Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/1 p. 24-28
  • “Chineke Hụrụ Onye Weere Obi Ụtọ Na-enye n’Anya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Chineke Hụrụ Onye Weere Obi Ụtọ Na-enye n’Anya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnakọta Onyinye Maka Ndị Nọ ná Mkpa
  • Arịrịọ Maka Mmesapụ Aka
  • Ndị Ji Obi Ụtọ Enye Taa
  • Imesapụ Aka N’ụba Na-eweta Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Sọpụrụ Jehova Site n’Akụ̀ Gị”—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Enye Onyinye n’Ọrụ Nkwusa Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/1 p. 24-28

“Chineke Hụrụ Onye Weere Obi Ụtọ Na-enye n’Anya”

JEHOVA bụ mmesapụ aka n’onwe ya. N’ezie, Bible na-ekwu na ọ bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.” (Jemes 1:17) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndị Chineke kere. O mere ihe oriri dị ụtọ, ọ bụghị nke na-adịghị ụtọ; okooko osisi ndị tụrụ àgwà, ọ bụghị ndị chanwụrụ achanwụ; ọdịda anyanwụ ndị mara mma, ọ bụghị ndị na-adịghị egbuke egbuke. Ee, akụkụ nile nke ihe ndị Jehova kere na-enye ihe àmà nke ịhụnanya na mmesapụ aka ya. (Abụ Ọma 19:1, 2; 139:14) Ọzọkwa, Jehova bụ Onye na-ewere obi ụtọ na-enye. Ọ na-atọ ya ụtọ imere ndị ohu ya ihe ọma.—Abụ Ọma 84:11; 149:4.

E nyere ụmụ Israel iwu igosipụta mmesapụ aka Chineke ná mmekọrịta ha na ibe ha. “Agbala obi gị ume, akwụkwụbala aka gị n’ebe nwanne gị, bụ́ ogbenye, nọ,” ka Mosis gwara ha. “Ị ghaghị inye ya, ọ gaghị ajọkwara obi gị njọ.” (Deuterọnọmi 15:7, 10) Ebe ọ bụ na inye ihe ga-esi n’obi, ụmụ Israel ga-enwe mmasị n’omume mmesapụ aka.

E nyere ndị Kraịst ndụmọdụ yiri nke ahụ. N’ezie, Jisọs sịrị na ọ dị “ngọzi inye ihe.” (Ọrụ 20:35) Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ezi ihe ilereanya n’iji obi ụtọ na-enye. Dị ka ihe atụ, Bible na-akọ na na Jerusalem, ndị ghọrọ ndị kwere ekwe ‘rere ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, wee kesaa ha nye mmadụ nile, dị ka mkpa dịịrị onye ọ bụla.’—Ọrụ 2:44, 45.

Ma ndị Judia a na-emesapụ aka mesịrị daa ogbenye. Bible ekwughị kpọmkwem ihe wetara ọnọdụ ha. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-asị na ụnwụ nri ahụ e zoro aka na ya n’Ọrụ 11:28, 29 pụrụ ịbụworị ihe kpatara ya. Ka o sina dị, ndị Kraịst bụ́ ndị Judia nọ n’oké ihe isi ike, Pọl chọkwara ijide n’aka na a ga-elebara mkpa ha anya. Ọ̀ ga-esi aṅaa mee otú ahụ?

Ịnakọta Onyinye Maka Ndị Nọ ná Mkpa

Pọl chọrọ inweta enyemaka nke ọgbakọ ndị dị anya dị ka Masedonia, o mekwara ndokwa ka a nakọta onyinye maka ndị Kraịst ahụ dara ogbenye nọ na Judia. Nye ndị Kọrint, Pọl dere, sị: “Dị ka m nyere nzukọ Kraịst dị na Galetia iwu, unu onwe unu meekwa otú a. Kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa ka unu nile n’otu n’otu debe ihe n’ụlọ na-akpado ya, otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma.”a—1 Ndị Kọrint 16:1, 2.

Pọl zubere ka e zigara ụmụnna nọ na Jerusalem ego ndị a ngwa ngwa, ma ndị Kọrint adịghị ngwa n’imeghachi omume ná ntụziaka Pọl. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ na ọnọdụ nke ụmụnna ha ndị Judia adịghị emetụ ha n’obi? Ee e, n’ihi na Pọl maara na ndị Kọrint “babigara ókè n’ihe nile, bụ́ okwukwe, na okwu, na ihe ọmụma, na ịnụ ọkụ n’obi nile.” (2 Ndị Kọrint 8:7) O yiri ka ha ji nnọọ ọrụ n’aka n’ịhụ banyere ihe ndị ọzọ bara uru ndị Pọl kwuru okwu banyere ha n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ha. Ma ugbu a, ọnọdụ dị na Jerusalem chọrọ ime ihe ngwa ngwa. Ya mere Pọl kwuru ihe banyere okwu ahụ n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrint.

Arịrịọ Maka Mmesapụ Aka

Nke mbụ, Pọl gwara ndị Kọrint banyere ndị Masedonia, bụ́ ndị mmeghachi omume ha n’ọrụ enyemaka ahụ bụ ezi ihe nlereanya. “N’ime ọtụtụ nnwapụta nke mkpagbu,” ka Pọl dere, “mbabiga ókè nke ọṅụ ha na ogbenye ọnụ ntụ ha bụ babigara ókè ruo akụ̀ nke afọ ofufo ha.” Ọ dịghị ndị Masedonia mkpa ịbụ ndị a kwaliri inye ihe. N’ụzọ megidere nke ahụ, Pọl sịrị na “ha weere ọtụtụ arịrịọ na-arịọ anyị ka anyị nye ha amara nke a.” Iji obi ụtọ emesapụ aka nke ndị Masedonia dị ịrịba ama nke ukwuu mgbe anyị tụlere na ha onwe ha bụ “ogbenye ọnụ ntụ.”—2 Ndị Kọrint 8:2-4.

N’ịja ndị Masedonia mma, Pọl ọ̀ na-anwa ịkpali mmụọ ịsọ mpi n’etiti ndị Kọrint? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na ọ maara na nke a abụghị ụzọ kwesịrị ekwesị isi kwalie mmadụ. (Ndị Galetia 6:4) Ọzọkwa, ọ mara na ọ dịghị mkpa imenye ndị Kọrint ihere gaa n’ime ihe ziri ezi. Kama nke ahụ, o nwere obi ike na ndị Kọrint hụrụ ụmụnna ha ndị Judia n’anya n’ezie ma chọọkwa ịtụnye ụtụ n’ọrụ enyemaka ahụ. “[Unu] buru ụzọ malite n’afọ gara aga,” ka ọ gwara ha, “ọ bụghị nanị ime eme, kama ịchọkwa achọ.” (2 Ndị Kọrint 8:10) N’ezie, n’akụkụ ụfọdụ nke ọrụ enyemaka ahụ, ndị Kọrint n’onwe ha bụ ihe nlereanya. “Amatara m obi dị ọkụ unu, nke m na-anyara ndị Masedonia isi banyere unu,” ka Pọl gwara ha, na-agbakwụnye, sị: “Ịnụ ọkụ n’obi unu kwalikwara obi ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha.” (2 Ndị Kọrint 9:2, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú ọ dị, ọ dị ndị Kọrint mkpa ugbu a itinye ịnụ ọkụ n’obi na obi dị ọkụ ha n’ọrụ.

N’ihi ya, Pọl gwara ha, sị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Nzube Pọl mgbe ahụ abụghị ịrụgide ndị Kọrint, n’ihi na o siri ike ka mmadụ bụrụ onye weere obi ụtọ na-enye mgbe a manyere ya amanye. Ihe àmà na-egosi na Pọl weere ya na ha enweworị ebumnobi kwesịrị ekwesị, na onye nke ọ bụla adịla mbụ kpebie inye ihe. Tụkwasị na nke a, Pọl gwara ha, sị: “A sị na obi dị ọkụ dị ya, ọ bụ ihe a ga-anara nke ọma dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị.” (2 Ndị Kọrint 8:12) Ee, mgbe obi dị ọkụ dị ya—mgbe ịhụnanya kwaliri mmadụ—ihe ọ na-enye ga-abụ ihe Chineke na-anara nke ọma, n’agbanyeghị otú o yiri ka ọ dịruru nta.—Tụlee Luk 21:1-4.

Ndị Ji Obi Ụtọ Enye Taa

Ọrụ enyemaka ahụ maka ndị Judia bụ́ ndị Kraịst na-enye ihe nlereanya magburu onwe ya maka ụbọchị anyị. Ndịàmà Jehova anọwo na-arụ ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, na-ewetara ọtụtụ nde ndị agụụ na-egbu n’ụzọ ime mmụọ nri. (Aịsaịa 65:13, 14) Ha na-eme nke a ná nrubeisi nye iwu Jisọs bụ́: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

Ịrụzu ọrụ a abụghị ọrụ dị mfe. Ọ na-agụnye ilekọta ebe obibi ndị ozi ala ọzọ nakwa ihe karịrị otu narị alaka ụlọ ọrụ gburugburu ụwa. Ọ na-agụnyekwa owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ dị iche iche ka ndị na-efe Jehova ofufe wee nwee ebe ndị kwesịrị ekwesị izukọta ma gbarịta ibe ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Mgbe ụfọdụ, Ndịàmà Jehova na-ewetakwa ihe enyemaka n’ógbè ndị ọdachi meere onwe ya kpaworo aka ọjọọ.

Cheekwa echiche banyere oké mmefu a na-eme n’ibipụta akwụkwọ. Kwa izu, ná nkezi, a na-ebipụta ihe karịrị Ụlọ Nche 22,000,000 ma ọ bụ ihe dị ka Teta! 20,000,000. Tụkwasị ná nri ime mmụọ a na-enye n’esepụghị aka e nwere ọtụtụ nde akwụkwọ, broshuọ, kaseti ndị a na-ege ege, na kaseti vidio ndị a na-emepụta kwa afọ.

Olee otú e si akwado ọrụ a nile? Site n’onyinye afọ ofufo. A na-enye ndị a, ọ bụghị iji mee ka ọha na eze mara ma ọ bụ site n’ebumnobi nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, kama iji mee ka ezi ofufe gaa n’ihu. N’ihi ya, ụdị inye ihe ahụ na-ewetara onye na-enye ya obi ụtọ, tinyekwara ngọzi Chineke. (Malakaị 3:10; Matiu 6:1-4) Ọbụna ụmụaka n’etiti Ndịàmà Jehova na-egosi onwe ha ịbụ ndị na-ewere mmesapụ aka na obi ụtọ na-enye. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nụsịrị banyere mbibi nke oké ifufe hurricane kpatara n’otu akụkụ nke United States, Allison gbara afọ anọ tụnyere $2. “Nke a bụ ego nile dị n’ebe m na-etinye ego,” ka o dere. “Amaara m na ihe ngwuri egwu na akwụkwọ na ụmụ bebi nile nke ụmụaka ahụ funahụrụ ha. Ma eleghị anya unu pụrụ iji ego a zụtara nwatakịrị nwanyị mụ na ya bụ ọgbọ otu akwụkwọ.” Maclean, bụ́ onye dị afọ asatọ, dere na o nwere obi ụtọ na ọ dịghị otu n’ime ụmụnna nwụrụ n’oké ifufe ahụ. Ọ gbakwụnyere, sị: “Akpatara m $17 site n’iso papa m na-ere hupcap. Anọ m na-aga iji ego m zụrụ ihe, ma mgbe ahụ echere m echiche banyere ụmụnna ahụ.”—Leekwa igbe dị n’elu.

N’ezie, obi Jehova na-aṅụrị ọṅụ ịhụ ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ka ha na-ebute ọdịmma Alaeze ya ụzọ site ‘n’ịsọpụrụ ya site n’akụ̀ ha.’ (Ilu 3:9, 10) Otú ọ dị, ọ dịghị onye pụrụ ime ka Jehova baa ọgaranya n’ezie, n’ihi na ọ bụ ya nwe ihe nile. (1 Ihe E Mere 29:14-17) Ma ịkwado ọrụ ahụ bụ ihe ùgwù nke na-enye onye ahụ na-efe ofufe ohere igosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ. Anyị nwere ekele n’ebe onye ọ bụla nke obi ya kpaliworo ya n’ụzọ dị otú ahụ nọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na Pọl ‘nyere iwu,’ nke a apụtaghị na ọ na-achọ ihe otú o si masị ya, ná mmanye. Kama nke ahụ, Pọl na-elekọta nanị onyinye ahụ, bụ́ nke metụtara ọgbakọ dị iche iche. Tụkwasị na nke a, Pọl sịrị na onye ọ bụla “n’ụlọ [nke aka ya, NW]” ga-enye “otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a ga-enye onyinye nke ọ bụla ná nzuzo nakwa n’ụzọ afọ ofufo. Ọ dịghị onye a manyere amanye.

[Igbe dị na peeji nke 26, 27]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe Onyinye Ndị A Na-enye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha.

A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ gaa n’ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

Onyinye nke A Pụrụ Ịnaraghachi

A pụrụ inye Watch Tower Society ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.

Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya

Tinyere inye onyinye ego kpọmkwem na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze zuru ụwa ọnụ uru. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bú na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Ihe Ntụkwasị Obi: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “inye ihe e mere atụmatụ ya” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ ime ka Society rite uru site n’ụdị ụfọdụ nke inye ihe e mere atụmatụ ya aka, Society akwadebewo otu broshuọ Bekee a kpọrọ Planned Giving to Benefit Kingdom Service Worldwide. E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị Society nataworo metụtara onyinye, ike ekpe, na ihe ntụkwasị obi. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ ndị bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi. A hazikwara ya iji nyere ndị bi na United States aka bụ́ ndị na-eme atụmatụ inye Society onyinye pụrụ iche ugbu a ma ọ bụ ịhapụ ekpe mgbe ha nwụrụ ịhọrọ ụzọ ndị kasị baa uru na ndị kasị dị irè, na-eburu ọnọdụ onwe onye na nke ezinụlọ ha n’uche.

Mgbe ha gụsịrị broshuọ ahụ ma soro ndị na-arụ ọrụ ná Ngalaba Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Society ma n’otu mgbe ahụ, mụbaa ihe e sepụrụ n’ụtụ isi site n’ime otú ahụ. E kwesịrị ime ka Ngalaba Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya mara banyere ma nata otu n’ime akwụkwọ ndị bara uru metụtara nke ọ bụla ná ndokwa ndị a. Ndị nwere mmasị na broshuọ ma ọ bụ na nke ọ bụla n’ime ndokwa inye ihe e mere atụmatụ ha ndị a kwesịrị ịkpọtụrụ Ngalaba Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu.

Planned Giving Desk

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive, Patterson, New York 12563-9204

Telephone: (914) 878-7000

[Igbe dị na peeji nke 28]

Ụmụaka Bụkwa Ndị Na-ewere Obi Ụtọ Na-enye!

Achọrọ m inye unu nke a iji bipụtakwuoro anyị akwụkwọ. Enwetara m ego a site n’inyere papa m aka. Unu emeela nnọọ maka nrụsi ọrụ ike nile unu.—Pamela, afọ asaa.

Ana m ezitere unu $6.85 iji nye aka iwukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Akpatara m ya n’oge okpomọkụ a mgbe m rere “lemonade” n’okporo ámá.—Selena, afọ isii.

M na-akpa nnekwu ọkụkọ bụ́ nke m si na ya nweta oké ọkụkọ na nnekwu ọkụkọ ọzọ. Araara m nke ikpeazụ nye Jehova. O mesịrị mụta nnekwu ọkụkọ atọ, bụ́ ndị m rere. Ana m enye ego ya maka ọrụ Jehova.—Thierry, afọ asatọ.

Nke a bụ ego nile m nwere! Biko jirinụ ya mee ihe n’ụzọ amamihe. O siri ike ichekwa. Ọ dị $21.—Sarah, afọ iri.

Enwetara m ihe nrite nke mbụ n’ihe omume ụlọ akwụkwọ, ya mere agara m asọmpi nke gọọmenti ime obodo. Enwetakwara m ihe nrite nke mbụ n’ebe ahụ, nwetakwa ihe nrite nke abụọ ná ndị ikpeazụ nke distrikti. Eritere m ego na ha nile. Achọrọ m isoro Society kerịta ụfọdụ n’ime ego ahụ. Echere m na enwere m ike inweta ihe nrite ndị a n’ihi ọzụzụ m nataworo n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Obi ruru m ala ikwu okwu n’ihu ndị na-eme mkpebi.—Amber, klas nke isii.

M ga-enwe mmasị inye unu nke a maka Jehova. Jụọnụ ya ihe a ga-eji ya mee. Ọ maara ihe nile.—Karen, afọ isii.

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

E ji onyinye afọ ofufo akwado ọrụ Ndịàmà Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya