Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 1/15 p. 14-19
  • Jehova Na-ahụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-ahụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbụ Ndị Obi nke Nwere Ọchịchọ Kpaliri
  • Gịnị Na-akpali Inye Ihe n’Obi Ụtọ?
  • Nchịkwa Inye Ihe E Ji Nlezianya Mee
  • Ọ Bụghị Site Ná Mmanye
  • Gosi Obi Ekele Gi Maka Onyinye Nile nke Chineke
  • “Chineke Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Chineke Hụrụ Onye Weere Obi Ụtọ Na-enye n’Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 1/15 p. 14-19

Jehova Na-ahụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Anya

“Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 NDỊ KỌRINT 9:7.

1. Olee ụzọ Chineke na Kraịst siworo bụrụ ndị na-eji obi ụtọ na-enye ihe?

JEHOVA bụ onye mbụ na-eji obi ụtọ enye ihe. O ji ọṅụ nye Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya ndụ ma jiri ya mee ihe ime ka ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ dịrị. (Ilu 8:30, 31; Ndị Kọlọsi 1:13-17) Chineke nyere anyị ndụ na ume na ihe nile, tinyere mmiri ozuzo sitere n’eluigwe na oge mkpụrụ, na-emeju obi anyị n’ọṅụ. (Ọrụ 14:17; 17:25) N’ezie, ma Chineke ma Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, bụcha ndị na-eji obi ụtọ enye ihe. Ha na-eji mmụọ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enye ihe n’obi ụtọ. Jehova hụrụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na “o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Jisọs n’ịdị njikere ‘weere ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’—Jọn 3:16; Matiu 20:28.

2. Dị ka Pọl si kwuo, ụdị onye dị aṅaa na-enye ihe ka Chineke na-ahụ n’anya?

2 Ya mere, ndị na-ejere Chineke na Kraịst ozi kwesịrị ịbụ ndị na-eji obi ụtọ enye ihe. A gbara ụdị inye onyinye dị otú ahụ ume n’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst na Kọrint, bụ́ nke e dere n’ihe dị ka 55 O.A. Dị ka ọ pụtara ìhè na ọ na-ezo aka n’onyinye afọ ofufo na onyinye ego dịịrị onwe onye e mere karịsịa iji nyere ndị Kraịst nwere mkpa n’ime Jerusalem na Judia aka, Pọl sịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7; Ndị Rom 15:26; 1 Ndị Kọrint 16:1, 2; Ndị Galetia 2:10) Olee otú ndị Chineke siworo meghachi omume n’ohere nile ha nwere inye ihe? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site ná ndụmọdụ Pọl banyere inye ihe?

Ịbụ Ndị Obi nke Nwere Ọchịchọ Kpaliri

3. Ruo ókè hà aṅaa ka ndị Israel kwadoro owuwu nke ụlọ ikwuu ahụ maka ofufe Jehova?

3 Obi ndị nwere mmasị na-akpali ndị nke Chineke inye onwe ha na ihe ha nwere ná nkwado nke nzube Chineke. Dị ka ihe atụ, ndị Israel nke ụbọchị Mosis ji ọṅụ kwadoo owuwu nke ụlọ ikwuu maka ofufe Jehova. Obi nke ụfọdụ ndị inyom kpaliri ha ịkpa ajị ewu, ebe ụfọdụ ndị ikom jere ozi dị ka ndị na-akwa nkà. Ndị ahụ weere obi ụtọ nye ọlaedo, ọlaọcha, osisi, ákwà ọcha, na ihe ndị ọzọ dị ka ‘onyinye maka Jehova’ bụ́ nke e nyere n’afọ ofufo. (Ọpụpụ 35:4-35) Ha nyere ihe n’ụba nke na ihe ndị a tụkọtara “zuoro ha iji jee ozi nile, ime ya, ihe wee fọdụ.”—Ọpụpụ 36:4-7.

4. Olee ụdị omume Devid na ndị ọzọ ji nye onyinye maka ụlọ nsọ ahụ?

4 Ọtụtụ narị afọ ka nke a gasịrị, Eze Devid nyere onyinye dị ukwuu maka ụlọ nsọ nke Jehova nke nwa ya bụ Solomọn ga-ewu. Ebe Devid bụ onye ‘ihe ụlọ Chineke na-atọ ụtọ,’ o nyere “ihe nke aka” ya nke ọlaedo na ọlaọcha. Ndị isi ụlọ, ndị isi usuu nile, na ndị ọzọ ‘ji onyinye mejuo aka ha maka Jehova.’ Gịnị ka nke a kpatara? Ee, “ndị Israel wee ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na ha weere afọ ofufo nye onwe ha, n’ihi na n’obi zuru okè ka ha weere afọ ofufo nye Jehova onwe ha”! (1 Ihe Emere 29:3-9) Ha bụ ndị ji obi ụtọ na-enye ihe.

5. Olee ụzọ ndị Israel si kwadoo ezi ofufe n’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ?

5 N’ime ọtụtụ narị afọ nile gaworo aga, ndị Israel nwere ihe ùgwù nke ịkwado ụlọ ikwuu ahụ, ụlọ nsọ ndị e mesịrị wuo, na ije ozi ndị nchụàjà na ndị Livaị jere n’ebe ahụ. Dị ka ihe atụ, n’ụbọchị Nehemaịa, ndị Juu kpebiri inye onyinye iji nọgide na-enwe ezi ofufe, na-amata na ha ekwesịghị ileghara ụlọ Chineke anya. (Nehemaịa 10:32-39) N’otu aka ahụ taa, Ndịàmà Jehova taa na-eji obi ụtọ na-enye onyinye afọ ofufo iji wuo ma na-edozi ebe nzukọ dị iche iche na ịkwado ezi ofufe.

6. Nye ihe atụ nke ndị Kraịst iji obi ụtọ na-enye ihe.

6 Ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị na-eji obi ụtọ enye ihe. Dị ka ihe atụ, Gaịọs na-eme “ihe kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ” n’ịdị na-ele ndị na-ejegharị ejegharị maka ọdịmma nke Alaeze ọbịa nke ọma, ọbụna dị ka Ndịàmà Jehova ndị na-ele ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ọbịa nke ọma, bụ́ ndị Watch Tower Bible and Tract Society na-ezipụ ugbu a. (3 Jọn 5-8) Ọ na-efu ihe iji mee ka ụmụnna ndị a mee njem gaa n’ọgbakọ dị iche iche na ile ha ọbịa, ma lee ka nke a si bụrụ ihe bara uru n’ụzọ ime mmụọ!—Ndị Rom 1:11, 12.

7. Olee ụzọ ndị Filipaị si jiri ihe onwunwe ha mee ihe?

7 Ọgbakọ nile n’ozuzu ha ejiwo ihe onwunwe ha mee ihe iji kwadoo ọdịmma Alaeze. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara ndị kwere ekwe na Filipaị, sị: “N’ihi na ọbụna na Tesalọnaịka unu zigara otu mgbe zigakwa mgbe ọzọ igbo m mkpa. Ọ bụghị na ana m achọ onyinye ahụ; kama ana m achọ mkpụrụ ahụ nke na-aba ụba ịgụnyere unu.” (Ndị Filipaị 4:15-17) Ndị Filipaị ji obi ụtọ nye ihe, ma olee ihe ndị na-akpali ụdị inye ihe n’obi ụtọ nke dị otú ahụ?

Gịnị Na-akpali Inye Ihe n’Obi Ụtọ?

8. Olee ụzọ ị pụrụ isi gosi na mmụọ Chineke na-akpali ndị ya ịbụ ndị na-eji obi ụtọ na-enye ihe?

8 Mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Jehova na-akpali ndị ya iji obi ụtọ na-enye ihe. Mgbe ndị Judia bụ́ ndị Kraịst nọ ná mkpa, mmụọ Chineke kpaliri ndị ọzọ kwere ekwe inyere ha aka n’ụzọ ihe onwunwe. Iji gbaa ndị Kraịst nọ na Kọrint ume ime ihe ha nwere ike ya n’inye ụdị onyinye ahụ, Pọl hotara ihe nlereanya nke ọgbakọ ndị dị na Masedọnia. Ọ bụ ezie na ndị Masedọnia kwere ekwe nọ ná mkpagbu na n’ọnọdụ ogbenye, ha gosiri ịhụnanya ụmụnna site n’inye karịa ihe ha nwere ike. Ọbụna ha rịọrọ maka ihe ùgwù nke inye ihe! (2 Ndị Kọrint 8:1-5) Ije ije n’ụzọ Chineke adịghị adabere nanị n’onyinye nke ndị bara ọgaranya. (Jemes 2:5) Ndị ohu ahụ ya raara onwe ha nye, bụ́ ndị dara ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, abụrụwo ndị na-enye nkwado bụ isi n’inye ego maka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) N’agbanyeghị nke ahụ, ha adịghị ata ahụhụ n’ihi mmesapụ aka ha, n’ihi na Chineke adịghị ahapụ igbo mkpa nke ndị ya n’ọrụ a, ike nọkwa n’azụ ịga n’ihu na ịba ụba ya bụ mmụọ ya.

9. Olee ụzọ okwukwe, ihe ọmụma, na ịhụnanya si nwee ihe jikọrọ ha na iji obi ụtọ na-enye ihe?

9 Okwukwe, ihe ọmụma, na ịhụnanya na-akpali inye ihe n’obi ụtọ. Pọl sịrị: “Dị ka unu [ndị Kọrint] babigara ókè n’ihe nile, bụ́ okwukwe, na okwu, na ihe ọmụma, na ịnụ ọkụ n’obi nile, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezienụ anya ka unu babigakwa ókè n’amara nke a. Ekwughị m n’ụzọ inye iwu, kama n’iwere ịnụ ọkụ n’obi nke ndị ọzọ nwapụtakwa ịhụnanya unu na ọ bụ ezi ịhụnanya.” (2 Ndị Kọrint 8:7, 8) Inye onyinye maka ụzọ Chineke, karịsịa mgbe onye na-enye ihe nwere ihe onwunwe dị nta, chọrọ okwukwe n’onyinye nile nke Chineke n’ọdịnihu. Ndị Kraịst jupụtara n’ihe ọmụma na-achọ imezu nzube Jehova, ndị jupụtakwara n’ịhụnanya maka ya na ndị ya na-eji ihe o nwere akwado ụzọ ya n’obi ụtọ.

10. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na ihe nlereanya Jisọs na-akpali ndị Kraịst inye ihe n’obi ụtọ?

10 Ihe nlereanya Jisọs na-akpali ndị Kraịst iji obi ụtọ na-enye ihe. Mgbe a kpọsịrị ndị Kọrint òkù iji ịhụnanya na-enye ihe, Pọl sịrị: “Unu maara amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na, ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ ghọrọ ogbenye n’ihi unu, ka unu onwe unu wee were ogbenye ya ghọọ ndị ọgaranya.” (2 Ndị Kọrint 8:9) N’ịbụ onye bara ọgaranya n’eluigwe karịa nwa ọzọ nke Chineke, Jisọs napụrụ onwe ya ihe ndị a nile ma were ụdịdị mmadụ. (Ndị Filipaị 2:5-8) Otú ọ dị, site n’ịbụ ogbenye n’ụzọ nke a nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị, Jisọs nyere aka n’ido aha Jehova nsọ ma tọgbọ ndụ ya dị ka àjà mgbapụta maka abamuru nke ụmụ mmadụ ga-anara ya. N’ikwekọ n’ihe nlereanya Jisọs, ọ̀ bụ na anyị agaghị eji obi ụtọ na-enye ihe iji nyere ndị ọzọ aka ma soro doo aha Jehova nsọ?

11, 12. Olee ụzọ ezi atụmatụ pụrụ isi mee anyị ndị na-enye ihe n’obi ụtọ?

11 Ezi atụmatụ na-eme ka inye ihe n’obi ụtọ kwe omume. Pọl gwara ndị Kọrint, sị: “Kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa ka unu nile n’otu n’otu debe ihe n’ụlọ na-akpado ya, otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma, ka a ghara ịnara ụtụ mgbe ọ bụla m ga-abịa.” (1 Ndị Kọrint 16:1, 2) N’ụzọ inye onyinye afọ ofufo na nke dịịrị nanị onwe onye dị otú ahụ, ndị ahụ na-achọ inye onyinye iji mee ka ọrụ Alaeze na-aga n’ihu taa ga-eme nke ọma iwepụta iche akụkụ ụfọdụ nke ihe ha na-enweta maka nzube ahụ. Dị ka ihe ga-esi n’ụdị ezi atụmatụ ahụ pụta, Ndịàmà n’otu n’otu, ndị ezinụlọ, na ọgbakọ nile pụrụ inye onyinye iji mee ka ezi ofufe na-aga n’ihu.

12 Itinye atụmatụ ndị e mere iji nye onyinye n’ọrụ ga-eme anyị obi ụtọ. Dị ka Jisọs kwuru, “ọ dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW] inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ya mere ndị Kọrint pụrụ ime ka ọṅụ ha baa ụba site n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl itinye atụmatụ ha nọworo otu afọ n’ọrụ izipụ ego gaa Jerusalem. “Ọ bụ ihe a ga-anara nke ọma dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị,” ka o kwuru. Mgbe mmadụ nyere onyinye dị ka ihe o nwere hà, e kwesịrị iwere ha dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi, ọ pụrụ ime ka ịha nhata dịrị nke ga-eme ka ndị nwere ọtụtụ ihe na-enye n’ụba, n’atụfughị ihe, ndị nwekwara ihe dị nta ghara ịnọ n’ụkọ dị iche iche nke na-ebelata ume na ike ha ijere ya ozi.—2 Ndị Kọrint 8:10-15.

Nchịkwa Inye Ihe E Ji Nlezianya Mee

13. N’ihi gịnị ka ndị Kọrint ji nwee ike inwe obi ike ná nlekọta Pọl lekọtara onyinye?

13 Ọ bụ ezie na Pọl lekọtara ndokwa inye onyinye ahụ ka ndị kwere ekwe nọ ná mkpa nwee ike inweta enyemaka ihe onwunwe ma jiri ume tinye onwe ha karị n’ọrụ nkwusa, ma ya ma ndị ọzọ ewereghị ego ọ bụla maka ijere onwe ha ozi. (2 Ndị Kọrint 8:16-24; 12:17, 18) Pọl rụrụ ọrụ iji gboo mkpa ihe onwunwe nke onwe ya kama ibokwasị ibu ego n’ọgbakọ ọ bụla. (1 Ndị Kọrint 4:12; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:8) Ya mere, n’inyefe onyinye ahụ n’aka ya, ndị Kọrint ahụ ji ntụkwasị obi na-etiba ha n’aka onye na-ejere Chineke ozi nke na-arụsi ọrụ ike, onye a tụkwasịkwara obi.

14. Banyere iji onyinye eme ihe, aha ọma dị aṅaa ka Watch Tower Society nwere?

14 Kemgbe e guzobere ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society na 1884, ndị na-enye onyinye ahụwo ihe àmà na-egosi na ọ bụ onye nlekọta a tụkwasịrị obi nke onyinye nile e nyere ya n’aka idebe maka ọrụ Alaeze Jehova. Dị ka iwu e ji guzobe ya si dị, Society na-agbalị igbo mkpa kachasị ukwuu nke mmadụ nile, mkpa maka ihe ime mmụọ. A na-eme nke a n’ụdị nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na ntụziaka n’ụzọ a pụrụ isi nweta nzọpụta. Taa, Jehova na-eme ka nchịkọta nke ndị yiri atụrụ baa n’ime ọgbakọ ya na-amụbawanye amụba gaa ọsọ ọsọ, ngọzi ọ gọzikwara iji onyinye dị iche iche a na-enweta na-eme ihe n’ụzọ amamihe n’ọrụ nkwusa Alaeze bụ ihe àmà pụtara ìhè nke nkwado Chineke. (Aịsaịa 60:8, 22) Anyị nwere obi ike na ọ ga-anọgide na-akpali obi nke ndị na-eji obi ụtọ na-enye ihe.

15. Gịnị mere magazin nke a na-eji akpọtụ onyinye uche mgbe ụfọdụ?

15 Society mgbe ụfọdụ na-eji peji dị iche iche nke akwụkwọ a na-eme ka ndị na-agụ ya mara ihe ùgwù ha nwere inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ. Nke a abụghị arịrịọ, kama ọ bụ ichetara ndị nile na-achọ ịkwado “ọrụ onye nchụàjà nke ozi ọma Chineke” dị ka Chineke na-eme ka ha na-enwe ọganihu. (Ndị Rom 15:16; 3 Jọn 2) Society na-eji ego nile e nyere eme ihe n’ụzọ kasị baa uru iji kwusaa aha Jehova na Alaeze ya. A na-eji obi ekele anata, anabatakwa onyinye nile, jirikwa ya eme ihe n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, site na nke a a na-anọgide na-akwado ọrụ ozi ala ọzọ ná mba dị iche iche, a na-elekọta ma na-agbasawanye ụlọ obibi akwụkwọ dị mkpa maka ịgbasa ihe ọmụma nke Bible. Ọzọkwa, a na-eji onyinye a na-enye maka ọrụ nke a zuru ụwa ọnụ iji na-akwụ ụgwọ na-arị elu nke imepụta Bible na akwụkwọ metụtara Bible, tinyekwara kaseti vidio na kaseti ndị nke a na-ege ná ntị. N’ụzọ ndị dị otú ahụ, ndị na-eji obi ụtọ enye ihe na-eme ka ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu.

Ọ Bụghị Site Ná Mmanye

16. Ọ bụ ezie na ole na ole Ndịàmà Jehova bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe, n’ihi gịnị ka a na-eji enwe obi ekele maka onyinye ha?

16 Ole na ole ná Ndịàmà nke Jehova bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ bụ ezie na ha pụrụ inye ego dị nta iji kwadoo ọdịmma Alaeze, n’agbanyeghị nke ahụ onyinye ha dị mkpa. Mgbe Jisọs hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-atụba ego nta abụọ n’ime igbe ebe a na-atụbanye ego n’ụlọ nsọ, ọ sịrị: “Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karị ha nile: n’ihi na ndị a nile sitere n’inwebiga akụ ókè ha tụba n’onyinye: ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.” (Luk 21:1-4) Ọ bụ ezie na onyinye ya dị nta, ọ bụ onye na-eji obi ụtọ na-enye ihe—e gosikwara obi ekele maka onyinye ya.

17, 18. Gịnị ka okwu Pọl ná 2 Ndị Kọrint 9:7 na-egosi, gịnịkwa ka okwu Grik ahụ a sụgharịrị “obi ụtọ” na-egosi?

17 Banyere ọrụ enyemaka maka ndị Judia bụ́ ndị Kraịst, Pọl sịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Onyeozi ahụ pụrụ ịdị na-ezo aka n’akụkụ nke Ilu 22:8 ná nsụgharị nke Septuagint, nke sịrị: “Chineke na-agọzi onye na-eji ihu ọchị enye ihe; ọ ga-emejukwa ebe ihe kọrọ ya n’ọrụ ya.” (The Septuagint Bible, nke Charles Thomson sụgharịrị) Pọl ji ‘na-ahụ n’anya’ dochie “na-agọzi,” ma e nwere njikọ dị na ya, n’ihi na owuwe ihe ubi nke ngọzi na-esite n’ịhụnanya Chineke apụta.

18 Onye na-eji obi ụtọ enye ihe na-enwe obi ụtọ n’ezie inye ihe. Ee, site n’okwu Grik a kpọrọ “obi ụtọ” ná 2 Ndị Kọrint 9:7 ka okwu bụ “aṅụrị” sị pụta! Mgbe o mesịrị ka nke a pụta ìhè, onye ọkà mmụta bụ R. C. H. Lenski kwuru, sị: “Chineke hụrụ onye ji ihu ọchị, ọṅụ, na obi ụtọ na-enye ihe n’anya . . . [onye] okwukwe ya bụ nke ịchị ọchị chọrọ mma mgbe ohere ọzọ nke inye ihe chere ya ihu.” Onye nwere ụdị mmụọ aṅụrị dị otú ahụ adịghị enye ná mwute ma ọ bụ ná mmanye kama ọ na-eji obi ya nile na-enye ihe. Ị̀ na-enwe obi ụtọ dị otú ahụ banyere ịdị na-enye ihe ná nkwado nke ọdịmma Alaeze?

19. Olee ụzọ ndị Kraịst oge mbụ si nye onyinye?

19 Ndị Kraịst oge mbụ adịghị ebugharị efere onyinye ma ọ bụ na-enye tithe site n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha na-arụta maka nzube okpukpe. Kama nke ahụ, onyinye ha bụ nnọọ nke afọ ofufo. Tertullian, bụ́ onye a tọghatara n’Iso Ụzọ Kraịst n’ihe dị ka 190 O.A., dere, sị: “Ọ bụ ezie na anyị nwere igbe ego anyị, ego e ji azụta nzọpụta adịghị n’ime ya, dị ka okpukpe nwere ọnụ ego ya. N’ụbọchị ọnwa ọ bụla [nke pụtara ìhè na ọ bụ otu ugbo n’ọnwa], ọ bụrụ na ọ chọọ, onye ọ bụla na-etinye onyinye nta; kama nanị ma ọ bụrụ ihe ọ chọrọ, nanị ma o nwee ike ime ya; n’ihi na a dịghị amanye mmadụ amanye; ihe nile bụ n’afọ ofufo.”—Apology, Isiakwụkwọ nke Iri Atọ na Itoolu.

20, 21. (a) Gịnị ka otu mbipụta ochie nke magazin nke a kwuru banyere ihe ùgwù nke ịkwado ụzọ Chineke site n’iji ego, oleekwa otú nke a si kwekọọ ọbụna ugbu a? (b) Olee ihe na-eme mgbe anyị ji akụ anyị sọpụrụ Jehova?

20 Inye ihe n’afọ ofufo abụrụwo mgbe nile omenala dị n’etiti ndị na-ejere Jehova ozi n’oge a. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ejibeghị ihe ùgwù nke ịkwado ụzọ Chineke nke ha nwere mee ihe n’ụzọ zuru ezu site n’inye onyinye. Dị ka ihe atụ, na February 1883, magazin nke a [Bekee] sịrị: “Ụfọdụ na-ebu ibu arọ dị ukwuu [n’ụzọ ego] maka ndị ọzọ, nke na ike inye aka ha n’ụzọ ego na-adalata site n’oké ịrụ ọrụ na ike ọgwụgwụ, otú a e mebiwo ịba uru ha; ọ bụghịkwa nanị nke ahụ, kama ndị ahụ . . . na-aghọtachabeghị ọnọdụ ahụ, abụrụwo ndị ihe funahụworo n’ihi emeghị ihe ọ bụla n’ihe banyere nke ahụ.”

21 Ka ìgwè mmadụ ahụ na-enubanye n’ime nzukọ Jehova taa, ka ọrụ Chineke na-agbasawanyekwa baa n’ime n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na akụkụ ndị ọzọ e nwere mmachibido ná mbụ, e nwere mkpa dị ukwuu maka mgbasapụwanye nke ụlọ ọrụ mbipụta akwụkwọ na ihe ọrụ ndị ọzọ. A ghaghị ibipụta Bible na akwụkwọ ndị ọzọ dị ukwuu karị. A na-emekwa atụmatụ ọtụtụ ihe owuwu ọchịchị Chineke ndị ọzọ; otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ ịga ngwa ngwa karị ma ọ bụrụ na e nwere ego zuru ezu. N’ezie, anyị nwere okwukwe na Chineke ga-enye ihe nile a chọrọ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na a ga-agọzi ‘ndị na-asọpụrụ Jehova site n’akụ ha.’ (Ilu 3:9, 10) N’ezie, “onye werekwa ngọzi na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi.” Jehova ‘ga-eme ka anyị bụrụ ọgaranya n’ihe nile ọ bụla ruo afọ ofufo nile,’ anyị iwekwara obi ụtọ na-enye ga-eme ka ọtụtụ ndị too ma keleekwa ya.—2 Ndị Kọrint 9:6-14.

Gosi Obi Ekele Gi Maka Onyinye Nile nke Chineke

22, 23. (a) Olee ihe bụ onyinye e nyere n’efu nke a na-apụghị ịkọwa akọwa nke Chineke nyere? (b) Ebe anyị nwere obi ekele maka onyinye nile nke Jehova, olee ihe anyị kwesịrị ime?

22 Ịbụ onye obi ekele dị omimi kpaliri, Pọl n’onwe ya sịrị: “Ekele dịrị Chineke n’ihi onyinye ya nke a na-apụghị ịkọ akụkọ ya.” (2 Ndị Kọrint 9:15) Dị ka “ihe ịjụrụ Chineke obi” maka mmehie nke ndị Kraịst e tere mmanụ na maka nke ụwa, Jisọs bụ ebe ndabere na ụzọ nke onyinye a na-apụghị ịkọwa akọwa nke Chineke nyere n’efu si abịa. (1 Jọn 2:1, 2) Onyinye ahụ bụ “amara Chineke dị n’ime unu nke karịrị nke ukwuu” nke o gosiworo ndị ya n’elu ala site na Jisọs Kraịst, o bukwara ibu maka nzọpụta na maka inye Jehova otuto na iwepụ ya n’ụta.—2 Ndị Kọrint 9:14.

23 Obi ekele anyị dị omimi na-agara Jehova maka onyinye ya o nyere n’efu nke a na-apụghị ịkọwa akọwa nakwa ọtụtụ onyinye ime mmụọ na nke anụ ahụ o nyere ndị ya. Ee, ịdị mma nke Nna anyị nke eluigwe n’ebe anyị nọ dị nnọọ ukwuu nke na ọ karịrị ike ikwu okwu nke ụmụ mmadụ! Ọ bụkwa ihe e ji n’aka na o kwesịrị ịkpali anyị ịbụ ndị na-eji obi ụtọ na-enye ihe. Ebe ọ dị otú a, site n’inwe obi ekele sitere n’obi, ka anyị nile mee ihe nile anyị nwere ike ime iji kwado ụzọ nke Chineke anyị na-enye ihe n’ụba, Jehova, Onye mbụ na Onye na-enweghị atụ n’iji obi ụtọ na-enye ihe!

Ị̀ Na-echeta?

◻ Obi dị njikere akpaliwo ndị Jehova ime gịnị?

◻ Gịnị na-akpata iji obi ụtọ na-enye ihe?

◻ Olee ụzọ Watch Tower Society si e ji onyinye nile ọ na-anata eme ihe?

◻ Ụdị onye na-enye ihe dị aṅaa ka Chineke na-ahụ n’anya, oleekwa ụzọ anyị kwesịrị isi gosi obi ekele anyị maka ọtụtụ onyinye Ya?

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe a na-ewu ụlọ ikwuu ahụ, ndị Israel ji ike ha nile rụọ ọrụ ma nyekwa onyinye n’ụba maka Jehova

[Foto dị na peeji nke 18]

A na-enwe obi ekele maka ụdị onyinye ndị dị ka nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke nwere mkpa nyere, ha dịkwa mkpa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya