Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 5/1 p. 8-9
  • Saịnaị—Ugwu Mosis na Ebere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Saịnaị—Ugwu Mosis na Ebere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Mozis—Otú Ndụ Ya Si Emetụta Gị
    Teta!—2004
  • Nkwa Ndị Izrel Kwere Jehova
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 5/1 p. 8-9

Ihe Ndị A Hụrụ N’ala Nkwa Ahụ

Saịnaị—Ugwu Mosis na Ebere

MGBE i chere echiche banyere Ugwu Saịnaị, ma eleghị anya i bu Mosis n’uche. N’ihi gịnị? N’ihi na Mosis natara Iwu Chineke n’otu ugwu dị na Ala Saịnaị Ọ Fọrọ nke Nta ka Mmiri Gbaa Gburugburu. Olè ugwu ọ bụ? Ma eleghị anya nke e sepụtara n’elu.a

N’akụkụ ndịda nke ala ahụ ọ fọrọ nke nta ka mmiri gbaa gburugburu, ihe dị ka n’etiti ngalaba abụọ nke Osimiri Uhie, e nwere warawara ala nke nwere ugwu abụọ. Otú ebe ahụ dị kwekọrọ n’ihe ndekọ Bible ndị metụtara Mosis. A na-akpọ otu ugwu Jebel Musa, nke pụtara “Ugwu Mosis.”

Ihe ndekọ dị iche iche nke Bible na-eme ka aha ahụ kwesị nnọọ ekwesị. Ì chetara na Mosis na-azụ ìgwè anụ Jetro mgbe otu mmụọ ozi gosiri onwe ya n’ọhịa nke na-enwu ọkụ? Olè ebe nke ahụ mere? Bible na-asị na ọ bụ ‘n’ugwu nke Chineke, Horeb,’ nke a na-akpọkwa Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 3:1-⁠10; 1 Ndị Eze 19:8) Mgbe Mosis dupụtasịrị ndị Chineke site n’Ijipt, ọ kpọtara ha n’ebe a. Ọpụpụ 19:​2, 3 na-asị na “Israel wee maa ụlọikwuu ha n’ebe ahụ n’ihu ugwu ahụ. Mosis wee rịgokwuru Chineke, Jehova wee si n’ugwu ahụ kpọọ ya òkù.”

Nke ahụ bụ mbụ Mosis rịgoro n’elu Ugwu Saịnaị, ọ rịmikwara arịmi n’elu ya. Anyị na-agụ, sị: “Jehova wee rịdakwasị ugwu Saịnaị, ruo elu ugwu ahụ: Jehova wee kpọọ Mosis ịbịaru elu ugwu ahụ, Mosis wee rịgoo.”​—⁠Ọpụpụ 19:20.

Ọtụtụ puku ndị njem ngagharị nke oge a ejiwo oké mgbalị iso ụzọ ndị a kwara rịgoro n’ọnụ ọnụ ya n’abalị, nọgide ebe ahụ ịhụ ka anyanwụ na-awa, wee rịdata mgbe ọ na-eru oge ehihie. Ọ dịghị otú ahụ n’akụkụ nke Mosis. Chineke gwara ya, sị: “Rịgokwute m ruo ugwu a, nọkwaa n’ebe ahụ: ka m nyekwa gị nkume abụọ ahụ dị mbadamba, na iwu m.” N’oge ahụ, “Mosis wee nọọ n’ugwu ahụ [iri ụbọchị anọ] ehihie na abalị.”​—⁠Ọpụpụ 24:​12-⁠18.

Ya mere o kwere nghọta na e jikọrọ aha Mosis na ugwu a, ma gịnị ka a ga-eji jikọọ ya na “ebere”? Ọ dị mma, ka Mosis nọ n’elu ebe ahụ na-anata Iwu ahụ, ndị ahụ nọ n’ala n’okpuru (ma eleghị anya n’Ala Dị Larịị nke er-Raha na foto ahụ) gbasoro ụzọ nzuzu. Ha rụgidere nwanne Mosis nke nwoke imere ha chi. Erọn sịrị: “Tijipụnụ mgbaaka ọlaedo nke dị n’ime nti . . . chịtara m ha.” Otú a, ha mere chi nwa ehi ọlaedo maka ofufe. Nke a kpasuru ezi Chineke ahụ iwe wee duba n’ọnwụ nke ọtụtụ puku mmadụ. (Ọpụpụ 32:​1-⁠35) Ma e meere Erọn ebere, hapụkwa ya ndụ. N’ihi gịnị?

Ihe Chineke kwuru n’Ọpụpụ 32:10 na-atụ aro na o leghị Erọn anya dị ka onye isi nkwali nke ngahie Israel. Mgbe a chọkwara idozi ihe iseokwu ahụ, “ụmụ ndị ikom Livaị nile” họọrọ akụkụ nke Chineke, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ gụnyere Erọn. (Ọpụpụ 32:26) Ya mere n’agbanyeghị na ikpe matụrụ Erọn, ọ natara ebere Chineke n’ala Ugwu Saịnaị.

E mesịa, Mosis gosipụtara ọchịchọ ịmara Jehova nke ọma karị na ịhụ ebube Ya. (Ọpụpụ 33:​13, 18) Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme ịhụ ihu Chineke, Jehova gosiri ya ụfọdụ n’ebube Ya, na-emesi ya ike na Ya “ga-emekwara onye ahụ amara, bụ́ onye [Ọ] ga-emere amara.” (Ọpụpụ 33:17-34:7) O kwesịrị nnọọ ekwesị na Chineke ga-emesi ebere ya ike, n’ihi na Bible jiri “ebere” mee ihe nnọọ ọtụtụ ugbo n’ihe banyere mmekọrịta Chineke na Israel, ndị o webatara n’ọgbụgba ndụ na Saịnaị.​—⁠Abụ Ọma 103:​7-13, 18.

Ndị na-eleta Ugwu Saịnaị taa na-ahụ n’ala ala ya otu ogige ndị ụkọ, nke ọ ga-esiri ike ichetara mmadụ ezi ofufe nke Mosis mụtara banyere ya n’ugwu dị n’elu. Kama nke ahụ, okpukpe a na-ekpe n’ogige ndị ụkọ ahụ lekwasịrị anya n’onyinyo dị iche iche. Nke e gosipụtara n’ebe a bụ “Ubube Ịga Paradaịs.” Ọ dabeere n’akwụkwọ onye mọnk Byzantium bụ́ John Climacus dere. Mgbe ọ nọsịrị ihe dị ka 40 afọ n’ụlọ nta ndị ụkọ nke ogige ndị ụkọ ahụ, ọ ghọrọ onye isi ogige ndị ụkọ ahụ wee dee banyere ubube ihe atụ e ji aga eluigwe. Ma rịba ama na e gosiri ụfọdụ ndị ụkọ ka ndị mmụọ ọjọọ na-adọkpụba ha n’ọkụ ala mmụọ. Ọ bụ nkọwa pụtara ìhè ma akwụkwọ nsọ akwadoghị ya!​—⁠Eklisiastis 9:​5, 10; Jeremaịa 7:31.

N’ụzọ dị iche site n’ozizi ụgha ahụ, ihe bụ eziokwu bụ na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile bụ “Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Mosis nọketere Chineke nke a dị ebere nso n’Ugwu Saịnaị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka foto buru ibu karị, lee 1993 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya