Ihe A Hụrụ N’ala Nkwa ahụ
O Gboro Mkpa Israel na Saịnaị
CHEEDỊ echiche banyere ọtụtụ nde ndị mmadụ—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị—ka ha na-etinye isi “n’ọzara ukwu ahụ nke dị egwu, nke agwọ nke yiri ọkụ na akpi dị n’ime ya, na ala akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri na-adịghị ya”!
Okwu ndị ahụ Chineke kwuru nke a na-achọta na Deuterọnọmi 8:15 na-echetara anyị ihe pụrụ iyiworị njem na-atụ egwu nke na-echere ndị Israel ka hapụrụ Ijipt ma zọrọ ije gaa n’ọzara nke Saịnaị. E nwere otu nsogbu siri ike: Ònye ga-eweta ihe oriri na mmiri ga-ezu mmadụ nile?
Ndị Israel anọwo n’ịgba ohu laa azụ n’ala mmiri nke osimiri Nile, ma ọ dịghị ihe kọrọ ha. Ihe osise ndị e sere n’ahụ ili ndị oge ochie na-egosipụta ụdị dị iche iche nke grape, melon, na ihe ọkụkụ ndị ọzọ, tinyere azụ na anụ ndị a na-akpa akpa, bụ́ ndị ga-eme ka e nwee ụdị ihe oriri dị iche iche. Mgbe ahụ, lee otú mkpesa ọchịchọ obi ahụ e mere n’ọzara si bụrụ ihe mere eme: “Ònye ga-eme ka anyị rie anụ? Anyị na-echeta azụ nke anyị na-eri n’Ijipt n’azụghị azụ; ya na cucumbers, na melons, na leeks, na onions, na garlic!”—Ọnụ Ọgụgụ 11:4, 5; 20:5.
Mgbe ụmụ Israel gabigara Osimiri Uhie ahụ, n’oge na-adịghị anya ha ghọtara ihe Saịnaị dị ka ya n’ezie. Ha esoghị ụzọ ahụ a na-eji emekarị njem azụmahịa nke gawara n’ebe ugwu kama ha tinyere isi ná nsọtụ ụzọ mmiri gbara ibe atọ. Mgbe ha gaworo ihe dị ka 80 kilomita site n’ọzara ahụ, mkpa ha nwere maka mmiri yiri nke dị oké njọ. Ha apụghị ịṅụ ihe ọ bụla ha hụrụ, n’ihi na ọ na-elu ilu, ma eleghịkwa anya bụrụ nke ọrịa dị na ya. “Gịnị ka anyị ga-aṅụ?” ka ha tiri mkpu. Chineke mere ihe, na-eme ka mmiri ahụ dị ụtọ.—Ọpụpụ 15:22-25.
Rịba ama ebe ụgbọ camel ahụ dị n’elu chere ihu. Ị pụrụ ịghọta ihe mere e ji jụọ ajụjụ ahụ bụ otú Israel ga-esi nwee ike nọgide na-aga n’ọzara ahụ ruo Ugwu Saịnaị. Olee otú ha ga-esi nọgide na-enweta mmiri zuru ezu—na ihe oriri—maka onwe ha nakwa ìgwè atụrụ na ewu na ehi ndị ha chọrọ ka ha dịrị ndụ?—Ọpụpụ 12:38.
Ha gatụkwuru n’ebe ndịda, n’oge na-adịghịkwa anya ha nwetara mmiri dị mma na ihe oriri n’Ilim. (Ọpụpụ 15:27) Otú ọ dị, ebe ahụ abụghị ebe ha na-eje. Ha na-eje “n’ugwu nke Chineke,” bụ́ Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 3:1; 18:5; 19:2; 24:12-18) Nke ahụ dị 120 kilomita n’ihu—ọtụtụ kilomita nke bụ ala okwute kpọrọ nkụ.
Ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-agaru Ugwu Saịnaị, ha bịarutere—ma eleghị anya kwụsịkwa—n’otu ala mmiri buru ibu a maara dị ka Feiran. A na-ahụta otu akụkụ ya dị nta na foto ahụ dị na peji chere nke a ihu.a Ọ gabigara n’otu ụzọ ngafe dị n’ọzara ahụ, nke gawara n’Osimiri Uhie ahụ (Gulf of Suez). Lee aha ume ọhụrụ ha pụrụ inweta n’ebe ahụ!
Ọ bụ ezie na ọzara Saịnaị pụrụ ikwekọ n’ọtụtụ ụzọ ná nkọwa nke ‘ọzara ukwu nke dị egwu,’ n’ala mmiri ahụ dị na Feiran, ndị Israel pụrụ izu ike na ndò nke osisi nkwụ ndị buru ibu na osisi ndị ọzọ dị n’ala mmiri Feiran. Ha ga-enweta mkpụrụ nkwụ ndị dị ụtọ, ndị ga-abụrụ ha ihe oriri kpọmkwem n’ebe ahụ nakwa ndị ha pụrụ iwere ewere.
Ihe ndị a nile kwere omume n’ihi na mmiri sitere n’ime ala na-agbapụta n’elu ala na Feiran. Cheedị echiche ihe ga-abụ mmetụta gị ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọzara ala akọrọ wee nweta mmiri dị mma ọṅụṅụ na mberede! Nke a na-egosipụta na ọbụna na Saịnaị e nwere ebe ndị a na-enweta mmiri. Mgbe ụfọdụ a ghaghị igwu umi ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ miri nnọọ emi. Ọ ga-ewekwa oké ọrụ isepụta ọtụtụ bọket ma ọ bụ ite mmiri juru eju na ya, karịsịa ma ọ bụrụ na a ga-enye ìgwè atụrụ na ewu mmiri. Ruo taa a na-adọrọ mmasị ndị Bedouin (ndị bi n’ọzara) nke Saịnaị gaa n’umi ebe ha pụrụ iseta mmiri ha onwe ha na camel ha ga-aṅụ.—Tụlee Jenesis 24:11-20; 26:18-22.
Ee, n’agbanyeghị oge ndị ha tamuru ntamu banyere ihe yiri ka ọ bụ ịnọ n’ụkọ nke na-enweghị ngwọta, ndị Israel nwere mmiri na ihe oriri. Mgbe ụfọdụ Chineke nyere ha ihe dị otú ahụ n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọpụpụ 16:11-18, 31; 17:2-6) N’oge ndị ọzọ o yiri ka Chineke duziri ha gaa ‘n’ebe izu ike,’ bụ́ ebe a pụrụ igbo ihe bụ mkpa ha n’ezie site n’ihe a na-enweta n’okike. (Ọnụ Ọgụgụ 10:33-36) Ka ihe ndị a nile na-eme, o debere n’ihu ha ịba ụba nke na-echere ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’Ala Nkwa ahụ.—Deuterọnọmi 11:10-15.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E nwere foto ahụ n’ihe osise buru ibu nke dị na 1992 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24, 25]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.