‘Ịnara Ihe Ọmụma nke Chineke na Jisọs’
“NKE a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Otú ahụ ka Jisọs kwuru n’ekpere o kpegaara Nna ya nke eluigwe, o sikwa otú a gosipụta otu isi ihe dị oké mkpa a chọrọ maka inweta ndụ ebighị ebi. Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka New World Translation ji sụgharịa amaokwu a ịbụ “ịnara ihe ọmụma nke . . . Chineke” kama ịbụ “mara . . . Chineke,” dị ka ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị ndị ọzọ nke Bible si dee ya?—Leekwa nkọwa ala ala peji maka Jọn 17:3.
Okwu Grik nke a sụgharịrị ebe a ịbụ ‘nara ihe ọmụma’ ma ọ bụ “mara” bụ otu ụdị nke ngwaa okwu ahụ bụ gi·noʹsko. Otú e si dee ya na New World Translation bụkwa nke e mere iji wepụta ihe okwu ahụ pụtara n’ụzọ kachasị mma ọ pụrụ ikwe mee. Isi ihe okwu ahụ bụ gi·noʹsko pụtara bụ ‘ịmara,’ ma okwu Grik ahụ nwere ụdị ihe dị iche iche ọ pụtara. Rịba ama nkọwa ndị na-esonụ:
“GINŌSKŌ (γινώσκω) pụtara ịnọgide na-anara ihe ọmụma, ịmata, ịmata nke ọma, ịghọta, ma ọ bụ ịghọta n’ụzọ zuru ezu.” (Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere) Ya mere, ịsụgharị gi·noʹsko ‘ịnara ihe ọmụma’ abụghị ‘ịgbanwe Bible,’ dị ka ndị na-akatọ New World Translation kwuworo na ọ bụ. N’ịtụle ụdị ihe dị iche iche okwu ahụ pụrụ ịgụnyekọta, onye a ma ama n’ide akwụkwọ ọkọwa okwu, bụ́ James Hope Moulton kwuru, sị: “Ọnọdụ okwu ahụ nke bụ nke ihe na-eme eme, bụ́ γινώσκειν, na-egosi ihe a nọgidere na-eme n’ogologo oge, ‘ịnọ na-anara ihe ọmụma.’”—A Grammar of New Testament Greek.
Akwụkwọ bụ A Grammatical Analysis of the Greek New Testament kọwara gi·noʹsko dị ka ọ dị na Jọn 17:3 dị ka “nke na-egosi usoro nke nọgidere na-aga n’ihu.” Nkọwa a gara n’ihu nye okwu Grik nke a pụtara n’akwụkwọ bụ Word Studies in the New Testament, nke Marvin R. Vincent dere. Nke a na-asị: “Ihe mejupụtara ndụ ebighị ebi bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ, kama nke ahụ, nchụso nke ihe ọmụma, ebe ọnọdụ okwu nke na-egosi ihe na-eme eme na-egosi ihe na-aga n’ihu, nghọta nke na-aga n’ihu n’ihu.” (Ọ bụ ya dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Akwụkwọ A. T. Robertson bụ́ Word Pictures in the New Testament na-atụ aro ịsụgharị okwu ahụ ịbụ “kwesịrị ịnọgide na-amara.”
N’ihi ya, n’asụsụ Grik mbụ ahụ, okwu Jisọs nke dị na Jọn 17:3 na-egosi mgbalị a nọgidere na-eme ịmata ezi Chineke ahụ na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, e mekwara ka nke a pụta ìhè nke ọma ná nsụgharị nke New World Translation. Anyị na-enweta ihe ọmụma nke a site n’ịdị uchu n’ịmụ Okwu Chineke nakwa iji nrubeisi na-eme ka ndụ anyị kwekọọ n’ụkpụrụ ya nile. (Tụlee Hosea 4:1, 2; 8:2; 2 Timoti 3:16, 17.) Ezi nkwụghachi ụgwọ dị aṅaa na-echere ndị ahụ na-amata àgwà nile nke Chineke na nke Ọkpara ya, wee mee mgbalị iṅomi ha? Ndụ ebighị ebi!