“Ebere Ya Dị Ike”
DỊ KA JOSÉ VERGARA OROZCO SI KỌỌ
Ị̀ chere na ihe mkpali ọhụrụ pụrụ imejupụta ndụ gị n’afọ ndụ nke 70? Nke m dị otú ahụ. Nke ahụ bụkwa n’ihe karịrị 35 afọ gara aga. Site n’ebere Jehova, eri 1962, ejewo m ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, eri 1972 kwa, abụwo m onye nlekọta n’Ọgbakọ El Carrizal nke Ndịàmà Jehova na steti Jalisco, Mexico. Ka m gwatụ gị banyere ntolite m.
A MỤRỤ m na steti Michoacán, na Mexico, n’August 18, 1886. Nna m bụ onye òtù Mason, ya mere ezinụlọ anyị agaghị Chọọchị Katọlik, anyị ekerekwaghị òkè n’ememe okpukpe ọ bụla nke Katọlik ma ọ bụ nwee ihe oyiyi ọ bụla nke okpukpe n’ebe obibi anyị.
Mgbe m gbara 16 afọ, nna m hapụrụ ịga rụọ ọrụ na United States, ma o mere ndokwa ka otu nwoke kụziere m otu aka ọrụ. Otú ọ dị, nwoke ahụ kpọọrọ m gaa Mexico City iji nye m ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ ndị agha. Mgbe nke ahụ gasịrị, m malitere ọrụ n’ìgwè ndị agha Mexico.
Ịbụ Onye Agha na Mgbe E Mesịrị
Alụrụ m ọgụ ná Mgbanwe Ọchịchị Mexico nke malitere na 1910. Anyị nile bụ ụmụ okorobịa n’ụlọ akwụkwọ ahụ kwadoro Francisco I. Madero, bụ́ onye nkwatu ọchịchị nke megidere ọchịchị aka ike Porfirio Díaz. Anyị kwadoro Madero ruo ọnwụ ya na 1913, mgbe nke ahụ gasịkwara, anyị kwadoro Venustiano Carranza, bụ́ onye jere ozi dị ka onye isi ala Mba ahụ site 1915 ruo 1920. A kpọrọ anyị ndị Carranzista.
N’oge anọ dị iche iche, anwara m, ma ghara inwe ihe ịga nke ọma, ịbụ onye a tọhapụrụ site n’ije ozi agha. N’ikpeazụ, agbapụrụ m ma ghọọ onye mwagharị. N’ihi ya, a tụrụ nna m mkpọrọ, bụ́ onye lọghachiworo Mexico. N’otu ụbọchị, n’iji aghụghọ mee ka m bụ nwa nwanne ya, eletara m ya n’ụlọ mkpọrọ. Anyị ji ide ihe n’iberibe akwụkwọ ndị dị nta kwurịta okwu ka ndị nche ghara ịnụ ihe anyị na-ekwu. Iji mee ka onye ọ bụla ghara ịmata onye m bụ, atara m akwụkwọ ahụ.
Mgbe a tọhapụrụ nna m site n’ụlọ mkpọrọ, o letara m ma rịọ ka m nye onwe m n’aka ndị isi. Emere m otú ahụ, dịkwa ka ihe ijuanya nye m, ọchịagha nọ n’isi mgbe ahụ ejideghị m. Kama nke ahụ, ọ tụrụ aro ka m kwaga na United States. M gbasoro aro ya wee biri n’ebe ahụ site 1916 ruo 1926.
Na 1923, alụru m otu nwanyị onye Mexico bụ́ onye bikwa na United States. Amụrụ m otu aka ọrụ n’iwu ihe owuwu, anyị kuchikwara otu nwatakịrị nwanyị. Mgbe ọ gbara ọnwa 17, anyị lọghachiri Mexico ma biri na Jalpa, Tabasco. Mgbe ahụ ‘nnupụisi Cristero’ malitere, ọ dịgidekwara site 1926 ruo 1929.
Ndị Cristero ahụ chọrọ ka m sonyere ha. Otú ọ dị, mụ na ezinụlọ m họọrọ ịgbalaga Aguascalientes State. Ka anyị biworo n’ebe dị iche iche ná mba Mexico, na 1956 anyị nọdụrụ na Matamoros, Tamaulipas, ebe m malitere ilekọta ọrụ owuwu ihe dị iche iche.
Ndụ M Agbanwee
Nke a bụ mgbe ndụ m malitere ịgbanwe. Nwa m nwanyị, onye lụworo di ugbu a ma biri ná ngafe ókèala nke Brownsville, Texas, U.S.A., na-eleta anyị mgbe mgbe. Otu ụbọchị ọ sịrị: “Papa, ọtụtụ ezinụlọ na-ezukọ n’ụlọ nzukọ ọha na eze ugbu a. Ka anyị gaa hụ ihe ọ bụ.” Ọ bụ mgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Mụ na nwa m nwanyị, di nwa m, nwa nwa m, nwunye m, gara ụbọchị anọ dum nke mgbakọ ahụ.
Malite n’afọ ahụ gaa n’ihu, anyị gara nzukọ ndị Kraịst nile nke Ndịàmà Jehova. Enwere m ọganihu ime mmụọ na Mexico, ebe nwa m nwanyị mere otú ahụ na United States. N’oge na-adịghị anya ana m agwa ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ eziokwu dị iche iche nke Bible ndị m na-amụta. Ana m anata magazin iri n’ime mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ ndị m na-ekesa n’etiti ndị mụ na ha na-arụ ọrụ. Ise n’ime ndị na-arụ ọrụ n’ime ọfịs na atọ n’ime ndị injinia nakwa ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ndị ọzọ ghọrọ Ndịàmà.
Ewoo, oyi na-atụ na December 19 ahụ, 1959, mgbe e mere m baptism n’ime osimiri! Onye ọ bụla e mere baptism n’ụbọchị ahụ dara ọrịa n’ihi mmiri jụbigara oyi ókè. E mere nwa m nwanyị baptism tupu e mee m, nwunye m kwa, ọ bụ ezie na e meghị ya baptism, ruru n’ọnọdụ nke ịmata eziokwu Bible, ọ na-emekwa nnọọ ihe n’ụzọ kwekọrọ na ya.
Ozi Oge Nile
Enwere m mmetụta dị ka onye ji Chineke ụgwọ n’ihi ebere ya nile, ya mere na February 1962, mgbe m gbara 75 afọ, amalitere m ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. N’afọ ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, na 1968, nwunye m nwụrụ. Achọrọ m mgbe ahụ ije ozi ná mba ọzọ, ma n’ihi afọ ndụ m, ụmụnna echeghị na ezi uche dị na nke ahụ. Otú ọ dị, na 1970, e kenyere m ọrụ dị ka onye ọsụ ụzọ na Colotlán na steti Jalisco, ebe e nwere otu obere ọgbakọ.
Na September 1972, onye nlekọta sekit tụrụ aro ka m kwagaa n’obodo nta bụ El Carrizal, nke dị nso na Colotlán. Na November afọ ahụ, e hibere ọgbakọ n’ebe ahụ, a họpụtakwara m dị ka onye okenye. Ọ bụ ezie na ọ bụ obodo dịpụrụ nnọọ iche, ihe ruru 31 mmadụ na-abịa nzukọ ndị ahụ a na-enwe n’ọgbakọ.
N’agbanyeghị afọ ndụ m, m ka na-arụsi ọrụ ike n’ozi, na-agbalịsi ike inyere ndị mmadụ aka ka ha tụgharịa uche ná nkwenkwe ha nile. Dị ka ihe atụ, n’ekpere Rosari, ndị Katọlik obi ha ziri ezi na-ekwe ugboro ugboro Ekele M Marịa: ‘Ekele, Marịa, i jupụtara na grasịa; Osebulụwa dịnyeere gị.’ Ekpere ahụ na-ekwukwa, sị: ‘Marịa dị Nsọ, Nne nke Chukwu.’ M na-ajụ ha, sị: ‘Olee otú nke ahụ ga-esi mee? Ọ bụrụ na Chukwu bụ onye na-azọpụta Marịa, olee otú ọ pụrụ isi bụrụ n’otu oge ahụ nwa Ya?’
Agbara m 105 afọ ugbu a, ejewokwa m ozi dị ka onye okenye na dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile n’El Carrizal, Jalisco, ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 20 afọ. Echere m na ọ bụwo uche Jehova ka m dịrị ndụ ọtụtụ afọ ndị a, ebe ọ bụ na site n’ụzọ dị otú a m pụrụ ịkwụ ụgwọ oge m tụfuru mgbe m na-adịghị ejere Ya ozi.
Otu ihe m mụtaworo bụ na anyị kwesịrị inwe obi ike mgbe nile na Onye Ikpe Kasị Elu anyị nwere si n’ocheeze ezi omume ya na-ele anyị anya ma na-enye anyị ihe nile dị anyị mkpa. Dị ka Abụ Ọma 117:2 na-ekwu, sị: “Ebere ya dị ike n’ahụ anyị.”