Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 11/1 p. 3
  • Otu Echiche Ụgha Na-eduga n’Ọzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Echiche Ụgha Na-eduga n’Ọzọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Justin—Ọkà Ihe Ọmụma, Onye Nkwado Okwukwe, na Onye E Gburu n’Ihi Okwukwe Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ndị Nkwado—Okwukwe Hà Bụ Ndị Gbachiteere Ozizi Ndị Kraịst Ka Hà Bụ Ndị Na-aga Ịghọ Ndị Ọkà Ihe Ọmụma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Akụkụ nke 3—Ndị Nkwado Okwukwe Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Echiche Ụgha nke 2: Ndị Ajọ Omume Na-ata Ahụhụ na Hel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 11/1 p. 3

Otu Echiche Ụgha Na-eduga n’Ọzọ

PỌL onyeozi degaara Ndị Kraịst biri n’ọkara ikpeazụ nke narị afọ mbụ Oge Anyị akwụkwọ ozi, sị: “Nọrọnụ na nche.” Gịnị ka ọ na-adọ ha aka ná ntị maka ya? O kwuru, sị: “Ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị Pọl, malite n’ọkara narị afọ nke abụọ Oge Anyị, ụfọdụ Ndị Kraịst malitere iji echiche nkà ihe ọmụma oge ochie na-akọwa ihe ndị ha kweere. N’ihi gịnị? Ha chọrọ ka ha na ndị gụrụ akwụkwọ n’Alaeze Ukwu Rom dịrị ná mma ma si otú ahụ tọghatakwuo ndị mmadụ.

Justin Martyr, bụ́ otu n’ime Ndị Kraịst ahụ a kacha mara amara, kweere na Ọnụ Na-ekwuru Chineke eburula ụzọ gosi ndị ọkà ihe ọmụma Gris onwe ya ogologo oge tupu Jizọs abịa n’ụwa. Justin na ndị nkụzi echiche ya na ha yiri kwuru na mwebata e webatara nkà ihe ọmụma na echiche ụgha n’Iso Ụzọ Kraịst so mee ka okpukpe a zuo ụwa ọnụ.

Ụdị Iso Ụzọ Kraịst ahụ Justin Martyr soro tọghatara nnọọ ọtụtụ mmadụ. Ma, mwebata e webatara otu echiche ụgha mere ka e nwekwuo echiche ụgha ndị ọzọ, bụ́kwanụ ebe e si nweta ihe ọtụtụ ndị weere ugbu a dị ka ozizi Ndị Kraịst. Iji gbaa echiche ụgha ndị ahụ n’anwụ, ka anyị jiri ihe akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha, bụ́ ndị anyị ga-atụle ugbu a, kwuru tụnyere ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie.

[Ebe e sigasị nweta foto dị na peeji nke 3]

Ekwensu: Barrators—Giampolo/The Doré Illustrations For Dante’s Divine Comedy/Dover Publications Inc.; ndị mmụọ ozi: Art Resource, NY; atọ n’ime otu a tụrụ atụ: Museo Bardini, Florence

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya