, ha bụ akụkụ ihe ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mezuru nke ọnụnọ Jisọs n’ebube Alaeze, ya na akụkụ ndị ọzọ dị ka agha, oké ụnwụ, na oké ala ọma jijiji. (Mak 13:8; Luk 21:10, 11) Akụkụ ndị a bụkwa ihe mere a ga-eji ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na Luk depụtakwara okwu Jisọs ndị a: “Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:28.