Inye Ihe Oyiyi Nsọpụrụ Dị Omimi—Ihe Iseokwu
N’OTU ebe na Poland, otu nwoke ejikerewo maka njem ya. Otu ọ dị, ọ ghaghị ilebara otu ihe dị mkpa anya. O gburu ikpere n’ala n’ihu ihe oyiyi nke Jisọs, tụọ mma mma, wee kpee ekpere maka nchebe n’oge njem ya nile.
Ọtụtụ puku maịlụ n’ebe dị anya na Bangkok, Thailand, ị pụrụ ịhụ ememe mbụ nke ndị Buddha a na-eme kwa afọ, n’oge ọnwa gbazuworo okirikiri na May. Mgbe a na-eme ememe ahụ, ndị kwụrụ n’ahịrị na-ebugharị ihe oyiyi nke Buddha n’okporo ama dị iche iche.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị matawo na nsọpụrụ dị omimi nke a na-enye ihe oyiyi dị ka ndị a a kọwara, jupụtara ebe nile. N’ụzọ nkịtị ọtụtụ nde ndị mmadụ na-akpọ isiala nye ihe oyiyi dị iche iche. Ruo ọtụtụ puku afọ e lewo ihe oyiyi anya dị ka ụzọ dị mkpa e si eru Chineke nso.
Olee ihe i chere banyere iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe? Inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi ò ziri ezi ka ọ bụ na o zighị ezi? Olee otú Chineke si ele ya anya? È nwere ihe na-egosipụta na ọ na-anabata ụdị ofufe ahụ? Eleghị anya gi onwe gi echebarabeghị ụdị ajụjụ ndị dị otú ahụ echiche buru ibu. Ma, ọ bụrụ na i were mmekọrịta gị na Chineke dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ọ dị gị mkpa inweta azịza nye ajụjụ ndị ahụ.
Ọ bụ ezie na, n’ebe ụfọdụ ndị nọ, okwu a abụghị ihe dị mfe ikpebi. N’ezie, ọ bụrụwo isiokwu nke ihe iseokwu na-ekpo ọkụ na mgbe ụfọdụ nke na-eweta ime ihe ike ruo ọtụtụ puku afọ. Dị ka ihe atụ, laa azụ n’afọ 1513 T.O.A., onye ndú ndị Hibru bụ́ Mosis bibiri ihe oyiyi ọlaedo nke nwa ehi ma jiri mma agha gbuo 3,000 ndị mmadụ bụ́ ndị na-enye ya nsọpụrụ dị omimi.—Ọpụpụ, isi 32.
Nguzogide siri ike nke iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe akwụsịghị n’ebe ndị Juu nọ. Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme n’oge ochie e chebewo akụkọ ifo nke Takhmūrūp, onye na-achị Peasia bụ́ onye a sịrị na o mere mkpọsa dị ukwuu megide inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi ọtụtụ narị afọ tupu Mosis. Na China onye eze nke e kwuru na o biri ndụ n’ogologo oge gaworo aga ka a kọrọ na o ji ndị agha lụọ ọgụ megide ihe a kpụrụ akpụ nke chi dị iche iche. Mgbe e bibisịrị ihe oyiyi ndị ahụ, ọ katọrọ dị ka ihe nzuzu nsọpụrụ dị omimi nke a na-enye chi ndị e ji aja kpụọ. Mgbe e mesịrị, mgbe Muhammad ka bụ nwata, e nwere ndị Arebia na-eguzogide iji ihe oyiyi na-efe ofufe. Mmetụta ha nwere n’ebe Muhammad nọ kpatara ihe bụ uche ya n’ihe banyere ife arụsi n’afọ ndị sochirinụ. Na Koran, Muhammad kụziri na ife arụsi bụ mmehie n’enweghị mgbaghara, na ekwesịghị ikpere ndị na-efe arụsi ekpere, nakwa na a machibidoro iwu ịlụ onye na-efe arụsi.
Ọbụna ndị okpukpe a ma ama nke Krisendọm na narị afọ nke abụọ, atọ, anọ, na ise O.A., dị ka Irenaeus, Origen, Eusebius nke Sizarịa, Epiphanius, na Augustine, guzogidere ojiji nke a na-eji ihe oyiyi a na-efe ofufe. Ihe dị ka ná mmalite nke narị afọ nke anọ O.A., na Elvira, Spain, otu òtù nke ndị ụkọchukwu depụtara ụfọdụ mkwupụta dị mkpa megide inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi. Nzukọ Elvira nke a ama ama mere ka a machibido ihe oyiyi iwu na chọọchị nile nakwa nguzobe nke ntaramahụhụ siri ike megide ndị na-efe ihe oyiyi ofufe.
Ndị Na-ebibi Ihe Oyiyi
Ihe ndị a merenụ mepere ụzọ maka otu n’ime ihe iseokwu kasị ukwuu n’ime akụkọ ihe mere eme: ihe iseokwu nke ndị na-ebibi ihe oyiyi nke narị afọ nke asatọ na itoolu. Otu onye ọkọ akụkọ kwuru na “iseokwu a dị ilu nọgidere ruo otu narị afọ na ọkara, ma wetakwa ịta ahụhụ siri ike” nakwa na ọ bụ “otu n’ime ihe kpatara nkewa dị n’etiti alaeze ukwuu Ọdịda Anyanwụ na nke Ọwụwa Anyanwụ.”
Okwu ahụ bụ “onye mbibi ihe oyiyi” sitere n’okwu Grik bụ eikon, nke pụtara “ihe oyiyi,” na klastes, nke pụtara “onye mbibi.” Ime ihe dị ka aha ya sị dị, mgbalị a a haziri ahazi megide ihe oyiyi gụnyere mwepụ na mbibi nke ihe oyiyi dị iche iche na Europe nile gbaa gburugburu. E tinyere ọtụtụ iwu megidere ihe oyiyi n’ọrụ iji kpochapụ ojiji e ji ihe oyiyi eme ihe n’ife ofufe. Inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi ghọrọ ihe iseokwu kpụ ọkụ n’ọnụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke dọtara ndị ọchịchị alaeze ukwu na ndị popu, ndị ọchịagha na ndị bishọp baa n’ihe bụ n’ezie agha nkà mmụta okpukpe.
Nke a karịkwara agha nke okwu ọnụ. Akwụkwọ bụ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature nke McClintock na Strong dere, kwuru na mgbe Emperor Leo nke Atọ nyesịrị iwu megide iji ihe oyiyi eme ihe n’ime chọọchị, ndị mmadụ “biliri n’ígwè megide iwu ahụ, na ọgba aghara ime ihe ike, karịsịa na Constantinople,” ghọrọ ihe na-eme kwa ụbọchị. Nsogbu dị n’etiti ndị agha alaeze ahụ na ndị mmadụ mere ka e gbukpọọ ọtụtụ ndị. E sogburu ndị mọnk n’ụzọ dị njọ. Ọtụtụ narị afọ ka nke a gasịrị, na narị afọ nke 16, e nwere ọtụtụ nrụrịta ụka ihu ọha na Zurich, Switzerland, n’okwu banyere ihe oyiyi n’ime chọọchị. Dị ka ihe si na nke a pụta, e mepụtara iwu nke chọrọ mwepụsị nke ihe oyiyi nile site n’ime chọọchị nile. A rịbara ụfọdụ ndị na-eme mgbanwe ama maka nkatọ siri ike na nke a na-ejikarị ime ihe ike eme ha katọrọ ofufe nke ihe oyiyi.
Ọbụna taa e nwere nkewa dị ukwuu n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe n’oge a banyere iji ihe oyiyi na-eme ihe n’ofufe. Isiokwu ndị na-esonụ ga-enyere gị aka ịtụle ma ihe oyiyi ọ pụrụ inyere mmadụ aka iru Chineke nso.