Justin—Ọkà Ihe Ọmụma, Onye Nkwado Okwukwe, na Onye E Gburu n’Ihi Okwukwe Ya
“ANYỊ na-achọ ka enyochaa ihe ndị ahụ e kwuru na ndị Kraịst mere, na, ọ bụrụkwa na e gosipụta na nke a bụ eziokwu, ka e nye ha ntaramahụhụ kwesịịrị ha . . . Ma ọ bụrụ na o nweghị onye ga-akọli ihe ọjọọ ọ bụla nke mere a ga-eji maa anyị ikpe, ikpe ziri ezi na-egbochi unu, imerụ ndị aka ha dị ọcha ahụ n’ihi akụkọ ọjọọ na-enweghị isi nke a na-agbasa . . . N’ihi na ọ bụrụ na unu, mgbe unu mụtaworo eziokwu, ma na-adịghị eme ihe n’ikpe na-ezighị ezi, mgbe unu mataworo ihe bụ eziokwu unu ga-anọ n’ihu Chineke n’enweghị ihe ngọpụ ọ bụla.”
Site n’okwu ndị a nile, Justin Martyr, onye kwuru na ya bụ onye Kraịst nke narị afọ nke abụọ O.A., kpọkuru onye ọchịchị alaeze ukwu Rom bụ́ Antoninus Pius. Justin rịọrọ ka e nwee nnọkọ ikpe anya doro nke ga-enyocha ndụ na nkwenkwe ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst. Ọchịchọ nke a maka ikpe ziri ezi sitere n’aka nwoke nwere ihe ọmụma ụwa na nzụlite na-adọrọ mmasị.
Ọzụzụ na Ndụ Ya Mgbe Ọ Bụ Nwantakịrị
Justin bụ onye Gentaịl, nke a mụrụ n’ihe dị ka 110 O.A. na Sameria n’obodo ukwu nke Flavia Neapolis, nke bụ ugbu a Nablus. Ọ kpọrọ onwe ya Onye Sameria, ọ bụ ezie na o yiri ka nna ya na nna ya ochie bụ ndị Rom na Grik. Nzụlite ya n’omenala ndị ọgọ mmụọ, tinyere agụụ nke eziokwu, dugara ya n’ịmụsi nkà ihe ọmụma ike. N’enweghị afọ ojuju ná nnyocha ya n’etiti ndị Stoik, ndị Peripatetic, na ndị òtù Pythagoras, ọ chụsoro echiche nke Plato.
N’otu n’ime akwụkwọ ya, Justin kwuru banyere ọchịchọ ya iso ndị ọkà ihe ọmụma kwurịta okwu wee sị: “E nyefere m otu onye Stoic onwe m; ebe m sowokwara ya nọkọọ ruo ogologo oge ụfọdụ, mgbe m na-enwetakwughị ihe ọmụma ọ bụla banyere Chineke (n’ihi na ya onwe ya amaghị ya), . . . M hapụrụ ya ma nyefekwa onye ọzọ onwe m.”—Dialogue of Justin, Philosopher and Martyr, With Trypho, a Jew.
Onye ọzọ Justin gakwuuru bụ onye Peripatetic bụ́ onye nwere mmasị n’ego karịa n’eziokwu. “Nwoke a, ka ọ nabatasịrị m n’ụbọchị ole na ole mbụ,” ka Justin kwuru, “gwara m ka m kwụọ ụgwọ ya, iji mee ka nkwurịta okwu anyị ghara ịbụ nke na-abaghị uru. N’ihi ihe a, a hapụkwara m ya, na-ekwere na ọ bụghị onye ọkà ihe ọmụma ma ọlị.”
N’ihi ọchịchọ nke ịnụ “nkà ihe ọmụma dị mma,” Justin “bịakwutere onye òtù Pythagoras, onye a ma ama—nwoke amamihe nke ya onwe ya na-afụli elu.” Justin kwuru, sị: “Mgbe ọ gbara m ajụjụ ọnụ, n’ịdị njikere m ịghọ onye na-eso ụzọ ya na onye na-ege ya ntị, ọ sịrị, ‘Gịnị ọzọ ka a ga-eme? I nwere ihe ọmụma banyere egwu, nkà inyocha mbara igwe, na mgbakọ na mwepụ? Ị na-atụ anya ịmata otu n’ime [ihe Chineke] ndị ahụ nke na-enye ndụ obi ụtọ, ọ bụrụ na a gwabeghị gị ihe banyere [ihe ndị a] na mbụ?’ . . . Ọ chụpụrụ m mgbe m kwupụtara na amaghị m ihe banyere ihe ndị a.”
Ọ bụ ezie na o nwere nkụda aka, Justin nọgidere na-achọ eziokwu site n’ichega ihu n’onye òtù Plato ahụ a ma ama. O kwuru, sị: “M malitere mgbe ahụ iji oge m dị ukwuu m pụrụ iwepụta soro onye ahụ bịara n’obodo anyị n’oge na-adịbeghị anya nọrọ—nwoke nwere amamihe na nghọta, nọ n’ọkwa dị elu n’etiti ndị òtù Plato,—e nwekwara m ọganihu, na-enwekwa ito uto kasị ukwuu kwa ụbọchị . . ., nke mere na na nwa ntakịrị oge e chere m na enwewo m amamihe; ma nke ahụ,” ka Justin kwubiri, “bụ nzuzu m mere.”
Ọchịchọ nke Justin chọrọ eziokwu site n’izute ndị ọkà ihe ọmụma abụrụwo ihe efu. Ma mgbe ọ na-atụgharị uche n’ụsọ osimiri, o zutere onye Kraịst mere okenye, “otu nwoke meworo agadi, onye na-adịghị ala ma ọlị n’ọdịdị ya, na-egosipụta ụmeala na àgwà dị mma ịkwanyere ùgwù.” Mkparịta ụka dapụtaranụ dujere echiche ya n’ozizi Bible ndị bụ isi nke lekwasịrị anya ná mkpa maka ezi ihe ọmụma nke Chineke.—Ndị Rom 10:2, 3.
Onye Kraịst ahụ a na-akpọghị aha gwara Justin, sị: “Ogologo oge tupu ugbu a, e nwere ndị ikom meworo ochie karịa ndị ahụ nile e lere anya dị ka ndị ọkà ihe ọmụma, ndị na-eme ezi omume na ndị Chineke hụrụ n’anya, bụ́ ndị . . . buru amụma ihe ndị ga-emenụ, bụkwa nke na-eme eme ugbu a. A na-akpọ ha ndị amụma. Nanị ndị a hụrụ ma kpọsaa eziokwu nye ndị mmadụ, . . . ebe ha jupụtara n’ike Mmụọ Nsọ.” N’ịgakwu n’ihu n’ịkpali mmasị Justin, onye Kraịst ahụ sịrị: “Ihe odide ha ka dị adị, a na-enyekwara onye ọ bụla gụworo ha aka nke ukwu n’ihe ọmụma ya nke mmalite na ọgwụgwụ nke ihe nile.” (Matiu 5:6; Ọrụ 3:18) Dị ka nwoke ahụ nwere obi ọma gbara ume ya, Justin ji ịdị uchu nyochaa Akwụkwọ nsọ ma yie ka o nwetawo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nghọta ha na amụma Bible, dị ka a na-ahụ n’ihe odide ya.
Ilebakwu Anya n’Akwụkwọ Ya Dị Iche Iche
Justin nwere obi ụtọ n’ihi atụghị egwu nke ndị Kraịst n’ihu ọnwụ. Ọ ghọtakwara ozizi eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Iji kwadoo ịrụ ụka ya n’akwụkwọ ya bụ Dialogue With Trypho, Justin hotara ihe site na Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Deuterọnọmi, 2 Samuel, 1 Ndị Eze, Abụ Ọma, Aịsaịa, Jeremaịa, Ezikiel, Daniel, Hosea, Joel, Emos, Jona, Maịka, Zekaraịa, na Malakaị, nakwa n’Oziọma. Nghọta ya nke akwụkwọ Bible ndị a nile bụ nke a pụrụ ịhụ na mkwụrịta okwu ya na Trypho nwere, bụ ebe Justin kwuru banyere okpukpe ndị Juu nke kwenyere na Mesaịa ahụ.
A na-akọ na Justin bụ onye na-eje ozi ọma, na-ekwusa ozi ọma n’ohere ọ bụla. O yiri ka o mere njem dị ukwu. O ji ụfọdụ oge ya nọrọ n’Efesọs, o dokwara anya na o bitụrụ na Rom ruo oge ụfọdụ.
Ọrụ ihe odide nke Justin gụnyere nkwado okwukwe o dere ná nkwado nke Iso Ụzọ Kraịst. Na First Apology ya, ọ chọrọ iwepụ ọchịchịrị dị ukwuu nke nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ site n’iji ìhè sitere n’Akwụkwọ nsọ. O kwuru na amamihe nke ndị ọkà ihe ọmụma bụ ụgha na ihe ghere oghe n’ụzọ dị iche n’okwu na ọrụ dị ike nke Kraịst. (Tụlee Ndị Kọlọsị 2:8.) Justin rịọrọ arịrịọ maka ndị Kraịst ahụ a na-eleda anya bụ ndị ọ nọnyeere. Mgbe a tọghatasịrị ya, ọ gara n’ihu na-eyi uwe ndị ọkà ihe ọmụma, na-ekwu na ya enwetawo nanị otu ezi nkà ihe ọmụma dịnụ.
N’ihi ịjụ ife chi ndị ọgọ mmụọ ofufe, e lere ndị Kraịst narị afọ nke abụọ anya dị ka ndị na-ekwenyeghị na Chineke dị. “Anyị abụghị ndị na-ekwenyeghị na Chineke dị,” ka Justin zaghachiri, “ebe anyị na-efe Onye Mere eluigwe na ala . . . Onye na-akụziri anyị ihe ndị a nile bụ Jisọs Kraịst . . . Ọ bụ Ọkpara nke ezi Chineke ahụ.” Banyere ife arụsị, Justin sịrị: “Ha mere ihe ha kpọrọ chi; bụ́ ihe anyị lere anya dị ka ọ bụghị nanị ihe nzuzu, kama ihe na-ewetara Chineke mkparị . . . Lee ụdị ihe nzuzu nke a bụ! na ndị mmadụ na-ebi ndụ rere ure bụ ndị a sị na ha na-echepụta ma na-eme chi dị iche iche maka ofufe gị.”—Aịsaịa 44:14-20.
Ebe ọ kpọtụrụ ọtụtụ uche n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst, Justin kwupụtara nkwenkwe ya ná mbilite n’ọnwụ, omume ọma ndị Kraịst, baptism, amụma Bible (karịsịa metụta Kraịst), na ozizi Jisọs. Banyere Jisọs, Justin hotara Aịsaịa, na-ekwu, sị: “Ọchịchị ga-adị n’ubu [Kraịst].” Justin kwukwara sị: “Ọ bụrụ na anyị achọ alaeze nke mmadụ, anyị gakwa agọnarị Kraịst anyị.” O kwuru banyere ule na ibu ọrụ nke ndị Kraịst, nọgide na-ekwu na ijere Chineke ozi kwesịrị ekwesị chọrọ ịbụ onye na-eme uche Ya, ma gaakwa n’ihu ikwu na “O kwesịrị izipụ ndị mmadụ ná mba nile ikwusa ihe ndị a.”
The Second Apology of Justin (e kwenyere na ọ bụ nanị ịga n’ihu n’ihe odide nke mbụ) bụ nke e degaara nzukọ Senate nke Rom. Justin kpọkuru ndị Rom site n’ịkọ ahụmahụ nke ndị Kraịst, bụ́ ndị e sogburu mgbe ha nwetaworo ezi ihe ọmụma nke Jisọs Kraịst. Omume ọma nke ozizi Jisọs, nke e gosipụtara n’àgwà nke ndị Kraịst ahụ bụ́ ụmụ amaala, yiri ihe na-abaghị uru n’ebe ndị ọchịchị Rom nọ. Kama nke ahụ, nanị mmadụ ikwupụta na ya bụ onye na-eso ụzọ pụrụ ikpata ọnwụ. Banyere onye bụbu onye nkuzi nke ozizi ndị Kraịst, Justin hotara otu onye aha ya bụ Lucius, bụ́ onye jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka unu ji taa nwoke a ahụhụ, ọ bụghị dị ka onye dinara nwunye onye ọzọ, ma ọ bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ ogbu mmadụ, ma ọ bụ onye ohi, ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe, ma ọ bụ onye a mara ikpe imempụ ọ bụla, kama onye kwupụtara nanị na a na-akpọ ya onye Kraịst?”
Òkè nke ịkpọ asị megide ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst n’oge ahụ ka egosipụtara site n’okwu Justin: “Ya mere, mụ onwe m kwa na-ele anya na ụfọdụ ndị ahụ m kpọworo aha, ma ọ bụ Kresens, onye ahụ na-ahụ mpako ma ọ bụ itu ọnụ n’anya, ga-eme atụmatụ megide m ma kwụba m n’osisi; n’ihi na nwoke ahụ ekwesịghị ịbụ onye a kpọkwasịrị aha ọkà ihe ọmụma nke na-agba àmà ihu ọha megide anyị n’okwu ndị ọ na-aghọtaghị, na-ekwu na ndị Kraịst bụ ndị na-ekwenyeghị na Chineke dị na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, na-eme nke ahụ iji nata ihu ọma nke ìgwè mmadụ e duhieworo, na ime ihe ga-atọ ha ụtọ. N’ihi na ọ bụrụ na ọ wakwasị anyị n’agụghị ozizi nke Kraịst, ọ rụwo arụ nke ukwuu, ọ jọkwara njọ karịa onye na-amaghị akwụkwọ, bụ́ onye na-ajụ ikwu okwu ma ọ bụ ịgba àmà ụgha banyere ihe ndị ha na-aghọtaghị.”
Ọnwụ Ya
Ma ọ bụ n’aka Kresens ma ọ bụ ndị Cynic ọzọ, e kwugidere Justin n’ihu ọchịchị Rom dị ka onye na-akwatu ọchịchị ma maa ya ikpe ọnwụ. N’ihe dị ka 165 O.A., e gbupụrụ ya isi na Rom, o wee bụrụ “martyr” (pụtara “onye àmà”). Ya mere, a na-akpọ ya Justin Martyr.
Ụdị odide ihe nke Justin pụrụ ịbụ nke na-enweghị ịma mma na ịdị akọ nke ndị mụrụ akwụkwọ ọzọ n’oge ya, ma ịnụ ọkụ n’obi ya maka eziokwu na ezi omume pụtara nnọọ ìhè dị ka nke ziri ezi. A pụghị ikwu n’ezie ruo òkè ha aṅaa o biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ nsọ na ozizi Jisọs. Otú ọ dị, e weere akwụkwo dị iche iche nke Justin dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa n’ihi akụkọ ihe mere eme dị n’ime ha na ọtụtụ nhota Akwụkwọ nsọ. Ha na-enye ihe ọmụma nke ndụ na ahụmahụ nile nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst na narị afọ nke abụọ.
Ihe kwesịrị ịrịba àmà bụ mgbalị Justin igosi ndị ọchịchị alaeze ukwu ahụ emeghị ihe n’ikpe ziri ezi nke mkpagbu a kpagburu ndị Kraịst. Ọjụjụ ọ jụrụ okpukpe ndị ọgọ mmụọ na nkà ihe ọmụma iji nweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-echetara anyị na n’Atens Pọl onyeozi jiri nkwụwa okwu gwa ndị ọkà ihe ọmụma Epikurean na Stoik okwu banyere ezi Chineke ahụ na Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilie.—Ọrụ 17:18-34.
Justin n’onwe ya nwere ihe ọmụma ụfọdụ banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ n’oge Puku Afọ ahụ. Lee ka ezi olileanya mbilite n’ọnwụ nke Bible si bụrụ ihe na-emesi okwukwe ike! Ọ kwadowo ndị Kraịst n’ihu mkpagbu ma nyere ha aka ịtachiri ọnwụnwa ndị dị ukwu obi, ọbụna ruo ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; 1 Ndị Kọrint 15:16-19; Mkpughe 2:10; 20:4, 12, 13; 21:2-4.
Ya mere, Justin chụsoro eziokwu ma jụụ nkà ihe ọmụma nke Grik. Dị ka onye nkwado okwukwe, ọ kwuchiteere ozizi na omume ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst. N’ihi ikwukwa na ya nọ n’Isọ Ụzọ Kraịst, e gburu ya maka okwukwe ya. Ihe kwesịrị ịrịba àmà karịsịa bụ obi ekele Justin nwere maka eziokwu na iji nkwụwa okwu gbaa àmà n’ihu mkpagbu, n’ihi na a hụrụ àgwà ndị a na ndụ ndị na-eso ụzọ Jisọs n’ezie taa.—Ilu 2:4-6; Jọn 10:1-4; Ọrụ 4:29; 3 Jọn 4.