Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 1/1 p. 5-7
  • Iwe Ndị Na-efe Ofufe Dị Ka Ihe Ubi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwe Ndị Na-efe Ofufe Dị Ka Ihe Ubi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • “N’ụwa Nile”
  • “Olu Ha Pụrụ Jezuo”
  • “Ná Nsọtụ Nile nke Elu Ụwa Dum Mmadụ Bi”
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 1/1 p. 5-7

Iwe Ndị Na-efe Ofufe Dị Ka Ihe Ubi

ENYERE Jọn onyeozi ọhụụ nke ihe omume ndị ga-eme ka ụwa mee mkpatụ, bụ ndị ga-ewere ọnọdụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” Ọ hụrụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst n’eluigwe ka ọ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya na-eje ibu agha ezi omume, bụ́ nke e ji ịnyịnya ọcha see onyinyo ya—“na-emeri, ya na ka o wee merie.” Ihe mbụ o mere bụ isi n’eluigwe tụdata onye isi ndị iro Chineke, bụ́ Setan, na gburugburu elu ala ebe a. Setan meghachiri omume site n’iti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti site n’ụdị mgbukpọ, ụnwụ nri, na ọrịa a na-ahụtụbeghị mbụ nke e ji ndị na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ihe atụ dị iche iche na ịnyịnya ha see onyinyo ha—nke na-acha uhie uhie, nke dị oji, na nke ahụ ya yiri ozu. (Mkpughe 1:10; 6:1-8; 12:9-12) Ihe otiti ndị a tiwapụrụ nke mbụ ha n’afọ 1914, ha amụbawokwa eri mgbe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ha ga-abịaru ná njedebe ha site n’ihe Jisọs kọwara dị ka ‘mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.’—Matiu 24:3-8, 21.

Olee ụzọ ihe ga-esi gaara ndị na-efe Jehova n’oge ahụ? Mkpughe isi 7, amaokwu 1 ruo 10, na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi ndị ‘na-ejidesi ike’ ifufe nke mbibi ruo mgbe a chịkọtasịrị ndị a na-efe ofufe. N’ime oge dịworo kemgbe 1914, a chịkọtawo ndị nke ikpeazụ nọ n’elu ala, bụ́ ndị so n’Israel ime mmụọ, ndị ọnụ ọgụgụ ha bụ 144,000. Mgbe ahụkwa, “lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Oké ìgwè mmadụ nke a eruworị ọtụtụ nde n’ọnụ ọgụgụ ugbu a. Ha na-eguzo dị ka ndị a nwapụtaworo n’ihu ocheeze Chineke n’ihi inwe okwukwe n’ọbara mgbapụta nke Jisọs, onye e gburu dị ka nwa atụrụ nke na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla. “Ha wee were oké olu tie mkpu, sị, Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịịkwara Nwa Atụrụ ahụ.” Ndị a ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe ofufe nọgidere na-asị, “Bịa,” gwa ndị ọzọkwa, ndị a na-achịkọtakwa maka nzọpụta gabiga ‘oké mkpagbu ahụ.’—Mkpughe 7:14-17; 22:17.

“N’ụwa Nile”

A pụrụ ikwu banyere ndị a raara onwe ha nye ife ofufe, sị: “N’ụwa nile ka olu ha pụrụ jezuo, ná nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.” (Ndị Rom 10:18) E jiwo mkpụrụ kwesịrị ịrịba ama gọzie ọrụ ha na-arụsi ike. Dị ka ihe atụ:

Ugbu a, Mexico na-enye akụkọ ozi nke 335,965 ndị na-arụsi ọrụ ike n’ife Jehova ofufe, bụ́ ịrị elu nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị puku mmadụ n’ime nanị afọ atọ! N’ihi gịnị ka e ji nwee oké mgbasapụ dị otú a? Akụkọ na-esonụ pụrụ inye aka ịkọwa nke ahụ. Otu nwa okoro aha ya bụ Aurelio bụ onye na-elekọta ihe nsọ dị iche iche n’otu chọọchị Katọlik. Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova bịara n’obodo nta ahụ, ọ na-akụ mgbịrịgba ụlọ chọọchị ahụ iji mee ka onye ọ bụla ghara ige ha ntị. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ zụtara otu Jerusalem Bible ndị Katọlik wee malite ịgụ ya, ma ọ ghọtaghị ihe ọ na-agụ. Mgbe ahụ, otu ụbọchị ọ hụrụ otu enyi ya onye kpanyere otu nsụgharị Bible New World Translation ná mkpaabụ ya. Aurelio mara enyi ya ahụ njakịrị, na-agwa ya na Bible nke ya abụghị eziokwu, wee kpọrọ ya jee n’ụlọ igosi ya Bible “nke bụ ezie.” Enyi ya ahụ sịrị: “Gụọ Ọpụpụ 20,” o wee hapụ ya laa.

N’ịmalite n’isi nke 1, onye nlekọta ihe nsọ ahụ gụzuru akwụkwọ Ọpụpụ ruo mgbe o rutere n’isi nke 20, amaokwu nke 4 na 5. Ihe Bible ndị Katọlik nke ya kwuru banyere ihe oyiyi dị iche iche nwụrụ ya ibubo n’ahụ. Mgbe e dosiri Mas na Sunday nke na-eso ya, o ji ihe odide ndị ahụ metụtara ihe oyiyi dị iche iche jekwuru onye ụkọchukwu. Ná mmalite, onye ụkọchukwu ahụ kwuru na ya onwe ya na-asọpụrụ ihe oyiyi ndị ahụ nanị nsọpụrụ; na ya adịghị efe ha ofufe. Mgbe ọ hụrụ na nke a ejughị Aurelio afọ, onye ụkọchukwu ahụ boro ya ebubo iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Aurelio kwuru na ya adịghị eme otú ahụ, ma kwuo, sị, “Ugbu a m ga-eme otú ahụ!”

Mgbe ọzọ Ndịàmà ahụ bịara n’obodo nta ahụ, Aurelio jekwuuru ha wee malite iso ha na-amụ Bible. Ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ na chọọchị ahụ, mgbe ọnwa atọ gasịrị o rukwara eru ikere òkè iso Ndịàmà Jehova na-eje ozi ihu ọha ha. Ụlọ mbụ o jere na ya bụ ụlọ onye ụkọchukwu ahụ, onye na-ekweghị ihe ọ hụrụ mgbe ọ hụrụ onye nke a bụbu onye na-elekọta ihe nsọ ka ọ nọ n’ọrụ dị ka onye nkwusa Alaeze. Onye ụkọchukwu ahụ yiri ya egwu ịchụpụ ya na chọọchị, ma Aurelio gwara ya na ọ gaghị adị mkpa ya ime nke ahụ ebe ọ bụ na ya ahapụworị chọọchị ahụ. Ụzọ anyaike ọ gbasoro gbara ọtụtụ ndị obodo nta ahụ ume, ndị malitewororị iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Aurelio na 21 mmadụ ndị ọzọ si n’obodo nta ahụ mere baptism ná mgbakọ distrikti ọzọ e nwere. Ito uto a na-enwe n’ógbè nke a na-adị oké ngwa nke na e nwere nanị otu onye okenye nọ ya iso ìgwè nke a tụleghachi ajụjụ ndị ahụ dịịrị ndị na-achọ ime baptism.

“Olu Ha Pụrụ Jezuo”

A naghị agbanarị nkwusa Alaeze ahụ agbanarị. Otu onye Itali bụ onye Katọlik na-ewebu iwe mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya. Ya mere, mgbe ụlọ ọrụ ya zijere ya Singapore, o chere na ha agaghị enyekwa ya nsogbu ọzọ. Ma n’ịbụrụ ya ihe ijuanya, Ndịàmà nọkwa n’ebe ahụ. Ya mere o nwetara nkịta abụọ na-eme ara ara ịwakwasị Ndịàmà ọzọ bịaranụ. Mgbe Ndịàmà abụọ bịara n’ụlọ ya, nkịta ndị ahụ mapụtara. N’ịbụ ndị oké egwu tụrụ, ndị inyom ahụ gbara ọsọ iji zọpụta ndụ ha, nke ọ bụla etinye isi n’ụzọ nke ya n’ebe ụzọ abụọ jikọtara. Mgbe otu n’ime nkịta ndị ahụ chụkwutere ya, otu n’ime Ndịàmà ahụ, n’amaghị ihe ọ ga-eme, chịpụtara akwụkwọ nta abụọ site n’akpa ya wee fanye ha n’ọnụ nkịta ahụ nke ghere oghe. Mgbe nke a mere, nkịta ahụ kwụsịrị ịchụ ya, wee tụgharịa ma gbaghachi n’ụlọ.

N’izu na-eso ya, Ndịàmà abụọ ahụ nọ na-eme nletaghachi n’otu ụlọ dị n’akụkụ nke ọzọ nke okporo ama ahụ. Onye nwe nkịta ndị ahụ nọ n’ubi ya, n’ịbụkwa ihe ijuanya, o kelere ndị inyom ahụ wee kpọọ ha òkù ka ha bata n’ụlọ ya. Ọ gwara ha na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ya na Ndịàmà Jehova kwurịtara okwu ma ọ bụ mgbe ya gụrụ akwụkwọ ha ọ bụla. Ma ọ bụụrụ ya ihe ịtụnanya ịhụ ka otu n’ime nkịta ya kpụ akwụkwọ nta abụọ n’ọnụ wee lọta. N’uhuruchi ụbọchị ahụ, ọ gụrụ akwụkwọ nta ndị ahụ, ha masịkwara ya n’ezie. Ọ bụ ezie na ọ bụwo onye Katọlik ná ndụ ya nile, o gosipụtara ọchịchọ iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible.

Ebe ọ bụ na a na-ezijeghachi nwoke ahụ Itali, e mere ndokwa ka Ndịàmà Jehova soro ya mụọ ihe n’ebe ahụ. Ka ya na nwunye ya malitere ije nzukọ dị iche iche, onye ụkọchukwu parish dị n’ebe ahụ ji iwe jee iyi ha egwu. Mgbe otu onye sunyere ọkụ n’ubi ha, di na nwunye ahụ gbubiri ihe nile jikọtara ha na chọọchị ahụ. Ugbu a, nwoke ahụ na-asị: “Anọwo m rịị na-agbara ọtụtụ ndị nọ n’ezinụlọ m àmà n’ihi na achọrọ m ka ha mara na Jehova bụ nanị ezi Chineke dịnụ.”

“Ná Nsọtụ Nile nke Elu Ụwa Dum Mmadụ Bi”

Otu ahụmahụ ọzọ si n’otu nsọtụ nke ụwa na-egosi ụzọ e si enwe mmasị n’ozi Alaeze ahụ na ụzọ ọ na-esi enye aka ịgbanwe ndụ ụmụ mmadụ. Mgbe ọ na-eje klasị ndị dị ime, otu Onyeàmà bi n’Australia zutere otu nwanyị onye nwere ọtụtụ àgwà ọjọọ dị iche iche, ọbụna ịjụ ịkwụsị ise siga n’oge ọ dị ime. Àgwà nwanyị ahụ nyere Onyeàmà ahụ nsogbu nke ukwuu. Ọ dabara na ha mụrụ ụmụ ha n’otu mgbe, nọrọkwa n’otu ọnụ ụlọ, ya mere ha nwere ohere ịkparịta ụka. O yiri ka nwanyị ahụ nwere ọtụtụ ihe isi ike n’oge ọ bụ nwata, ugbu a kwa, alụmdi na nwunye ya na-akwado ịdakasị. Ya mere, mgbe ha hapụsịrị ụlọ ọgwụ ahụ, Onyeàmà ahụ jere n’ụlọ nwanyị ahụ wee malitere ya ọmụmụ Bible, na-eji akwụkwọ ahụ bụ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ.

Di nwanyị ahụ anọworị na-ekpeku Chineke ekpere ka ya chọta ezi okpukpe ahụ, na-etinyekwa ọnọdụ ahụ bụ: “Ya bụrụhaala na ọ bụghị Ndịàmà Jehova!” Otú o sina dị, mgbe ọ chọpụtara na nwunye ya so Ndịàmà na-amụ ihe, ọ malitere ịjụ ajụjụ dị iche iche, e wee kpọọ ya òkù ka o sonye n’ọmụmụ ihe ahụ. O mere nke a, n’oge na-adịghị anya ọ malitekwara ịbịa nzukọ dị iche iche ọgbakọ na-enwe. Ugbu a, ma di ma nwunye ahụ abụrụwo ndị e mere baptism, ọ pụtakwara ìhè na ọnọdụ alụmdi na nwunye ha adịwanyewo mma nke ukwuu.

Ọmụmụ Bible ebe obibi ndị dabeere n’akwụkwọ ndị dị otú ahụ arụpụtawo nchịkọta nke ọtụtụ ndị ọhụrụ na-efe ofufe. Ná mba dị iche iche ebe ọ dịworo mkpa ka Ndịàmà Jehova nagide ọnọdụ mgbanwe ọchịchị, agha obodo, ma ọ bụ mmachibido iwu ndị ọchịchị, ọrụ ọmụmụ Bible ebe obibi amụbawo. Agha obodo gara n’ihu ruo ọtụtụ afọ n’Angola, Ndịàmà takwara ahụhụ mkpagbu na ihe isi ike dị ukwuu. Ná mmalite afọ gara aga, akụkọ ozi gosiri na, na nkezi, onye nkwusa ọ bụla na-eduzi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọmụmụ Bible ebe obibi atọ, ma ndị nkwusa ahụ enweghị akwụkwọ buru ibu ndị e ji amụ Bible. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta otu ìgwè nta kwa ụbọchị, na-ahazi ozi ubi n’oge ehihie na nzukọ dị iche iche n’uhuruchi ọ bụla. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ mgbe mburịta agha gwụsịrị, 42 tọn nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, bụ́ ndị a chọsiri ike wee si South Africa rute! N’ezie, ịhụnanya nke ụmụnna ndị ahụ ‘ga-ababiga ókè karị nke ukwuu n’ezi ihe ọmụma na nghọta nile,’ ebe ha nwere ike ugbu a ‘ijide n’aka ihe ndị ka ibe ha mkpa.’ (Ndị Filipaị 1:9, 10) Lee nnọọ ihe mkpali ịrụ ọrụ ọ bụ nye ndị nwere ọtụtụ ihe na-enye aka ịmụ Bible bụ́ ndị ha ga-eji mee ihe ijizu ndokwa Jehova ji amara na-eme mee ihe nke ọma!—1 Timoti 4:15, 16.

Obi ụtọ nke ndị a ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe na-echetara anyị okwu Jisọs n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, bụ́: “Ngọzi na-adịrị ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha [“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha,” NW]: n’ihi na alaeze nke eluigwe bụ nke ndị ahụ. . . . Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị e sogbuworo n’ihi ezi omume: n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị ahụ. . . . Ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:3-12) Lee nnọọ oké ihe ubi nke a nọworo na-achịkọbata n’Angola!

N’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, a nọwo na-ebelata ma ọ bụ na-ewepụchasị kpam kpam ihe mgbochi e tinyere n’ọrụ Ndịàmà Jehova. Jisọs kwuru n’oge ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” (Matiu 9:37) Lee nnọọ ka nke a si bụrụ eziokwu taa! A nọgidere na-enwe mkpa maka inwetakwu ndị ọrụ. Anyị nwere obi ụtọ na ofufe anyị metụtara ịchịkọbata ihe ubi ahụ. E nweghị ọṅụ ọ bụla a na-achọta n’elu ala taa nke dị ukwuu karịa ije ozi na-amịpụta mkpụrụ nke anyị raara onwe anyị nye ijere Jehova Chineke.

Ma, gịnị na-akpali ndị na-efe Jehova igosipụta ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ? Anyị ga-ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya