Ihe Oyiyi Hà Pụrụ Ịdọta Gị Nso n’Ebe Chineke Nọ?
ỌNỤ ọgụgụ dị ukwuu nke ihe oyiyi ndị Ijipt, Babilọn, na Grik jupụtara n’ụlọ ebe a na-echebe ihe ochie taa. Ugbu a a kpọsasịrị ihe a kpụrụ akpụ ndị bụbu n’otu mgbe ihe a na-enye nsọpụrụ dị omimi nanị dị ka ọrụ nke nkà oge ochie. Ike ha dị nanị n’echiche nke ndị na-efe ha ofufe. Ka ndị na-enye ha nsọpụrụ dị omimi nwụsịrị, ike e chere na ihe oyiyi ndị a nwere pụkwara n’anya. E kpughere ihe oyiyi ndị a dị ka ihe na-adịghị ike—nke bụ n’ezie ihe ha bụworo mgbe nile—ihe na-adịghị ndụ e ji osisi, nkume, ma ọ bụ ígwè mee.
Gịnị banyere ihe oyiyi dị iche iche a na-enye nsọpụrụ dị omimi taa, na-efekwa ha ofufe? Ihe oyiyi ndị a hà dị ike karịa ihe oyiyi nke Ijipt, Babilọn, na Grik oge ochie? Hà abụrụwo ihe na-enyere mmadụ aka ịbịarụ Chineke nso?
Ka ọgbọ ọ bụla na-agafe, ihe a kpọrọ mmadụ yiri ka ha na-anọgide na-ewezụga onwe ha n’ebe Chineke nọ. Gịnịkwa ka ihe oyiyi nile dị n’ime ụwa pụrụ ime banyere ya? Ọ bụrụ na e lefuru ha anya, ha ga-ekpo ntụ ma repịasịa ma ọ bụ rekasịa. Ha apụghị ilekọta onwe ha anya, ka ọ fọdụkwa ime ihe ọ bụla maka ụmụ mmadụ. Otú ọ dị, dị ka ihe ka mkpa, gịnị ka Bible nwere ikwu n’okwu a?
Ha Dị Oké Ọnụ, Dịkwa Ukwuu, ma Ha Abaghị n’Ihe
Dị ka ihe na-adịghị eju anya, Bible na-ekpughe ihe oyiyi dị ka ihe na-abaghị n’ihe na ihe na-enweghị ike ọ bụla nke inyere ndị na-asọpụrụ ha aka ịbịarụ Chineke nso. Ọ bụ ezie na ihe oyiyi okpukpe na-adịkarị oké ọnụ ma dịkwa ukwuu, Bible gosịrị ihe ha pụtara mgbe o kwuru, sị: “Arụsị nile ha bụ ọlaọcha na ọlaedo, ọrụ aka mmadụ. Ha nwere ọnụ, ma ha adịghị ekwu okwu; ha nwere anya abụọ, ma ha adịghị ahụ ụzọ; ha nwere ntị abụọ, ma ha adịghị anụ ihe; ha nwere imi, ma ha adịghị anụta ísì; ha nwere aka ha abụọ, ma ha adịghị ebitu ihe; ha nwere ụkwụ ha abụọ, ma ha adịghị eje ije; ha adịghị ewere akpịrị ha mee ụṅara. Ndị na-eme ha ga-adị ka ha; Ee, onye ọ bụla nke na-atụkwasị ha obi.”—Abụ Ọma 115:4-8.
Ọ bụghị nanị na Bible kpughere arụsị dị ka ihe na-abaghị uru kama o kwukwara n’ụzọ nkatọ banyere ihe oyiyi na ndị na-efe ha ofufe: “Ha dị ka nkwụ, ihe a kpụrụ akpụ ka ha bụ, ha adịghị ekwu okwu: aghaghị ibu ha ebu, n’ihi na ha adịghị azọ ije. Unu atụla egwu ha; n’ihi na ha agaghị eme ihe ọjọọ, ọzọkwa, ime ezi ihe adịghị ha n’aka. Nanị anụ ọhịa ka mmadụ ọ bụla ghọworo site n’ihe ọmụma ya; e mewo ka ihere mee onye nnụcha ọla ọ bụla site n’arụsị ya a pịrị apị: n’ihi na okwu ụgha ka arụsi ya a wụrụ awụ bụ, nkuume adịghịkwa n’ime ha. Ihe efu ka ha bụ, ọrụ ịkwa emo.”—Jeremaịa 10:5, 14, 15.
Echiche Ndị Katọlik
N’ezie, ọtụtụ ndị na-akpọ isiala nye ihe oyiyi okpukpe, kpegara ya ekpere ma mụnye kandụl, sutụkwa ya ọnụ adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị na-efe arụsị ma ọ bụ ndị na-efe ihe oyiyi. Dị ka ihe atụ, ndị Katọlik na-ekwu na ha na-enye ihe oyiyi nke Meri na Jisọs nsọpụrụ dị omimi, ọ bụghị n’ihi na ihe oyiyi ndị ahụ n’onwe ha nọ n’ụdị chi, kama n’ihi ndị ihe oyiyi ahụ nọchịrị anya ha. Akwụkwọ bụ The World Book Encyclopedia kwuru na “n’ime Chọọchị Roman Katọlik, a na-enye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi dị ka ihe ngosi nke ndị ha na-anọchi anya ha.” Onye ụkọchukwu Katọlik ekwuwo n’okwuchukwu na o ziri ezi inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi ma ọ bụrụhaala na nsọpụrụ ahụ dị ala karịa nke e kwesịrị inye Chineke n’onwe ya.
Nke bụ eziokwu bụ na a na-enye ihe oyiyi ndị a nsọpụrụ dị omimi. Ọbụna akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia na-ekwenye na ụdị nsọpụrụ dị omimi dị otú ahụ bụ “omume nke ife ofufe.” Otú ọ dị, Jisọs kraịst gụpụrụ iji ihe oyiyi eme ihe dị ka ihe na-enye aka n’ịbịakwute Chineke mgbe o kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Mgbe ahụ ọ bụghị ihe ijuanya, na ndi Kraịst narị afọ mbụ kpọrọ iji ihe oyiyi na-eme ihe n’ofufe asị.
N’agbanyeghị nke a, taa okpukpe nile nke Krisendọm karịrị ndị ọ bụla ọzọ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ihe oyiyi dị iche iche. Ee, n’agbanyeghị ihe àmà nile nke akụkọ ihe mere eme na nke Akwụkwọ nsọ ndị na-ekpughe nzuzu dị n’inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi, ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst n’elu ụwa nile na-anọgide na-akpọ isiala ma na-ekpe ekpere n’ihu ihe oyiyi dị iche iche n’ọchịchọ ha ji ezi obi na-achọ Chineke. N’ihi gịnị?
Ha Bụ Ndị Onye Iro Na-adọrọ
Onye amụma bụ Aịsaịa kwuru na ndị na-efe ihe oyiyi ofufe nke oge ya ahụghị ihe nzuzu dị n’omume ha n’ihi na anya ha abụrụwo nke ‘e techiworo, ha we ghara ịhụ ụzọ; O techiwo obi ha, ha wee ghara inwe uche.’ (Aịsaịa 44:18) Ònye pụrụ inwe ụdị mmetụta ahụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ? Nzụkọ nke ndị na-ebibi ihe oyiyi nke 754 O.A. kwupụtara na Setan webatara omume nke inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi maka nzube nke ịdọrọ mmadụ pụọ n’ebe ezi Chineke ahụ nọ. Mkwubi okwu a ò ziri ezi?
Ee, n’ihi na o kwekọrọ na Bible e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke kwuru n’ọtụtụ narị afọ tupu oge a na onye iro bụ isi nke Chineke, bụ́ Setan, Ekwensu, ‘mere ka anya nke uche ndị mmadụ kpuo isi’ ka eziokwu “wee ghara ịwakwasị” ha. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ya mere, mgbe a na-enye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi, kama ịbụ onye na-eru Chineke nso, onye ahụ n’ezie na-ejere ọdịmma nke ndị mmụọ ọjọọ ozi.—1 Ndị Kọrint 10:19, 20.
Ịbịaru Chineke Nso
Ihe oyiyi apụghị inyere anyị aka ịbịaru Chineke nso. Onye Okike Ukwuu, Jehova Chineke, kpọrọ inye ihe oyiyi nsọpụrụ dị omimi asị. (Deuterọnọmi 7:25) “Chineke ekworo . . . ka Jehova bụ.” (Nehum 1:2) O kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: M gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, M gaghị enyekwa arụsị dị iche iche apịrị apị otuto m.” (Aịsaịa 42:8) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Bible dọrọ aka ná ntị na ndị na-asọpụrụ ihe oyiyi dị iche iche “agaghị eketa alaeze Chineke.”—Ndị Galetia 5:19-21.
Otú ọ dị, Jehova bụkwa Chineke nwere obi ebere ma na-agbaghara mmehie. Bible na-ekwu banyere ndị ahụ hapụrụ arụsị ma chigharịkwute chineke wee bụrụ ndị a gụrụ dị ka ndị ezi omume mgbe ha kwụsịrị omume ikpere arụsị ha. (1 Ndị Kọrint 6:9-11; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:9) Ha gere ntị n’okwu Jisọs: “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”—John 4:24.
Ịmụsị Bible ike ga-ekpughe na ọ bụghị ihe siri ike ịbịaru Chineke nso. (Ọrụ 17:26-28) O nwere ọdịdị onye na-ekpo ọkụ, na-ahụkwa n’anya, onye a pụrụ ịgakwuru, ọ na-akpọkwa anyị òkù ma na-ele anyị anya ịzụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe ọ nọ.—Aịsaịa 1:18.
Ndịàmà Jehova na-akpọ gị òkù ka ị mara Nna anyị nke eluigwe dị ka Onye, ịmụta banyere aha ya, bụ́ Jehova, nakwa banyere àgwà ya nile na mmeso ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Site na peji nile nke Okwu ya, bụ́ Bible, ị ga-aghọta ihe mere na ọ dịghị gị mkpa inwe ihe enyemaka a na-ahụ anya, dị ka ihe a kpụrụ akpụ na ihe osise, iji bịakwute Chineke. Ee, “bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jemes 4:8.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ndị Na-akọ Akụkọ Ihe Mere Eme Chọpụtara na . . .
◻ “Ọ bụ eziokwu a ma ama na okpukpe Buddha, nke e guzobere na narị afọ nke isi TOA, ahụghị ihe oyiyi mbụ nke onye guzobere ya ruo ihe dị ka narị afọ nke mbụ OA.”
“Ruo ọtụtụ narị afọ, omenala Hindu bụ nke na-enweghị arụsị ma ọ bụ ihe oyiyi.”
“Okpukpe Hindu na Buddha malitere na-enweghị arụsị ma ọ bụ ihe oyiyi ma jiri nnọọ nwayọọ na-anabata ihe oyiyi n’ime ofufe ha. Okpukpe ndị Kristian mere otu ihe ahụ.”—Akwụkwọ bụ The Encyclopedia of Religion, nke Mircea Eliade dere.
◻ “Site n’ọtụtụ ihe ndekọ Bible dị iche iche o doro anya na ezi ofufe nke Chineke enweghị ihe oyiyi n’ime ya. . . . Na AỌ [Agba Ọhụrụ], kwa, a amachibidoro ofufe nke chi na arụsị dị iche iche nke ndị mba ọzọ iwu.”—New Catholic Encyclopedia.
◻ “A maghị ihe banyere ihe oyiyi n’ofufe ndị Kraịst oge ochie.”—Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke McClintock na Strong dere.
◻ “Ma n’Agba Ọhụrụ ma n’ihe odide ziri ezi nke oge mbụ nke Iso Ụzọ Kraịst, a pụghị ịchọpụta ihe na-egosi ojiji nke e jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ ihe osise mee ihe n’ofufe nke ndị Kraịst, ma ọ̀ bụ n’ihu ọha ma ọ̀ bụ na nzuzo.”—A Concise Cyclopedia of Religious Knowledge, nke Elias Benjamin Sanford dere.
◻ “Ndị Kraịst oge mbụ gaara eleworị nanị ịtụ aro nke idote ihe oyiyi n’ime chọọchị anya ọjọ, ma na-ewere ịkpọ isiala ma ọ bụ ikpe ekpere n’ihu ha dị ka ife arụsị.”—History of the Christian Church nke John Fletcher Hurst dere.
◻ “Na chọọchị oge mbụ, a nọgidere na-emegide ime na inye ihe a kpụrụ akpụ nke Kraịst na ndị nsọ nsọpụrụ dị omimi.”—The New Encyclopædia Britannica.
◻ “Ọ bụ ezie na ndị Chọọchị oge mbụ adịghị eguzogide ime nkà, ma o nweghị ihe oyiyi dị iche iche nke Kraịst.”—Schaff-Herzog Encyclopedia of Religious Knowledge.
[Foto dị na peeji nke 7]
Jisọs mesịrị ya ike na Chineke na-achọ ndị ahụ “na-akpọ isiala nye [Nna] n’ime mmụọ na eziokwu”