Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/15 p. 25-28
  • Ọ̀ Bụ Ije Ozi nke Dịịrị Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Bụ Ije Ozi nke Dịịrị Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa nke Ndị Na-eje Ozi
  • Ije Ozi Ndị Kraịst
  • Ò Kwesịrị Ịbụ Ọrụ Ị Ga-arụ?
  • Gbalịa Ije Ozi Zuru Ezu Karị
  • Ole Ndị Bụ Ndị Ozi Chineke Taa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • “Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/15 p. 25-28

Ọ̀ Bụ Ije Ozi nke Dịịrị Gị?

JEHOVA egosipụtawo mmesapụ aka ya site n’ịkwajupụta ihe n’ụwa ka anyị wee nweta ọṅụ ná ndụ. O ji afọ ofufo kwere ka ihe ndị a dịgide ọbụna mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi. Karịa nke ahụ, o gosipụtawo ịhụnanya ya na-enweghị atụ n’izite Ọkpara ya ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ kwere ekwe site n’ọdachi nke mmehie.—Matiu 5:45; Jọn 3:16.

Olee ụzọ anyị ga-esi zaghachi n’ịhụnanya dị otú ahụ? Jisọs kwuru na anyị aghaghị ịhụ Jehova bụ Chineke anyị n’anya site n’obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum. Nke a na-atụ aro na anyị ji ya ụgwọ ofufe na nguzosi ike n’ihe anyị, na anyị kwesịkwara ịdị ndụ anyị n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya.—Mak 12:30; 1 Pita 4:2.

Ma gịnị ka o metụtara, bụ́ ime uche Chineke? Ọ̀ dị ozi anyị pụrụ ijere ya—ije ozi nke anyị kwesịrị ikere òkè na ya?

Mkpa nke Ndị Na-eje Ozi

Chọọchị dị iche iche etinyewo ihe mgbagwoju anya n’uche ụmụ mmadụ banyere ụzọ a ga-esi fee Chineke, jeekwara ya ozi. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-egosi na e nwere nanị otu ezi okpukpe, “otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe dị, otu baptism dị, otu Chineke na Nna nke anyị nile dị.” Jisọs kwuru, sị: “Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu.” N’ihi ya, e nyere ha ndụmọdụ, sị: “Ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 4:3-6; Jọn 4:23; 1 Ndị Kọrint 1:10.

Mgbagwoju anya banyere ihe bụ ezi okpukpe malitere n’Iden mgbe Setan mara izi ezi nke ịbụ ọkaaka Jehova aka site n’itinye ụzọ Chineke si achị achị n’ajụjụ. (Jenesis 3:1-6, 13) Ugbu a, Setan na-akwado mmegide nke a ọ na-emegide Chineke site n’ime ka ndị ozi nrafu nke okpukpe na-agbasa ozizi ụgha dị iche iche, bụ́ ndị “na-emekwa onwe ha ka ha yie ndị na-eje ozi ezi omume.” Ya mere Bible na-asị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwela okwu mmụọ nile . . . n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụwo baa n’ụwa.”—2 Ndị Kọrint 11:14, 15; 1 Jọn 4:1.

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na Chineke emewo ihe iji dozie ihe iseokwu nke a metụtara ọchịchị. Ebe o ziteworo Ọkpara ya ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ, o mewo ka Jisọs bụrụ Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, na-enwe ikike ibibi Setan na ndị amụma ya, ma ọ bụ ndị na-ejere ya ozi. Nke a ga-eme ka e jide n’aka na a ga-eme ihe Chineke na-achọ n’elu ala, maka ngọzi ebighị ebi nke ụmụ mmadụ ndị na-erube isi.—Daniel 7:13, 14; Ndị Hibru 2:9.

Setan ekpuchiwo eziokwu ndị a. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ihi ya ọ dị mkpa ka anyị nọrọ dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, na-ekpughe okwu ụgha nile nke Setan, na-agbara eziokwu ahụ àmà. Jehova adịghị amanye anyị amanye ije ozi nke a. Ọ chọrọ ka anyị wepụta onwe anyị dị ka Jisọs mere n’ihi obi ekele anyị nwere maka ya nakwa maka ihe o mewooro anyị.—Abụ Ọma 110:3; Ndị Hibru 12:1-3.

Ije Ozi Ndị Kraịst

Jisọs “na-agagharị n’obodo na obodo nta dị iche iche, na-ekwusa na-ezikwa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Ọ zụkwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dị ka ya onwe ya, zipụkwa ha ikwusa ozi ọma. (Matiu 10:1-14, 27) E mesịa, o nyere ha ọrụ ka ha nọgide n’ije ozi ahụ ruo nsọtụ nile nke ụwa.—Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8.

Ọrụ nke a na-adịkwasị ezi ndị Kraịst, mmụọ Chineke na-akpalikwa ha ikwusa ozi ọma. Dị ka o mere na Pentikọst 33 O.A., ndị nile na-anakwere ozi ọma ahụ na-eburu ibu ọrụ nke ikwusa okwukwe ha n’ihu ọha.—Ọrụ 2:1-4, 16-21; Ndị Rom 10:9, 13-15.

Ma, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ apụghị ịhụ onwe ha dị ka ndị na-eje ozi. Peter, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-asị, “Ndị ikom bi na Germany na-elekarị ya anya dị ka iweda onwe ha n’ala ikwu okwu banyere okpukpe. ‘Nke ahụ dịịrị ndị ndú okpukpe ime,’ ka ha na-asị.” Dị ka Tony si kwuo, bụ́ onye jeworo ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ iri afọ, ndị bi n’England ekwuwo, sị: “Ihe unu na-ekwu dị mma, echekwara m na Ndịàmà Jehova bụ ndị ezi mmadụ. Ma ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma—apụghị m nnọọ ime nke ahụ.” Ben duziiri otu nwoke bụ onye Nigeria ọmụmụ ihe ruo nwa oge, bụ́ onye gwara ya, sị: “Apụghị m igosi onwe m ebe m na-ekwusa ozi ọma n’ihu ọha site n’ụlọ ruo n’ụlọ; ma apụrụ m inye ọgbakọ unu ego iji nyere ndị dị njikere ime nke ahụ aka.” Ee, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ enweghị okwukwe na nkwenye zuru ezu maka ije ozi ndị Kraịst.

N’agbanyeghị nke ahụ, ọrụ nkwusa ihu ọha bụ ibu ọrụ dịịrị mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst n’agbanyeghị afọ ndụ ha ma ọ bụ ma hà bụ nwoke ma hà bụ nwanyị. Ọ bụghị ihe dịịrị nanị ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, bụ́ ndị ‘na-edu ndú,’ kama ọ dịịrị ndị Kraịst nile n’ozuzu ha. A gbara mmadụ nile ume, sị: “Na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbubere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya. . . . Na-ekwenyenụ ndị isi [“ndị na-edu ndú n’etiti,” NW] unu.”—Ndị Hibru 13:15, 17.

Mgbe ọ na-agwa otu ìgwè gwara ọgwa okwu n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m nke bi n’eluigwe na-achọ.” N’otu oge ọzọ, o gosiri na ime ihe Chineke na-achọ gụnyere ikwusara ndị na-ekweghị ekwe ozi ọma. Ndị na-eso ụzọ ya na-agba ya ume ka ọ hapụ ịgwa ndị Sameria ụfọdụ ozi ọma ka o wee jee rie nri, ma ọ sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ, ka m rụzuokwa ọrụ ya.”—Matiu 7:21; Jọn 4:27-38.

Ò Kwesịrị Ịbụ Ọrụ Ị Ga-arụ?

Ọ na-amasịkarị ndị mmadụ ịchụso ihe oriri anụ ahụ na akụ. Ma tupu mgbe ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs gwara ndị na-ege ya ntị okwu ndụmọdụ megide iji ịnụ ọkụ n’obi na-achụso ihe ndị dị otú ahụ. “Kama,” ka ọ sịrị, “kpadoonụ akụ n’eluigwe nye onwe unu . . . Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume [Chineke].”—Matiu 6:20, 33.

Ibu ụzọ achọ Alaeze ahụ pụtara ịghara ikwe ka ọdịmma ndị ọzọ kpuchite ije ozi anyị. Otú ọ dị, ime nke a apụtaghị iwepụchasị ihe nile ọ bụla ọzọ. Dị ka ihe atụ, Bible na-agba anyị ume ka anyị ghara ilefuru ezi ibu ọrụ ezinụlọ ndị dịịrị anyị anya. Anyị nwere ibu ọrụ ndị ahụ dị ka mmadụ nile ọzọ nwekwara ha. Ilefuru ha anya bụ ime ihe n’ụzọ megidere okwukwe ndị Kraịst. (1 Timoti 5:8) Otú o sina dị, anyị kwesịrị ime ihe nile anyị kwesịrị ime n’ụzọ ezi uche dị na ya n’ije ozi ahụ mgbe anyị nọkwa na-elekọta ibu ọrụ ndị ọzọ n’ụzọ a haziri nke ọma.

Jisọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe . . . ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ọnọdụ okwu nke amụma ahụ mere ka mmezu ya bụrụ n’oge anyị a. Kemgbe 1914, ozi ọma a na-ekwusa bụ na e nyewo Alaeze ahụ ike ime ihe n’ịkwado ịbụ ọkaaka nke Jehova, megidekwa Setan na ụwa ya. (Mkpughe 11:15-18) Anyị kwesịrị ichesi echiche ike banyere ihe nke a pụtara. Ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, anyị aghaghịkwa ịrụzu ọrụ nkwusa ahụ tupu mgbe ahụ. Ndụ ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ; anyị pụkwara inye aka ịzọpụta ọtụtụ n’ime ha.

Gbalịa Ije Ozi Zuru Ezu Karị

Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na-etinye hour iri ma ọ bụ karị kwa ọnwa n’iso ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. Ọtụtụ puku na-etinye hour abụọ ma ọ bụ karị kwa ụbọchị n’ọrụ nkwusa dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka, ndị ọzọkwa na-eje ozi n’ụzọ na-adịgide adịgdie dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụru iche. Ha ghọtara ịdị ngwa nke ọrụ nke a, chọọkwa ikere òkè kasị zuo ezu ha pụrụ ikere iji rụzuo ya tupu ọgwụgwụ nke ụwa nke a na-enweghị obi ụtọ abịarute.

Ị̀ bụworị Onyeàmà Jehova nke na-arụsi ọrụ ike? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịa ikere òkè zuru ezu karị n’ije ozi ahụ. Meziwanye ịdị irè gị n’ọrụ nkwusa na izi ihe, na-agbalị ịrụzu ihe dị ukwuu karị n’ije ozi ahụ. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ ịghọ onye ọsụ ụzọ, mee otú ahụ. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị enyeghị gị ohere n’ezie ime nke ahụ, gbaa ndị pụrụ iru eru maka ije ozi nke a ume.

Ọ bụrụ na ị bụghị Onyeàmà nke Jehova raraworo onwe ya nye, ekwula na ije ozi ahụ adịghịrị gị. Otu nwoke ọzọ aha ya bụ Peter, onye injinia, jụwapụrụ isi na nwunye ya agaghị eso ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. “M̀ ga-esi aṅaa kwere ka nwunye m na-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ?” ka ọ na-ajụ. Mgbe ọtụtụ afọ nke ịhụ mkpebi siri ike nwanyị ahụ mere banyere eziokwu nke Okwu Chineke gasịrị, ya onwe ya kpebiri ịmụkwa Bible. Ugbu a, dị ka nwunye ya, ọ bụ onye ozi nke ozi ọma ahụ nke raraworo onwe ya nye, meekwa baptism.

Ya mere, egbochila onwe gị ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi. Anyị na-agba gị ume ịmụ Bible na isonyere ezi ndị Kraịst ná nzukọ ha dị iche iche. Nke a ga-enyere gị aka iwulite ndụ gị n’ụzọ kwekọrọ n’ezi omume Chineke, wulitekwa okwukwe siri ike ná nzube ya nile. Ọ bụrụ na i nwee ọganihu na nke a, gị onwe gị ga-erukwa eru ịbụ onye na-ejere Chineke ozi. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihe ùgwù nke ikere òkè n’imezu iwu nke a Jisọs nyere: “Ya mere, gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19,20, NW.

Ee, e nwere ije ozi nke ị pụrụ ikere òkè na ya, ọ dịkwa ngwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka i mee otú ahụ ugbu a.

[Igbe dị na peeji nke 25]

Otu onye nọọsụ nke nwere ezinụlọ ọ ga-elekọta kwuru, sị: “Ana m aga njem ihe karịrị otu hour kwa ụbọchị iru ụlọ ọgwụ ebe m na-arụ ọrụ, ya mere echere m na apụghị m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ma eji m nlezianya hazie ihe omume m nile iji kere òkè n’ozi ubi n’isi ụtụtụ ọ bụla tupu m jee ọrụ, n’oge ezumike ehihie n’ụlọ ọrụ, nakwa n’ụbọchị ndị m na-agaghị eje ọrụ. Ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ ọṅụ m nwere n’ọgwụgwụ ọnwa ahụ mgbe m chọpụtara na etinyewo m 117 hour n’ọrụ nkwusa! Etinyere m 263 magazin, nata 22 ụtụ magazin, nweekwa ike ịmalite ọmụmụ Bible 3.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Michael nwere ụmụntakịrị asaa, o jikwa ọrụ dị mkpa n’otu kọleji ukwu dị na Nigeria. Ọ bụkwa onye okenye ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ na-ekwupụta echiche nke ọtụtụ puku Ndịàmà nwekwara:

“Ana m ele ije ozi ahụ anya dị ka ọrụ dịịrị m, na-echetakwa mgbe nile na Pọl kwuru, sị, ‘Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba.’ Mụ na nwunye m ‘na-akụ mkpụrụ’ n’oge a na-enwe mkparịta ụka dị mkpirikpi banyere ozi ọma ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Anyị ‘na-akwọsa mmiri’ site n’ịlaghachi n’ụlọ ndị gosiri mmasị iji zie ha ihe site na Bible, dị ka Jisọs kwuru na anyị kwesịrị ime. Ọmụmụ Bible ebe obibi a na-enwe kwa izu enyeworo ọtụtụ ndị aka—n’ọnọdụ ụfọdụ ezinụlọ dum—ịmụta eziokwu ahụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya