Iju Mmiri ahụ n’Akụkọ Ifo nke Ụwa
IJU Mmiri nke ụbọchị Noa bụ oké ihe wetara mbibi nke na ihe a kpọrọ mmadụ apụghị ichezọ ya ma ọlị. Ihe karịrị 2,400 afọ mgbe ọ gasịrị, Jisọs Kraịst kwuru banyere ya dị ka ihe bụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme. (Matiu 24:37-39) Ihe omume a na-atụ egwu hapụrụ ụdị mmetụta a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’agbụrụ ụmụ mmadụ nke na ọ bụrụwo ihe nwere akụkọ ifo dị iche iche banyere ya n’elu ụwa nile.
N’akwụkwọ bụ́ Myths of Creation, Philip Freund mere atụmatụ na ihe karịrị 250 agbụrụ na ndị mmadụ dị iche iche na-akọ ihe karịrị 500 akụkọ ifo dị iche iche banyere Iju Mmiri ahụ. Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ka ọtụtụ narị afọ na-agafe, akụkọ ndị a abụrụwo nke e tinyere n’ụzọ dị ukwuu ihe omume na ndị so mee ya, nke bụ nanị ihe e chepụtara echepụta. Otú ọ dị, n’ime ha nile, a pụrụ ịhụ myirịta ụfọdụ bụ isi.
Myirịta Ndị Pụtara Ìhè
Ka ndị mmadụ si na Mesopọtemịa pụtasịa mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ha buuru akụkọ nke ọdachi ahụ gaa n’akụkụ nile nke ụwa. Otú a, ndị bi n’Esia, agwaetiti nile nke Ebe Ndida Pacific, Ebe Ugwu America, Ebe Etiti America, na Ebe Ndida America nwechara akụkọ nke ihe omume a nwere mmetụta dị ukwuu. Ọtụtụ akụkọ ifo banyere Iju Mmiri ahụ dị adị ogologo oge tupu ndị a abụrụ ndị e kpughere nye Bible. Ma, akụkọ ifo ndị a nwere ụfọdụ isi ihe ndị bụ isi yiri ihe ndekọ Bible nke Oké Iju Mmiri ahụ.
Ụfọdụ akụkọ ifo kwuru banyere ndị bụ dike na-eme ihe ike bi n’elu ala tupu Iju Mmiri ahụ. Iji ya tụnyere nke a, Bible na-egosi na tupu Oké Iju Mmiri ahụ ndị mmụọ ozi na-enupụ isi nwoghatara anụ ahụ, soro ndị inyom bikọọ, ma mụpụta agbụrụ nke ndị dike a kpọrọ Nefilim.—Jenesis 6:1-4; 2 Pita 2:4, 5.
Akụkọ ifo dị iche iche banyere Iju Mmiri na-egosikarị na a dọrọ otu nwoke aka ná ntị banyere iju mmiri na-abịa nke Chineke ga-eweta. Dị ka Bible si kwuo, Jehova Chineke dọrọ Noa aka ná ntị na Ya ga-ebibi ndị ọjọọ na ndị na-eme ihe ike. Chineke gwara Noa: “Ọgwụgwụ anụ ahụ nile abịawo n’ihu m; n’ihi na ụwa jupụtara n’ihe ike site na ha; ma, lee, m ga-ebibi ha na ụwa.”—Jenesis 6:13.
Akụkọ ifo dị iche iche banyere Iju Mmiri ahụ n’ozuzu ya gosiri na o wetara mbibi zuru ụwa ọnụ. N’otu aka ahụ, Bible kwuru, sị: “Mmiri ahụ dị ike nke ukwuu nke ukwuu n’elu ụwa; e wee kpuchie ugwu nile dị elu nke dị n’okpuru eluigwe nile. Ihe ọ bụla nke ume nke mmụọ nke ndụ dị n’oghere ime ya abụọ, n’ime ihe nile ọ bụla nke dị n’ala ọkpọ nkụ, ọ nwụrụ anwụ.”—Jenesis 7:19, 22.
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke akụkọ ifo dị iche iche banyere Iju Mmiri kwuru na otu nwoke na otu onye ma ọ bụ ndị ọzọkwa lanarịrị Oké Iju Mmiri ahụ. Ọtụtụ akụkọ ifo kọrọ banyere ya na ọ gbabara n’ime ụgbọ nke o wuru maka nchebe, ha kọkwara na ụgbọ ahụ tọgbọọrọ n’elu otu oké ugwu. Iji tụnyere nke a, Akwụkwọ nsọ kwuru na Noa wuru ụgbọ. Ha kwukwara, sị: “O wee fọdụ nanị Noa na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ ahụ.” (Jenesis 6:5-8; 7:23) Dị ka Bible si kwuo, mgbe Oké Iju Mmiri ahụ gasịrị “ụgbọ ahụ wee tọgbọrọ n’elu ugwu nke Ararat,” ebe Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta. (Jenesis 8:4, 15-18) Ọtụtụ akụkọ ifo gosikwara na ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ malitere na-amụjughachi elu ala, dị ka Bible gosiri na ezinụlọ Noa mere.—Jenesis 9:1; 10:1.
Akụkọ Ifo Iju Mmiri nke Oge Ochie
N’iburu isi ihe ndị a n’uche, ka anyị tụlee ụfọdụ akụkọ ifo Iju Mmiri. Ka anyị jiri ndị Sumeria malite, ndị oge ochie bi na Mesopọtemịa. A hụrụ akụkọ ha nke Oké Iju Mmiri ahụ n’elu mbadamba ájá e gwupụtara ná mkpọmkpọ ebe nile nke Nippur. Mbadamba ájá nke a kwuru na chi ndị Sumeria bụ Anu na Enlil kpebiri ibibi ihe a kpọrọ mmadụ site n’oké iju mmiri. Ebe chi Enki dọworo ya aka ná ntị, Ziusudra na ezinụlọ ya lanarịrị n’ime otu nnukwute ụgbọ.
Akụkọ Ifo Gilgamesh nke ndị Babilọn nwere ọtụtụ nkọwa dị ukwuu. Dị ka o si kwuo, Gilgamesh jere leta nna ochie ya bụ Utnapishtim, bụ́ onye e nyeworo ndụ ebighị ebi ka ọ lanarịsịrị Iju Mmiri ahụ. Ná nkwurịta okwu si na nke a pụta, Utnapishtim kọwara na a gwara ya ka o wuo ụgbọ mmiri ma were ehi, anụ ọhịa, na ezinụlọ ya baa n’ime ya. O wuru ụgbọ mmiri ahụ dị ka igbe ukwu dị 60 mita n’akụkụ ya nile nke hà nhata, nke nwere okpukpu isii. Ọ gwara Gilgamesh na oké ifufe ahụ nọrọ ụbọchị isii ehihie na abalị, mgbe ahụ o wee sị: “Mgbe abalị nke asaa bịaruru, oké ifufe ọjọọ, Oké Iju Mmiri ahụ, egwu nke agha kwusịrị bụ́ nke tiworo ihe otiti dị ka ndị agha. Osimiri ahụ dara jụụ, oké ifufe ahụ danyụrụ, Oké Iju Mmiri ahụ kwụsịkwara. M wee lee anya n’elu osimiri ahụ, ụda nke ụda olu nile akwụsịwo. Ihe nile a kpọrọ mmadụ aghọwokwa ájá ụrọ.”
Mgbe ụgbọ ahụ tọgbọọrọ n’Ugwu Nisir, Utnapishtim dupụrụ nduru nke lọghachiri n’ụgbọ ahụ mgbe ọ na-apụghị ịchọta ebe ọ ga-ebekwasị. A tọhapụkwara nnụnụ swallow bụ́ nke mesịkwara lọghachị. A tọhapụrụ ugoloọma, ma mgbe ọ na-alọghachighị, ọ matara na mmiri ahụ akwụsịwo. Mgbe ahụ Utnapishtim tọhapụrụ ụmụ anụmanụ ahụ, chụọkwa àjà.
Akụkọ ifo a nọworo ogologo oge n’ụzọ ụfọdụ yiri ihe ndekọ Bible nke Iju Mmiri ahụ. Otú ọ dị, o nweghị akụkọ doro anya nke otú ihe si mee na ịdị mfe nke ihe ndekọ Bible nwere, ọ kọghịkwa otú ụgbọ ahụ hà n’ogologo ma ọ bụ n’ibu ma ọ bụ nye oge a rụtụrụ aka n’ime Akwụkwọ nsọ. Dị ka ihe atụ, Akụkọ Ifo nke Gilgamesh kwuru na oké ifufe dịruru ụbọchị isii ehihie na abalị, ebe Bible sịrị na “oké mmiri ozuzo ahụ wee dị n’elu ụwa [ụbọchị iri anọ] ehihie na abalị”—oké mmiri ozuzo dịgiderenụ nke mesịrị jiri mmiri kpuchie elu ụwa nile.—Jenesis 7:12.
Ọ bụ ezie na Bible kwuru banyere mmadụ asatọ lanarịrị Iju Mmiri, n’akụkọ ifo ndị Grik nanị Deucalion na nwunye ya, Pyrrha, lanarịrị. (2 Pita 2:5) Dị ka akụkọ ifo nke a si kwuo, tupu Iju Mmiri ahụ ndị na-eme ihe ike a kpọrọ ndị ikom nke ígwè bronze bijupụtara n’elu ala. Chi Zeus kpebiri iji oké iju mmiri bibie ha ma gwa Deucalion ka o wuo igbe buru ibu ma banye n’ime ya. Mgbe iju mmiri ahụ kwụsịrị, nnukwu igbe ahụ tọgbọọrọ n’elu Ugwu Parnassus. Deucalion na Pyrrha si n’elu ugwu ahụ gbadata ma malite ihe a kpọrọ mmadụ ọzọ.
Akụkọ Ifo nke Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ
N’India, e nwere akụkọ ifo banyere Iju Mmiri bụ́ ebe Manu bụ nanị mmadụ lanarịrịnụ. O mere otu ntakịrị azụ enyi ya bụ́ nke toro wee buo ibu ma dọọ ya aka ná ntị maka iju mmiri na-eweta mbibi. Manu wuru otu ụgbọ, bụ́ nke azụ ahụ dọọrọ ruo mgbe ọ tọgbọọrọ n’elu otu ugwu nke dị na Himalayas. Mgbe iju mmiri ahụ kwụsịrị, Manu si n’elu ugwu ahụ gbadata, sitekwa n’Ida, bụ́ ihe atụ nke ịchụ àjà ya, ọ mụpụtaghachiri agbụrụ ụmụ mmadụ.
Dị ka akụkọ ifo ndị China banyere iju mmiri si dị, chi nke égbè eluigwe nyere ụmụaka abụọ, bụ́ Nuwa na Fuxi otu mkpụrụ eze. O nyere ha iwu ka ha kụọ ya ma nọrọ n’okpuru otu osisi ụgba ga-esi na ya pupụta. Ngwa ngwa osisi sitere n’eze ahụ puo ma mịpụtakwa otu mkpụrụ osisi ụgba dị ukwuu. Mgbe chi nke égbè eluigwe ahụ kpatara oké mmiri ahụ ozuzo, ụmụaka ahụ rịbara n’ime mkpụrụ osisi ahụ. Ọ bụ ezie na iju mmiri nke a kpatara rikpuru ndị ọzọ nile bi n’elu ala, Nuwa na Fuxi lanarịrị ma mụjughachi elu ala dum.
N’ebe Ugwu na Ndịda Kọntinent America
Ndị India nke Ebe Ugwu America nwere ụfọdụ akụkọ ifo nke bu otu ụdị isiokwu nke iju mmiri ahụ bibiri mmadụ nile ma e wepụ mmadụ ole na ole. Dị ka ihe atụ, ndị Arikara, bụ́ ndị Caddo, kwuru na elu ala bụ ebe otu agbụrụ mmadụ ndị siri oké ike bibu nke na ha ji chi dị iche iche mee ihe ọchị. Chi Nesaru bibiri ndị dike ndị a site n’iju mmiri ma chebe ndị ya, ụmụ anụmanụ, na ọka n’ime otu ọgba. Ndị Havasupai sịrị na chi bụ Hokomata kpatara oké iju mmiri nke bibiri ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, nwoke ahụ bụ Tochopa chebere ada ya nwanyị bụ Pukeheh site n’ikwuchigide ya n’ime ógwè osisi nwere oghere.
Ndị India nọ n’Ebe Etiti na Ndịda America nwere akụkọ banyere iju mmiri nke yiri ibe ha n’ụzọ bụ isi. Ndị Maya nke Ebe Etiti America kwenyere na otu oké agwọ nke mmiri ozuzo jiri mmiri nke na-asọ n’ike bibie ụwa. Na Mexico akụkọ nke Chimalpopoca kọrọ na oké iju mmiri kpuchiri elu ugwu nile. Chi bụ Tezcatlipoca dọrọ nwoke ahụ bụ Nata aka ná ntị, onye mere ka e nwee oghere n’ógwè osisi, bụ́ ebe ya na nwunye ya, Nena, nwetara ebe mgbaba ruo mgbe mmiri ahụ tara.
Na Peru ndị Chincha nwere akụkọ ifo nke iju mmiri ụbọchị ise nke bibiri mmadụ nile e wepụ otu onye nke anụmanụ bụ llama nke na-ekwu okwu dupụrụ gaa ná nchebe n’elu otu ugwu. Ndị Aymara nke Peru na Bolivia kwuru na chi Viracocha pụtara site n’Ọdọ Mmiri Titicaca wee kepụta ụwa na ndị nwoke siri ike ma dị ukwuu n’ụzọ gabigara ókè. N’ihi na agbụrụ mbụ nke a kpasuru ya iwe, Viracocha jiri iju mmiri bibie ha nile.
Ndị India Tupinamba nke Brazil kwuru banyere otu oge mgbe oké iju mmiri rikpuru ndị nna ha ochie nile e wepụ ndị lanarịrị n’ime ụgbọ epeepe ma ọ bụ n’elu osisi ndị toro ogologo. Ndị Cashinaua nke Brazil, ndị Macushi nke Guyana, ndị Carib nke Ebe Etiti America, na ndị Ona na Yahgan nke Tierra del Fuego na Ebe Ndịda America bụ ndị so n’ọtụtụ agbụrụ nke nwere akụkọ ifo banyere iju mmiri.
Ebe Ndịda Pacific na Esia
N’Ebe Ndịda Pacific dum, akụkọ ifo nke iju mmiri nke nwere mmadụ ole na ole lanarịrị ya bụ ihe a ma ama. Dị ka ihe atụ, na Samoa, e nwere akụkọ ifo iju mmiri n’oge mbụ nke bibiri onye ọ bụla e wepụ Pili na nwunye ya. Ha nwetara nchebe n’elu oké nkume, mgbe iju mmiri ahụ gafere ha mụjuru elu ala ọzọ. N’Agwaetiti dị iche iche nke Hawaii, chi bụ Kane wesoro ụmụ mmadụ iwe wee zite iju mmiri iji bibie ha. Nanị Nuʹu lanarịrị n’ime ụgbọ ukwu nke mesịrị tọgbọrọ n’elu ugwu.
Na Mindanao dị na Philippines, ndị Ata sịrị na ụwa bụbu ebe mmiri kpuchiri nke bibiri onye ọ bụla e wepụ ụmụ nwoke abụọ na otu nwanyị. Ndị Iban nke Sarawak, Borneo, sịrị na nanị mmadụ ole na ole lanarịrị oké iju mmiri site n’ịgbaga n’elu ugwu ndị kasị elu. N’akụkọ ifo nke Igorot nke ndị Philippines, nanị nwoke na nwanne ya nwanyị lanarịrị site n’izobe onwe ha n’ugwu Pokis.
Ndị Soyot nke Siberia, Russia, sịrị na otu awọ gbara dimkpa, bụ́ nke jidere elu ala, pụrụ wee kpata elu ụwa ịbụ ebe mmiri rikpuru. Otu nwoke meworo agadi na ezinụlọ ya lanarịrị n’elu ibe osisi ndị ọ kụkọtara ọnụ. Mgbe mmiri ahụ tara, ibe osisi ndị ahụ a kụkọtara ọnụ tọgbọrọ n’elu otu oké ugwu dị elu. Ndị Ugrian nke ebe ọdịda anyanwụ Siberia na Hungary kwukwara na ndị lanarịrị iju mmiri ahụ jiri ibe osisi ndị a kụkọtara akụkọta mee ihe ma bụrụ ndị mmiri bugara n’akụkụ dị iche iche nke elu ala.
Isite n’Otu Ebe
Olee ihe anyị pụrụ ikwubi site n’ọtụtụ akụkọ ifo Iju Mmiri ndị a? Ọ bụ ezie na ihe ha kọrọ dị iche iche nke ukwuu n’ụzọ e si kọọ ha, e nwere myirịta dị iche iche. Ihe ndị a na-egosi mmalite sitere n’ọdachi wetara mbibi nke dịkwa ukwuu na nke a na-adịghị echezọ echezọ. N’agbanyeghị ịdị iche iche pụtara ìhè n’akụkọ ndị ahụ na narị afọ ndị gaworo aga, isiokwu dị n’ime ha dị nnọọ ka eriri nke gakọtara ha gaa n’otu oké ihe omume—ihe ndekọ Bible nke Oké Iju Mmiri zuru ụwa nile ọnụ nke e dere kpọmkwem ka o si mee, na n’ụzọ dịkwa mfe.
Ebe akụkọ ifo Iju Mmiri ndị ahụ bụ nke a na-ahụkarị n’etiti ndị mmadụ bụ́ ndị na-amaghị ihe banyere Bible ruo narị afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ọ ga-abụ njehie ikwu na ihe ndekọ Akwụkwọ nsọ metụtara echiche ha. Ọzọkwa akwụkwọ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru, sị: “Ihe ndekọ iju mmiri ahụ ịbụ ihe a ma ama n’ụwa nile bụ ihe a na-ewekarị dị ka ihe na-egosi mbibi ụmụ mmadụ nke zuru ụwa ọnụ site n’iju mmiri . . . Ọzọkwa, ụfọdụ n’ime ihe ndekọ oge ochie bụ nke ndị na-emegide nnọọ omenala ndị Hibru na nke ndị Kraịst dere.” (Mpịakọta 2, peji nke 319) Ya mere anyị pụrụ iji obi ike kwubie na akụkọ ifo Iju Mmiri mesiri eziokwu nke ihe ndekọ Bible ike.
N’ịbụ ndị bi n’ime ụwa nke ime ihe ike na omume rụrụ arụ jupụtara, anyị ga-eme nke ọma ịgụ ihe ndekọ Bible nke Iju Mmiri ahụ, dị ka e dekọrọ ya na Jenesis isi nke 6 ruo 8. Ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe kpatara Oké Iju Mmiri ahụ zuru ụwa nile ọnụ—ime ajọ omume n’anya Chineke—anyị ga-ahụ n’ime ya ịdọ aka ná ntị dị mkpa.
N’oge na-adịghị anya ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-ezute ikpe mbibi nke Chineke. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na a ga-enwe ndị ga-alanarị ya. Ị pụrụ ịbụ otu onye n’ime ha ma ọ bụrụ na ị ṅaa ntị n’okwu Pita onyeozi: ‘Ụwa nke dị n’oge [Noa] lara n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya: ma eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu ahụ, ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. . . . Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke.’—2 Pita 3:6-12.
Ị̀ ga-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Jehova? Ọ bụrụ na ị na-eme nke ahụ ma na-eme ihe kwekọrọ n’uche Chineke, ị ga-enweta ngọzi dị ukwuu. Ndị ahụ na-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ n’ụzọ dị otú a pụrụ inwe okwukwe n’ụwa ọhụrụ ahụ nke Pita hotara mgbe o kwukwara sị: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.
[Foto dị na peeji nke 7]
E bufere akụkọ ifo iju mmiri nke ndị Babilọn site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ
[Foto dị na peeji nke 8]
Ị̀ na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị nke Pita site n’ile anya ụbọchị nke Jehova?